Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Isi Zụlite Ịhụnanya Maka Chineke n’Ime Obi Nwa Gị

Ụzọ Isi Zụlite Ịhụnanya Maka Chineke n’Ime Obi Nwa Gị

Ụzọ Isi Zụlite Ịhụnanya Maka Chineke n’Ime Obi Nwa Gị

TAA, ọ natụghị adị mfe mmadụ ime ka ya na Jehova Chineke dị nnọọ ná mma. (Abụ Ọma 16:8) Dị ka e buru n’amụma, anyị bi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ bụ “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-5) Ee, ezi ịhụnanya maka Chineke dị nnọọ ụkọ n’ụwa taa.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka nwatakịrị hụ Chineke n’anya site n’obi ya, anyị aghaghị ime mgbalị iji nyere ya aka ime otú ahụ. Anyị aghaghị ịzụlite ịhụnanya maka Jehova Chineke n’ime obi ụmụ anyị. Olee otú anyị nwere ike isi mee nke a?

Nkwurịta Okwu Si n’Obi

Anyị nwere ike ịzụlite ịhụnanya maka Chineke n’ime obi ụmụ anyị ma ọ bụrụ na obi nke anyị jupụtara n’ịhụnanya maka Chineke. (Luk 6:40) Bible gosiri nke a mgbe o kwuru, sị: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya. Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị.”—Deuterọnọmi 6:4-7.

Olee otú anyị nwere ike isi zụlite ịhụnanya maka Chineke n’ime obi nwa anyị? Nke mbụ bụ na anyị aghaghị ịmata ihe dị n’obi nwa anyị. Nke abụọ abụrụ na anyị aghaghị ikpughe ihe dị n’obi nke anyị.

Mgbe Jizọs Kraịst zutere mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-aga Emeọs, o buru ụzọ gbaa ha ume ikwupụta olileanya ha na ụjọ ha. Ọ bụ nanị mgbe Jizọs gere ha ntị ruo oge ụfọdụ ka ọ gbaziri echiche ha site n’ịkọwara ha Akwụkwọ Nsọ. Ha mesịrị kwuo, sị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ ka ọ nọ na-agwa anyị okwu?” Mkparịta ụka ahụ bụ ihe atụ nke nkwurịta okwu si n’obi. (Luk 24:15-32) Olee otú anyị nwere ike isi mata ihe dị n’obi nwa anyị?

Na nso nso a, a jụrụ ụfọdụ ndị nne na nna, bụ́ ndị ụmụ ha torola ma ọ bụ ndị ụmụ ha ka na-eto eto, ndị bụ́kwa ezi ihe nlereanya n’ọgbakọ, ajụjụ banyere nkwurịta okwu si n’obi. Dị ka ihe atụ, Glen, bụ́ onye bi na Mexico, nwere ụmụ anọ toro eto. * O kwuru, sị: “Nkwurịta okwu si n’obi nke na-adị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha chọrọ mgbalị. Mụ na nwunye m na-ahapụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa iji soro ụmụ anyị nọrịa. Mgbe ha ka nọ n’agbata afọ iri na atọ na afọ iri na itoolu, mgbe ụfọdụ, anyị na-ewepụta nnọọ otu mgbede anyị na ha ga-eji kwurịta ihe ọ bụla gbatara ha n’uche. Mgbe anyị na-erikwa nri, site n’ige ihe ndị ha na-ekwu, anyị na-aghọta ebe ndị ha nwere nsogbu, ma jiri obiọma gbazie ha, mgbe mgbe, ha anadịghị ama.”

Nkwurịta okwu si n’obi gụnyekwara ikwupụta ihe ndị dị n’obi nke anyị. Jizọs kwuru, sị: “Ezi mmadụ na-ewepụta ezi ihe site n’ezi akụ̀ nke obi ya . . . n’ihi na ọnụ ya na-ekwu okwu site n’ihe jupụtara n’obi ya.” (Luk 6:45) Toshiki, bụ́ onye ụmụ ya atọ bụ ndị ozi oge nile na Japan, kwuru, sị: “Agwara m ha ọtụtụ mgbe ihe mere m ji nwee okwukwe na Jehova—otú m si bịa jiri obi m nile kwere na ọ dị adị, na otú ihe ndị m gabigarala ná ndụ siworo mee ka m kwenyesie ike na ihe ndị dị na Bible bụ eziokwu, bụrụkwa ihe nduzi kasị mma ná ndụ.” Cindy, bụ́ onye bi na Mexico, kwuru, sị: “Di m na-eso ụmụ anyị ekpe ekpere mgbe nile. Mgbe ha na-anụ okwu ndị sitere n’obi ọ na-ekpe n’ekpere, ha na-amata na Jehova dị adị n’ezie.”

Ihe Ihe Nlereanya Anyị Pụrụ Ịrụzu

Ọbụna ụzọ anyị si ebi ndụ pụrụ ịrụzu ihe karịa okwu ọnụ anyị, n’ihi na ọ na-egosi ụmụ anyị ókè anyị hụruru Chineke n’anya. Ndị mmadụ matara ókè Jizọs Kraịst hụruru Chineke n’anya mgbe ha hụrụ na ọ na-erubere Jehova isi. Jizọs kwuru, sị: “Ka ụwa wee mara na m hụrụ Nna m n’anya, ọbụna dị ka Nna m nyeworo m iwu ka m mee ya, otú ahụ ka m na-eme.”—Jọn 14:31.

Gareth, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova bi na Wales, kwuru, sị: “Ụmụ anyị aghaghị ịhụ na anyị hụrụ Jehova n’anya nakwa na anyị na-agbalị ime ihe kwekọrọ n’uche ya. Dị ka ihe atụ, ụmụ m na-ahụ na m na-erubere ihe Chineke gwara anyị isi, site n’ikwere mmejọ m. Ugbu a, ụmụ m na-agbalị imekwa otu ihe ahụ.”

Greg, bụ́ onye Australia, kwuru, sị: “Anyị chọrọ ka ụmụ anyị hụ na eziokwu na-achị ndụ anyị. Mgbe anyị na-eme mkpebi banyere ọrụ na ntụrụndụ, anyị na-ebu ụzọ atụle otú ha ga-esi metụta ozi anyị na-eje dị ka Ndị Kraịst. Obi dị anyị ụtọ ịhụ na nwa anyị nwanyị dị afọ iri na itoolu amalitela ime otu ihe ahụ n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka ya.”

Inyere Ụmụ Anyị Aka Ịghọta Chineke

Anyị enweghị ike ịhụ onye anyị na-aghọtaghị n’anya ma ọ bụ tụkwasị ya obi. Mgbe Pọl onyeozi chọrọ ka Ndị Kraịst nọ na Filipaị nwekwuo ịhụnanya n’ebe Jehova nọ, o dere, sị: “Nke a bụkwa ihe m nọgidere na-ekpe n’ekpere, ka ịhụnanya unu wee na-amụbawanye n’ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu.” (Ndị Filipaị 1:9) Falconerio, bụ́ onye na-azụ ụmụ anọ na Peru, kwuru, sị: “Iso ha na-agụ ma na-amụ Bible mgbe nile na-eme ka okwukwe ha sikwuo ike. Ọ dị oge ndị m leghaara ịmụrụ ha ihe anya, ahụkwara m na ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ jụwara oyi.” Gary, bụ́ onye bi n’Australia, kwuru, sị: “Mgbe mgbe, m na-egosi ụmụ m ihe àmà ndị na-egosi na amụma Bible na-emezu. M na-akọwakwara ha uru ndị anyị na-erite site n’ịgbaso ụkpụrụ Bible. Isi ihe nyewooro ha aka inwe okwukwe siri ike bụ ọmụmụ Bible ezinụlọ anyị na-enwechi anya.”

Ịnọ n’ebe ahụ́ ga-eru nwatakịrị ala na n’ebe a na-akwanyere ya ùgwù na-amụrụ ya ihe ga-eme ka ihe ọ na-amụ ruo ya n’obi karịsịa, bụ́ nke na-eme ka ọmụmụ ihe na-enye ọṅụ. (Jems 3:18) Ndị Britain bụ́ Shawn na Pauline, bụ́ ndị nwere ụmụ anọ, kwuru, sị: “Mgbe anyị na-enwe ọmụmụ Bible ezinụlọ anyị, anyị na-agbalị ịghara ịbara ụmụ anyị mba, ọbụna mgbe ha metụwara ụzụ. Anyị na-agbanwe otú anyị si amụ ihe. Mgbe ụfọdụ, anyị na-agwa ụmụ anyị ka ha họta isiokwu anyị ga-amụ. Anyị ji vidio ndị nzukọ Jehova wepụtara mụọ ihe. Mgbe ụfọdụ, anyị na-elegharị otu akụkụ nke vidio ahụ ma ọ bụ kwụsịtụ ya iji nye anyị ohere ikwurịta ihe ndị anyị kiriri.” Otu nne aha ya bụ Kim, nke bikwa na Britain, kwuru, sị: “M na-akwado nke ọma maka ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị ka m wee nwee ike ịjụ ajụjụ ndị ga-akpali ụmụ m iche echiche. Ọmụmụ ihe anyị na-atọ anyị ụtọ. Anyị na-achị ọchị ọtụtụ ugboro.”

Ịhọrọ Ndị Enyi

Ụmụ anyị ga-akasị hụ Jehova n’anya ma na-akwanyere ezi ofufe ùgwù ma ọ bụrụ na ha esoro ndị enyi Chineke na-akpa. Ịchọta ndị enyi ha na ụmụ anyị ga na-ekwurịta ihe ndị bara uru ma na-egwuri egwú nwere ike ịchọ mgbalị. Ma ime otú ahụ bara uru! Ọzọkwa, ọ bara uru iwepụta oge iji mee ka ụmụ anyị soro Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị jirila ozi oge nile mere aka ọrụ ná ndụ ha, nọkọọ. Ọtụtụ ndị jirila ozi oge nile mere aka ọrụ ná ndụ ha mere otú ahụ n’ihi na ha na ndị ohu Chineke na-anụ ọkụ n’obi kpara. Otu nwanna nwanyị ghọrọ onye ozi ala ọzọ kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, ndị mụrụ m kpọrọ ndị ọsụ ụzọ iso anyị rie nri. Ahụrụ m na ozi ha na-eme ha nnọọ obi ụtọ nke na ọ gụrụ m agụụ ijere Chineke ozi otú ahụ.”

N’ezie, ndị ọzọ nwere ike ime ka ụmụ anyị kpawa àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa inwe nkà dị ka ndị nne na nna iji nyere ụmụ anyị aka izere ihe ize ndụ nke mkpakọrịta ọjọọ. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ịkụziri ụmụ anyị otú ha ga-esi ghara iso ndị na-ahụghị Jehova n’anya ma ọ bụ ndị na-amaghị ya na-atụrụ ndụ bụ nkà. (Ilu 13:20) Shawn, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, kwuru, sị: “Anyị kụziiri ụmụ anyị iso ụmụ akwụkwọ ibe ha na-emekọrịta ihe nke ọma, ma mee ka mmekọrịta ndị ahụ kwụsị ebe ahụ—n’ụlọ akwụkwọ. Ụmụ anyị ghọtara ihe mere ha na-agaghị eji na-eme ihe ndị na-esoghị n’ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ sonye n’egwuregwu ụlọ akwụkwọ.”

Uru Ọzụzụ Bara

Site n’ịkụziri ụmụ anyị ka ha na-akọwara ndị ọzọ ihe ndị ha kweere, anyị na-enyere ha aka ime ka ọ na-atọ ha ụtọ ikwupụta ịhụnanya ha nwere maka Chineke. Mark, bụ́ onye bi na United States, kwuru, sị: “Anyị chọrọ ime ka ụmụ anyị nwoke mara na o nwere ike ịtọ ha ụtọ ịgwa ndị ọzọ banyere okwukwe ha n’oge ọ bụla, ọ bụghị nanị mgbe ha jikeere ma gawa ozi ọma. N’ihi ya, mgbe anyị gara ebe anyị ga-anọ tụrụ ndụ, dị ka n’ogige ntụrụndụ, n’ụsọ osimiri, ma ọ bụ n’ọhịa, anyị na-eji Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, anyị na-agwakwa ndị anyị hụrụ ebe ahụ ihe ndị anyị kweere. Ọ na-atọ nnọọ ụmụ anyị ụtọ iso anyị eme nkwusa n’oge ndị ahụ. Ha na-etinye ọnụ ná nkwurịta okwu ndị ahụ ma kwupụta ihe ndị ha kweere.”

Nwoke ahụ merela agadi bụ́ Jọn onyeozi nyeere ọtụtụ ndị aka ime ka ịhụnanya ha nwere maka Chineke mụbaa. O dere banyere ha, sị: “Ọ dịghị ihe ga-akpatara m inwe obi ekele nke karịrị ihe ndị a, na m ga na-anụ na ụmụ m [n’ọgbakọ] nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Ọ bụrụ na anyị azụlite ịhụnanya maka Chineke n’ime obi ụmụ anyị, anyị ga-enwe nnọọ otu ọṅụ ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 8 A gbanwere aha ụfọdụ agbanwe.

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Nkwurịta okwu si n’obi banyere ihe ndị metụtara ofufe chọrọ mgbalị

[Foto dị na peeji nke 10]

Na-akụziri ụmụ gị ikwupụta ịhụnanya ha nwere maka Chineke

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’aka Green Chimneys Farm