Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebe ọ bụ na a gwara ndị Juu ka ha ghara iji “achịcha ọ bụla koro eko” mee Ememe Ngabiga, gịnị meziri Jizọs ji jiri mmanya—nke e ji ihe na-agbaka agbaka mee—mee ihe mgbe ọ na-eguzobe Ncheta ọnwụ ya?—Ọpụpụ 12:20; Luk 22:7, 8, 14-20.

E guzobere Ememe Ngabiga bụ́ nke e ji echeta Ọpụpụ ụmụ Izrel site n’Ijipt n’afọ 1513 T.O.A. Mgbe Jehova na-enye ntụziaka otú a ga-esi eme ya, o kwuru, sị: “Unu agaghị eri achịcha ọ bụla koro eko; n’ebe obibi unu nile ka unu ga-eri achịcha ekoghị eko.” (Ọpụpụ 12:11, 20) Mmachibido iwu a sitere n’aka Chineke bụ nanị maka ụdị achịcha a ga-ata mgbe a na-eme Ememe Ngabiga. E kwughị ihe ọ bụla banyere mmanya.

Ihe bụ́ isi mere e ji machibido iri achịcha koro eko iwu bụ na ndị Izrel pụrụ n’Ijipt ọkụ ọkụ. Ọpụpụ 12:34 na-ekwu, sị: “Ndị Izrel wee buru ụtụ ọka flour ha a gwọrọ agwọ tupu o koo, ebe e kere ihe ha e ji agwọ achịcha n’uwe mgbokwasị ha tụkwasị n’ubu ha.” Ha ịghara iji ihe na-eko achịcha mee Ememe Ngabiga ndị sochirinụ ga-echetara ọgbọ ndị ha ga-enwe n’ọdịnihu ihe a dị mkpa.

Ka oge na-aga, a bịara na-ewere ihe na-eko achịcha mgbe mgbe dị ka ihe na-anọchi anya mmehie ma ọ bụ mmerụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere onye na-eme omume rụrụ arụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na obere ihe iko achịcha na-eme ka ngwakọta ntụ ọka dum koo eko?” O kwuziri, sị: “Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ngwakọta ntụ ọka ọhụrụ, dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo Kraịst bụ́ àjà ememe ngabiga anyị n’àjà. N’ihi ya, ka anyị na-eme ememe ahụ, ọ bụghị site n’iji ihe iko achịcha ochie, ọ bụghịkwa site n’iji ihe iko achịcha bụ́ ihe ọjọọ na ajọ omume, kama site n’iji achịcha na-ekoghị eko bụ́ izi ezi na eziokwu.” (1 Ndị Kọrint 5:6-8) Ọ bụ nanị achịcha na-ekoghị eko pụrụ ịnọchi anya anụ ahụ́ Jizọs nke na-enweghị mmehie.—Ndị Hibru 7:26.

Ọ bụ ndị Juu mesịrị gbakwụnye iji mmanya eme Ememe Ngabiga. O nwere ike ịbụ na ha gbakwụnyere ya mgbe ha lọtasịrị ná ndọrọ n’agha na Babilọn. Bible ekwughị ihe ọ bụla megide ihe ọhụrụ a a gbakwụnyere n’ememe ahụ, n’ihi ya kwa, Jizọs nwere nnọọ ike iji mmanya mee Ememe Ngabiga. A sị ka e kwuwe, ihe na-agbaka mmanya ndị e nwere n’oge ochie dị iche n’ihe na-eko achịcha. Iji mee ka ntụ ọka a gwọrọ agwọ koo, a na-etinye ya yist, ma ọ bụ ihe na-eko achịcha. A naghị etinye mmanya e ji mkpụrụ vaịn mee ihe ndị dị otú ahụ. Mkpụrụ vaịn ndị ahụ nwere ihe ndị na-eme ka mmanya gbakaa n’ime ha. Ọ gaghị adị mfe inweta mmiri mkpụrụ vaịn nkịtị n’oge Ememe Ngabiga n’ihi na ọ gaghị anọ n’agbakaghị agbaka site n’oge owuwe ihe ubi ruo n’oge opupu ihe ubi bụ́ mgbe a na-eme Ememe Ngabiga.

N’ihi ya, Jizọs iji mmanya mee ihe nnọchianya n’oge Ncheta ọnwụ ya adịghị ụzọ ọ bụla o si megide ntụziaka ahụ e nyere banyere iji ihe na-eko achịcha eme Ememe Ngabiga. Mmanya ọ bụla na-acha ọbara ọbara a na-etinyeghị ihe na-atọ ụtọ, ihe na-aba n’anya, ma ọ bụ ihe ndị ga-enye ya ụtọ dị iche kwesịrị ekwesị iji ya eme ihe nnọchianya nke “ọbara dị oké ọnụ ahịa” nke Kraịst.—1 Pita 1:19.