Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Ihe Ọjọọ Ka Ji Dịrị

Ihe Mere Ihe Ọjọọ Ka Ji Dịrị

Ihe Mere Ihe Ọjọọ Ka Ji Dịrị

BIBLE kwuru, sị: “Onye ezi omume ka Jehova [Chineke] bụ n’ụzọ Ya nile.” (Abụ Ọma 145:17; Mkpughe 15:3) Mozis onye amụma kwuru banyere ya, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Jems 5:11 kwuru, sị: “Jehova nwere mmetụta dị nnọọ nro, na-emekwa ebere.” Chineke enweghị ike ịkpata ihe ọjọọ, ọ dịghịkwa akpata ihe ọjọọ.

Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Jehova Chineke adịghị eji ihe ọjọọ anwa ụmụ mmadụ, ọ dịghịkwa araba ha n’ime ihe ọjọọ. Ònyezi na-akpata ihe ọjọọ na ahụhụ na-esi na ya apụta?

Ònye Na-akpata Ihe Ọjọọ?

Onye so dee Bible bụ́ Jems kwuru na ụmụ mmadụ so na-akpata ihe ọjọọ. O kwuru, sị: “A na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà. Ọchịchọ ahụkwa, mgbe ọ tụrụwooro ime, na-amụpụta mmehie; mmehie, n’aka nke ya, mgbe e mechaworo ya, na-eweta ọnwụ.” (Jems 1:14, 15) Ụmụ mmadụ nwere ike ime ihe dị ka ọchịchọ ọjọọ ha si dị. Tụleekwa mmehie ụmụ mmadụ ketara eketa. Ikike mmehie nwere n’ahụ́ ụmụ mmadụ nwere ike ime ka ha nwekwuo ọchịchọ ọjọọ ma kpatara ha nnọọ nsogbu. (Ndị Rom 7:21-23) N’ezie, mmehie e ketara eketa ‘achịwo ụmụ mmadụ dị ka eze,’ na-eme ka ha na-arụ ọrụ ọjọọ ndị na-akpata oké ahụhụ. (Ndị Rom 5:21) Ọzọkwa, ndị ajọ mmadụ pụrụ ịrata ndị ọzọ ime ihe ọjọọ.—Ilu 1:10-16.

Otú ọ dị, onye bụ́ isi na-akpata ihe ọjọọ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Ọ bụ ya wetara ihe ọjọọ n’ụwa. Jizọs Kraịst kpọrọ Setan “ajọ onye ahụ” na “onye na-achị ụwa,” ma ọ bụ ọha mmadụ na-eme mmehie. Ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ mmadụ na-ekwenyere Setan site n’ịnabata agbamume ya ịjụ ezi ụzọ nke Jehova Chineke. (Matiu 6:13; Jọn 14:30; 1 Jọn 2:15-17) Jọn nke Mbụ 5:19 na-ekwu, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” N’ezie, Setan na ndị mmụọ ozi ya “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi,” na-akpatara ha nanị “ahụhụ.” (Mkpughe 12:9, 12) N’ihi ya, ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu bụ onye bụ́ isi na-akpata ihe ọjọọ.

Eklisiastis 9:11 kpughere ihe ọzọ na-akpata mmekpa ahụ́ ma ọ bụ ahụhụ, sị: “Mgbe na ihe ndapụta na-adabara [anyị] nile.” Jizọs Kraịst kwuru banyere otu ọdachi dakwasịrị mmadụ iri na asatọ, bụ́ ndị ụlọ elu dagburu. (Luk 13:4) Ihe mere ọdachi ahụ ji dakwasị ha bụ na ha nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị. Ihe ndị yiri nke ahụ na-emekwa taa. Dị ka ihe atụ, blọk nwere ike isi n’elu ụlọ dị elu dakwasị onye na-agafe agafe. Ọ̀ bụ Chineke kpatara ya? Ee e. Ọ bụ ihe mberede na ihe ndabara. Ọ na-abụkarịkwa otu ihe ahụ na-akpata ọrịa n’ezinụlọ ma ọ bụ ọnwụ mberede bụ́ nke na-eme ka e nwee ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.

Ya mere, o doro anya na ọ bụghị Chineke kpatara ihe ọjọọ; ọ dịghịkwa akpata ahụhụ. Kama nke ahụ, nzube Jehova bụ iwepụ ihe ọjọọ na ndị na-akpata ya. (Ilu 2:22) N’ezie, ọ ga-eme ihe karịrị nke ahụ. Akwụkwọ Nsọ kwuru na nzube Chineke nke ọ ga-eji Kraịst mezuo bụ ‘itipịasị ọrụ Ekwensu.’ (1 Jọn 3:8) A ga-ebibizi usoro ihe dị ugbu a—bụ́ nke hiwere isi n’anyaukwu, ịkpọasị, na ọrụ ọjọọ. Ọbụna Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya [nile],” si otú ahụ mee ka ahụhụ kwụsị. (Mkpughe 21:4) Ma, i nwere ike ịjụ, sị: ‘Gịnị mere Chineke emebeghị ya? Olee ihe mere o ji hapụ ihe ọjọọ na ahụhụ ka ha dịgide ruo n’oge anyị a?’ Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị ahụ dị n’ihe e dekọrọ na Bible banyere Adam na Iv.

E Welitere Otu Ihe Iseokwu Dị Mkpa

Ihe mere Chineke ji hapụ ihe ọjọọ ka ọ dịgide ruo n’oge anyị a metụtara otu ihe mere oge na-adịghị anya ka e kesịrị mmadụ. Otu ihe mere mgbe ahụ welitere otu ihe iseokwu dị mkpa banyere Onye Okike n’onwe ya—bụ́ ihe iseokwu nke a na-enweghị ike idozi ozugbo ma ọ bụ n’ụzọ dị mfe. Ka anyị tụlee ihe merenụ.

Jehova Chineke kere nwoke mbụ na nwanyị mbụ dị ka ndị zuru okè ma tinye ha na Paradaịs. E nyere ha onyinye nke mere ka ha dị iche n’ebe ụmụ anụmanụ dị—nke bụ́ ikike ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme. (Jenesis 1:28; 2:15, 19) Ebe ọ bụ na e kere Adam na Iv inwe ike ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme, ha nwere ike iji ikike ahụ họrọ ịhụ Onye Okike ha n’anya, ijere ya ozi, na irubere ya isi. Ma ọ bụkwanụ, ha ahọrọ ikewapụ onwe ha n’ebe Chineke nọ ma kpachara anya nupụrụ ya isi.

Ezi Chineke ahụ nyere Adam na Iv otu iwu iji nye ha ohere igosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Ọ nọ. O nyere Adam iwu, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Ka Adam na Iv na Chineke wee nọgide na-adị ná mma, nakwa ka ihe wee dịrị ha na ụmụ ha ndị ha ga-amụta n’ọdịnihu mma, ha ga-ezere iri mkpụrụ nke otu osisi ahụ. Hà zeere ya?

Bible gwara anyị ihe merenụ. Setan bụ́ Ekwensu ji agwọ bịakwute Iv ma jụọ ya, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” Mgbe Iv gwara ya iwu Chineke nyere ha, Setan gwara Iv, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” N’ihi ya, osisi ahụ bịara yie ihe mara nnọọ mma nye Iv nke mere ka “o were ụfọdụ n’ime mkpụrụ ya, rie.” Bible kwukwara, sị: “O nyekwa di ya, tinyere onwe ya, o wee rie.” (Jenesis 3:1-6) Ma Adam ma Iv si otú ahụ jiri ikike ha nwere ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma mee mmehie site n’inupụrụ Chineke isi.

Ị̀ ghọtara otú ihe ahụ merenụ dịruru ná mkpa? Ekwensu gbaghara ihe Chineke gwara Adam. Okwu Setan pụtara na enyemaka Jehova adịghị Adam na Iv mkpa iji kpebiere onwe ha ihe ga-abara ha uru na ihe ga-aghọ ha ahịa. N’ihi ya, ihe iseokwu ahụ Setan welitere mere ka e nwewe obi abụọ ma ọ̀ bụ Jehova ka o ruuru ịchị ụmụ mmadụ. Ya mere, ihe iseokwu gbara ọkpụrụkpụ Setan welitere bụ ma ọ̀ bụ Jehova kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ. Olee ihe ezi Chineke ahụ mere banyere ihe iseokwu ahụ?

A Chọrọ Oge Zuru Ezu Iji Dozie Ihe Iseokwu Ahụ

Jehova nwere ikike igbu ndị nnupụisi atọ ahụ—Setan, Adam, na Iv. O doro anya na Chineke ka ha ike. Ma Setan amaghị ike Chineke nwere aka. Kama ihe ọ mara aka bụ oruru o ruuru Jehova ịchị ụmụ mmadụ. Ihe iseokwu ahụ metụtara ihe nile e kere eke nwere ikike ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme. Ọ dị ha mkpa ịhụ na a ghaghị iji ikike ime mkpebi mee ihe n’ụzọ ziri ezi—otú ọ na-agaghị emegide iwu ndị Chineke nyere banyere ụwa, omume na ofufe. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-ata nnọọ ahụhụ, dị nnọọ ka onye si n’elu ụlọ elu wụpụ, bụ́ onye leghaara iwu ndọda anya, ga-esi merụọ nnọọ ahụ́. (Ndị Galeshia 6:7, 8) Ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi pụrụ irite uru site n’iji anya ha hụ ihe ọjọọ si na ha ịhọrọ ikewapụ onwe ha n’ebe Chineke nọ pụta. Nke a chọrọ oge.

A pụrụ iji ihe atụ a na-esonụ gosi na a chọrọ oge iji dozie ụfọdụ ihe iseokwu: Ka e were ya na otu nwoke nwere ezinụlọ gwara nwoke ọzọ nwere ezinụlọ ka ha maa aka iji mara onye ka ibe ya ike. A pụrụ idozi okwu ahụ ozugbo. A pụrụ ịchọpụta onye ka ibe ya ike site n’ịsị ha abụọ bulie nkume elu. A ga-ewere onye buliri nkume nke kasị arọ elu dị ka onye ka ike. Ma ka e were ya na ịma aka ahụ bụ iji mara onye hụrụ nnọọ ụmụ ya n’anya nakwa iji mara ma ụmụ ahụ hà hụrụ nna ha n’anya. Ma ọ bụ gịnị ma ọ bụrụ na ịma aka ahụ bụ iji mara nna nke kasị elekọta ezinụlọ ya nke ọma? Ma ibuli nkume elu iji gosi ike ma okwu ọnụ nkịtị agaghị ezu iji dozie esemokwu ahụ. Iji dozie esemokwu ahụ, a chọrọ oge zuru ezu iji mee ka ndị mmadụ hụ ọdịiche dị n’etiti ihe mmadụ abụọ ahụ na-eme ma kpebizie n’onwe ha onye nke ka ibe ya bụrụ ezigbo mmadụ.

Ihe Oge Gafeworonụ Gosirila

Ihe dị ka puku afọ isii agafeela kemgbe Setan kwuru na ọ bụghị Chineke ka o ruuru ịchị ụmụ mmadụ. Gịnị ka ihe ndị merela n’oge ndị gara aga gosirila? Tụlee akụkụ abụọ nke ebubo ahụ Setan boro Chineke. Setan gwara Iv hoo haa, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ.” (Jenesis 3:4) Setan kpọrọ nnọọ Jehova onye ụgha site n’ịgwa Adam na Iv na ọ dịghị ọnwụ ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu. Nke a bụ nnọọ ajọ ebubo! Ọ bụrụ na Chineke ekwughị eziokwu n’okwu a, olee otú a ga-esi tụkwasị ya obi n’ihe ọ bụla ọzọ? Otú ọ dị, olee ihe oge gafeworonụ gosirila?

Adam na Iv malitere ịrịa ọrịa, inwe ihe mgbu, ịka nká ma mesịa nwụọ. Bible kwuru, sị: “Ụbọchị nile nke Adam dị ndụ wee bụrụ [narị afọ itoolu na iri atọ]: o wee nwụọ.” (Jenesis 3:19; 5:5) Adam bufekwara ụmụ mmadụ nile mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Oge gafeworonụ egosiwo na Setan bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna nke ụgha,” o gosikwara na Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.”—Jọn 8:44; Abụ Ọma 31:5.

Setan gwakwara Iv, sị: “Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere [n’osisi ahụ a machibidoro iwu], mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu [ma Iv ma Adam] ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:5) Setan ji okwu nduhie dị otú ahụ mee ka ụmụ mmadụ chee na ha nwere ike ịchị onwe ha. Setan ji aghụghọ kwuo na ihe ga-akara ụmụ mmadụ mma ma ọ bụrụ na ha anọghị n’okpuru Chineke. Nke a ò meela?

Kemgbe ụwa, alaeze ukwu dị iche iche achịala ụwa ma pụọ n’anya. A nwaleela ụdị ọ bụla nke ọchịchị ụmụ mmadụ a pụrụ ichetụ n’echiche. N’agbanyeghị nke ahụ, ọdachi adakwasịla ụmụ mmadụ ugboro ugboro. Otu onye so dee Bible ji amamihe kwubie ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Jeremaịa onye amụma dere, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ọbụna ihe ndị sayensị na nkà na ụzụ rụzurula n’afọ ndị na-adịbeghị anya emebeghị ka okwu ndị a gharakwa ịbụ eziokwu. Nanị ihe oge gafeworonụ merela bụ igosi na okwu ndị a bụ eziokwu.

Gịnị Ka Ị Ga-eme?

Oge Chineke nyere egosiwo na ihe ahụ Setan kwuru na ọ bụghị Jehova ka o ruuru ịchị ụmụ mmadụ, bụ ụgha. Jehova Chineke bụ Onye Ọchịchị kasịnụ n’eluigwe na ala. O ruuru ya ịchị ihe ndị o kere eke, ụzọ o si achị bụkwa nke kasị mma. Ndị mmụọ e kere eke nọ n’eluigwe, bụ́ ndị nọrọla n’okpuru ọchịchị Chineke ruo ọtụtụ afọ kwetara na nke a bụ eziokwu mgbe ha kwuru, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.”—Mkpughe 4:11.

Olee ebe ị kwụ n’ihe banyere ọchịchị Chineke? Ì kwetara na ọ bụ Chineke ka o ruuru ịchị gị? Ọ bụrụ na i kwetara, ị ghaghị ịnakwere ọbụbụeze Jehova. I nwere ike ime nke a site n’itinye eziokwu na ndụmọdụ ndị magburu onwe ha dị n’Okwu ya, bụ́ Bible, n’ọrụ n’akụkụ nile nke ndụ gị. “Chineke bụ ịhụnanya,” iwu ya nile na-adaberekwa n’ịhụnanya o nwere n’ebe ihe ndị o kere eke nọ. (1 Jọn 4:8) Jehova anaghị anapụ onye ọ bụla n’ime anyị ihe ga-abara anyị uru. N’ihi ya, ị pụrụ itinye ndụmọdụ a Bible nyere n’ọrụ: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—Ilu 3:5, 6.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ị pụrụ ịhọrọ ọchịchị Chineke site n’ịmụ Bible na itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ ná ndụ gị

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 4]

© Jeroen Oerlemans/Panos Pictures