Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jonatan “Ya na Chineke Arụwo Ọrụ”

Jonatan “Ya na Chineke Arụwo Ọrụ”

Jonatan “Ya na Chineke Arụwo Ọrụ”

NWA eze mbụ nke Izrel letara onye a na-achọ achọ n’ebe o zoro. Ọ gwara onye ahụ na-agba ọsọ ndụ, sị: “Atụla egwu: n’ihi na aka nna m, bụ́ Sọl, agaghị achọta gị; gị onwe gị ga-abụkwa eze Izrel, mụ onwe m ga-abụkwara gị onye nke abụọ.”—1 Samuel 23:17.

Onye ahụ bịara ileta mmadụ bụ Jonatan; onye ahụ na-agba ọsọ ndụ abụrụ Devid. E wezụga na Jonatan nwụrụ obere oge ka nke ahụ gasịrị, o nwere ike ịbụ na ọ gaara aghọ osote Devid.

Ọbụbụenyi Jonatan na Devid pụrụ iche. N’ezie, Jonatan bụ nwoke pụrụ iche. Ndị ha na ya dịkọrọ ndụ chekwara otú ahụ, n’ihi na ha kwuru banyere ya, sị: “Ya na Chineke arụwo ọrụ.” (1 Samuel 14:45) Olee ihe mere ha ji kwuo otú ahụ? Olee àgwà ndị Jonatan nwere? Oleekwa uru akụkọ ndụ ya ga-abara gị?

“Mkpa Na-akpa” Ndị Izrel

Mgbe mbụ Bible kwuru banyere Jonatan bụ mgbe “mkpa na-akpa” ndị Izrel. Ndị Filistia kwakọọrọ ihe ha ma gbochie ha ichebe onwe ha.—1 Samuel 13:5, 6, 17-19.

Ma, Jehova kwuru na ya agaghị ahapụ ndị ya, Jonatan kwenyesikwara ike na nke ahụ. Ọ bụ nna ya, bụ́ Sọl, ka Chineke kwuru banyere ya, sị: “Ọ ga-azọpụtakwa ndị m n’aka ndị Filistia.” Jonatan kweere okwu ahụ. Tupu mgbe ahụ, ya onwe ya du otu puku ndị agha Izrel na-ejichaghị ngwá agha merie ndị Filistia. Ugbu a, ọ chọrọ ime ka ndị Filistia gharakwa inye ndị ya nsogbu ọzọ.—1 Samuel 9:16; 12:22; 13:2, 3, 22.

Mwakpo E Ji Obi Ike Mee

Jonatan mere atụmatụ ịwakpo ebe nguzo ndị agha Filistia nke dị nso n’ebe ngabiga bụ́ Mikmash. (1 Samuel 13:23) Iji ruo ebe ahụ, ọ ghaghị iji “aka ya na ụkwụ ya” rịa ebe dị elu. Nke ahụ emeghị ka ọ laa azụ. Jonatan kpebiri na ya na nanị onye na-ebu ihe agha ya ga-awakpo ndị iro ahụ, ọ gwakwara onye ahụ na-ebu ihe agha ya, sị: “Eleghị anya Jehova ga-arụrụ anyị ọrụ: n’ihi na ihe mgbochi adịghị n’ebe Jehova nọ ịzọpụta site n’iwere ọtụtụ mmadụ ma ọ bụ site n’iwere mmadụ ole na ole.”—1 Samuel 14:6, 13.

Ndị Izrel abụọ ahụ gwara Jehova ka o nye ha ihe àmà. Ha ga-egosi ndị nọ n’ebe nguzo ndị agha ahụ onwe ha. Ọ bụrụ na ndị Filistia ahụ asị: “Guzonụ duu ruo mgbe anyị ruru unu ahụ́!” Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya agaghị aga ịlụso ha ọgụ. Ma ya bụrụ na ndị iro ahụ asị: “Rịgokwutenụ anyị!” nke ahụ ga-apụta na Jehova ga-enye Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya mmeri. Ọ bụrụ na Jonatan ejide n’aka na Chineke ga-akwado ya, ọ ga-arịgo n’ebe nguzo ndị agha ahụ iji luso ha ọgụ.—1 Samuel 14:8-10.

Olee ihe mmadụ abụọ ga-emeta ndị agha nile nọ n’ebe nguzo ndị agha? Cheedị echiche, Jehova ó nyeereghị Onyeikpe Ihud aka mgbe o du ndị Izrel gaa ịlụso ndị Moab agha? Chineke ọ́ nọnyeereghị Shamga, mee ka o jiri ndụdụ e ji achụ ehi tigbuo narị ndị Filistia isii? Jehova ó nyekwaghị Samsịn ike n’ọgụ nanị ya lụsoro ndị Filistia? Obi siri Jonatan ike na Chineke ga-enyekwara ya aka.—Ndị Ikpe 3:12-31; 15:6-8, 15; 16:29, 30.

Mgbe ndị Filistia hụrụ ndị Izrel abụọ ahụ, ha tiri mkpu, sị: “Rịgokwutenụ anyị, anyị ga-emekwa ka unu mara ihe!” Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya gakwuwere ha. Ha ji obi ike lụsoo ndị iro ha ahụ agha ma gbuo iri ndị agha abụọ n’ime ha, bụ́ nke mere ka egwu jide ndị agha nọ n’ebe nguzo ndị agha ahụ. Ikekwe, ndị Filistia chere na ọtụtụ ndị dike Izrel so mmadụ abụọ mbụ ahụ n’azụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ihe ndekọ ahụ kwuru na “ọma jijiji wee dị . . . n’etiti ndị ahụ nile . . . ala dekwara ude; o wee ghọọ ọma jijiji nke Chineke.” N’ihi ala ọma jijiji ahụ Chineke zitere, ndị Filistia gbara aghara, nke mere ka “mma agha nwoke ọ bụla [dịgide] ibe ya.” Mgbe ndị agha Izrel hụrụ nke a, obi siri ha ike. Ndị Izrel zoburu ezo na ndị dụnyeerela ndị Filistia úkwù sonyeere ha, “ha wee tigbuo ụfọdụ n’ime ndị Filistia n’ụbọchị ahụ site na Mikmash ruo Ajalọn.”—1 Samuel 14:11-23, 31.

Ndị Izrel Gbapụtara Ya

Eze Sọl kpara àgwà iberibe site n’ịbụ onye agha ya ọ bụla riri ihe tupu e merie n’agha ahụ ọnụ. N’ihi ihe ụfọdụ, Jonatan amaghị banyere nke a. Jonatan riri ihe. O ji isi mkpara ya detụ n’ụgbụgbọ mmadụ aṅụ ma rachaa ya. Ọ dị ka nke ahụ ò mere ka o nwetaghachi ume ịlụcha ọgụ ahụ.—1 Samuel 14:24-27.

Mgbe Sọl nụrụ na Jonatan riri ihe, o nyere iwu ka e gbuo ya. Ụjọ atụghị Jonatan ịnwụ. O kwuru, sị: “Lee m, m ga-anwụ.” “Ndị Izrel wee sị Sọl, Jonatan ọ̀ ga-anwụ, bụ́ onye zọpụtara nzọpụta ukwu a n’Izrel? ya bụrụ ihe arụ: Jehova na-adị ndụ, ọ dịghị otu n’ime agịrị isi nke isi ya ga-adaru ala; n’ihi na ya na Chineke arụwo ọrụ taa. Ndị Izrel wee gbapụta Jonatan, o wee ghara ịnwụ.”—1 Samuel 14:38-45.

Ohu Chineke nke oge a anaghị alụ agha nkịtị, ma e nwere ike inwe oge ndị okwukwe na obi ike dịkwa gị mkpa ná ndụ. O nwere ike isiri gị ike ime ezi ihe mgbe ndị nile gbara gị gburugburu na-eme ihe ọjọọ. Otú ọ dị, Jehova ga-enye gị ike ma gọzie ọchịchọ gị ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ ezi omume ya. Obi ike nwere ike ịdị gị mkpa iji nara ọrụ ụfọdụ ná nzukọ Jehova, dị ka ịmụba ozi gị, ịnabata ọrụ ndị ọhụrụ e nyere gị, ma ọ bụ ịga ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. I nwere ike ịnọ na-eche ma ị̀ ga-arụlikwa ọrụ ahụ. Ma, jide n’aka na ị na-eme ihe dị mma ma ọ bụrụ na i kwere ka Jehova jiri gị rụọ ọrụ n’ebe o lere anya kwesịrị ekwesị. Cheta Jonatan! ‘Ya na Chineke rụkọrọ ọrụ’

Jonatan na Devid

Ihe dị ka iri afọ abụọ ka nke ahụ gasịrị, dike ndị Filistia a na-akpọ Golaịat kwara ndị agha Izrel emo, ma Devid gburu ya. Ọ bụ ezie na ọ dị ka Jonatan ò ji iri afọ atọ tọọ Devid, àgwà ha abụọ yiri nnọọ. * Devid gosipụtakwara ụdị obi ike ahụ Jonatan gosipụtara na Mikmash. Nke kasịkwa mkpa bụ na Devid nwere ụdị okwukwe ahụ Jonatan nwere na Jehova ga-azọpụta ndị ya, bụ́ nke mere ka o nwee ike ịlụso Golaịat ọgụ n’atụghị egwu mgbe ndị Izrel ndị ọzọ nile na-agbara ya ọsọ. Ọ bụ otú ahụ ka ‘e si kekọta mkpụrụ obi Jonatan na mkpụrụ obi Devid, Jonatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi ya.’—1 Samuel 17:1–18:4.

Ọ bụ ezie na obi ike Devid mere ka Eze Sọl mewere ya anyaụfụ, ọ dịtụghị mgbe Jonatan kwere ka ekworo bata ya n’obi. Ya na Devid ghọrọ nnọọ ezi enyi, o nwekwara ike ịbụ na mgbe ha abụọ na-ekwurịta okwu nzuzo, Jonatan matara na e teela Devid mmanụ ịbụ eze ọzọ nke Izrel. Jonatan nabatara mkpebi ahụ Chineke mere.

Mgbe Eze Sọl gwara nwa ya nwoke na ndị ohu ya na ya chọrọ igbu Devid, Jonatan gbaara Devid àmà. Jonatan mere ka obi sie Sọl ike na Devid anaghị echere ya echiche ọjọọ. N’ezie, ọ dịtụghị ihe ọjọọ Devid merela eze ahụ! Devid ó tinyeghị ndụ ya n’ihe ize ndụ mgbe ọ gara ịlụso Golaịat agha? Arịrịọ ọmịiko Jonatan rịọrọ maka enyi ya a na-emegbu emegbu mere ka obi jụrụ Sọl. Ma, n’oge na-adịghị anya, eze ahụ maliteghachiri ịkpa nkata igbu Devid ma nwaakwa igbu ya, bụ́ nke mere ka Devid gbalaga.—1 Samuel 19:1-18.

Jonatan kwadoro Devid. Ndị enyi abụọ ahụ zutere iji gbaa izu ihe ha ga-eme. Ebe ọ bụ na Jonatan kwesịrị ntụkwasị obi nye Devid ma chọọkwa ikwesị ntụkwasị obi nye nna ya, ọ gwara Devid, sị: “Ya bụrụ ihe arụ; ị gaghị anwụ.” N’agbanyeghị nke ahụ, Devid gwara Jonatan, sị: “Nanị ihe ha ka otu nzọụkwụ dị n’agbata mụ na ọnwụ!”—1 Samuel 20:1-3.

Jonatan na Devid chepụtara otú ha ga-esi mara ihe dị Sọl n’obi. Ya bụrụ na Sọl amata na Devid esoghị ezinụlọ ya rie nri, Jonatan ga-agwa ya na Devid rịọrọ ya ka ya nye ya ohere ịga soro ezinụlọ ya chụọ àjà. Ọ bụrụ na iwe ewee Sọl, nke ahụ ga-egosi na o buuru Devid ihe ọjọọ n’obi. Jonatan gọziri ya ma kwuo ihe gosiri na ọ ma na Devid ga-abụ eze n’ọdịnihu, sị: “Jehova nọnyekwara gị, dị ka Ọ nọnyewooro nna m.” Ha abụọ ṅụrụ iyi ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ibe ha ma kpebie otú Jonatan ga-esi gwa Devid ihe si n’ule ahụ pụta.—1 Samuel 20:5-24.

Mgbe Sọl hụrụ na Devid anọghị ya, Jonatan kọwaara ya na Devid rịọrọ ya arịrịọ, sị: “Ọ bụrụ na ahụtawo m amara n’ihu gị, biko, ka m wepụga onwe m, wee hụ ụmụnne m.” Jonatan atụghị ụjọ ikweta na ihe Devid dị ya mma. Eze ahụ koro ọnụma! Ọ gwara Jonatan okwu ọjọọ ma baa mba na Devid chọrọ ịnara nwa ya eze. Sọl nyere Jonatan iwu ka o dutere ya Devid ka e gbuo ya. Jonatan zaghachiri ya ozugbo, sị: “N’ihi gịnị ka a ga-eme ka ọ nwụọ? Gịnị ka o meworo?” Sọl ji oké iwe tụọ nwa ya ube. Jonatan zere ya, ọnọdụ Devid wutekwara ya nke ukwuu.—1 Samuel 20:25-34.

Jonatan kwesịrị nnọọ ntụkwasị obi! E lee ya anya nanị n’otú mmadụ si ele ihe anya, ọ dịchaghị uru ọ ga-erite n’ọbụbụenyi ya na Devid, kama nke ahụ, ọtụtụ ihe ga-efunahụ ya. Ma, Jehova ekpebiela na Devid ga-anọchi Sọl dị ka eze, ihe ahụ Chineke kpebiri bụkwa maka ọdịmma Jonatan na nke ndị ọzọ.

Mgbasa E Ji Anya Mmiri Gbasaa

Jonatan gakwuuru Devid na nzuzo ma gwa ya ihe ahụ merenụ. O doola anya na ụkwụ Devid agakwaghị akpa n’obí eze Sọl ọzọ. Mmadụ abụọ ahụ bere ákwá ma makụọ onwe ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, Devid gara zoo.—1 Samuel 20:35-42.

Jonatan hụrụ onye ahụ na-agba ọsọ ndụ nanị otu ugboro ọzọ, mgbe Devid zoro n’ihi Sọl “n’ọzara Zif n’oké ọhịa.” Ọ bụ n’oge ahụ ka Jonatan ji okwu ndị a gbaa Devid ume: “Atụla egwu: n’ihi na aka nna m, bụ́ Sọl, agaghị achọta gị; gị onwe gị ga-abụkwa eze Izrel, mụ onwe m ga-abụkwara gị onye nke abụọ; ọzọkwa, Sọl, bụ́ nna m, maara nke a.” (1 Samuel 23:15-18) Obere oge ka nke ahụ gasịrị, Jonatan na Sọl nwụrụ n’agha ha na ndị Filistia lụrụ.—1 Samuel 31:1-4.

Ndị nile hụrụ Chineke n’anya kwesịrị ịtụle ụdị ndụ Jonatan biri. Ị̀ nọ n’ọnọdụ nke amaghị onye ị ga-adụnyere úkwù? Ya bụrụ otú ahụ, cheta na Sọl gbara Jonatan ume ka ọ chọọ ọdịmma nke onwe ya. Ma, Jonatan kwanyeere Jehova ùgwù site n’iji obi ya nile doo onwe ya n’okpuru ya ma ṅụrịa ọṅụ na ọ bụ onye Chineke họọrọ ga-abụ eze ọzọ nke Izrel. Ee, Jonatan kwadoro Devid ma kwesị ntụkwasị obi nye Jehova.

Jonatan nwere àgwà ndị magburu onwe ha. Ṅomie ha! Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ndị mmadụ ga-enwe ike ikwu banyere gị dị ka ha kwuru banyere Jonatan, sị: “Ya na Chineke arụwo ọrụ.”—1 Samuel 14:45.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 18 Ma ọ dịghị ihe ọzọ, Jonatan eruola iri afọ abụọ mgbe mbụ a kpọtụrụ ya aha dị ka onyeisi agha ná mmalite nke ọchịchị Sọl dịruru iri afọ anọ. (Ọnụ Ọgụgụ 1:3; 1 Samuel 13:2) N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ na Jonatan eruwela iri afọ isii mgbe ọ nwụrụ n’ihe dị ka afọ 1078 T.O.A. Ebe ọ bụ na Devid dị iri afọ atọ mgbe ahụ, ọ dị ka Jonatan ò ji ihe dị ka iri afọ atọ tọọ Devid.—1 Samuel 31:2; 2 Samuel 5:4.

[Foto dị na peeji nke 19]

Jonatan ekwosoghị Devid ekworo