Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’Ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Ihe Ọjọọ Dịrị?

N’Ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Ihe Ọjọọ Dịrị?

N’Ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Ihe Ọjọọ Dịrị?

IHE ọjọọ na ahụhụ juru ebe nile. Agha na-egbu ma ndị nkịtị ma ndị agha. Mpụ na ime ihe ike juru ebe nile. Ma eleghị anya, e mesowo gị omume ọjọọ n’ihi agbụrụ gị ma ọ bụ kpee gị ikpe na-ezighị ezi n’oge na-adịbeghị anya. N’ihi ihe ndị ị hụworo na ihe ndị merela gị, ma eleghị anya, ị jụwo, sị, ‘N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ dịrị?’

Ọtụtụ mmadụ ajụọla ajụjụ ahụ. Ihe dị ka puku afọ atọ na narị isii gara aga, otu ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ Job, jụrụ, sị: “Gịnị mere ndị na-emebi iwu na-adị ndụ?” (Job 21:7) N’ihi mwute Jeremaịa onye amụma bụ́ onye dịrị ndụ na narị afọ nke asaa T.O.A. nwere n’ihi omume ọjọọ nke ndị obodo ya, ọ jụrụ, sị: “Gịnị mere ụzọ ndị na-emebi iwu ji agara ha nke ọma? gịnị mere ndị nile na-aghọgbu aghọgbu nke ukwuu ji anọ n’udo?” (Jeremaịa 12:1) Ma Job ma Jeremaịa maara na Chineke bụ onye ezi omume. N’agbanyeghị nke ahụ, ha jụrụ ihe mere ihe ọjọọ ji jupụta ebe nile. Ma eleghị anya, ị jụọkwala ajụjụ a.

Ụfọdụ ndị na-ata Chineke ụta na ọ bụ ya kpatara ihe ọjọọ na ahụhụ. Ndị ọzọ na-ajụ, sị: ‘Ọ bụrụ na Chineke pụrụ ime ihe nile, na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-ahụ n’anya, gịnị mere na ọ kwụsịbeghị ihe ọjọọ na ahụhụ? Olee ihe mere o ji hapụ ihe ọjọọ ka ọ dịgide ruo n’oge anyị a?’ Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa.

[Ebe E Si Nweta Ihe Osise dị na peeji nke 3]

Foto AP/Adam Butler