Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nna Unu Na-eme Ebere”

“Nna Unu Na-eme Ebere”

“Nna Unu Na-eme Ebere”

“Nọgidenụ na-eme ebere, dị nnọọ ka Nna unu na-eme ebere.”—LUK 6:36.

1, 2. Olee otú ihe Jizọs gwara ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na ụmụazụ ya si gosi na ebere bụ àgwà magburu onwe ya?

IWU ahụ e si n’aka Mozis nye nwere ihe dị ka narị iwu na ụkpụrụ isii dị iche iche. Ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ka ndị Izrel mee ihe dị n’Iwu Mozis, ọ dịkwa ha ezigbo mkpa ịdị na-eme ebere. Tụlee ihe Jizọs gwara ndị Farisii, bụ́ ndị na-adịghị emere ndị ọzọ ebere. Ọ baara ha mba ugboro abụọ, na-agwa ha na Chineke enyewo iwu, sị: “Achọrọ m ebere, ọ bụghịkwa àjà.” (Matiu 9:10-13; 12:1-7; Hosea 6:6) Ná ngwụsị nke ozi Jizọs, o kwuru, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ mint nakwa mkpá akwụkwọ dil nakwa mkpụrụ kumin, ma unu na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.”—Matiu 23:23.

2 O doro anya na Jizọs weere ebere dị ka àgwà dị oké mkpa. Ọ gwara ụmụazụ ya, sị: “Nọgidenụ na-eme ebere, dị nnọọ ka Nna unu na-eme ebere.” (Luk 6:36) Otú ọ dị, iji “ghọọ ndị na-eṅomi Chineke” n’akụkụ a, ọ dị anyị mkpa ịmata ihe ezigbo ebere bụ. (Ndị Efesọs 5:1) Ọzọkwa, ịghọta uru a na-erite n’ime ebere ga-akpali anyị ịdị na-akpakwu àgwà a ná ndụ anyị.

Imere Ndị Nọ ná Mkpa Ebere

3. Gịnị mere o ji bụrụ n’aka Jehova ka anyị kwesịrị ịmụta ihe ezi ebere bụ?

3 Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Onye dị amara na onye nwere obi ebere ka Jehova bụ; Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ dịkwa ukwuu n’ebere. Jehova dị mma n’ebe ihe nile e kere eke dị; obi ebere Ya nile dịkwasịkwara n’ọrụ Ya nile.” (Abụ Ọma 145:8, 9) Jehova bụ “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi nile.” (2 Ndị Kọrint 1:3) Mmadụ na-egosi na ya na-eme ebere site n’iji ọmịiko na-emeso ndị ọzọ ihe. Nke a so n’àgwà ndị bụ́ isi Chineke nwere. Ihe nlereanya ya na ntụziaka ndị ọ na-enye anyị pụrụ ịkụziri anyị ihe ezi ebere bụ.

4. Gịnị ka Aịsaịa 49:15 na-akụziri anyị banyere ebere?

4 Dị ka e dere n’Aịsaịa 49:15, Jehova kwuru, sị: “Nwanyị, ọ̀ ga-echezọ nwa ya na-aṅụ ara, wee ghara inwe obi ebere n’ahụ́ nwa afọ ya?” E ji okwu Hibru ndị ha na nke a sụgharịrị ebe a dị ka “obi ebere” yiri mee ihe mgbe a na-ekwu banyere ebere n’Abụ Ọma 145:8, 9, bụ́ nke e hotara n’elu. E ji obi ebere Jehova na-enwe n’ahụ́ ndị mmadụ tụnyere obi ebere nwanyị mụrụ nwa na-enwe n’ebe nwa ya nọ. Eleghị anya agụụ na-agụ nwa ahụ, ma ọ bụ ya enwee ihe ọzọ ọ chọrọ ka e meere ya. Ọmịiko ma ọ bụ ebere nwanyị ahụ nwere n’ebe nwa ya ahụ nọ na-akpali ya imere ya mkpa ya. Jehova na-enwe ọmịiko dị otú ahụ n’ebe ndị ọ na-emere ebere nọ.

5. Olee otú Jehova si gosi na ya “bara ụba n’ebere” n’ebe ụmụ Izrel nọ?

5 E nwere ihe dị iche n’inwe ọmịiko n’ebe onye nọ ná mkpa nọ na igboro ya mkpa ya. Tụlee ihe Jehova mere mgbe ndị na-efe ya ofufe bụ ohu n’Ijipt ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. Ọ gwara Mozis, sị: “Ahụwo m n’ezie mweda n’ala nke ndị m nke dị n’Ijipt, anụwokwa m iti mkpu ha n’ihi ndị na-achị ha n’ihe ike; n’ihi na amawo m ihe mgbu ha nile; M wee rịdata ịnapụta ha n’aka ndị Ijipt, na ime ka ha si n’ala ahụ rịgoruo ala dị mma nke sakwara mbara, ruo ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ọpụpụ 3:7, 8) Ihe dị ka narị afọ ise a napụtasịrị ndị Izrel n’Ijipt, Jehova chetaara ha, sị: “Mụ onwe m mere ka Izrel si n’Ijipt rịgota, M wee napụta unu n’aka ndị Ijipt na n’aka alaeze nile nke na-emegbu unu.” (1 Samuel 10:18) Ebe ndị Izrel kwụsịrị ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ziri ezi nke Chineke, ha dabara ná nsogbu ọtụtụ mgbe. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, ma gbatara ha ọsọ enyemaka ọtụtụ mgbe. (Ndị Ikpe 2:11-16; 2 Ihe E Mere 36:15) Nke a na-egosi otú Chineke anyị na-ahụ n’anya si enyere ndị nọ ná mkpa, ndị nọ n’ihe ize ndụ, ma ọ bụ ndị nọ ná nsogbu, aka. Jehova “bara ụba n’ebere.”—Ndị Efesọs 2:4.

6. Olee otú Jizọs Kraịst si ṅomie Nna ya n’imere ndị ọzọ ebere?

6 Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’elu ala, o ṅomiri Nna ya n’ụzọ zuru okè n’imere ndị ọzọ ebere. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndị ikom abụọ kpuru ìsì rịọrọ ya arịrịọ, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid”? Ha na-arịọ Jizọs ka ọ rụọrọ ha ọrụ ebube site n’ime ka ha hụwa ụzọ ọzọ. Jizọs mere otú ahụ, ma ọ rụghị ọrụ ebube ahụ iji mee ka ha kwụsị inye ya nsogbu. Bible kwuru, sị: “N’ịbụ onye nwere ọmịiko, Jizọs bitụrụ anya ha aka, ozugbo ahụkwa ha hụrụ ụzọ.” (Matiu 20:30-34) Obi ebere mere ka Jizọs rụọ ọrụ ebube ndị mere ka ndị ìsì, ndị mmụọ ọjọọ ji, ndị ekpenta, na ndị nne na nna ụmụ ha na-arịa ọrịa nwere onwe ha.—Matiu 9:27; 15:22; 17:15; Mak 5:18, 19; Luk 17:12, 13.

7. Gịnị ka ihe nlereanya Jehova Chineke na Ọkpara ya na-akụziri anyị banyere ebere?

7 Ihe nlereanya Jehova Chineke na Jizọs Kraịst gosiri na ebere nwere akụkụ abụọ—inwe ọmịiko n’ebe ndị nọ ná mkpa nọ na ime ihe iji nyere ha aka. A chọrọ ụzọ ihe abụọ a n’aka onye na-eme ebere. N’Akwụkwọ Nsọ, ebere na-apụtakarị ime ihe iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. Ma, olee otú e si egosipụta ebere n’ikpe? Ọ̀ pụtakwara ime ihe ndị e nwere ike ile anya dị ka ihe na-ezighị ezi, dị ka ịghara inye onye mere ihe ọjọọ ntaramahụhụ?

Imere Ndị Mere Mmehie Ebere

8, 9. Olee ihe ebere e meere Devid mgbe ya na Bat-sheba mechara mmehie gụnyere?

8 Tụlee ihe mere mgbe Netan onye amụma gwasịrị Eze Devid nke Izrel oge ochie okwu banyere iko Devid na Bat-sheba kwara. Devid chegharịrị ma kpee ekpere, sị: “Meere m amara, Chineke, dị ka ebere Gị si dị: dị ka ịba ụba nke obi ebere Gị nile si dị hichapụ njehie m nile. Sụchaa m nke ọma dị ka ákwà ka ajọ omume m pụọ n’ime m, meekwa ka m si ná mmehie m dị ọcha. N’ihi na mụ onwe m maara njehie m nile: mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe nile. Megide Gị, nanị Gị, ka m mehieworo, ọ bụkwa ihe jọrọ njọ n’anya Gị ka m meworo.”—Abụ Ọma 51:1-4.

9 Devid si n’ala ala obi ya chegharịa. Jehova gbaghaara ya mmehie ya ma ghara inye ya na Bat-sheba ntaramahụhụ kwesịịrị ha. A gbasoo Iwu Mozis, e kwesịrị igbu Devid na Bat-sheba egbu. (Deuterọnọmi 22:22) Ọ bụ ezie na ha nwetara ntaramahụhụ maka mmehie ha, e gbughị ha. (2 Samuel 12:13) Ebere Chineke na-agụnyekwa ịgbaghara mmehie. Ma, ọ naghị ahapụ inye ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị.

10. Ọ bụ ezie na Jehova na-eme ebere mgbe ọ na-ekpe ikpe, olee ihe mere anyị na-agatụghị eji jiri ebere ya mere ihe mgbakwasị ụkwụ iji na-eme ihe ọjọọ?

10 Ebe ọ bụ na “mmehie sitere n’otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa” ya abụrụkwa na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ,” mmadụ nile kwesịrị ọnwụ. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Anyị kwesịrị nnọọ ikele Jehova na ọ na-eme ebere mgbe ọ na-ekpe ikpe! Otú ọ dị, anyị aghaghị ịkpachara anya ịghara iji ebere Chineke mere ihe mgbakwasị ụkwụ iji na-eme ihe ọjọọ. Deuterọnọmi 32:4 kwuru na “ụzọ [Jehova] nile bụ ikpe ziri ezi.” Mgbe Chineke na-eme ebere, ọ naghị eleghara ụkpụrụ ya zuru okè nke ikpe ziri ezi anya.

11. Olee otú Jehova si kpee nnọọ ikpe ziri ezi n’ihe banyere Devid n’ihi mmehie ya na Bat-sheba mere?

11 Tupu a gbanwee ihe n’ikpe ọnwụ ahụ mara Devid na Bat-sheba, a ghaghị ibu ụzọ gbaghara ha mmehie ha. Ma e nyeghị ndị ikpe Izrel ikike ime nke a. Ọ bụrụ na a hapụ ha ka ha jiri aka ha kpee ikpe ahụ, ọ dịghị ihe ọzọ ha gaara eme ma ọ́ bụghị ịma ha ikpe ọnwụ. Ọ bụ ihe Iwu ahụ kwuru ka e mee. Ma n’ihi ọgbụgba ndụ dị n’etiti Jehova na Devid, Jehova chọrọ ịhụ ma ò nwere ihe ọ ga-eji gbaghara Devid mmehie ya. (2 Samuel 7:12-16) Ọ bụ n’ihi nke a ka Jehova Chineke, “Onyeikpe ụwa nile,” onye “na-anwapụta obi,” ji họrọ iji aka ya kpee ikpe ahụ. (Jenesis 18:25; 1 Ihe E Mere 29:17) Chineke maara obi Devid nke ọma, mara na nchegharị ya si ya nnọọ n’ala ala obi, ma gbaghara ya.

12. Olee otú ụmụ mmadụ na-emehie emehie ga-esi rite uru n’ebere Chineke?

12 Ebere Jehova meere anyị ime ka o kwe anyị omume izere ọnwụ n’ihi mmehie anyị ketara eketa kwekọrọ n’ikpe ziri ezi ya. Ka Jehova wee nwee ike ịgbaghara mmehie n’emeghị ihe ga-emegide ikpe ziri ezi ya, o nyere ihe mgbapụta bụ́ àjà Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, chụrụ—nke bụ́ ebere kasịnụ e metụrụla. (Matiu 20:28; Ndị Rom 6:22, 23) Ka anyị wee rite uru n’ebere Chineke, bụ́ nke nwere ike ime ka anyị ghara inweta ntaramahụhụ n’ihi mmehie anyị ketara eketa, anyị aghaghị ‘igosipụta okwukwe n’Ọkpara ahụ.’—Jọn 3:16, 36.

Chineke nke Ebere na Ikpe Ziri Ezi

13, 14. Ebere Chineke ọ̀ na-emejụ ikpe ziri ezi ya? Kọwaa.

13 Ọ bụ ezie na ebere Jehova anaghị emebi ụkpụrụ ikpe ziri ezi ya, ò nwere ụzọ ụfọdụ ebere si emetụta ikpe ziri ezi ya? Ebere ọ̀ na-ebelata ikpe ziri ezi nke Chineke site n’ime ka ọ dị nro? Ee e, ọ naghị eme otú ahụ.

14 Jehova sitere n’ọnụ Hosea onye amụma gwa ụmụ Izrel, sị: “M ga-ekwerekwa ịlụ gị n’Onwe m ruo mgbe ebighị ebi; ee, M ga-ekwerekwa ịlụ gị n’Onwe m n’ezi omume, na n’ikpe, na n’ebere, na n’obi ebere nile.” (Hosea 2:19) Okwu ndị a na-eme ka o doo anya na ebere Jehova na-ekwekọ mgbe nile n’àgwà ya ndị ọzọ, gụnyere ikpe ziri ezi. Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, . . . Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Jehova bụ Chineke nke ebere na ikpe ziri ezi. Bible kwuru banyere ya, sị: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi.” (Deuterọnọmi 32:4) Ikpe ziri ezi Chineke zuru okè, ọ bụkwa otú ahụ ka ebere ya dị. Ọ dịghị nke ka ibe ya, ọ dịghịkwa nke na-emejụ ibe ya. Kama nke ahụ, àgwà abụọ a na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ụzọ zuru okè.

15, 16. (a) Olee otú anyị si mara na Chineke anaghị eji obi ọjọọ ekpe ikpe ziri ezi? (b) Mgbe Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’isi ụwa ọjọọ dị ugbu a, olee ihe ndị na-efe ya ga-ejide n’aka?

15 Jehova anaghị eji obi ọjọọ ekpe ikpe ziri ezi. A na-ekwukarị banyere ikpe ziri ezi n’ihe banyere ikpe, ikpe na-achọkarịkwa ka e nye ndị mere ihe ọjọọ ntaramahụhụ kwesịịrị ha. Otú ọ dị, ikpe ziri ezi Chineke nwere ike ịgụnye ịzọpụta ndị kwesịrị nzọpụta. Dị ka ihe atụ, mgbe e bibiri ndị ajọ omume n’obodo Sọdọm na Gọmọra, a zọpụtara nna ochie ahụ bụ́ Lọt na ụmụ ya ndị nwanyị abụọ.—Jenesis 19:12-26.

16 Anyị ga-enwe obi ike na mgbe Jehova ga-ebibi ụwa ọjọọ dị ugbu a, a ga-azọpụta “oké ìgwè mmadụ” bụ́ ndị na-efe ezi ofufe, ndị ‘sawokwara uwe mwụda ha ma mee ka ha na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’ N’ihi ya, ha ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.’—Mkpughe 7:9-14.

Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Na-eme Ebere?

17. Olee ezi ihe mere anyị ga-eji na-eme ebere?

17 Ihe nlereanya Jehova na Jizọs Kraịst na-akụziri anyị ihe ezi ebere bụ. Mgbe Ilu 19:17 na-agwa anyị ezi ihe mere anyị kwesịrị iji na-eme ebere, o kwuru, sị: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka Ọ ga-akwụghachi ya.” Obi na-atọ Jehova ụtọ mgbe anyị ṅomiri ya na Ọkpara ya site n’imere ibe anyị ebere. (1 Ndị Kọrint 11:1) Ebere nke anyị na-agbakwa ndị ọzọ ume ime ebere, n’ihi na ebere na-akpata ebere.—Luk 6:38.

18. Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbalị ịdị na-eme ebere?

18 Ebere gụnyere ọtụtụ àgwà ọma. Ọ gụnyere ime amara, ịhụnanya, obiọma, na ịdị mma. Ọ bụ ọmịiko na-akpali mmadụ ime ebere. Ọ bụ ezie na ebere Chineke anaghị ebelata ikpe ziri ezi, Jehova anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ na-ejikwa ndidi enye ndị mmehie oge zuru ezu ichegharị. (2 Pita 3:9, 10) N’ihi ya, ebere gụnyere ndidi na ogologo ntachi obi. Ebe ọ bụ na ebere gụnyere ọtụtụ àgwà ọma—ndị gụnyere akụkụ dị iche iche nke mkpụrụ nke mmụọ Chineke—ebere na-akpali mmadụ ịzụlite àgwà ndị a. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị na-agbalị ịdị na-eme ebere!

“Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-eme Ebere”

19, 20. Olee otú ebere na-esi aṅụrị ọṅụ mmeri n’ebe ikpe dị?

19 Jems onye na-eso ụzọ gwara anyị ihe mere anyị kwesịrị iji were ebere dị ka àgwà dị oké mkpa ná ndụ anyị. O dere, sị: “Ebere na-aṅụrị ọṅụ mmeri n’ebe ikpe dị.” (Jems 2:13b) Jems na-ekwu banyere ebere onye na-efe Jehova na-emere ndị ọzọ. Ọ na-aṅụrị ọṅụ mmeri n’ebe ikpe dị n’ihi na mgbe oge ruru ka mmadụ ‘zaa Chineke ajụjụ maka onwe ya,’ Jehova ga-echeta ebere onye ahụ meere ndị ọzọ ma gbaghara onye ahụ dabere n’àjà mgbapụta nke Ọkpara Ya. (Ndị Rom 14:12) O doro anya na otu ihe mere e ji meere Devid ebere ná mmehie ya na Bat-sheba mere bụ na ọ bụ nwoke na-eme ebere. (1 Samuel 24:4-7) N’aka nke ọzọ, “a ga-eji emeghị ebere kpee ikpe nke onye na-adịghị eme ebere.” (Jems 2:13a) Ka a sịkwa ihe mere e ji kwuo na “ndị na-adịghị eme ebere” so ná ndị Chineke weere dị ka ndị “kwesịrị ọnwụ”!—Ndị Rom 1:31, 32.

20 N’Ozizi Elu Ugwu Jizọs, ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere, ebe ọ bụ na a ga-emere ha ebere.” (Matiu 5:7) Okwu ndị a gosiri nnọọ na ndị chọrọ ka Chineke meere ha ebere aghaghị ịdị na-emere ndị ọzọ ebere! Isiokwu na-esonụ ga-atụle otú anyị ga-esi na-eme ebere ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Gịnị bụ ebere?

• Olee ụzọ dị iche iche e si meere ụmụ mmadụ ebere?

• Olee otú Jehova si bụrụ Chineke nke ebere na ikpe ziri ezi?

• Gịnị mere anyị ga-eji na-eme ebere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Ọmịiko Jehova na-enwe n’ahụ́ ndị nọ ná mkpa yiri nke nwanyị mụrụ nwa na-enwe n’ahụ́ nwa ya

[Foto dị na peeji nke 23]

Gịnị ka ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-akụziri anyị banyere ebere?

[Foto dị na peeji nke 24]

Jehova ò mere ihe megidere ikpe ziri ezi ya mgbe o meere Devid ebere?

[Foto dị na peeji nke 25]

Ebere Chineke na-emere ụmụ mmadụ na-ezughị okè kwekọrọ n’ikpe ziri ezi ya