Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnukwu Akwụkwọ John Milton Dere nke Furu Efu

Nnukwu Akwụkwọ John Milton Dere nke Furu Efu

Nnukwu Akwụkwọ John Milton Dere nke Furu Efu

ỌRARA ahụ́ inweta onye edemede ihe odide ya metụtara ndị nọ ya gburugburu dị ka nke John Milton, bụ́ onye dere otu nnukwu akwụkwọ Bekee bụ́ Paradise Lost. Dị ka otu onye na-ede akụkọ ndụ si kwuo, “ọtụtụ ndị hụrụ [Milton] n’anya, ụfọdụ kpọrọ ya asị, ma ọ bụ nanị mmadụ ole na ole bụ ndị na-amaghị banyere ya.” Ruokwa taa, ọtụtụ ihe banyere otú e si ede ihe na ihe ndị a na-eme n’asụsụ Bekee dabeere n’ihe odide ya.

Olee otú John Milton si ghọọ onye a ma ama otú ahụ? Olee ihe mere akwụkwọ ikpeazụ o dere—On Christian Doctrine—ji see okwu nke na e bipụtaghị ya ruo otu narị afọ na iri ise?

Mgbe Ọ Ka Na-eto Eto

A mụrụ John Milton n’otu ezinụlọ bara ọgaranya na London na 1608. Milton chetara, sị: “Site na mgbe m ka na-eto eto, nna m kwadebere m maka ịmụ otú e si ede edemede, bụ́ nke masịrị m nnọọ nke na malite mgbe m dị afọ iri na abụọ, ọ na-ara ahụ́ mụ ahapụ akwụkwọ m lakpuo ụra ma ọ́ kụbeghị elekere iri na abụọ nke etiti abalị.” O mere nnọọ nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ma nweta akara ugo mmụta master’s na Mahadum Cambridge na 1632. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ nọgidere na-agụ akụkọ ihe mere eme na akwụkwọ ndị e dere na Rom na Gris oge ochie.

Milton chọrọ ịghọ ode uri, ma n’oge ya, England nọ n’ọgba aghara n’ihi ndị na-achọ mgbanwe ọchịchị. Nzukọ ndị isi, nke onye bụ́ isi na-eduzi ya bụ Oliver Cromwell, họpụtara ndị ikpe nyere iwu ka e gbuo Eze Charles nke Mbụ na 1649. Milton ji ihe odide na-akpali akpali o dere kọwaa na ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ogbugbu a e gburu eze ahụ, ọ ghọkwara ọnụ na-ekwuru ọchịchị Cromwell. N’ezie, tupu John Milton aghọọ onye a ma ama dị ka ode uri, o wuwelarị ewuwe n’ihi traktị ndị o dere banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na omume.

Mgbe e nyeghachisịrị onye eze ọchịchị bụ́ mgbe e chiri Charles nke Abụọ eze na 1660, nkwado Milton na-akwadobu Cromwell tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ. Milton zoro, ọ bụkwa nanị ndị enyi ya ọnụ na-eru n’okwu mere e gbughị ya. Ihe a nile adịghị nke mere ka ọ kwụsị inwe oké mmasị n’ihe ndị metụtara okpukpe.

“Ụkpụrụ Bible”

Mgbe Milton na-ekwu banyere otú o si nwee mmasị n’ihe banyere okpukpe mgbe ọ na-eto eto, o dere, sị: “Mgbe m na-eto eto, amalitere m site n’ịmụ nnọọ Agba Ochie na Agba Ọhụrụ n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ha.” Milton bịara na-akwanyere Akwụkwọ Nsọ ùgwù dị ka nanị ihe nduzi ziri ezi n’ihe metụtara omume na ofufe. Ma ihe ọ hụrụ ka ọ na-enyocha akwụkwọ ndị e weere dị ka ndị bụ́ ịgba n’ịkụzi ihe banyere okpukpe n’oge ahụ kụdara ya mmụọ. O mesịrị dee, sị: “Ekpebiri m na ekwesịghị m ikwe ka nkwenkwe na olileanya nzọpụta m dabere n’ihe nduzi ndị dị otú ahụ.” Ebe ọ bụ na Milton kpebisiri ike iji nanị “ụkpụrụ Bible” tụọ nkwenkwe ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ọ malitere idepụtasị amaokwu Bible ndị bụ́ isi n’okpuru isiokwu dị iche iche ma na-ehota amaokwu dị iche iche site n’ihe ndị ahụ o depụtasịrị.

Taa, ihe a kasị eji echeta John Milton bụ Paradise Lost ahụ o dere, bụ́ akwụkwọ na-akpali akpali o dere iji kọghachi akụkọ Bible banyere otú ụmụ mmadụ si ghọọ ndị na-ezughị okè. (Jenesis, isi 3) Ọ bụ akwụkwọ a e bipụtara nke mbụ ya na 1667 kasị mee ka Milton ghọọ onye a ma ama n’ide ihe, karịsịa ná mba ndị na-asụ Bekee. O mesịrị bipụta akwụkwọ malitere akụkọ ahụ n’ebe nke mbụ ahụ kwụsịrị, bụ́ nke a kpọrọ Paradise Regained. Akwụkwọ ndị a e dere n’ụdị uri kọwara nzube mbụ nke Chineke maka mmadụ—nke bụ́ ịdị ndụ obi ụtọ n’ụwa paradaịs—ma kọwaa otú Chineke ga-esi jiri Kraịst weghachi Paradaịs n’ụwa. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ahụ bụ́ Paradise Lost, Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi buru amụma banyere mgbe Kraịst “ga-akwụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nye Ya ụgwọ, nyekwa ha obi ụtọ ebighị ebi, n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, n’ihi na mgbe ahụ, ụwa dum ga-abụ paradaịs, bụ́ ebe na-enye nnọọ obi ụtọ karịa Iden a, nakwa ebe a ga-adị ndụ obi ụtọ karịa nnọọ ka a dịrị n’Iden.”

Akwụkwọ Bụ́ On Christian Doctrine

Ruo ọtụtụ afọ, Milton chọkwara ibipụta akwụkwọ nke ga-akọwa ọtụtụ ihe banyere ndụ na ozizi Ndị Kraịst. N’agbanyeghị na o kpuola ìsì kpamkpam na 1652, ọ gbasiri mbọ ike iji bipụta akwụkwọ a site n’enyemaka nke ndị odeakwụkwọ ya ruo nnọọ mgbe ọ nwụrụ na 1674. Milton kpọrọ akwụkwọ ikpeazụ a o dere A Treatise on Christian Doctrine Compiled From the Holy Scriptures Alone. N’okwu mmalite ya, o dere, sị: “Nanị ihe ihe ka ọtụtụ n’ime ndị derela akwụkwọ n’isiokwu a . . . mere bụ idepụta isiakwụkwọ na amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị ihe nile ha na-akụzi dabeere nnọọ na ha ugboro ole na ole n’ihe odide ntụkwasị nke akwụkwọ ha. Ma mụ onwe m gbalịrị iji ihe m hotara n’akụkụ nile nke Bible dejupụta peeji nile nke akwụkwọ m, ọbụna dee ya ka ọ na-asụsị asụsị.” Milton mere ihe kwekọrọ n’okwu ya site n’ịrụtụ aka ma ọ bụ ihota ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ ihe karịrị ugboro puku itoolu n’akwụkwọ ahụ bụ́ On Christian Doctrine.

Ọ bụ ezie na tupu mgbe ahụ, Milton anaghị ezo ọnụ ikwupụta echiche ya, o bipụtaghị akwụkwọ ahụ ozugbo. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ọ maara na ihe ndị ọ kọwara site n’Akwụkwọ Nsọ dị nnọọ iche n’ozizi ndị chọọchị na-ezi. Ọzọkwa, mgbe e nwere eze ọhụrụ, ya na ndị ọchịchị adịkwaghị ná mma otú ha dịbu. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ọ na-eche ka ihe dajụtụ. Otú o sina dị, mgbe Milton nwụsịrị, odeakwụkwọ ya wegaara onye na-ebi akwụkwọ ihe odide ahụ dị n’asụsụ Latin, ma onye ahụ na-ebi akwụkwọ jụrụ ibipụta ya. Odeakwụkwọ mba England bukọrọziiri ihe odide ndị ahụ ma debe ha ebe ọ na-adịghị ihe ga-eme ha. Otu narị afọ na iri ise gafere tupu a chọpụta ebe ihe odide Milton ahụ dị.

Na 1823, otu onye ọrụ eze hụrụ ihe odide ahụ onye a na-ede uri a ma ama dere ebe e ji akwụkwọ fụchie ya. Eze George nke Anọ, bụ́ onye na-achị England n’oge ahụ, nyere iwu ka a sụgharịa akwụkwọ ahụ dị n’asụsụ Latin ma bipụtara ya ọhaneze. Mgbe e bipụtara akwụkwọ ahụ na Bekee afọ abụọ ka e mesịrị, ọ kpatara oké esemokwu n’etiti ndị ọkà mmụta okpukpe na ndị edemede. Ozugbo ahụ, otu bishọp kwuru na akwụkwọ ahụ na-ezi ozizi nduhie, sị na ya ekweghị na Milton—bụ́ onye ọtụtụ ndị weere dị ka ode uri bụ́ ọkaibe n’England n’ihe banyere okpukpe—ga-ajụ nnọọ ozizi ndị chọọchị ji kpọrọ ihe otú ahụ. Ebe ọ bụ na onye sụgharịrị ya tụrụ anya ụdị ihe ahụ na iji gosi na ọ bụ Milton dere akwụkwọ ahụ, o gosiri narị ebe ise akwụkwọ bụ́ On Christian Doctrine na Paradise Lost na-ekwu otu ihe. *

Nkwenkwe Milton

Ka ọ na-erule n’oge Milton, England anabatala Mgbanwe Ndị Protestant ma sere aka ha na Chọọchị Roman Katọlik. Ihe ka ọtụtụ ná ndị Protestant kweere na ọ bụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ikwu ihe anyị ga-ekwere na otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà, na ọ bụghị popu. Ma, n’akwụkwọ ahụ bụ́ On Christian Doctrine, Milton gosiri na ọtụtụ ihe ndị Protestant na-ezi ma na-eme ekwekọkwaghị n’Akwụkwọ Nsọ. Dabere na Bible, ọ jụrụ ozizi akara aka nke ndị okpukpe Calvin ma kwere na e nyere anyị nile ike ime mkpebi. Ọ gbara ndị mmadụ ume iji aha Chineke, bụ́ Jehova, eme ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù, o jikwa ya mee ihe ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ ya.

Milton ji Akwụkwọ Nsọ rụọ ụka iji gosi na mkpụrụ obi mmadụ nwere ike ịnwụ anwụ. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere Jenesis 2:7, o dere, sị: “Mgbe e si otú a kee mmadụ, e kwuru n’ikpeazụ, sị: mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ. . . . Ọ gbaghị mkpị ma ọ bụ bụrụ ihe abụọ dịgasị iche: ọ bụghị dị ka a na-eche, onye e ji ihe abụọ dị iche iche kee na onye bụ́ ihe abụọ dị iche iche, nke bụ́ mkpụrụ obi na anụ ahụ́. Kama nke ahụ, mmadụ ahụ dum bụ mkpụrụ obi, mkpụrụ obi bụkwa mmadụ.” Milton jụziri, sị: “Ihe nile dị mmadụ n’ime ọ̀ na-anwụ, ka ọ̀ bụ nanị ahụ́ ya na-anwụ?” Mgbe o hotasịrị ọtụtụ amaokwu Bible ndị gosiri na ihe nile dị mmadụ n’ahụ́ na-anwụ anwụ, ọ gbakwụnyere, sị: “Ma ihe kasị gbaa ọkpụrụkpụ m ga-eji kọwaa na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ bụ ihe Chineke n’onwe ya kwuru, n’Ezik[iel 18:]20: mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” Milton rụtụkwara aka n’amaokwu Bible ndị dị ka Luk 20:37 na Jọn 11:25 iji gosi na olileanya ụmụ mmadụ nwere dabeere ná mkpọlite a ga-akpọlite ndị nọ n’ụra ọnwụ n’ọdịnihu.

Olee ihe kasị kpasuo ndị mmadụ iwe n’ihe banyere akwụkwọ ahụ bụ́ On Christian Doctrine? Ọ bụ ụzọ doro anya ma na-eru n’obi Milton si jiri Bible gosi na Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, nọ n’okpuru Chineke, bụ́ Nna ahụ. Mgbe Milton hotasịrị Jọn 17:3 na Jọn 20:17, ọ jụrụ, sị: “Ya bụrụ na Nna ahụ bụ Chineke Kraịst na Chineke anyị, ya bụrụkwa na e nwere nanị otu Chineke, olee onye ga-abụ Chineke ma e wezụga Nna ahụ?”

Ọzọkwa, Milton kwuru, sị: “Ọkpara ahụ n’onwe ya na ndịozi ya kwetara n’ihe nile ha kwuru ma dee na Nna ahụ ka Ọkpara ahụ ukwuu n’ihe nile.” (Jọn 14:28) “N’ezie, ọ bụ Kraịst kwuru, sị, Mat. xxvi. 39: Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ka iko a gabiga m; ma, ọ bụghị dị ka m si chọọ, kama dị ka i si chọọ. . . . Olee ihe o ji kpegara nanị Nna ahụ ekpere, kama ikpegara onwe ya, ma ọ bụrụ na ya onwe ya bụ Chineke n’ezie? Ọ bụrụ na ya onwe ya bụ ma mmadụ ma Chineke pụrụ ime ihe nile, olee ihe o jidị kpewe ekpere maka ihe dị n’ike aka ya onwe ya? . . . Dị ka Ọkpara ahụ na-akwanyere nanị Nna ahụ ùgwù ma na-efe nanị ya n’ebe nile, ọ na-akụziri anyị ime otú ahụ.”

Ebe Ndị Milton Mejọrọ

John Milton chọrọ eziokwu. Ma, o mehiekwara ihe dị ka mmadụ, o nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ n’ime echiche ndị na-ezighị ezi o nwere bụ n’ihi ihe ọjọọ ndị dabaara ya. Dị ka ihe atụ, obere oge ya na nwunye ya lụsịrị, nwunye ya ahụ bụ́ obere nwa nwanyị nke otu Eze bara ọgaranya, hapụrụ ya, laghachi n’ezinụlọ nna ya ma nọọ ebe ahụ afọ atọ. N’oge a, Milton dere traktị ndị kwadoro ịgba alụkwaghịm, ọ bụghị nanị n’ihi ịkwa iko—bụ́ nanị ihe Jizọs kwuru pụrụ ime ka a gbaa alụkwaghịm—kamakwa na di na nwunye pụrụ ịgba alụkwaghịm ma ọ bụrụ na ihe adabaaraghị ha. (Matiu 19:9) Milton zikwara otu ozizi ahụ n’akwụkwọ ya bụ́ On Christian Doctrine.

N’agbanyeghị ebe ndị Milton mejọrọ, On Christian Doctrine kụziri ihe Bible kwuru n’ọtụtụ ozizi ndị dị mkpa. Ruo taa, nnukwu akwụkwọ ya na-agba ndị na-agụ ya ume iji Akwụkwọ Nsọ na-adịghị ehie ụzọ tụlee nkwenkwe ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 14 Nsụgharị ọhụrụ nke On Christian Doctrine, nke Mahadum Yale bipụtara na 1973, kwekọkwudịrị n’ihe odide mbụ Milton dị na Latin.

[Foto dị na peeji nke 11]

Milton ji ịmụ Bible kpọrọ ihe

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’aka The Early Modern Web n’Oxford

[Foto dị na peeji nke 12]

Akwụkwọ ahụ bụ́ uri bụ́ “Paradise Lost” mere Milton onye a ma ama

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’aka The Early Modern Web n’Oxford

[Foto dị na peeji nke 12]

Akwụkwọ ikpeazụ Milton furu efu ruo otu narị afọ na iri ise

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe osise sitere n’aka Rare Books and Special Collections, Thomas Cooper Library, Mahadum South Carolina

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 11]

Ihe osise sitere n’aka Rare Books and Special Collections, Thomas Cooper Library, Mahadum South Carolina