Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbalị Ibi Ndụ Nwere Nzube

Ịgbalị Ibi Ndụ Nwere Nzube

Ịgbalị Ibi Ndụ Nwere Nzube

“Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Jaa.”—ABỤ ỌMA 150:6.

1. Kọwaa otú otu nwa okorobịa si gbalịa ibi ndụ nwere nzube.

SEUNG JIN, * bụ́ onye nọ na Korea too, kwuru sị: “Agara m mahadum mụọ otú e si agwọ ọrịa n’ihi na achọrọ m inyere ndị mmadụ aka. Echekwara m na oké aha ndị dọkịta na-aza na ego ha na-enweta ga-eme ka m nwee obi ụtọ. Mgbe m chọpụtara na enyemaka ndị mmadụ na-enweta n’aka ndị dọkịta enweghị otú ọ ha ma e jiri ya tụnyere nsogbu ndị mmadụ na-enwe, enwere m nkụda mmụọ. Ihe m meziri bụ ịga mụọ otú e si ese ihe, ma ihe ndị m na-ese enwechaghịkwa uru ọ baara ndị ọzọ, nke a mekwara ka m chewe na m na-eme ihe na-enye nanị m obi ụtọ. Amalitere m ịkụzi nkụzi, ọ dịghịkwa anya mụ achọpụta na ihe m na-eme bụ nanị ịkụziri ndị mmadụ ihe, adịghị m enye ha ụdị nduzi pụrụ ime ka ha nwee obi ụtọ n’ezie.” Seung Jin nọ na-agbalị ịchọta otú ọ ga-esi bie ndụ nwere nzube dị ka ụfọdụ ndị nọkwa na-agbalị ime.

2. (a) Gịnị ka mmadụ inwe nzube ná ndụ pụtara? (b) Olee otú anyị si mara na Onye Okike nwere nzube mere o ji kee anyị n’ụwa a?

2 Ibi ndụ nwere nzube pụtara mmadụ inwe ihe o bu n’uche ime ná ndụ, ya bụ, inwe ihe mgbaru ọsọ doro anya ná ndụ. Ụmụ mmadụ hà pụrụ ibi ndụ nwere nzube n’ezie? Ee! Ọgụgụ isi, akọ na uche na ikike iche echiche Onye Okike nyere anyị gosiri na o nwere nnọọ nzube mere o ji kee anyị n’ụwa a. N’ihi ya, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na anyị pụrụ imezu nzube mere e ji kee anyị nanị ma ọ bụrụ na anyị ebie ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube nke Onye Okike.

3. Gịnị ka nzube Chineke maka ụmụ mmadụ gụnyere?

3 Bible na-egosi na nzube Chineke nwere maka anyị gụnyere ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, ụzọ magburu onwe ya e si kee anyị na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya n’ezie. (Abụ Ọma 40:5; 139:14) N’ihi ya, ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke pụtara ịhụ nnọọ ndị ọzọ n’anya dị ka Chineke hụrụ anyị. (1 Jọn 4:7-11) Ọ pụtakwara ime ihe ndị Chineke nyere anyị n’iwu, bụ́ ndị na-enyere anyị aka ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ya nke na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya.—Eklisiastis 12:13; 1 Jọn 5:3.

4. (a) Gịnị dị anyị mkpa iji bie ndụ nwere nzube n’ezie? (b) Olee ndụ kasị nwee nzube mmadụ pụrụ ibi?

4 Chineke zubekwara ka ụmụ mmadụ na ibe ha na ihe ndị ọzọ nile e kere eke biri n’udo na n’obi ụtọ. (Jenesis 1:26; 2:15) Gịnịzi ka anyị kwesịrị ime iji nwee obi ụtọ na ahụ́ iru ala ma soro ndị ọzọ dịrị n’udo? Dị nnọọ ka ahụ́ na-eru nwatakịrị ala ya enweekwa obi ụtọ ma ọ mara na nne na nna ya nọ ya nso, otú ahụ ka ọ dị mkpa ka anyị na Nna anyị nke eluigwe na-akpachi anya iji bie ndụ nwere nzube n’ezie. (Ndị Hibru 12:9) Chineke mere ka o kwe omume anyị na ya ịdị ná mma site n’ikwe ka anyị na-abịaru ya nso nakwa site n’ịnụ ekpere anyị. (Jems 4:8; 1 Jọn 5:14, 15) Ọ bụrụ na anyị ejiri okwukwe ‘soro Chineke na-eje ije’ ma mete ya enyi, anyị pụrụ ime ka obi Nna anyị nke eluigwe ṅụrịa ma wetara ya otuto. (Jenesis 6:9; Ilu 23:15, 16; Jems 2:23) Nke ahụ bụ ụdị ndụ kasị nwee nzube mmadụ pụrụ ibi. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Jaa.”—Abụ Ọma 150:6.

Gịnị Bụ Nzube Gị ná Ndụ?

5. Gịnị mere na ibute ihe onwunwe ụzọ abaghị uru ọ bụla?

5 Ilekọta onwe anyị na ezinụlọ anyị anya nke ọma so n’ihe Chineke zubere maka anyị. Nke a gụnyere igbo mkpa anụ ahụ́ anyị na ezinụlọ anyị na ịgbalị ime ka mmekọrịta ezinụlọ anyị na Jehova sie ike. Ma anyị ekwesịghị ikwe ka ịchọ otú anyị ga-esi gboo mkpa anụ ahụ́ mee ka anyị leghara ozi Jehova anya. (Matiu 4:4; 6:33) Ọ dị mwute ikwu na ọtụtụ ndị tinyere nnọọ isi kpamkpam n’ịchụ ihe onwunwe. Ma ịchọ igbo mkpa anyị nanị site n’ịchụ ihe onwunwe agaghị abara anyị uru. Otu nchọpụta e mere banyere ndị bụ́ aka ji akụ̀ n’Eshia gosiri na “ahụ́ adịghị eru ọtụtụ n’ime ha ala ọbụna ka ha na-ekpori ndụ ma na-aza oké aha ego ha weteere ha.”—Eklisiastis 5:11.

6. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere banyere ịchụ ihe onwunwe?

6 Jizọs kwuru okwu banyere “ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba.” (Mak 4:19) Olee otú akụ̀ na ụba si dịrị aghụghọ? Ọ na-eme ka o yie ka onye nwere ya ò nwere obi ụtọ, ma nke ahụ bụ ụgha. Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ.” (Eklisiastis 5:10) Ma ọ̀ ga-ekwe omume mmadụ ịchụpagide ihe nke ụwa a ma ka jiri obi ya dum na-ejere Chineke ozi? Ọ gaghị ekwe omume. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leghara nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na nke Akụ̀ na Ụba.” Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha kpadooro onwe ha, ọ bụghị ihe onwunwe nkịtị n’ụwa kama, “akụ̀ n’eluigwe,” ya bụ, ka ha meere onwe ha ezi aha n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye “maara ihe ndị na-akpa [ha] tupurị [ha] arịọ ya.”—Matiu 6:8, 19-25.

7. Olee otú anyị pụrụ isi “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”?

7 Mgbe Pọl onyeozi na-edegara onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti akwụkwọ, o nyere ndụmọdụ gbara ọkpụrụkpụ n’okwu banyere ịchụ ihe onwunwe. Ọ gwara Timoti, sị: “Na-enye ndị bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a iwu . . . ka ha tụkwasịkwa olileanya ha, ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ . . . ka ha na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe, na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Timoti 6:17-19.

Olee Ihe Bụ́ “Ndụ ahụ nke Bụ́ Ndụ n’Ezie”?

8. (a) Gịnị mere ọtụtụ ji adọga ịba ọgaranya na ịbụ ndị a ma ama? (b) Gịnị ka ndị dị otú a na-adịghị aghọta?

8 Ihe na-agbatakarị ọtụtụ ndị n’obi ma ha nụ okwu ahụ bụ́ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” bụ ikpori ndụ. Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’Eshia kwuru, sị: “Ndị na-ekiri fim ma ọ bụ televishọn na-adị na-achọ inweta ihe ndị ha na-ahụ na televishọn, ha na-adị na-arọ nrọ otú ha ga-esi nweta ihe ndị ahụ.” Ọtụtụ ndị na-eme ka nzube ha ná ndụ bụrụ ịba ọgaranya na ịbụ ndị a ma ama. Ọtụtụ ndị na-eji oge ntorobịa ha ha gaara eji mee ihe bara uru na-achụ ihe ndị a. Ha na-etinyekwa ahụ́ ike ha, ezinụlọ ha na mmekọrịta ha na Jehova n’ihe ize ndụ ebe ha na-achụ ihe nke ụwa. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-aghọta na ihe ndị ahụ a na-egosi na fim na televishọn bụ ihe ndị e ji ama “mmụọ nke ụwa”—bụ́ ụdị echiche ọtụtụ ijeri mmadụ bi n’ụwa nwere nke na-akpali ha ime ihe megidere nzube Chineke maka anyị. (1 Ndị Kọrint 2:12; Ndị Efesọs 2:2) Ka a sịkwa ihe mere e ji nwee ọtụtụ ndị na-enweghị obi ụtọ n’ụwa taa!—Ilu 18:11; 23:4, 5.

9. Gịnị ka ụmụ mmadụ na-agaghị emeli, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

9 Oleekwanụ maka ndị ji obi ha dum na-agba mbọ maka ọdịmma nke ndị ọzọ, ndị na-agbalị ikpochapụ agụụ, ọrịa, na ikpe na-ezighị ezi? Ọrụ ọma ha na mgbalị ndị ha ji obi ha na-eme na-abara ndị mmadụ uru. Ma, n’agbanyeghị ọrụ ọma ha nile, ha agaghị agbanweli ụwa ochie a ka ọ ghọọ ebe dị mma a na-emeso mmadụ nile ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan, ọ chọghịkwa ka ụwa ya gbanwee.—1 Jọn 5:19.

10. Olee mgbe ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ga-ebi “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”?

10 Onye olileanya ya bụ nanị n’ụwa a kwesịrị imere ebere! Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ nanị ná ndụ a ka anyị nweworo olileanya na Kraịst, anyị bụ ndị kasị dị imere ebere n’etiti mmadụ nile.” Echiche ndị kweere na ndụ a bụ nanị ndụ dịnụ bụ “ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:19, 32) Ma olileanya dị, a ga-enwe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa [Chineke] si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) N’oge ahụ, Ndị Kraịst ga-ezu okè ma bie “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ya bụ, “ndụ ebighị ebi” n’eluigwe ma ọ bụ n’ọchịchị Alaeze Chineke n’ụwa bụ́ ebe ịhụnanya ga-ejupụta.—1 Timoti 6:12.

11. N’ihi gịnị ka ịgbalịsi ike ịhụ na ihe ndị metụtara Alaeze Chineke na-aga n’ihu ji bụrụ ọrụ nwere nzube?

11 Ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu nile ụmụ mmadụ na-enwe kwụsị kpamkpam. N’ihi ya, ihe kasị mma mmadụ pụrụ ime ná ndụ bụ ịgbalị nnọọ hụ na ihe ndị metụtara Alaeze Chineke na-aga n’ihu. (Jọn 4:34) Ka anyị na-eme nke a, anyị na Nna anyị nke eluigwe na-adị nnọọ ná mma, nke bụ́ ihe ùgwù pụrụ iche. Anyị na-enwekwa ọṅụ nke na-abịa site n’iso ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị, bụ́ ndị na-agbalị ibi otu ụdị ndụ a nwere nzube, na-ejere Jehova ozi.

Ịchụ Ihe Ndị Kwesịrị Ekwesị n’Àjà

12. Gịnị dị iche ná ndụ a na-adị taa na “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”?

12 Bible kwuru na ụwa a “na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya.” Ọ dịghị akụkụ ọ bụla nke ụwa Setan, gụnyere oké aha na akụ̀ na ụba ya, nke ga-afọdụ, “ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:15-17) “Ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ya bụ, ndụ ebighị ebi n’ime Alaeze Chineke, na-adịte aka ma kwesị ihe ọ bụla anyị chụrụ n’àjà maka ya, ọ bụrụhaala na anyị chụrụ ihe ndị kwesịrị ekwesị n’àjà. Ọ dịghị ka akụ̀ na ụba nke ụwa a a na-ejighị n’aka, oké aha ndị mmadụ na-aza, bụ́ ndị a na-echefu ngwa ngwa, nakwa ihe ụtọ nke ụwa a na-adịru nanị nwa oge.

13. Olee otú otu di na nwunye si chụọ ihe kwesịrị ekwesị n’àjà?

13 Tụlee ihe banyere Henry na Suzanne. Ha kwenyesiri ike na Chineke ga-emezu nkwa o kwere na ya ga-enyere ndị nile butere Alaeze ya ụzọ ná ndụ ha aka. (Matiu 6:33) N’ihi ya, ha họọrọ ibi n’ụlọ na-adịghị oké ọnụ ka ha na ụmụ ha abụọ wee nwee ike itinyekwu oge n’ozi Jehova kama ha abụọ ga-arụwa ọrụ ego iji nwee ike ịkwụ ụgwọ ụlọ dị oké ọnụ. (Ndị Hibru 13:15, 16) Otu enyi ha chere na ọ na-emere ha ihe ọma aghọtaghị ihe mere ha ji kpebie ime ihe ha mere. Ọ gwara Suzanne, sị: “Nne, ọ bụrụ na ị chọrọ ibi n’ụlọ mara mma, ị ghaghị ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà.” Ma Henry na Suzanne maara na ibute Jehova ụzọ “nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8; Taịtọs 2:12) Ụmụ ha tolitere ma bụrụ ndị ozi oge nile. Ha nile kweere na ọ dịghị ihe ọ bụla funahụrụ ha; kama nke ahụ, ha ritere uru dị ukwuu n’ihi ime ka nzube ha bụrụ ịgbalị inweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—Ndị Filipaị 3:8; 1 Timoti 6:6-8.

E ‘Jila Ụwa Eme Ihe n’Újú’

14. Olee ọdachi ichefu ihe bụ́ nzube anyị ji na-adị ndụ na-akpata?

14 Ichefu ihe bụ́ ezi nzube anyị ná ndụ ma ghara ijidesi aka ike ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” pụrụ ịkpatara anyị ọdachi. Anyị nwere ike ịbụ ndị “nchegbu na akụ̀ na ụba na ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ na-ebupụ.” (Luk 8:14) Oké ọchịchọ na “nchegbu nke ndụ” pụrụ ime ka mmadụ mikpuo onwe ya n’ihe nke ụwa a. (Luk 21:34) Ọ dị mwute na ụfọdụ anọrọla ebe ha na-achụ ihe nke ụwa a ka a na-anwụ anwụ ‘pụọ n’okwukwe, jirikwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara,’ ọbụna nke a emebiwo mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa ha na Jehova nwere. Nke a bụ nnọọ ọdachi ọjọọ nke ‘ejidesighị aka ike ná ndụ ebighị ahụ’ na-akpata.—1 Timoti 6:9, 10, 12; Ilu 28:20.

15. Olee otú ịghara ‘iji ụwa eme ihe n’újú’ si baara otu ezinụlọ uru?

15 Pọl nyere ndị ji ụwa eme ihe ndụmọdụ ka ha “dị ka ndị na-adịghị eji ya eme ihe n’újú.” (1 Ndị Kọrint 7:31) Keith na Bonnie ṅara ntị ná ndụmọdụ ahụ. Keith na-ekwu, sị: “Aghọrọ m otu n’ime Ndịàmà Jehova obere oge tupu mụ agụchaa akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ebe a na-amụ otú e si agwọ ọrịa ezé. E nwere mkpebi chere m ihu. Enwere m ike ịdị na-anabata ọtụtụ ndị ọrịa ma m chọọ ma nweta ego buru ibu, ma ime nke ahụ ga-ewekọrọ oge anyị kwesịrị iji na-ejere Jehova ozi. Ekpebiri m ịghara ịnabata ọtụtụ ndị ọrịa ka m wee nwee ike inwekwu ohere maka ozi Jehova, nweekwa ike ịdị na-anọnyere ezinụlọ m, nke gụnyere ụmụ m nwanyị ise. Ọ bụ eziokwu na ego anyị nwere ebuchaghị ibu, anyị mụtara iwelata aka n’otú anyị si azụ ihe, anyị na-enwetakwa nnọọ ihe ndị dị anyị mkpa. Anyị nwere nnọọ ọṅụ na obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. Anyị nile mechara banye n’ozi oge nile. Ugbu a, ụmụ anyị nwanyị na ndị di ha na-ebi nnọọ n’udo, atọ n’ime ha nwekwara ụmụ nke ha. Ezinụlọ ha nwekwara obi ụtọ ka ha nọgidere na-ebute nzube Jehova ụzọ.”

Ibute Nzube Chineke Ụzọ ná Ndụ Gị

16, 17. Ihe atụ ndị dị aṅaa nke ndị nwere nkà ka a kọwara na Bible, gịnịkwa ka e ji echeta ha?

16 Na Bible, e nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị biri ndụ kwekọrọ ná nzube Chineke nakwa ndị na-emeghị otú ahụ. Ihe atụ ndị a na-akụziri ndị nọ n’ebe dị iche iche, na n’ọnọdụ dị iche iche ihe ma ndị agadi ma ndị na-eto eto. (Ndị Rom 15:4; 1 Ndị Kọrint 10:6, 11) Nimrọd wuru ọtụtụ obodo ukwu, ma ihe o bu n’obi wuo ha megidere nzube Jehova. (Jenesis 10:8, 9) E wezụga ihe atụ ndị yiri nke a, ọtụtụ ndị ọzọ setịpụrụ ezi ihe nlereanya. Dị ka ihe atụ, Mozis emeghị ka nzube ya ná ndụ bụrụ ịnọgide bụrụ onye a ma ama n’Ijipt. Kama nke ahụ, o ji mmekọrịta ya na Chineke kpọrọ ihe “dị ka akụ̀ dị ukwuu karịa akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt.” (Ndị Hibru 11:26) Eleghị anya onye dọkịta bụ́ Luk gwọrọ Pọl na ndị ọzọ ọrịa ha dị iche iche. Ma ebe Luk rụrụ ọrụ kasị mkpa bụ n’ikwusa ozi ọma na n’ide Bible. A maara Pọl nke ọma dị ka “onyeozi nye ndị mba ọzọ” ọ bụghị dị ka ọkàiwu.—Ndị Rom 11:13.

17 Ihe bụ́ isi e ji echeta Devid bụ na ọ bụ “nwoke dị ka obi [Chineke] si chọọ” ọ bụghị dị ka ọchịagha ma ọ bụ ọkpọ ụbọ. (1 Samuel 13:14) Ihe anyị ji mara Daniel bụ na ọ bụ onye amụma ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi, ọ bụghị n’ihi ọrụ ọ rụrụ n’obí eze Babilọn; A maara Esta dị ka onye setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke iji obi ike na okwukwe mee ihe ọ bụghị dị ka nwunye eze Pesia; A makwaara Pita, Andru, Jems, na Jọn dị ka ndịozi Jizọs ọ bụghị dị ka ndị bụ́ aka ochie n’ịkụ azụ. Oleekwanụ maka Jizọs, bụ́ onye setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma? A maara ya dị ka “Kraịst ahụ” ọ bụghị dị ka “ọkwá nkà ahụ.” (Mak 6:3; Matiu 16:16) Ndị a nile maara nke ọma na n’agbanyeghị ihe ịga nke ọma na ọrụ aka ha na ọkwá ha nwere n’ụwa, ihe kasị mma ha ga-eji ndụ ha mee bụ iji ya na-ejere Chineke ozi, ọ bụghị ịgbalị ịbụ ndị a ma ama n’ụwa a. Ha maara na nzube kasị mma na nke kasị enye afọ ojuju ha pụrụ inwe bụ ịbụ ndị ikom na ndị inyom na-atụ egwu Chineke.

18. Olee ihe otu nwa okorobịa bụ́ Onye Kraịst kpebiri iji ndụ ya mee, gịnị ka o mesịrị ghọta?

18 Seung Jin, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite, mesịrị ghọta nke a. O kwuru, sị: “Kama itinye ume m nile n’ịgwọ ọrịa, n’ise ihe, ma ọ bụ n’ịkụzi nkụzi, ekpebiri m ibi ndụ kwekọrọ ná nrara m raara onwe m nye Chineke. Ana m eje ozi ugbu a n’ebe a chọsiri ndị ga na-akụzi Bible ike iji nyere ndị mmadụ aka ịbanye n’ụzọ ahụ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi. M na-echebu na ịbụ onye ozi oge nile abụghị ọrụ siri ike. Ma ugbu a, ọ dịghịịrị m mfe ma ọlị ka m na-agbalị imezi àgwà m na iso ndị sitere n’ebe dị iche iche na-emekọ ihe. Achọpụtala m na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Jehova bụ nanị ndụ kasị mma.”

19. Olee otú anyị pụrụ isi bie ndụ nwere nzube n’ezie?

19 E nyela anyị bụ́ Ndị Kraịst ihe ọmụma na-azọpụta ndụ, meekwa ka anyị nwee olileanya na a ga-azọpụta anyị. (Jọn 17:3) N’ihi ya, ka anyị ghara “ịnara obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke ma nzube ya efunahụ [anyị].” (2 Ndị Kọrint 6:1) Kama nke ahụ, ka anyị jiri ndụ anyị dị oké ọnụ ahịa na-eto Jehova. Ka anyị kụziere ndị mmadụ ihe ọmụma ahụ nke na-eweta ezi obi ụtọ ugbu a ma na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị ga-achọpụta na ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Anyị ga-achọpụtakwa na ndụ anyị na-ebi bụ nke nwere nzube n’ezie.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 1 A gbanweela aha ụfọdụ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị bụ nzube kasị mma anyị pụrụ inwe ná ndụ?

• Gịnị mere ịchụpagide ihe onwunwe ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya?

• Gịnị bụ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” nke Chineke kwere ná nkwa?

• Olee otú anyị pụrụ isi jiri ndụ anyị na-emezu nzube Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ndị Kraịst kwesịrị ịchụ ihe ndị kwesịrị ekwesị n’àjà