Ụmụnne Nwanyị Abụọ Obi Na-adịghị Mma “Wuru Ụlọ Izrel”
Ụmụnne Nwanyị Abụọ Obi Na-adịghị Mma “Wuru Ụlọ Izrel”
KA CHI na-abọ, Lia maara na ọ gaghị adị anya a chọpụta ihe merenụ. Jekọb, bụ́ onye o dina n’akụkụ ya, ga-amata na onye ya na ya dinara abụghị Rechel, bụ́ nwanne nwanyị Lia nke obere. Lia mere ihe nna ya gwara ya mee, ikekwe o kpuchiri ihu ya nke ọma ma gaa dinaa n’ihe ndina e doweere Jekọb na Rechel.
Chegodị otú obi ga-adị Jekọb mgbe ọ chọpụtara ihe merenụ ka chi bọrọ! N’iwe, ya na Leban, bụ́ nna Lia, bara mba. Ka ihe a na-eme, ọ ghaghị ịbụ na Lia chesiri echiche ike banyere otú o si soro ghọgbuo Jekọb na ihe ga-esi na ya pụta n’ikpeazụ. Akụkọ banyere Lia na Rechel so n’akụkọ ndị mere eme dị mkpa e dekọrọ na Bible. O nyekwaara anyị aka ịghọta amamihe dị na nwoke ịlụ otu nwanyị nakwa di ma ọ bụ nwunye ịghara ịgba n’èzí.
Onye Ọbịa A Hụrụ n’Akụkụ Olulu Mmiri
Afọ asaa tupu ihe a emee, Rechel gbaara ọsọ otu ụbọchị bịa gwa nna ya na ya hụrụ otu nwoke sị na ya bụ onye ikwu ha n’akụkụ otu olulu mmiri. Ọ bịara bụrụ na onye ahụ bụ Jekọb, nwa nwanne nwanyị papa Rechel, ọ bụkwa onye na-efe Jehova. Ka otu ọnwa gasịrị, Jekọb rịọrọ ka ya jeere Leban ozi afọ asaa iji lụọ Rechel. Mgbe Leban hụrụ otú nwa nwanne ya a si dị ike ọrụ, marakwa na ndị obodo ha adịghị ele mmadụ ịlụ onye ikwu ya anya dị ka ajọ ihe, o kwetara ka Jekọb mee ihe o kwuru.—Jenesis 29:1-19.
Ịhụnanya Jekọb nwere n’ebe Rechel nọ abụghị nke elu ọnụ. Afọ asaa ahụ o ji jeere Leban ozi ka o wee nwee ike ịlụ Rechel dị ya “ka ụbọchị ole na ole, n’ihi ịhụnanya o ji hụ ya.” (Jenesis 29:20) Na Jekọb hụgidere Rechel n’anya ruo mgbe Rechel nwụrụ na-egosi na ọ ga-abụrịrị na Rechel nwere ọtụtụ àgwà ọma.
Lia ò bu n’obi ịlụ onye ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova? Bible ekwughị. Ihe Bible mere ka o doo anya bụ ihe Leban chere mere Lia ga-eji buru ụzọ lụọ di. Mgbe afọ asaa Jekọb ga-eji lụọ Rechel ruru, Leban meere ha oriri agbamakwụkwọ. Bible na-agwa anyị na mgbe o ruru anyasị, Leban kuuru Lia nwa ya, mee ka ọ bakuru Jekọb; Jekọb “wee bakuru ya.”—Jenesis 29:23.
Ọ̀ bụ Lia kpara nkata a ka a ghọgbuo Jekọb? Ka ọ̀ bụ nanị na o mere ihe nna ya sịrị ya mee? Oleekwanụ ebe Rechel nọ mgbe ihe a na-eme? Ọ̀ maara ihe na-aganụ? Ọ bụrụ na ọ maara, olee ihe o chere banyere ya? Nna ya ọ̀ dị aka ike nke na ọ gaghị anwa anwa rụọ ya ụka? Bible azaghị nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a. Ihe ọ sọkwara Rechel na Lia ha chee banyere okwu a, nke bụ́ isiokwu bụ na nkata aghụghọ ahụ were Jekọb ezigbo iwe. Ọ bụkwa Leban, ọ bụghị ụmụ ya, ka Jekọb wesara iwe, sị: “Ọ̀ bụghị n’ihi Rechel ka m fere ofufe n’aka gị? N’ihi gịnịkwa ka ị ghọgburu m?” Gịnị ka Leban kwuru? “Adịghị eme otú a Jenesis 29:25-27) Ọ bụ otú a ka e si ranye Jekọb ịlụ ụmụ nwanyị abụọ, bụ́kwanụ nke mesịrị kpata ekworo dị ukwuu n’ezinụlọ ya.
n’ebe nke anyị, inye nke nta tupu enye nke okenye. Debezuo abalị asaa nke nwanyị a, ma anyị ga-enyekwa gị nwanyị a n’ihi ofufe ị ga-efekwa ọzọ n’aka m afọ asaa ọzọ.” (Ezinụlọ Na-enweghị Obi Ụtọ
Jekọb hụrụ Rechel n’anya. Mgbe Chineke hụrụ na Lia bụ “onye a na-akpọ asị,” o meghere akpa nwa ya, ma Rechel nọ na-amụtaghị nwa. Ma ọ bụghị nanị ịmụta nwa ka Lia chọrọ; ọ chọrọ ka Jekọb hụ ya n’anya. Mgbe ọ hụrụ na ọ bụ nanị Rechel ka Jekọb hụrụ n’anya, iwe juru ya obi. N’agbanyeghị nke ahụ, Lia nwere olileanya na Jekọb ga-ahụ ya n’anya ebe ọ bụ ya mụụrụ ya nwa nwoke mbụ, bụ́ Reuben, nke pụtara “Lee, nwa Nwoke!” Lia nwere ihe mere o ji gụọ nwa ya a aha ahụ. Ọ sịrị: “N’ihi na Jehova elekwasịwo mweda n’ala m anya; n’ihi na ugbu a di m ga-ahụ m n’anya.” Ma Jekọb amaliteghị ịhụ ya n’anya; ọ hụwaghịkwa ya n’anya ọbụna mgbe ọ mụụrụ ya nwa nwoke ọzọ. Lia gụrụ nwa nke abụọ a Simiọn, nke pụtara “Ịnụ.” Ihe o kwuru mere o ji gụọ ya aha a bụ: “N’ihi na Jehova anụwo na onye a na-akpọ asị ka m bụ, n’ihi ya ka O nyekwara m nke a.”—Jenesis 29:30-33.
Na Chineke nụrụ gosiri na Lia kpere ekpere banyere nsogbu ya. O yiri ka ọ bụ nwanyị nwere okwukwe. Ma nsogbu ya nọgidere ọbụna mgbe o mụrụ nwa nwoke nke atọ, bụ́ Livaị. Aha ya, nke pụtara “Ịrapara,” ma ọ bụ “Ịnyakọta,” bụ nke e ji ihe a Lia kwuru kọwaa: “Ugbu a na mgbe a ka di m ga-arapara n’ahụ́ m, n’ihi na amụworo m ya ụmụ ndị ikom atọ.” O doro anya na nwa nke atọ a emeghị ka Jekọb malite ịhụ ya n’anya. Ikekwe Lia weziirị ụwa ya otú o si hụ ya, n’ihi na mgbe ọ mụrụ nwa nwoke nke anọ, aha ọ gụrụ ya egosighịzi na ọ ka na-atụ anya ka Jekọb malite ịhụ ya n’anya. Kama, Juda bụ́ aha ọ gụrụ nwa ya ahụ, bụ iji gosi ekele o nwere n’ebe Chineke nọ. Aha ahụ bụ́ “Juda” pụtara “Ekele,” ma ọ bụ “Ihe E Kwesịrị Iji Maka Ya Nye Ekele.” Nanị ihe Lia kwuru, bụ: “Na mgbe a ka m ga-ekele Jehova.”—Jenesis 29:34, 35.
Ọ bụrụ na obi adịghị Lia mma, obi adịkwughị Rechel mma. Ọ rịọrọ Jekọb arịrịọ, sị: “Nye m ụmụ, ma ọ bụrụ na i nyeghị m, onye nwụrụ anwụ ka m bụ.” (Jenesis 30:1) Rechel maara na Jekọb hụrụ ya n’anya, ma ọ chọrọ ịmụta ụmụ. Lia mụtara ụmụ, ma ọ chọrọ ka a hụ ya n’anya. Onye nke ọ bụla na-achọ inweta ihe ibe ya nwere, ọ dịghịkwa onye n’ime ha abụọ nwere obi ụtọ. Ha abụọ hụrụ Jekọb n’anya, chọọkwa ịmụrụ ya ụmụ. Onye nke ọ bụla na-ekwoso nwanne ya ekworo. Nke a bụ nnọọ nnukwu nsogbu n’ezinụlọ ahụ!
Ụmụ Rechel
N’oge ahụ, a na-ele amụghị nwa anya dị ka ajọ ihe. Chineke kwere Ebreham, Aịzik, na Jekọb nkwa na ọ bụ n’ezinụlọ ha ka a ga-esi nweta “mkpụrụ” nke agbụrụ nile nke ụwa ga-esi n’aka ya gọzie onwe ha. (Jenesis 26:4; 28:14) Ma Rechel amụtabeghị nwa. Jekọb gwara Rechel na ọ bụ nanị Chineke nwere ike inye ya ụmụ, nke ga-eme ka o soro ná ndị a ga-esi n’aka ha gọzie agbụrụ nile nke ụwa. Ma Rechel enweghị ndidi. Ọ gwara Jekọb, sị: “Lee, ohu m nwanyị Bilha, bakuru ya; ka o wee mụọ nwa n’ikpere m abụọ, ewee sitekwa na ya wulie m elu dị ka ụlọ, ọbụna mụ onwe m.”—Jenesis 30:2, 3.
Ihe a Rechel kwuru nwere ike isiri anyị ike nghọta. Ma, akwụkwọ ndị a chọtara na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, bụ́ akwụkwọ ndị e ji dekọọ ihe ndị lụrụ di na nwunye n’oge ochie kwekọrịtara, na-egosi na ọ bụ omenala ndị oge ahụ na nwanyị na-amụtaghị nwa nwere ike ịkpọnye di ya nwanyị na-ejere ya ozi ka ọ mụtara ya nwa. * (Jenesis 16:1-3) N’ọnọdụ ụfọdụ, a na-ewerezi na ụmụ ohu nwanyị ahụ mụtara bụ ụmụ nne ya ukwu.
Mgbe Bilha mụtara nwa nwoke, Rechel ji obi ụtọ kwuo, sị: “Chineke ekpepụtawo m, ọzọkwa, Ọ nụwo olu m, wee nye m nwa nwoke.” Ọ gụrụ nwa ahụ Dan, nke pụtara “Onye ikpe.” Nke a gosiri na Rechel kpekwara ekpere banyere nsogbu ya. Mgbe Bilha mụrụ nwa nwoke nke abụọ bụ́ Naftalaị, nke pụtara “Mgba M,” Rechel kwuru, sị: “Mgba Chineke ka mụ na nwanne m nwanyị gbaworo, enwewokwa m ike.” Aha ndị a na-egosi esemokwu dị n’etiti ya na nwanne ya nwanyị.—Jenesis 30:5-8.
Ikekwe mgbe Rechel nyere Jekọb nwanyị na-ejere ya ozi bụ́ Bilha, o chere na nke a bụ ụzọ Chineke ga-esi nye ya nwa, ma ihe a abụghị
ụzọ Chineke chọrọ isi nye ya nwa. E nwere ihe anyị ga-esi na nke a mụta. Anyị ekwesịghị ịkwụsị inwe ndidi mgbe anyị rịọrọ Jehova ihe. O nwere ike ịza anyị ekpere n’ụzọ ndị anyị na-atụghị anya ya na mgbe anyị na-atụghị anya ya.Lia achọghị ka nwanne ya nwanyị karịa ya, n’ihi ya kwa, ọ kpọọrọ nwanyị na-ejere ya ozi bụ́ Zilpa kpọnye Jekọb. Zilpa wee mụta Gad, mesịakwa mụta Asha.—Jenesis 30:9-13.
Otu ihe mere n’ezinụlọ ahụ nke mere ka o doo nnọọ anya na Rechel na Lia nwanne ya na-ese okwu bụ ihe banyere mandrake nwa Lia bụ́ Reuben chọtara. E weere na mkpụrụ osisi a na-enyere mmadụ aka ịtụrụ ime. Mgbe Rechel rịọrọ Lia ka o nyetụ ya mandrake ahụ, Lia ji obi ilu zaa ya, sị: “Ọ̀ bụ okwu nta na ị narawo m di m? Ị̀ ga-anarakwa m mandrake nwa m?” Ụfọdụ ndị na-aghọta ihe a o kwuru igosi na ọ bụ Jekọb na Rechel na-edinakarị karịa ka ya na Lia na-edina. Eleghị anya, Rechel hụrụ eziokwu dị n’ihe Lia kwuru, n’ihi na ọ zara, sị: “N’ihi nke a, gị na ya ga-edina n’abalị a n’ihi mandrake nwa gị.” Mgbe Jekọb lọtara n’uhuruchi ụbọchị ahụ, Lia gwara ya, sị: “Mụ ka ị ga-abakute; n’ihi na achịrịwo m mandrake nwa m goro gị n’ezie.”—Jenesis 30:15, 16.
Lia mesịrị mụọ nwa nwoke nke ise bụ́ Isaka na nke isii bụ́ Zebulọn. Mgbe ọ mụsịrị nke isii a, o kwuo, sị: “Mgbe a di m ga-ebinyere m, n’ihi na amụworo m ya ụmụ ndị ikom isii.” *—Jenesis 30:17-20.
Mandrake ahụ emeghị ka Rechel mụta nwa. N’ikpeazụ, ka ọ gasịrị afọ isii ọ lụrụ di, ọ tụụrụ ime mụọ Josef, n’ihi na Jehova “chetara” ya ma zaa ekpere ya. Ọ bụzi oge ahụ ka Rechel nwere ike ikwu, sị: “Chineke ekpochapụwo ịta ụta m.”—Jenesis 30:22-24.
Ọnwụ na Ihe Nketa
Rechel nwụrụ mgbe ọ na-amụ nwa ya nwoke nke abụọ bụ́ Benjamin. Jekọb hụrụ Rechel n’anya n’eziokwu, o jighịkwa ụmụ ya abụọ ahụ egwuri egwu. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, mgbe ọnwụ Jekọb na-eru nso, o chetara ọnwụ nwunye ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Rechel nwụchuru. (Jenesis 30:1; 35:16-19; 48:7) Bible ekwughị ihe ọ bụla banyere ọnwụ Lia. Nanị ihe anyị maara bụ na Jekọb liri ya n’ili ebe ọ chọrọ ka e lie ya onwe ya.—Jenesis 49:29-32.
Mgbe Jekọb kara nká, o kwuru na ndụ ya jupụtara ná nsogbu—nke gụnyere nsogbu ezinụlọ ndị o nwere. (Jenesis 47:9) Obi abụọ adịghị ya na ndụ adịghịkwa Lia na Rechel ụtọ. Akụkọ ha na-eme ka anyị ghọta nsogbu na-esi n’ịlụ ọtụtụ nwanyị apụta ma gosikwa ihe mere Jehova ji kwuo na nwoke kwesịrị ịlụ nanị otu nwanyị. (Matiu 19:4-8; 1 Timoti 3:2, 12) Ekworo na-amalite mgbe di ma ọ bụ nwunye malitere ịgba n’èzí. Nke a bụ otu n’ime ihe mere Chineke ji nye iwu ka a ghara ịkwa iko nakwa ka inwe mmekọahụ dịrị nanị n’etiti ndị bụ́ di na nwunye.—1 Ndị Kọrint 6:18; Ndị Hibru 13:4.
Otú o sina dị, Chineke nọgidere—ma ka nọgidekwa—na-emezu nzube ya—na-eji ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ekwesị ntụkwasị obi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị na-emezu ya. Ụmụnne abụọ ahụ nwere ebe ndị ha nwere ntụpọ dịkwa ka anyị onwe anyị. Ma ọ bụ site n’aka ụmụ nwanyị abụọ a ka Jehova si malite imezu nkwa ahụ o kwere Ebreham. Ọ dabara nnọọ adaba na e kwuru na ọ bụ Rechel na Lia “wuru ụlọ Izrel.”—Rut 4:11.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]
^ par. 15 Otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ e nwetara n’obodo Nuzi, dị n’Iraq, na-agụ, sị: “Kelim-ninu abụrụla nwunye Shennima. . . . Ọ bụrụ na Kelim-ninu amụtaghị [ụmụ], Kelim-ninu ga-achọta nwanyị [ohu nwanyị] si n’obodo Lullu ka ọ bụrụ nwunye Shennima.”
^ par. 20 Daịna, bụ́kwa nwa ọzọ Lia mụrụ, bụ nanị nwa nwanyị Jekọb anyị maara aha ya.—Jenesis 30:21; 46:7.
[Foto dị na peeji nke 9]
Lia chọrọ inweta ihe Rechel nwere, ebe Rechel chọrọ inweta nke Lia nwere, ọ dịghịkwa onye n’ime ha nwere obi ụtọ
[Foto dị na peeji nke 10]
Ọ bụ site n’ụmụ nwoke iri na abụọ Jekọb ka e si nweta mba Izrel