Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ò nwere ihe dị njọ na Jekọb mere ka à ga-asị na ya bụ Isọ, dị ka e dekọrọ ya na Jenesis 27:18, 19?

E nwere ike ị maara akụkọ a nke ọma. Mgbe Aịzik mere agadi, ọ gwara Isọ ka ọ gaa gbutere ya anụ mgbada ka o rie. Ọ sịrị ya: “Ka m wee rie; ka mkpụrụ obi m wee gọzie gị tupu mụ anwụọ.” Ribeka nụrụ ihe di ya kwuru ma gaa sie nri dị nnọọ ụtọ ma gwa Jekọb, sị: “Ị ga-ebugakwara nna gị, ka o wee rie, ka o wee gọzie gị tupu ọnwụ ya.” Jekọb yiziiri uwe Isọ, e jirikwa akpụkpọ ụmụ ewu fụchie ya olu na aka tupu ya ebugara nna ya nri ahụ dị ụtọ. Mgbe Aịzik jụrụ ya sị, “Ònye ka ị bụ, nwa m?” Jekọb zara ya, sị: “Mụ onwe m bụ Isọ ọkpara gị.” Aịzik kwetara ihe a ọ gwara ya ma gọzie ya.—Jenesis 27:1-29.

Bible agwaghị anyị ihe nile mere Ribeka na Jekọb ji mee ihe ha mere, ma ihe Bible kọọrọ anyị bụ na ha adịghị mbụ kpaa ihe a ha mere akpaa. Anyị kwesịrị iburu n’uche na Okwu Chineke ekwughị ma ihe Ribeka na Jekọb mere ọ̀ dị mma ma ọ dị njọ, n’ihi ya ihe ndekọ a adịghị egosi na ịgha ụgha na ịghọgbu mmadụ dị mma. Otú ọ dị, Bible kọwakwuru ihe ndị ọzọ mere ihe ahụ ji mee.

Nke mbụ, akụkọ ahụ na-egosi nnọọ na ọ bụ Jekọb ka Aịzik kwesịrị ịgọzi, ọ bụghị Isọ. Jekọb adịla mbụ zụrụ ọnọdụ di ọkpara ahụ n’aka ejima ya na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, bụ́ onye rere ya n’ihi otu efere nri iji gboo agụụ ji ya. Isọ ‘ledara ọnọdụ ọkpara ya anya.’ (Jenesis 25:29-34) N’ihi ya mgbe Jekọb gara ka papa ya gọzie ya, ngọzi ahụ ọ gara ịnara bụ nke ya.

Nke abụọ, mgbe Aịzik chọpụtara na ọ bụ Jekọb ka ya gọziri, ọ gaghị kwughariwa ihe ndị ahụ o kwuru. Eleghị anya, o chetara ihe Jehova gwara Ribeka tupu amụọ ụmụ ejima ahụ: “Nke okenye ga-efe nke nta.” (Jenesis 25:23) E kwesịkwara icheta na mgbe Jekọb na-achọ ịga Heran, Aịzik gọzikwuru ya n’elu nke ọ gọzirila ya agọzi.—Jenesis 28:1-4.

N’ikpeazụ, anyị kwesịrị icheta na Jehova maara ihe a nile na-emenụ. E nwere ihe jikọrọ ngọzi ahụ Aịzik gọziri Jekọb na nkwa Chineke kwere Ebreham. (Jenesis 12:2, 3) A sị na Chineke achọghị ka a gọzie Jekọb, ọ gaara ama otú ọ ga-esi bata n’okwu ahụ. Kama nke ahụ, Jehova mesikwuru Jekọb obi ike, sị: ‘A ga-agọzikwa agbụrụ nile nke elu ụwa n’ime mkpụrụ gị.’—Jenesis 28:10-15.