Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Gịnị Bụ Eziokwu?”

“Gịnị Bụ Eziokwu?”

“Gịnị Bụ Eziokwu?”

ONYE ọchịchị ndị Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet ji ịkwa emo jụọ Jizọs ajụjụ ahụ. Ọ chọghịdị ịma ihe bụ́ azịza nke ajụjụ ahụ, Jizọs azaghịkwanụ ya. Eleghị anya Paịlet lere eziokwu anya dị ka ihe a na-apụghị ịghọtacha aghọtacha.—Jọn 18:38.

Ọtụtụ ndị taa, tinyere ndị ndú okpukpe, ndị nkụzi na ndị ọchịchị na-ewerekwa eziokwu dị ka ihe a na-apụghị ịghọtacha aghọtacha. Ha kweere na ọ dịghị ihe a pụrụ ịkpọ aha kpọmkwem na ọ bụ ya bụ eziokwu—karịsịa mgbe a bịara n’ihe banyere omume na ihe ndị metụtara ofufe Chineke—ha kwekwara na eziokwu na-agbanwe agbanwe. N’eziokwu, nke a na-apụta na ndị mmadụ nwere ike ikpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. (Aịsaịa 5:20, 21) Ọ na-apụtakwa na ndị mmadụ kwesịrị iwere eziokwu dị ka ụkpụrụ na-abaghịzi uru, na nke bụ́ maka ọgbọ ndị gara aga.

O kwesịrị nnọọ ekwesị ka anyị ghọta ihe mere Paịlet ji jụọ ajụjụ ahụ. Jizọs bu ụzọ kwuo, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e jiworo mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Jizọs eleghị eziokwu anya dị ka ihe dị mgbagwoju anya nke a na-apụghị ịghọta aghọta. O kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:32.

Ebee ka e nwere ike ịchọta eziokwu dị otú ahụ? N’otu oge, Jizọs gwara Chineke n’ekpere, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Bible, bụ́ nke e dere site ná nduzi Chineke, mere ka a mara eziokwu nke na-enye nduzi a pụrụ ịdabere na ya nakwa ezi olileanya maka ọdịnihu, ya bụ, ndụ ebighị ebi.—2 Timoti 3:15-17.

Paịlet enwetụghịdị mmasị iji ohere a o nwere mụta eziokwu dị otú ahụ. Gịnịkwanụ banyere gị? Jụọnụ Ndịàmà Jehova ihe “eziokwu ahụ” Jizọs kwuru okwu ya bụ. Ha ga-enwe obi ụtọ ịkụziri gị eziokwu ahụ.