Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nzube Chineke Taa

Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nzube Chineke Taa

Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nzube Chineke Taa

“[Kraịst] nwụkwara maka mmadụ nile ka ndị dị ndụ wee ghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe ha.”—2 NDỊ KỌRINT 5:15.

1. Kọọ ahụmahụ otu onye ozi ala ọzọ nwere n’ebe ọ na-eje ozi.

AARON, bụ́ onye ozi ala ọzọ, na-ekwu, sị: “Ụgbọala anyị bụ ụgbọala mbụ na-abụghị nke ndị agha batara n’otu ime obodo dị n’Africa mgbe agha obodo a lụrụ n’ebe ahụ biri. * “Anyị enwelighị ike izigara obere ọgbakọ dị n’ebe ahụ ozi, ọ dịkwa mkpa na anyị ga-ahụ maka mkpa ụmụnna anyị ndị nọ n’ebe ahụ. E wezụga nri, uwe, na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible anyị ji gaa, anyị wetakwara vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. * Ọtụtụ ndị nwere mmasị gbakọtara n’otu ụlọ akịrịka buru ibu, bụ́ ebe e debere televishọn na vidio, ịbịa kirie vidio ahụ anyị ji bịa. N’ihi ọtụtụ mmadụ bịaranụ, anyị gosiri ya ugboro abụọ. Anyị malitere ịmụrụ ọtụtụ ndị Bible mgbe e kirisịrị vidio ahụ. N’ezie, mbọ nile anyị gbara rụpụtara ezi ihe.”

2. (a) Gịnị mere Ndị Kraịst ji ekpebi iji ndụ ha ejere Chineke ozi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle ugbu a?

2 Gịnị mere Aaron na ndị ya na ha na-ejekọ ozi ji kwere ịrụ ọrụ dị otú ahụ tara akpụ? Ọ bụ n’ihi na ha raara ndụ ha nye Chineke ma chọọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke n’ihi ekele ha nwere maka àjà mgbapụta Jizọs Kraịst. Dị ka ha mere, Ndị Kraịst nile raara onwe ha nye ekpebiwo ịghara “ịdị ndụ ọzọ maka onwe ha” kama ha na-eme ihe nile ha nwere ike ime “n’ihi ozi ọma” ahụ. (2 Ndị Kọrint 5:15; 1 Ndị Kọrint 9:23) Ha maara na mgbe usoro ihe ochie a ga-abịa ná njedebe, ego nile na oké aha nile nke ụwa a agaghị aba uru ọ bụla. N’ihi ya ha chọrọ iji ndụ ha na ahụ́ ike ha mee ihe kwekọrọ ná nzube Chineke. (Eklisiastis 12:1) Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe kwekọrọ ná nzube Chineke? Gịnị ga-enyere anyị aka ịkata obi iji mee nke a? Oleekwa ihe ùgwù ije ozi ndị anyị pụrụ ịbanye na ha?

Ịmalite nke Nta nke Nta

3. Olee ihe ndị bụ́ isi anyị kwesịrị ime iji mee uche Chineke?

3 Ndị Kraịst ghọtara na ha ga-anọgide na-eme uche Chineke ná ndụ ha nile. A na-amalitekari ime nke a site n’idebanye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ịgụ Bible kwa ụbọchị, iso na-aga ozi ọma, na inwe ọganihu ruo n’ime baptizim. Ka anyị na-enwe ọganihu, anyị na-echeta ihe Pọl onyeozi kwuru, sị: “Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè nye mmadụ nile.” (1 Timoti 4:15) Ọganihu dị otú a abụghị iji wetara onwe anyị otuto kama ọ na-egosi na anyị kpebisiri ike ime uche Chineke n’ebuteghị ọdịmma onwe anyị ụzọ. Ime nke a na-egosi na anyị na-ekwe ka Chineke na-eduzi nzọụkwụ anyị n’ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ, ọ na-emekwa nke a n’ụzọ ka nnọọ mma karịa ka anyị pụrụ ime.—Abụ Ọma 32:8.

4. Olee otú anyị pụrụ isi kwụsị ịtụ ụjọ na-enweghị isi?

4 Inwe obi abụọ ma ọ bụ imetere onwe anyị ebere gabiga okè pụrụ igbochi anyị inwe ọganihu n’ozi Chineke. (Eklisiastis 11:4) N’ihi ya, tupu ijere Chineke na ndị ọzọ ozi enwee ike inye anyị ọṅụ, anyị aghaghị ibu ụzọ kwụsị ịtụ ụjọ. Dị ka ihe atụ, Erik nọ na-atụle ma ọ̀ ga-enwe ike ije ozi n’ọgbakọ ebe a na-asụ asụsụ dị iche na nke ya. Ma ọ nọ na-eche, sị: ‘Ụmụnna ndị nọ n’ebe ahụ hà ga-anabata m? M̀ ga-enwe mmasị n’ebe ha nọ? Hà ga-enwe mmasị n’ebe m nọ?’ Ọ kọrọ, sị: “Emesịrị m chọpụta na ọ bụ ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ka ọ ka mkpa ka m na-eche banyere ha ọ bụghị onwe m. Ekpebiziri m ịkwụsị ichegbu onwe m kama lekwasị anya n’ihe m nwere ike imere ndị ọzọ. Ekpegaara m Jehova ekpere ka o nyere m aka, ma gawa. Ugbu a, ozi m na-atọzi m ụtọ nke ukwuu.” (Ndị Rom 4:20) Ee, ókè anyị jiruru obi anyị na-ejere Chineke na ndị ọzọ ozi, otú ahụ ka anyị na-enwetaru obi ụtọ.

5. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị jiri nlezianya hazie ihe ndị anyị na-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe kwekọrọ ná nzube Chineke? Nye ihe atụ.

5 Iji nwee ihe ịga nke ọma n’ibi ndụ kwekọrọ ná nzube Chineke, anyị aghaghị ikowe akpa anyị ebe aka anyị ga-eru. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ma anyị zere ịbanye n’oké ụgwọ bụ́ nke ga-eme ka anyị bụrụ ohu ụwa ochie a ma mee ka anyị ghara inwe ohere ijere Chineke ozi. Bible na-echetara anyị, sị: “Ohu ka onye na-ebiri ego bụụrụ onye mbinye.” (Ilu 22:7) Ịtụkwasị Jehova obi na ibute ihe ndị metụtara ozi ya ụzọ na-enyere anyị aka idebe ihe ọ bụla n’ọnọdụ ya. Dị ka ihe atụ, Guoming na ụmụnne ya ndị nwanyị abụọ na mama ha bi n’ógbè ebe ụlọ obibi dị oké ọnụ, o sikwara ike ịchọta ọrụ n’ebe ahụ. Site n’ịghara imefusi ego na ịgbakọ aka na-akwụ ụgwọ ihe ụfọdụ, enweghị mgbe ihe ndị dị ha mkpa na-akọ ha ọbụna mgbe ọ na-abụghị ha nile na-arụ ọrụ. Guoming kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ bụghị anyị nile na-akpata ego. Ma anyị nọgidere n’ozi ọsụ ụzọ anyị, ma n’otu oge ahụ lekọtakwa mama anyị nke ọma. Obi dị anyị ụtọ na mama anyị achọghị ka anyị kwụsị ozi anyị na-ejere Jehova iji kpatara ya ihe ọ ga-eji na-ebi ndụ ọgaranya.”—2 Ndị Kọrint 12:14; Ndị Hibru 13:5.

6. Ihe atụ dị aṅaa na-egosi otú anyị pụrụ isi mee ka ndụ anyị kwekọọ ná nzube Chineke?

6 Ọ bụrụ na i mikpuolạ onwe gị n’ihe nke ụwa—n’ịchụ ego ma ọ bụ n’ihe ọ bụla ọzọ—ọ ga-achọ gị n’aka ime mgbanwe ndị dị mkpa iji nwee ike ibute nzube Chineke ụzọ. A naghị eme mgbanwe ndị dị otú ahụ ọkụ ọkụ, ọ bụrụkwa na mgbalị mbụ i mere iji mee nke a agazichaghị, echela na ị kụọla afọ n’ala. Tụlee ihe banyere Koichi, bụ́ onye na-etinyekarị oge dị ukwuu n’ihe e ji atụrụ ndụ. Koichi mụrụ Bible mgbe ọ dị afọ iri na ụma, ma ruo ọtụtụ afọ, egwuregwu vidio riri ya ahụ́. Otu ụbọchị, Koichi gwara onwe ya, sị: ‘Legodị m nnọọ. A gafeela m afọ iri atọ ma o nwebeghị ihe bara uru m ji ndụ m na-eme!’ Koichi maliteghachiri ịmụ Bible, ọ nabatakwara enyemaka nke ndị nọ n’ọgbakọ. Ọ bụ ezie na o ji nke nta nke nta mee mgbanwe, ọ daghị mba. N’ihi ikpesi ekpere ike na enyemaka nke ndị ọzọ hụrụ ya n’anya, o mesịrị kwụsị ihe ahụ riri ya ahụ́. (Luk 11:9) Ugbu a, Koichi ji obi ụtọ na-eje ozi dị ka ohu na-eje ozi.

Mụta Idebe Ihe Ọ Bụla n’Ọnọdụ Ya

7. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịmara ebe ike anyị ruru mgbe a bịara n’ọrụ Chineke nyere anyị?

7 Anyị kwesịrị iji obi anyị dum na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke. Anyị ekwesịtụghị ịla azụ ime ihe anyị kwesịrị ime, anyị ekwesịghịkwa ịdị umengwụ. (Ndị Hibru 6:11, 12) Ma nke a apụtaghị na Jehova chọrọ ka anyị rụgbuo onwe anyị n’ọrụ. Ịghọta nnọọ na anyị apụghị ịrụzu ọrụ Chineke nyere anyị n’ike nke onwe anyị na-eme ka otuto na-agara Chineke ma na-egosi na anyị maara ebe ike anyị ruru. (1 Pita 4:11) Jehova kwere nkwa inye anyị ume dị anyị mkpa iji mee uche ya, ma anyị agaghị eme ihe karịrị ike anyị, na-agbalị ime ihe ọ na-atụghị anya ya n’aka anyị. (2 Ndị Kọrint 4:7) Iji jeere Chineke ozi otú anyị na-agaghị akpatara onwe anyị ike ọgwụgwụ, anyị aghaghị ịhazi otú anyị si eji ume anyị na-eme ihe.

8. Gịnị mere mgbe otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst gbalịrị inye Jehova na ụwa ihe kasị mma o nwere, mgbanwe dịkwa aṅaa ka o mere?

8 Dị ka ihe atụ, ruo afọ abụọ, Ji Hye, bụ́ onye bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia, na-arụ ọrụ na-adịghị ekwe ya megharịa ahụ́ ma na-arụkwa ọrụ ọsụ ụzọ. O kwuru, sị: “Agbalịrị m inye ma Jehova ma ụwa ihe kasị mma m nwere ike inye ha, ma ọ bụ nanị awa ise ka m na-ehi ụra kwa abalị. Ihe ndị metụtara ozi Jehova bịara na-agwụzi m ike, ozi m na-ejere Jehova adịghịkwa enyecha m obi ụtọ.” Iji nwee ike iji ‘obi ya dum, mkpụrụ obi ya dum, uche ya dum, na ume ya dum’ jeere Jehova ozi, Ji Hye chọọrọ ọrụ ga-enye ya ohere. (Mak 12:30) Ọ na-ekwu, sị: “N’agbanyeghị na ndị ezinụlọ m chọrọ ka m baa ọgaranya, agbalịrị m ibute ime uche Chineke ụzọ. M ka na-enweta ego na-ezuru m ịzụta ihe ndị dị m mkpa, dị ka uwe dị mma. Ọ na-atọkwa m ụtọ inwe ike ihikwu ụra karịa ka m na-ehibu. Ozi m na-atọkwa m ụtọ, mụ na Jehova adịkwuokwala ná mma ugbu a. Ihe mere o ji dị otú a bụ n’ihi na enweghịzi m oge ịhụ ihe ndị na-adọrọ mmasị dị n’ụwa a.”—Eklisiastis 4:6; Matiu 6:24, 28-30.

9. Olee otú mgbalị anyị pụrụ isi metụta ndị anyị na-ezute n’ozi ọma?

9 Ọ bụghị mmadụ nile ga-enwe ike ijere Chineke ozi dị ka onye ozi oge nile. Ọ bụrụ na i meela agadi, na-arịa ọrịa, ma ọ bụ nwee ihe ndị ọzọ na-egbochi gị ime ihe otú ọ dị gị n’obi, mara na Jehova nwere nnọọ ekele maka ikwesị ntụkwasị obi gị na ihe ọ bụla ị pụrụ iji obi gị dum meere ya. (Luk 21:2, 3) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iche na ọ dịghị uru mgbalị ọ na-eme na-abara ndị ọzọ, ọ sọkwa ya bụrụ na o nweghị ka ọ ha. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na anyị gara ozi ọma n’ụlọ ole na ole ma ọ dịghị onye anyị hụrụ nwere mmasị n’ozi anyị. Ọ bụrụ na anyị alaa, ndị ahụ nwe ụlọ pụrụ ịdị na-ekwu banyere ọbịbịa anyị ruo awa ole na ole ma ọ bụ ụbọchị ole na ole ọbụna ma a sị na ha emeghereghị anyị ụzọ mgbe anyị bịara. Anyị adịghị atụ anya na onye ọ bụla nụrụ ozi ọma anyị ga-aghọ onye Jehova, ma ụfọdụ pụrụ ime otú ahụ. (Matiu 13:19-23) Ndị ọzọ pụrụ imegharị ahụ́ n’ọdịnihu mgbe ha hụrụ ka ụwa ma ọ bụ ndụ ha na-agbanwe. Otú o sina dị, ka anyị na-eme ihe anyị nwere ike ime n’ozi ubi, anyị na-arụ ọrụ Chineke. Anyị bụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.”—1 Ndị Kọrint 3:9.

10. Olee ohere ọrụ gheere onye ọ bụla oghe n’ọgbakọ?

10 Tụkwasị na nke ahụ, anyị nile pụrụ inyere ndị ezinụlọ anyị na ụmụnna anyị aka. (Ndị Galeshia 6:10) Ọrụ ọma anyị pụrụ ịbara ndị ọzọ uru dị ukwuu na-adịte aka. (Eklisiastis 11:1, 6) Mgbe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi dị uchu n’ọrụ ha, ha na-eme ka ụmụnna ha na Jehova dịkwuo ná mma ma mee ka ọgbakọ kwụsie ike, nke a na-emekwa ka a na-arụpụta ihe ka ukwuu n’ọgbakọ. A na-emesi anyị obi ike na mgbe anyị nwere “ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị,” ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ “abụghị n’efu.”—1 Ndị Kọrint 15:58.

Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nzube Chineke n’Oge Ndụ Anyị Nile

11. E wezụga ije ozi n’ọgbakọ anyị, olee ohere ije ozi ndị ọzọ anyị nwere?

11 Ndụ na-atọ anyị bụ́ Ndị Kraịst ụtọ, anyị na-achọkwa ito Chineke n’ihe ọ bụla anyị na-eme. (1 Ndị Kọrint 10:31) Mgbe anyị nọgidesiri ike na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ma na-akụziri ndị ọzọ idebe ihe nile Jizọs nyere n’iwu, anyị ga-achọpụta ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ na-enye obi ụtọ anyị pụrụ isi na-ejere Jehova ozi. (Matiu 24:14; 28:19, 20) E wezụga iso ọgbakọ anyị na-eje ozi, ohere ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu pụkwara ịdapụta, o nwere ike ịbụ n’ókèala ọzọ, n’ebe a na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bụ ná mba ọzọ. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ruru eru, bụ́ ndị na-alụbeghị nwanyị, pụrụ ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, e mesịa, a pụrụ iziga ha n’ebe a chọrọ Ndị Kraịst tozuru okè, ma ọ bụ ná mba ha ma ọ bụ ná mba ọzọ. Ndị di na nwunye nọ n’ozi oge nile pụrụ iru eru inweta ọzụzụ na Gilead iji jee ozi ná mba ọzọ dị ka ndị ozi ala ọzọ. A chọkwara ndị ga-ewepụta onwe ha ịrụ ọrụ dị iche iche na Betel na iso na-ewu ma na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ụlọ ọrụ.

12, 13. (a) Olee otú ị pụrụ isi kpebie ihe ùgwù ije ozi ị ga-anakwere? (b) Kọwaa otú ahụmahụ e nwetara n’otu ihe ùgwù ije ozi pụrụ isi baa uru n’ọzọ.

12 Olee nke ị ga-achọ ịbanye n’ime ohere ije ozi a nile? Ebe ị bụ ohu Jehova raara onwe ya nye, na-elegara Jehova na nzukọ ya anya maka nduzi. “Ezi mmụọ” ya ga-enyere gị aka ime mkpebi ziri ezi. (Nehemaịa 9:20) Otu ihe ùgwù ije ozi na-emeghekarị ụzọ maka ọzọ, a pụkwara iji ahụmahụ na ihe ndị a mụtara n’otu eme ihe n’ọzọ ka oge na-aga.

13 Dị ka ihe atụ, Dennis na nwunye ya bụ́ Jenny, na-enyekarị aka n’ebe ndị a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe otu ajọ ifufe kpasịrị mkpamkpa n’ebe ndịda United States n’August 2005, ha wepụtara onwe ha inyere ndị ihe ahụ metụtara aka. Dennis na-akọ, sị: “Iji ihe ndị anyị mụtara mgbe anyị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nyere ụmụnna anyị aka wetaara anyị ọṅụ dị ukwuu. Otú ndị anyị nyeere aka si gosi ekele ha metụrụ anyị nnọọ n’ahụ́. Ọtụtụ òtù ndị ọzọ na-enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka emerughị ihe Ndịàmà mere. Ndịàmà Jehova arụziela ma ọ bụ wughachi ihe karịrị puku ụlọ ise na narị atọ nakwa ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọtụtụ ndị hụrụ nke a, ha na-egosikwukwa ezi mmasị n’ozi ọma anyị na-ekwusara ha ugbu a.”

14. Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịbanye n’ozi oge nile?

14 Ị̀ pụrụ ịbanye n’ozi oge nile iji gosi na ị chọrọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, jide n’aka na ị ga-enweta ngọzi dị ukwuu. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị ugbu a ekweghị gị, ikekwe ị pụrụ ime mgbanwe ụfọdụ. Kpegara Jehova ekpere dị ka Nehemaịa mere mgbe ọ gụrụ ya agụụ iwere ọrụ dị mkpa. Ọ sịrị: “Biko, Onyenwe anyị, biko, . . . meekwa ka ihe na-agara ohu Gị nke ọma.” (Nehemaịa 1:11) Mgbe i mesịrị nke a, obi sie gị ike na “Onye na-anụ ekpere” ga-aza ekpere gị, gbalịakwa mee ihe kwekọrọ n’ekpere gị. (Abụ Ọma 65:2) Ị ghaghị ibu ụzọ mee ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka Jehova gọzie mgbalị gị. Ozugbo i kpebiri ịbanye n’ozi oge nile, alala azụ. Ka oge na-aga, ị ga-enwekwu ahụmahụ, ị ga-enwekwukwa ọṅụ.

Ndụ nke Nwere Nzube n’Ezie

15. (a) Olee uru anyị pụrụ irite site n’iso ndị jeerela Chineke ozi ruo ogologo oge kọrịa akụkọ, ya na mgbe anyị na-agụ akụkọ ndụ ha? (b) Kọọ otu akụkọ ndụ nke gbara gị nnọọ ume.

15 Gịnị ka ị pụrụ ịtụ anya ha ma ọ bụrụ na ị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke? Gakwuru ndị jeerela Jehova ozi ruo ogologo oge, karịsịa ndị nke jerela ozi oge nile ruo ọtụtụ afọ, ka gị na ha kọrịa. Ị ga-ahụ na ndụ ha na-enye ha afọ ojuju n’ezie. (Ilu 10:22) Ha ga-akọrọ gị na Jehova ahapụtụbeghị inyere ha aka inweta ihe ndị dị ha mkpa nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ọbụna mgbe ihe siiri ha nnọọ ike. (Ndị Filipaị 4:11-13) Site n’afọ 1955 ruo 1961, e bipụtara ọtụtụ akụkọ ndụ nke ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’Ụlọ Nche n’okpuru isiokwu bụ́ “Pursuing My Purpose in Life” (Ịgbalị Iru Ihe Mgbaru Ọsọ M ná Ndụ). Kemgbe ahụ kwa, e bipụtala imerime akụkọ ndụ ndị ọzọ. N’akụkọ ndụ nke ọ bụla, a na-ahụ ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ ndị na-eme ka anyị cheta ụdị ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ e dekọrọ n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndịozi. Ịgụ akụkọ ndị a na-agba ume ga-akpali gị ikwu, sị, ‘Nke a bụ ụdị ndụ m chọrọ ibi!’

16. Gịnị na-eme ka ndụ Onye Kraịst nwee nzube ma na-enye obi ụtọ?

16 Aaron, bụ́ onye anyị kpọtụrụ aha ná mmalite, na-ekwu, sị: “N’Africa, ana m ahụkarị ndị na-eto eto na-akpagharị nnọọ na-achọ ihe ha ga-eji ndụ ha eme. Ọtụtụ adịghị ahụ ihe ha ga-eji ndụ ha eme. Ma leenụ, anyị ji ndụ anyị na-emezu nzube Chineke site n’iji ya na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ, anyị na-ebikwa ụdị ndụ na-eme ka anyị nwee ọtụtụ ahụmahụ na nzube. Anyị ejiwo anya anyị hụ na obi ụtọ na-adị n’ezie n’inye ihe karịa ka ọ na-adị n’ịnara anara.”—Ọrụ 20:35.

17. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-ebi ndụ kwekọrọ ná nzube Chineke ugbu a?

17 Oleekwanụ maka gị? Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ gị? Ọ bụrụ na i setịpụghị ihe mgbaru ọsọ doro anya nke ga-enyere gị aka ibi ndụ kwekọrọ ná nzube Chineke, ihe ndị ọzọ pụrụ ịdọrọ uche gị. Olee ihe mere ị ga-eji laa ndụ gị dị oké ọnụ ahịa n’iyi n’ịchụ ihe nke ụwa Setan a a na-ejighị n’aka? N’isi nso, mgbe “oké mkpagbu” ahụ ga-etiwapụ, akụ̀ na ụba nke ụwa a na ọkwá dị elu agaghị aba uru ọ bụla. Ihe ga-azọpụta anyị bụ mmekọrịta chiri anya nke anyị na Jehova nwere. Anyị ga-enwe nnọọ obi ụtọ dị ukwuu mgbe ahụ na anyị jiri ndụ anyị jeere Chineke na ndị ọzọ ozi ma bie nnọọ ndụ anyị n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke.—Matiu 24:21; Mkpughe 7:14, 15.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 1 A gbanweela aha ụfọdụ.

^ par. 1 Ọ bụ Ndịàmà Jehova mepụtara ya.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú ozi anyị na-ejere Jehova dị ya n’obi?

• Olee otú ịma ebe ike anyị ruru na idebe ihe ọ bụla n’ọnọdụ ya si enyere anyị aka ijere Chineke na ndị ọzọ ozi?

• Ohere ije ozi ndị dị aṅaa ka anyị nwere?

• Olee otú anyị pụrụ isi bie ndụ nwere nzube n’ezie ugbu a?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ọ dị mkpa ka anyị debe ihe ọ bụla n’ọnọdụ ha iji nwee ike iji obi dum na-ejere Jehova ozi

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

E nwere ụzọ dị iche iche a pụrụ isi jeere Chineke ozi