Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Ga-ewetara Anyị Obi Ụtọ Ma Anyị Họrọ Ime Ha

Ihe Ndị Ga-ewetara Anyị Obi Ụtọ Ma Anyị Họrọ Ime Ha

Ihe Ndị Ga-ewetara Anyị Obi Ụtọ Ma Anyị Họrọ Ime Ha

“A SỊ na m maara, agaraghị m eme ihe a otú a m si mee ya!” Ugboro ole ka ị gwarala onwe gị ihe a? Ọ na-amasị anyị nile ịhọrọ ime ihe ndị anyị na-agaghị akwa ụta maka ha ma e mesịa, karịsịa mgbe ihe ahụ anyị họọrọ metụtara otú anyị si ebi ndụ. Oleezi otú anyị nwere ike isi họrọ ime ihe ndị ga-ewetara anyị obi ụtọ?

Nke mbụ, anyị kwesịrị inwe ụkpụrụ a pụrụ nnọọ ịdabere na ya. È nwere ụkpụrụ ndị dị otú ahụ? Ọtụtụ ndị echeghị na e nwere. Dị ka otu nnyocha e ji narị ụmụ akwụkwọ anọ nọ na United States mee si gosi, a chọpụtara na narị atọ n’ime ha kweere na e nweghị kpọmkwem ihe na-ekpebi ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ nakwa na ọ bụ ‘onye ọ bụla na mba ọ bụla ga-eji aka ya ekpebiri onwe ya ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ.’

Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ichewe na onye ọ bụla kwesịrị ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ ma ọ bụkwanụ na ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ dabeere n’otú ndị mmadụ si ele ya anya? Ee e, ọ bụghị. Ọ bụrụ na a hapụ ndị mmadụ ka ha mewe otú masịrị ha ihe nile ga-adị ghaa ghaa ghaa. Ònye ga-achọ ibi n’obodo ebe a na-enweghị iwu, ụlọ ikpe, na ndị uwe ojii? E wezụga nke ahụ, ọ bụghị mgbe nile ka echiche mmadụ na-ezicha ezi. Anyị nwere ike họrọ ime ihe anyị kwenyesiri ike na ọ dị mma, ma e mesịa anyị achọpụta na otú ahụ anyị si chee ya hiere ụzọ. Ihe ndị merela kemgbe e kere mmadụ na-egosi na ihe a Bible kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Oleezi ebe anyị ga-esi nweta ihe ga-eduzi anyị mgbe anyị na-eme mkpebi ndị dị mkpa ná ndụ anyị?

Nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị e kwuru okwu ya n’isiokwu bu ụzọ mere nke ọma n’ịgakwuru Jizọs. Dị ka anyị hụrụ, Jizọs zoro aka n’Iwu Chineke mgbe ọ na-aza ajụjụ nwa okorobịa ahụ jụrụ ya. Jizọs maara na Jehova Chineke bụ Onye kasịnụ a pụrụ isi n’aka ya nweta ihe ọmụma na amamihe, marakwa na Jehova maara ihe ga-akasị baara ihe ndị O kere eke uru. N’ihi ya, Jizọs, sịrị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) N’eziokwu, Okwu Chineke bụ ebe anyị nwere ike isi nweta nduzi a pụrụ ịdabere na ya bụ́ nke ga-enyere anyị aka ịhọrọ ime ihe ndị amamihe dị na ha. Ka anyị tụlezie ihe ole na ole Okwu Chineke kwuru, bụ́ ndị ọ ga-abụ anyị tinye ha n’ọrụ ha emee ka anyị nwekwuo obi ụtọ.

Ụkpụrụ Ọma Ahụ

N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jizọs kụziri otu ụkpụrụ bụ́ isi ga-enyere anyị aka ime mkpebi ziri ezi n’ihe banyere otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe. Nke a bụ ihe o kwuru: “Ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) A na-akpọ ihe a Jizọs kwuru Ụkpụrụ Ọma ahụ.

Ụfọdụ ndị na-ekwughachi ihe a Jizọs kwuru n’ụzọ dị iche, sị: “Emela ndị ọzọ ihe ị na-agaghị achọ ka ha mee gị.” Iji gosi na e nwere ihe dị iche n’Ụkpụrụ Ọma ahụ na nke a ụfọdụ ndị na-ekwu, ka anyị tụlee ilu Jizọs banyere onye Sameria nke bụ́ ezigbo onye agbata obi. Ndị ohi tiri otu onye Juu ihe ma hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma n’okporo ụzọ. Otu onye nchụàjà na otu onye Livaị hụrụ ya ebe ọ tọgbọ n’ụzọ ma gafere ya. Ebe ọ bụ na ha emeghị ihe ga-eme ka ahụ́ ụfụ nwoke ahụ nọ na ya kakwuo njọ, e nwere ike ikwu na ha mere ihe kwekọrọ n’ụzọ ahụ dị iche ndị mmadụ si kwughachi Ụkpụrụ Ọma ahụ. Ma, otu nwoke Sameria kwụsịrị nyere nwoke ahụ aka. Ọ sara ọnyá ndị dị nwoke ahụ n’ahụ́ ma kpọga ya ebe a ga-elekọta ya. O meere nwoke ahụ ihe ọ gaara achọ ka e meere ya. O mere ihe Ụkpụrụ Ọma ahụ kwuru—ihe ahụ ọ họkwaara ime ziri ezi.—Luk 10:30-37.

E nwere ọtụtụ ụzọ anyị ga-esi tinye ụkpụrụ ọma a n’ọrụ, ya arụpụtakwa ihe ndị dị mma. Ka e were ya na otu ezinụlọ kwabatara n’ógbè unu ọhụrụ. Ì nwere ike ibu ụzọ gaa kelee ha? I nwedịrị ike inyere ha aka ịmata ógbè ahụ nke ọma ma ọ bụ zaa ha ajụjụ ndị ha nwegasịrị ma ọ bụ nyere ha aka n’ihe ndị dị ha mkpa. Site n’ibu ụzọ gakwuru ha, ị ga-eme ka gị na ha dị ná mma. Ị ga-enwekwa obi ụtọ ịmara na i mere ihe na-atọ Chineke ụtọ. Nke ahụ ọ̀ bụghị ihe amamihe dị na ya ime?

Ihe Ndị Anyị Na-ahọrọ Imere Ndị Ọzọ n’Ihi na Anyị Hụrụ Ha n’Anya

E wezụga Ụkpụrụ Ọma ahụ Jizọs nyere, o nyekwara ntụziaka ndị ọzọ ga-enyere gị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha. Mgbe a jụrụ Jizọs nke bụ́ iwu kasịnụ n’Iwu Mozis, ọ zara, sị: “‘Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Nke a bụ ihe e nyere n’iwu nke kasịnụ, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, dị ka ya, bụ nke a, ‘Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ N’ihe abụọ a e nyere n’iwu ka Iwu ahụ dum, nakwa akwụkwọ Ndị Amụma dabeere.”—Matiu 22:36-40.

N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, o nyere ndị na-eso ụzọ ya “iwu ọhụrụ,” nke bụ́ ka ha na-ahụrịta ibe ha n’anya. (Jọn 13:34) Gịnị mere o ji kwuo na iwu a bụ iwu ọhụrụ? A sị kwuwe, ọ dịla mbụ gwa ndị na-eso ụzọ ya na ịhụ onye agbata obi ha n’anya so n’otu n’ime iwu abụọ Iwu ahụ nile dabeere na ya. N’Iwu Mozis, a gwara ndị Izrel, sị: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” (Levitikọs 19:18) Ma ugbu a, Jizọs na-enye ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha mee ihe karịrị nke ahụ. N’otu abalị ahụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya na-aga ịnwụ maka ha. Ọ gwaziri ha, sị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya. Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya ka nke a ukwuu, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:12, 13) N’ezie, iwu a bụ iwu ọhụrụ n’ụdị na ọ chọrọ ka mmadụ bute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ.

E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi gosi na ịhụnanya anyị abụghị nanị iji rite ihe, kama iji gosi na anyị na-ebute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. Ka e were ya na n’ebe i bi e nwere ndị ọzọ bi n’ebe ahụ. Mgbe ị chọrọ igere egwú, ọ na-atọ gị ụtọ ma egwú i na-ege na-azụ azụ, ma ime ya otú ahụ na-enye onye agbata obi gị nsogbu. Ị̀ ga-adị njikere ime ihe dị onye agbata obi gị mma n’obi site n’ịgbatulata egwú ahụ, ọ bụ ezie na ọ gaghị atọru gị ụtọ otú ị chọrọ? N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ị̀ ga-ebute ọdịmma onye agbata obi gị ahụ ụzọ?

Tụlee ihe a merenụ. N’otu ụbọchị ezigbo oyi na-atụ na Canada, snow ana-adakwa, Ndịàmà Jehova abụọ bịara na nke otu agadi nwoke. Ka ha na-akparịta ụka, nwoke ahụ kwuru na obi mgbu ekweghị ya kpopụsịa snow ndị nọchiri ihu ụlọ ya. Ka ihe dị ka otu awa ma ọ bụ karịa gasịrị, nwoke ahụ nụrụ ụda shọvel. Ọ bụ Ndịàmà abụọ ahụ bịara ikpopụrụ ya snow mechiri ọnụ ụzọ ya. Nwoke ahụ degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Canada akwụkwọ ozi, sị: “Taa ka m hụrụ ndị nwere ịhụnanya e ji ama Ndị Kraịst. N’ezie, o meela ka m nwee olileanya na ụwa a ga-adị mma otu ụbọchị. O mekwaala ka m na-akwanyekwuru unu ùgwù n’ihi ọrụ ọma unu na-arụ n’ụwa nile.” N’eziokwu, ịhọrọ inyere ndị ọzọ aka, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ihe anyị mere yiri ka ọ̀ dị obere, nwere ike inwe mmetụta dị mma n’ebe ndị ọzọ nọ. Ịhọrọ ibute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ dị ukwuu!

Ihe Ndị Anyị Na-ahọrọ Ime n’Ihi na Anyị Hụrụ Chineke n’Anya

Ihe ọzọ anyị ga-eburu n’uche mgbe anyị na-ahọrọ ihe ndị anyị ga-eme bụ ihe Jizọs kọwara dị ka iwu kasịnụ—nke bụ́ anyị ịhụ Chineke n’anya. Ọ bụ ndị Juu, bụ́ mba raara onwe ya nye Jehova, ka Jizọs gwara okwu a. N’agbanyeghị nke ahụ, onye Izrel ọ bụla aghaghị ịhọrọ ma ọ̀ ga-eji ịhụnanya sitere n’obi dum jeere Chineke ozi ma ọ bụ na ọ gaghị.—Deuterọnọmi 30:15, 16.

N’otu aka ahụ, ihe ndị ị na-ahọrọ ime na-egosi otú i si were Chineke. Dị ka ihe atụ, ka ị na-amụtakwu ihe Bible kwuru ma na-ahụ uru Bible bara, gị onwe gị nwekwara ihe dị mkpa ị ga-ahọrọ ime. Ị̀ ga-adị njikere ịmalite ịmụchi Bible anya, iji ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs? Ịhọrọ ime nke a ga-ewetarịrị gị obi ụtọ, n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

Anyị amaghị ma nwa okorobịa onye ọchịchị ahụ ò mesiri kwaa ụta n’ihi mkpebi ahụ o mere. Ma, anyị maara otú obi dị Pita onyeozi ka o sosịrị Jizọs ruo ọtụtụ afọ. N’ihe dị ka n’afọ 64 O.A., mgbe oge ọnwụ Pita na-eru nso, ọ gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Meenụ ike unu nile ka [Chineke] wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-agbaghị ọrụ na ndị nọ n’udo.” (2 Pita 1:14; 3:14) O doro anya na Pita akwaghị ụta n’ihi ihe ọ họrọ ime ihe karịrị afọ iri atọ gara aga, ọ gbakwara ndị ọzọ ume ịnọgidesi ike n’ihe ha họọrọ ime.

Irube isi ná ndụmọdụ a Pita nyere pụtara na anyị ga-ahọrọ ịnabata ibu ọrụ nke ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na nke irube isi n’iwu Chineke. (Luk 9:23; 1 Jọn 5:3) Nke a nwere ike iyi ka o siri ike omume, ma Jizọs mere ka obi sie anyị ike mgbe o kwere nkwa, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.

Tụlee ahụmahụ otu nwoke aha ya bụ Arthur. Mgbe Arthur dị afọ iri, ọ malitere ịmụ otú e si akpọ ụbọ a na-akpọ violin, na-atụ anya iji ya mere aka ọrụ. Mgbe ọ dị afọ iri na anọ, ọ ghọọla onye a ma ama na-akpọ violin n’ebe a na-akụ egwú. N’agbanyeghị ihe ndị a, o nweghị obi ụtọ. Papa ya na-ajụkarị ajụjụ banyere ihe bụ́ nzube nke ndụ, n’ihi ya kwa, ọ kpọrọ ndị isi okpukpe ka ha bịa n’ụlọ ya zaa ya ajụjụ ahụ; ma ọ dịghị nke nyere ya azịza juru ya afọ. Papa ya na ndị ezinụlọ ya kparịtara ụka ma Chineke ọ̀ dị adị n’ezie nakwa ihe mere o ji kwere ka ihe ọjọọ dịrị. Otu ụbọchị papa Arthur na Ndịàmà Jehova malitere inwe mkparịta ụka. Mkparịta ụka ahụ masịrị papa Arthur nke na a malitere ịmụwara ya na ndị ezinụlọ ya nile Bible.

Ka oge na-aga, Arthur bịara si n’Akwụkwọ Nsọ ghọta ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ ghọtakwa nke ọma ihe bụ́ nzube nke ndụ. Arthur na mmadụ atọ n’ime ndị ezinụlọ ya họọrọ ime ihe ha na-akwabeghị ụta ya ruo taa. Ọ raara ndụ ya nye Jehova. O kwuru, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ na Jehova emeela ka m mata eziokwu ahụ nakwa maka ịnapụta m n’anyaụfụ na ịsọ mpi na-adịkarị n’etiti ndị ji ịkụ egwú mere aka ọrụ. Ọtụtụ ndị na-etinye aka n’ihe ọjọọ dị iche iche iji nwee ihe ịga nke ọma.”

Ọ ka na-atọkwa Arthur ụtọ ịkpọ violin iji na-eme ndị enyi ya obi ụtọ, ma ọ bụghị ya ka o ji mere ọrụ bụ́ isi ná ndụ ya. Kama nke ahụ, ihe bụ́ isi o ji ndụ ya na-eme bụ ijere Chineke ozi. Ọ dịla anya o jewere ozi n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Gị onwe gị nwekwara ike ime ka Arthur na ọtụtụ nde ndị ọzọ bụ́ ndị na-emeghị ka nwa okorobịa onye ọchịchị ahụ bara ọgaranya, site n’ịhọrọ ime ihe ga-enye gị obi ụtọ kasịnụ—nke bụ́ ịza òkù ahụ Jizọs kpọrọ ka ị bịa bụrụ onye na-eso ụzọ ya.

[Foto dị na peeji nke 6]

Mkpebi ọ bụla i mere nwere ike ime ka ndị ọzọ mee mgbanwe ná ndụ ha

[Foto dị na peeji nke 7]

Ị̀ ga-amụ Bible ma ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs?