Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joel na Emọs

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joel na Emọs

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joel na Emọs

NANỊ ihe Joel kọrọ banyere onwe ya bụ na ya bụ “Joel, nwa Petuel.” (Joel 1:1) N’akwụkwọ Joel nke bu aha ya, Joel ekwughị ọtụtụ okwu n’ihe ndị ọzọ na-agbasaghị ozi ya, o lekwasịrị anya karịsịa n’ozi ya. Nke a mere na a pụghị ikwu kpọmkwem mgbe o buru amụma ya, o nwere ike ịbụ n’afọ 820 T.O.A., afọ itolu ka Ụzaịa ghọsịrị eze Juda. Gịnị mere Joel achọghị ịkọ banyere onwe ya? O nwere ike ihe kpatara nke a bụ na ihe ọ chọrọ imesi ike bụ ozi ya ọ bụghị onye gara zie ya.

N’oge Ụzaịa kwa, e nyere Emọs, bụ́ onye bi na Juda ma bụrụkwa ‘onye nche ehi na onye na-edozi mkpụrụ osisi sycomore,’ ọrụ ibu amụma. (Emọs 7:14) N’adịghị ka Joel bụ́ onye buru amụma na Juda, e zigara Emọs n’ebe ugwu nke alaeze ebo iri Izrel. E dechara akwụkwọ Emọs n’ihe dị ka n’afọ 804 T.O.A. bụ́ mgbe onye amụma ahụ laghachirila Juda, e jikwa okwu ndị dị mfe nghọta ma doo anya dee akwụkwọ Emọs.

“EWOO, ỤBỌCHỊ AHỤ!”—N’IHI GỊNỊ?

(Joel 1:1–3:21)

Ihe Joel hụrụ n’ọhụụ bụ otú egú, igurube na ọchịcha si jupụta n’obodo ahụ. A kọwara ha dị ka ‘ndị dị ọtụtụ nweekwa ume’ na dị ka “ndị dike.” (Joel 1:4; 2:2-7) Joel kwuru, sị, “Ewoo ụbọchị ahụ! n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso, dị ka mbibi nke sitere n’aka Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ ga-abịa.” (Joel 1:15) Jehova dụrụ ndị bi na Zaịọn ọdụ, sị: ‘Werenụ obi unu nile chigharịkwute m.’ Ọ bụrụ na ha emee nke a, Jehova ‘ga-enwe ọmịiko n’ahụ́ ndị Ya’ ma mee ka “ụsụụ ndị agha Ugwu,” ya bụ, ụmụ ahụhụ ndị ahụ bịara inye ha nsogbu, si n’ahụ́ ha jee n’ebe dị anya. Ma tupu oké ụbọchị Jehova abịa, Jehova “ga-awụsa Mmụọ [ya] n’ahụ́ anụ ahụ́ nile,” ọ “ga-enyekwa ihe ebube dị iche iche n’eluigwe na n’ụwa.”—Joel 2:12, 18-20, 28-31.

A gwara mba dị iche iche ka ha jikere maka ọgụ: “Kpụgharịanụ mma ogè unu ka ha bụrụ mma agha, na mma ịkwọ osisi unu ka ha bụrụ ube” ma kwadebe maka agha. E nyere ha iwu ka ha ‘rigota na ndagwurugwu Jehoshafat’ bụ́ ebe a ga-anọ kpee ha ikpe ma laa ha n’iyi. “Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ bi ruo mgbe ebighị ebi.”—Joel 3:10, 12, 20.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:15; 2:1, 11, 31; 3:14—Gịnị bụ “ụbọchị Jehova”? Ụbọchị Jehova bụ oge Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’isi ndị iro ya, bụ́ nke ga-akpatara ha ọnwụ ma wetara ndị na-efe ya ofufe nzọpụta. Dị ka ihe atụ, ụbọchị Jehova dakwasịrị Babilọn oge ochie na 539 T.O.A. mgbe ndị Midia na ndị Peshia bibiri ya. (Aịsaịa 13:1, 6) “Ụbọchị Jehova” ọzọ dịkwa nso, bụ́ ụbọchị ọ ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ́ “Babilọn Ukwuu ahụ” nke bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha.—Mkpughe 18:1-4, 21.

2:1-10, 28—Olee otú e sirila mezuo amụma ahụ kwuru banyere otú ụmụ ahụhụ ga-esi wakpoo obodo ahụ? Ọ dịghị ihe e dere na Bible nke gosiri na e nwere mgbe ụmụ ahụhụ wakporo Kenan ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a a kọwara n’akwụkwọ Joel. N’ihi ya, mwakpo ahụ Joel kwuru okwu ya nwere ike ịbụ amụma nke ihe mere na 33 O.A. bụ́ mgbe Jehova malitere ịwụsa ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst mmụọ ya ha amalite ikwusa ozi ahụ nke mere ka ahụ́ ghara iru ndị ndú okpukpe ụgha ala. (Ọrụ 2:1, 14-21; 5:27-33) Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù anyị iso na-arụ ọrụ yiri nke ahụ taa.

2:32—Gịnị ka ‘ịkpọku aha Jehova’ pụtara? Ịkpọku aha Chineke pụtara ịmara aha ahụ, ịkwanyere ya ùgwù miri emi, na ịdabere n’onye nwe aha ahụ ma tụkwasị ya obi.—Ndị Rom 10:13, 14.

3:14—Gịnị bụ “ndagwurugwu mkpebi ikpe”? Ọ bụ n’ụzọ ihe atụ ebe Chineke ga-anọ mezuo ihe o kpere n’ikpe. N’oge eze Juda bụ́ Jehoshafat, bụ́ onye aha ya pụtara “Jehova Bụ Onyeikpe,” Chineke napụtara Juda n’aka mba ndị gbara ya gburugburu site n’imegheri ndị agha nke mba ndị ahụ anya. N’ihi ya, a na-akpọkwa ebe ahụ “ndagwurugwu Jehoshafat.” (Joel 3:2, 12) Taa, ọ na-anọchi anya ebe a ga-anọ gwepịa mba dị iche iche dị ka a na-eme vaịn n’ebe nzọcha mkpụrụ vaịn.—Mkpughe 19:15.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:13, 14. Iji bụrụ ndị a ga-azọpụta, ọ dị anyị mkpa iji obi anyị nile chegharịa ma kwere na Jehova bụ ezi Chineke ahụ.

2:12, 13. Ezi nchegharị na-esi n’obi. Ọ chọrọ anyị ‘ịdọwa obi anyị’, ọ bụghị ‘ịdọwa uwe anyị.’

2:28-32. Ọ bụ nanị onye ‘na-akpọku aha Jehova ka a ga-eme ka o wezụga onwe ya’ ‘n’ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị dị ukwuu dịkwa egwu.’ Anyị kwesịrị inwe nnọọ ekele na Jehova na-awụsa ụdị anụ ahụ́ ọ bụla mmụọ ya ma kwe ka ma nwata ma okenye, ma nwoke ma nwanyị, kere okè n’ọrụ ibu amụma, nke bụ́ ikwusa “ihe ndị dị ebube nke Chineke”! (Ọrụ 2:11) Ka ụbọchị Jehova na-eru nso, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị ‘na-akpa nnọọ àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke’?—2 Pita 3:10-12.

3:4-8, 19. Joel buru amụma na mba ndị gbara Juda gburugburu ga-anata ntaramahụhụ n’ihi imegbu ndị Chineke họọrọ. Amụma ahụ mezuru mgbe Nebukadneza bụ́ eze Babilọn bibiri nnukwu obodo Taịa. Mgbe Alekzanda onye Ukwu mechara bibie agwaetiti obodo ahụ, ha gburu ọtụtụ puku ndị agha obodo ahụ na ndị a ma ama, kpọrọkwa puku mmadụ iri atọ ndị ọzọ ka ha gaa gbawa ohu. Alekzanda na ndị ọzọ chịrị mgbe ọ chịchara mekwara ndị Filistịa otu ihe ahụ. Ka ọ na-erule na narị afọ nke anọ T.O.A., e nweghịkwa onye ọ bụla bi n’Idọm. (Malakaị 1:3) Amụma ndị a mezurunụ na-eme ka anyị tụkwasịkwuo Jehova obi dị ka Onye na-emezu nkwa ya. Ha na-egosikwa otú Jehova ga-esi emeso mba ndị na-akpagbu ndị ohu ya taa.

3:16-21. “Eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ,” Jehova ga-ekpekwa mba nile ikpe. “Ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba,” mee ka ha biri n’ime ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ikpebisi ike ịnọ n’akụkụ Jehova ka ụbọchị ọ ga-eji kpee ajọ ụwa a ikpe na-eru nso.

“JIKERE IZUTE CHINEKE GỊ”

(Emọs 1:1–9:15)

Emọs nwekwara ozi ọ ga-ezi mba ndị gbara Izrel gburugburu nakwa nke ọ ga-ezi Juda na Izrel. Mbibi na-echere Siria, Filistia, Taịa, Idọm, na Moab n’ihi otú ha si jiri obi ọjọọ mesoo ndị Chineke ihe. A ga-ebibikwa ndị bi na Juda ‘n’ihi na ha jụrụ iwu Jehova.’ (Emọs 2:4) Oleekwanụ banyere alaeze ebo iri Izrel? Mmehie ndị o mere gụnyere imegbu ndị ogbenye, omume rụrụ arụ, na ịkparị ndị amụma Chineke. Emọs dọrọ ha aka ná ntị na Jehova “ga-ejikwa mmehie ebe ịchụàjà nke Betel leta ha,” ọ “ga-etikwa ma ụlọ mgbe oyi ma ụlọ mgbe okpomọkụ ihe.”—Emọs 3:14, 15.

N’agbanyeghị ahụhụ dị iche iche a tarala ndị Izrel a na-ekpere arụsị, ha nọgidere na-akpọ ekwo nkụ. Emọs gwara ha, sị: “Jikere izute Chineke gị.” (Emọs 4:12) Ihe ụbọchị Jehova ga-apụtara mba Izrel bụ na ha ‘ga-eje biri n’ala ọzọ n’ofè Damaskọs,’ ya bụ, ha ga-aga Asiria. (Emọs 5:27) Otu onye nchụàjà Betel megidere Emọs, ma ọ dịghị mgbe ụjọ tụrụ Emọs. Jehova gwara Emọs, sị: “Ọgwụgwụ abịaruwo ndị m, bụ́ Izrel, ahụ́; m gaghị agabigakwa mmehie ya ọzọ.” (Emọs 8:2) Ma Shiol ma ugwu ndị dị elu adịghị nke ga-enwe ike ichebe ha n’ikpe Chineke ga-ekpe ha. (Emọs 9:2, 3) Ma, Jehova kwere nkwa ịkpọlata ha. O kwuru, sị: “M ga-emekwa ka ndị m a dọtara n’agha, bụ́ Izrel, lọta, ha ga-ewukwa obodo nile tọgbọrọ n’efu, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, ṅụọ mmanya ha; ha ga-emekwa ubi a gbara ogige, rie mkpụrụ ha.”—Emọs 9:14.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

4:1—Olee ndị ka “nne ehi nke Beshan” na-anọchi anya ha? Ihe e ji mara ala dị larịị nke Beshan, bụ́ nke nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Galili, bụ na e nwere ụdị anụmanụ dị iche iche mara mma n’ebe ahụ, tinyere nne ehi. Ihe kpatachara nke a bụ na ahịhịa ndị e nwere n’ebe ahụ dị nnọọ mma. Emọs ji ụmụ nwanyị Sameria ndụ okomoko na-atọgbu atọgbu tụnyere nne ehi Beshan. O doro anya na iji bie ndụ okomoko a na-atọ ha ụtọ, ụmụ nwanyị a kwanyere “ndị nwe ha,” ma ọ bụ ndị di ha, irigbu ndị ọ na-adịghị ka ọ ha ha.

4:6—Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ezé nwuru enwu” pụtara? A na-ejikarị okwu a eme ihe mgbe a na-ekwu okwu “ụkọ nri.” Ọ ga-abụ na ọ na-ezo aka n’oge a ga-enwe ụnwụ nri, bụ́ mgbe ezé ga-anọgide na-adị ọcha n’ihi ahụghị ihe ọ ga-eri.

5:5—Olee otú o si bụrụ na Izrel ‘agaghị achọ Betel’? Jeroboam guzobere nwa ehi na Betel ka a na-efe ya ofufe. Kemgbe ahụ o guzobechara ya, obodo ahụ aghọọla ebe ofufe ụgha hiwere isi. Ọ ga-abụkwa na Gilgal na Bia-shiba ghọkwuru ebe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-agakwa efe ofufe. Iji gbanahụ ahụhụ ahụ e kwurula gaje ịdakwasị ha, ụmụ Izrel kwesịrị ịkwụsị ịdị na-aga efe ofufe n’ebe ndị a ma malite ịchọ Jehova.

7:1—Gịnị ka ‘ahịhịa eze e bisịrị’ na-ezo aka na ya? O yiri ka ọ na-ezo aka n’ụtụ isi eze nyere iwu ka a na-akwụ ka e jiri ya na-elekọta ndị na-agbara ya ịnyịnya na ụmụ anụmanụ ya. A ga na-atụ ụtụ isi a “n’isi mmalite nke opupu ahịhịa nke mmiri ozuzo ikpeazụ.” Ọ bụrụ na ha emechaa nke a, ha nweziri ike ịga wee ihe ndị ha kụrụ n’ubi. Ma tupu ha agaa were ihe ndị ahụ ha kụrụ n’ubi, igurube na-ekworo gaa tachasịa ihe ndị ahụ na akwụkwọ nri ndị ọzọ.

8:1, 2—Gịnị ka “otu nkata nke mkpụrụ osisi nke mgbe nghọkọta mkpụrụ” na-egosi? Ọ na-egosi na ụbọchị Jehova dị nso. A na-aghọ mkpụrụ osisi ndị na-amị n’oge okpomọkụ ná ngwụsị nke oge owuwe ihe ubi. Mgbe Jehova mere ka Emọs hụ “otu nkata nke mkpụrụ osisi nke mgbe nghọkọta mkpụrụ,” ihe ọ pụtara bụ na mbibi Izrel dị nso. N’ihi ya, Chineke gwara Emọs, sị: “Ọgwụgwụ abịaruwo ndị m, bụ́ Izrel, ahụ́; m gaghị agabigakwa mmehie ya ọzọ.”

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:3, 6, 9, 11, 13; 2:1, 4, 6. Ọ bụ n’ihi iwe Jehova megide Izrel, Juda, na obodo isii ndị gbara ha gburugburu mere o ji kwuo, sị: ‘M gaghị eme ka ahụhụ ya laghachi azụ.’ E nweghị ike ịgbanahụ ikpe Jehova agbanahụ.—Emọs 9:2-5.

2:12. Anyị ekwesịghị ịkụda ndị ọsụ ụzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ozi ala ọzọ ma ọ bụ ndị ezinụlọ Betel bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike, aka, site n’ịgwa ha pụta n’ozi oge nile ha n’ihi ihe e chere na ọ bụ ụzọ kasị mma isi bie ndụ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịgba ha ume ịnọgide n’ọrụ ọma ha.

3:8. Dị nnọọ ka ụjọ na-ejide mmadụ ma ọ nụ ụja ọdụm, a kpaliri Emọs ịkpọsa okwu Chineke mgbe ọ nụrụ ka Jehova kwuru, sị: “Jee, buoro ndị m, bụ́ Izrel, amụma.” (Emọs 7:15) Egwu Chineke kwesịrị ịkpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa oziọma nke Alaeze ahụ.

3:13-15; 5:11. Site n’enyemaka Jehova, Emọs bụ́ onye na-azụ anụ, onye ndị mmadụ na-eleda anya, gbaara ndị aka ji akụ nwere omume ọ̀ gbasara m n’ihi ego ha, “àmà.” N’otu aka ahụ, Jehova na-akwadebe anyị ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’agbanyeghị otú o siruru ike ikwusa ozi ọma n’ókèala anyị.

4:6-11; 5:4, 6, 14. N’agbanyeghị na ndị Izrel nọgidere jụ “ịlaghachikwute” Jehova, a gbara ha ume ka ha ‘chọọ Jehova, wee dị ndụ.’ Ruo mgbe Jehova ga-enweruru ụwa ochie a ndidi, anyị kwesịrị ịnọgide na-agba ndị nọ n’ime ụwa ume ịlaghachikwute Chineke.

5:18, 19. Ịdị “na-achọsi ụbọchị Jehova ike” mgbe anyị na-ejikerebeghị maka ya bụ nnọọ ihe nzuzu. Onye na-eme otú a yiri nwoke gbanahụrụ ọdụm ma gbakwuru anụ ọhịa bea ma gbanahụ bea, agwọ atụọ ya. Anyị na-egosi na anyị maara ihe site ‘n’ịmụrụ anya’ n’ụzọ ime mmụọ ma nọgide na-adị njikere.—Luk 21:36.

7:12-17. Anyị kwesịrị iji obi ike na-ekwusa ozi Chineke.

9:7-10. Na ndị nna ochie ụmụ Izrel fere Jehova ofufe, e sikwa n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel ịbụ ndị Chineke họọrọ, emeghị ka ha mee ihe Chineke chọrọ, dị ka ụmụ Kush na-emeghị. Ihe ga-eme ka anyị na Chineke, bụ́ onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu dịrị ná mma abụghị ụdị ezinụlọ anyị si na ya, kama ọ bụ ‘ịtụ egwu ya na ime ezi omume.’—Ọrụ 10:34, 35.

Ihe Anyị Kwesịrị Ime

Ụbọchị Chineke ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’isi ụwa Setan dị nso. Chineke awụsala ndị na-efe ya ofufe mmụọ ya, bụ́ nke o ji na-akwadebe ha ịdọ ụmụ mmadụ aka ná ntị maka ụbọchị ya na-abịanụ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ikerechi oké anya n’inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara Jehova ma ‘kpọkuo aha ya’?—Joel 2:31, 32.

Emọs gbara ume, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụnụ ezi ihe n’anya, meenụ ikpe ziri ezi ka o guzosie ike n’ọnụ ụzọ ama.” (Emọs 5:15) Ka ụbọchị Jehova na-eru nso, ọ bụ nnọọ ihe amamihe dị na ya ịbịaru Chineke nso ma nọpụ iche n’ụwa a na-eme ihe ike ma zere itinye aka n’omume rụrụ arụ. N’ezie, anyị nwere ihe ndị magburu onwe ha anyị na-amụta n’akwụkwọ Bible bụ́ Joel na Emọs, bụ́ ndị na-enyere anyị aka izere omume rụrụ arụ.—Ndị Hibru 4:12.

[Foto dị na peeji nke 12]

Joel buru amụma, sị: “Ụbọchị Jehova dị nso!”

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Dị nnọọ ka Emọs mere, anyị kwesịrị iji obi ike na-akpọsa ozi Chineke