Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnapụta Pụọ n’Igbudu nke Osi Ọnyà

Nnapụta Pụọ n’Igbudu nke Osi Ọnyà

Nnapụta Pụọ n’Igbudu nke Osi Ọnyà

“[Jehova] ga-anapụta gị n’igbudu nke osi ọnyà.”—ABỤ ỌMA 91:3.

1. Ònye bụ “osi ọnyà” ahụ, gịnịkwa mere o ji bụrụ ajọ onye iro?

EZI Ndị Kraịst nile nwere otu ajọ onye iro nke nwere ọgụgụ isi karịa mmadụ ọ bụla ma bụrụkwa onye aghụghọ. A kpọrọ ya “osi ọnyà” n’Abụ Ọma 91:3. Ònye bụ onye iro a? Malite n’Ụlọ Nche nke June 1, 1883, magazin a emeela ka o doo anya na ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Setan bụ́ Ekwensu. Onye iro a dị nnọọ ike na-agbalị iji aghụghọ arafu ndị Jehova ma mee ka ha ma n’ọnyà dị nnọọ ka osi ọnyà si agbalị ịnwụde nnụnụ.

2. Gịnị mere e ji jiri Setan tụnyere osi ọnyà?

2 N’oge ochie, ụfọdụ na-ejide nnụnụ maka uri ọma ndị ha na-agụ, ụfọdụ na-anwụdekwa ha n’ihi na ha chọrọ ọmarịcha ábụ́bà ha, ebe ndị ọzọ na-anwụde ha iji mere anụ na iji chụọ àjà. Ma, nnụnụ na-adịkarị akọ, ọ na-esikwa ike ịnwụde ha. N’ihi ya, onye na-esi ọnyà n’oge Bible na-ebu ụzọ amata otú nnụnụ ọ chọrọ ịnwụde si akpa àgwà. Mgbe o mesịrị nke a, ọ na-echepụtazi ụzọ aghụghọ ọ ga-esi nwụde ya. Bible ji Setan tụnyere osi ọnyà iji nyere anyị aka ịghọta otú Setan si arụ ọrụ. Ekwensu na-ebu ụzọ amụ onye ọ bụla n’ime anyị. Ọ na-ahụ otú anyị si akpa àgwà ma siere anyị ọnyà iji nwụde anyị ná ndụ. (2 Timoti 2:26) Ọ bụrụ na Setan anwụde anyị, anyị na Chineke agaghịzi adị ná mma, nke a pụkwara imecha kpatara anyị mbibi. N’ihi ya, iji chebe onwe anyị, anyị kwesịrị ịma ụzọ aghụghọ nile nke “osi ọnyà” ahụ.

3, 4. Olee mgbe ụzọ Setan si eme ihe na-eyi nke ọdụm? nakwa nke agwọ?

3 Ọbụ abụ ahụ kọwakwara Setan nke ọma mgbe o ji ụzọ aghụghọ Setan tụnyere otú ọdụm ma ọ bụ agwọ si aghọ aghụghọ. (Abụ Ọma 91:13) Dị ka ọdụm, mgbe ụfọdụ, Setan na-abịa alụso anyị ọgụ ihu n’ihu site n’iwetara ndị Jehova mkpagbu ma ọ bụ ịkpali ndị ọchịchị imegide ndị Jehova. (Abụ Ọma 94:20) Ụdị mmegide a yiri nke ọdụm na-eme ka ụfọdụ sụọ ngọngọ. Ma ụdị mmegide a na-aghọkarị ya ahịa n’ụdị na ọ na-eme ka ndị Chineke dịkwuo n’otu. Oleekwanụ otú Setan si eji ụzọ aghụghọ ya yiri nke agwọ, bụ́ nke kadị dị aghụghọ, achọ ịnwụde anyị?

4 Ekwensu na-eji ọgụgụ isi ya karịrị nke mmadụ eduhie ndị mmadụ, ọ na-eme ka agwọ ọjọọ nke na-esi n’ebe zoro ezo abịa tụọ mmadụ. O sila n’ụzọ dị otú a merụọ uche ụfọdụ ndị Chineke, na-eme ka ha na-eme uche ya kama ime uche Jehova, nke a akpatakwarala ha nsogbu. Obi dị anyị ụtọ na anyị maara ụzọ aghụghọ Setan nke ọma. (2 Ndị Kọrint 2:11) Ugbu a, ka anyị tụlee anọ n’ime ọnyà ọjọọ ndị “osi ọnyà” ahụ ji anwụde ndị mmadụ.

Egwu Mmadụ

5. Gịnị mere osi ọnyà ahụ ji enwekarị ihe ịga nke ọma ma o jiri ịtụ “egwu mmadụ” sie ọnyà?

5 “Osi ọnyà” ahụ ghọtara na ọ na-amasịkarị ụmụ mmadụ ka ndị ọzọ na-anabata ha. Dị ka ọ na-adị ndị ọzọ, Ndị Kraịst na-enwekwa nnọọ nchegbu banyere ihe ndị ọzọ na-eche banyere ha. Ebe Ekwensu maara nke a, ọ na-agbalị iji ya esiri ha ọnyà. Dị ka ihe atụ, ọ na-achị ụfọdụ ndị Chineke n’ụkwụ site n’ime ka ha na-atụ “egwu mmadụ.” (Ilu 29:25) Ọ bụrụ na ndị ohu Chineke ejiri n’ihi egwu mmadụ soro ndị ọzọ na-eme ihe Jehova katọrọ ma ọ bụ ghara ime ihe Okwu Chineke nyere ha iwu ka ha mee, “osi ọnyà” ahụ amatala ha n’ọnyà.—Ezikiel 33:8; Jems 4:17.

6. Olee ihe atụ na-egosi otú “osi ọnyà” ahụ pụrụ isi mata onye na-eto eto n’ọnyà?

6 Dị ka ihe atụ, onye na-eto eto pụrụ ime ihe ndị ọgbọ ya ranyere ya ime ma soro ha see siga. Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị mgbe o bu n’uche ise siga mgbe o si n’ụlọ ha pụọ gawa ụlọ akwụkwọ n’ụbọchị ahụ. Ma ka a na-eme, ọ na-emezi ihe ga-akpatara ya ọrịa na ihe na-adịghị amasị Chineke. (2 Ndị Kọrint 7:1) Gịnị dubara ya n’omume ọjọọ a? Ikekwe o so ndị enyi ọjọọ na-akpakọrịta, ọ chọghịkwa ime ihe ga-ewute ha. Ndị na-eto eto, unu ekwela ka “osi ọnyà” ahụ rata unu ma mata unu n’ọnyà ya! Iji zere ya ịnwụde unu ná ndụ, unu ekwela ka a nwata unu itinye aka ọbụna n’ihe yiri ka ọ dịghị ihe ọ bụ. Ṅaanụ ntị n’ịdọ aka ná ntị dị na Bible ka unu zere mkpakọrịta ọjọọ.—1 Ndị Kọrint 15:33.

7. Olee otú Setan pụrụ isi mee ka ụfọdụ ndị nne na nna leghara ihe ime mmụọ anya?

7 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ndị ji ọrụ ha kpọrọ ihe, anaghị eji ọrụ Akwụkwọ Nsọ nyere ha bụ́ inye ezinụlọ ha ihe ndị na-akpa ha, egwuri egwu. (1 Timoti 5:8) Ma nzube Setan bụ ime ka Ndị Kraịst tinye uche gabiga ókè n’inye ezinụlọ ha ihe ndị na-akpa ha. Ikekwe ha na-ahakarị ọmụmụ ihe n’ihi na ha kwetara ime ihe onye were ha n’ọrụ gwara ha mee nke bụ́ ịrụkwu ọrụ ma ọrụ gbasachaa. Ha nwere ike ịdị na-atụ egwu ịgwa onye were ha n’ọrụ ka o nye ha ohere iji gaa mgbakọ distrikti ebe ha ga-eso ụmụnna ha fee Jehova. Ihe ga-enyere mmadụ aka izere ọnyà a bụ ‘ịtụkwasị Jehova obi.’ (Ilu 3:5, 6) Tụkwasị na nke ahụ, ọ bụrụ na anyị echeta na anyị nile so n’ezinụlọ Jehova nakwa na Jehova weere na iwu ji ya ilekọta anyị, nke a ga-enyere anyị aka ịghara ikwe ka a mata anyị n’ọnyà a. Ndị nne na nna, ùnu kweere na Jehova ga-esi otu ụzọ ma ọ bụ ụzọ ọzọ lekọta unu na ezinụlọ unu ma ọ bụrụ na unu emee uche ya? Ka Ekwensu ọ̀ ga-anwụde unu ná ndụ ma mee ka unu mewe uche ya n’ihi egwu mmadụ? Anyị na-agba unu ume ikpe ekpere mgbe unu na-echebara ajụjụ ndị a echiche.

Ọnyà E Ji Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya Esi

8. Olee otú Setan si eji ịhụ ihe onwunwe n’anya eme ihe?

8 Ihe ọzọ Setan ji amata ndị mmadụ n’ọnyà bụ ime ka ha na-ahụ ihe onwunwe n’anya. Azụmahịa nke ụwa a na-akpali ndị mmadụ ịchọ ịba ụba ọkụ ọkụ, ụdị ụba a nwedịrị ike iduhie ụfọdụ ndị Chineke. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ ịgba ụfọdụ ndị ume, sị: “Rụsie nnọọ ọrụ ike. Ị kpatachaa ego ga-ezuru gị, gị ewerezie ya nwayọọ ma kporiwe ndụ. I nweziri ike ịrụwa ọrụ ọsụ ụzọ mgbe ahụ.” Nke a nwere ike ịbụ echiche na-ezighị ezi nke ụfọdụ ndị na-achọ irigbu ụmụnna ha ndị ha na ha na-efekọ Chineke nwere. Chegodị echiche ihe bụ ebumnobi onye na-ekwu ụdị ihe a. Nke a o yighị echiche ọgaranya ahụ “na-enweghị uche” nke Jizọs kọrọ akụkọ ya?—Luk 12:16-21.

9. N’ihi gịnị ka ịchọ inweta ihe ụfọdụ pụrụ iji mata ụfọdụ Ndị Kraịst n’ọnyà?

9 Setan na-eme ihe n’ụzọ ga-akpali ndị mmadụ inwe oké ọchịchọ inweta ihe dị iche iche. Ọchịchọ dị otú ahụ pụdịrị ịgbanye mkpọrọgwụ n’uche Onye Kraịst nke na ọ ga-akpagbu okwu ahụ, na-eme ka ọ ghara ‘ịmị mkpụrụ.’ (Mak 4:19) Bible na-agba anyị ume ka ihe oriri na ihe mgbokwasị anyị nwere ju anyị afọ. (1 Timoti 6:8) Ma “osi ọnyà” ahụ na-amata ụfọdụ n’ọnyà n’ihi na ha weere na ndụmọdụ a agbasaghị ha. Ọ̀ ga-abụ mpako mere ka ha chee na e nwere ụdị ndụ kwesịịrị ha ibi? Oleekwanụ maka anyị onwe anyị n’otu n’otu? Ọchịchọ inwe ọtụtụ ihe ọ̀ na-eme ka anyị debe ofufe Jehova n’ọnọdụ nke abụọ ná ndụ anyị? (Hagaị 1:2-8) Ọ dị mwute na n’oge ihe siri ike, ụfọdụ na-ahapụ ozi Jehova iji nwee ike ịnọgide na-ebi ụdị ndụ marala ha ahụ́. Ụdị ịhụ ihe onwunwe n’anya dị otú a na-atọgbu “osi ọnyà” ahụ atọgbu!

Ọnyà E Ji Ihe Ntụrụndụ Ndị Rụrụ Arụ Esi

10. Olee nnyocha Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime banyere onwe ya?

10 Aghụghọ ọzọ “osi ọnyà” ahụ ji eme ihe bụ ime ka ndị mmadụ ghara ịma ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Ihe juziri n’ihe ntụrụndụ ndị e nwere taa bụ ụdị àgwà e nwere na Sọdọm na Gọmọra. Ọbụna n’akụkọ ụwa a na-akọ na televishọn nakwa ndị a na-agụta n’akwụkwọ akụkọ ndị a na-ebipụta site n’oge ruo n’oge, a na-ekwukarị okwu banyere ime ihe ike na otú ndị mmadụ ga-esi mejuo agụụ mmekọahụ rụrụ arụ. Ihe ka ukwuu n’ihe ntụrụndụ ndị a na-egosi n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi adịghịzi ekwe ka ndị mmadụ mara ihe bụ́ “ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:14) Ma cheta ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe, ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ.” (Aịsaịa 5:20) “Osi ọnyà” ahụ ò jirila nwayọọ nwayọọ were ihe ntụrụndụ ndị a rụrụ arụ metọọ echiche gị? Ọ dị mkpa ka i nyochaa onwe gị nke ọma.—2 Ndị Kọrint 13:5.

11. Olee ịdọ aka ná ntị e nyere na magazin a banyere ihe nkiri ụfọdụ ndị a na-egosi na televishọn?

11 Ihe dị ka iri afọ abụọ na ise gara aga, Ụlọ Nche ji ịhụnanya dọọ ndị na-efe Jehova aka ná ntị megide ihe nkiri ụfọdụ ndị a na-egosi na televishọn. * Lee otu ihe e kwuru banyere otú ihe nkiri ụfọdụ ndị a si eji aghụghọ arafu ndị mmadụ: “Oké nchọgharị a na-achọgharị ịhụnanya ka a na-agbakwasị ụkwụ na ya wee na-ewere ya na otú ọ bụla e si chọta ya adịghị ihe o mere. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ bu afọ ime na-enweghị di gwara enyi ya, sị: ‘Ahụrụ m Victor n’anya. Ọ dịghị ihe m kpọrọ ihe. . . . Ịmụrụ ya nwa ya nke a m bu n’afọ bụụrụ m ihe nile!’ Ma ụda egwú ahụ dị nro nke na-ada n’ime ime n’ihe nkiri ahụ na-eme ka o sie ike icheta na ụzọ nwa aghọghọ ahụ na-agbaso dị oké njọ. Ị wee malitekwa ịhụ Victor n’anya. Ị wee na-emere nwa agbọghọ ahụ ọmịiko. Ọ na-amalite ‘ikwe gị ghọta.’ ‘Ọ na-adị oké iju anya ụzọ a na-esi amalite na-anakwere ya,’ ka otu onye na-ekiri ya nke mesịrị nwetaghachi uche ya kwuru. ‘Anyị maara na omume ịkwa iko bụ ihe ọjọọ. . . . Ma a ghọtara m na n’ime obi m eso m ha na-ekere òkè na ya.’”

12. Olee eziokwu na-egosi na ịdọ aka ná ntị ahụ a dọrọ banyere ihe nkiri ụfọdụ ndị a na-egosi na televishọn kwesịrị ekwesị maka oge a?

12 Ihe nkiri ndị ahụ na-emerụ echiche mmadụ ejula ebe nile ugbu a karịa ka ọ dị mgbe e bipụtara Ụlọ Nche a kwuru okwu banyere ha. N’ọtụtụ ebe taa, a na-egosigide ihe nkiri ndị ahụ ruo awa iri abụọ na anọ nile e nwere n’ụbọchị. Ụmụ nwoke, ụmụ nwanyị, na ọtụtụ ndị na-eto eto na-awụnye ihe ndị a nile n’obi na n’uche ha kwa ụbọchị. Ma anyị ekwesịghị iduhie onwe anyị ichewe na ihe ndị a adịghị ihe ha mere. Ọ dị njọ ichewe na ntụrụndụ rụrụ arụ adịghị oké njọ ka ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa a. Olee nnọọ ihe Onye Kraịst ga-asị na ọ bụ ya mere ọ ga-eji kwere ka ụdị ndị ọ na-agaghị echetụdị n’echiche ịkpọbata n’ụlọ ya nọrọ n’ụlọ ya na-emere ya ihe nkiri?

13, 14. Olee ihe ụfọdụ ndị kwuru banyere uru ha ritere n’ịdọ aka ná ntị ahụ e nyere banyere televishọn?

13 Ọtụtụ ndị rubere isi n’ịdọ aka ná ntị ahụ sitere n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ritere uru na ya. (Matiu 24:45-47) Mgbe ụfọdụ ndị gụchara ịdọ aka ná ntị ahụ doro anya sitere na Bible, ha detaara ndị na-ebipụta Ụlọ Nche akwụkwọ ịgwa ha otú isiokwu ndị ahụ si nyere ha aka. * Otu n’ime ndị detara akwụkwọ kwuru, sị: “Ruo afọ iri na atọ, ile ụdị ihe nkiri ndị a riri m ahụ́. Echere m na ọ dịghị ihe ha ga-eme m ebe ọ bụ na m na-aga ọmụmụ ihe na-agatụkwa ozi ọma. Ma amalitere m ịkpa ụdị àgwà ndị ndị a na-egosi n’ihe nkiri ndị ahụ na-akpa, nke bụ́ na ọ bụrụ na di gị anaghị elezi gị anya ma ọ bụkwanụ ya adị gị ka ọ hụghị gị n’anya, ihe ọjọọ adịghị ya ma i nwee nwoke ọzọ gị na ya na-eme enyi—ọ bụ di gị kpatara ya. N’ihi ya, mgbe obi m gwara m na ụta adịghịrị m, amalitere m ime ụdị omume ọjọọ a ma mehie megide Jehova nakwa di m.” A chụrụ nwanyị a n’ọgbakọ. N’ikpeazụ, ọ ghọtara onwe ya, chegharịa, a nabatakwa ya n’ọgbakọ. Ịdọ aka ná ntị ndị ahụ e nyere banyere ihe nkiri ụfọdụ ndị a na-egosi na televishọn nyeere ya aka ịghara ikwe ka ihe ndị Jehova kpọrọ asị na-eme ya obi ụtọ.—Emọs 5:14, 15.

14 Onye ọzọ isiokwu ndị ahụ metụrụ ndụ ya kwuru, sị: “Ebere m ákwá mgbe m gụrụ isiokwu ndị ahụ n’ihi na achọpụtara m na ejighịzi m obi m nile na-ejere Jehova ozi. Ekwere m Chineke m nkwa na agaghịzi m abụ ohu nke ihe nkiri ndị ahụ.” Mgbe otu nwanna nwanyị kwusịrị obi ụtọ o nwere maka isiokwu ndị ahụ e bipụtara, o kwetakwara na ikiri ihe nkiri ndị ahụ riri ya ahụ́, wee dee, sị: “Ọ dị mgbe m malitere iche ma ịdị na-ekiri ihe nkiri a mgbe nile ọ̀ ga-emebi mmekọrịta mụ na Jehova. Olee otú m ga-esi ewere ndị a a na-egosi n’ihe nkiri ndị ahụ dị ka ndị enyi m ma n’otu oge ahụ bụrụkwa enyi Jehova?” Ọ bụrụ na ihe nkiri ndị a na-egosi afọ iri abụọ na ise gara aga dị njọ otú ahụ, oleezi ihe a ga-ekwu banyere ndị nke taa? (2 Timoti 3:13) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị chọpụta ụdị ọnyà dị iche iche Setan ji ntụrụndụ ndị rụrụ arụ sie taa, ma hà bịara n’ụdị ihe nkiri a na-egosi na televishọn, n’ụdị egwuregwu vidio ebe a na-eme ihe ike, ma ọ bụ n’ụdị vidio egwú a na-egosi omume rụrụ arụ na ya.

Ọnyà nke O Ji Nghọtahie Esi

15. Olee otú Ekwensu si nwụde ụfọdụ ná ndụ?

15 Setan na-eji nghọtahie na-adị n’etiti mmadụ na ibe ya emere ọnyà o ji akpata nkewa n’etiti ndị Jehova. Ọnyà a nwere ike ịmata anyị n’agbanyeghị ihe ùgwù ije ozi anyị nwere n’ọgbakọ. Ekwensu anwụdela ụfọdụ ná ndụ n’ihi na ha kwere ka nghọtahie ha na ndị kwere ekwe ibe ha nwere weta ọgba aghara, kpaghasịakwa ịdị n’otu na ọganihu Jehova na-eme ka ndị ya na-enwe.—Abụ Ọma 133:1-3.

16. Olee ụzọ aghụghọ Setan ji na-agbalị ịkpata nkewa n’etiti anyị?

16 N’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ, Setan gbalịrị ibibi ndị ohu Jehova nọ n’ụwa site n’iwetara ha mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ma atụmatụ ya kụrụ afọ n’ala. (Mkpughe 11:7-13) Kemgbe ahụzi, o jirila ụzọ aghụghọ dị iche iche na-agbalị ịkpata nkewa n’etiti anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwere ka nghọtahie dị n’etiti anyị na onye ọzọ kpata nkewa, anyị emegheerela “osi ọnyà” ahụ ụzọ ọ ga-esi bata. Anyị nwere ike isi otú a gbochie mmụọ nsọ Chineke ịdị na-arụ ọrụ ná ndụ anyị nakwa n’ọgbakọ anyị. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, Setan ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ọ maara na mgbe ọ bụla udo na ịdị n’otu na-adịghị n’ọgbakọ, ọrụ ikwusa ozi ọma anyị agaghị na-agakwa n’ihu.—Ndị Efesọs 4:27, 30-32.

17. Gịnị pụrụ inyere ndị nwere nghọtahie aka idozi nsogbu ha?

17 Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị na Onye Kraịst ibe anyị enwee nghọtahie? N’eziokwu, ihe nwere ike ime ka Onye Kraịst na ibe ya nwee nghọtahie na-adịgasị nnọọ iche. Otú ọ dị, n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka e nwee nghọtahie, ọ dịghị ihe kwesịrị ime ka a ghara idozi ya. (Matiu 5:23, 24; 18:15-17) Ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, zuokwa okè. Ọ bụrụ na e tinye ụkpụrụ ndị dị na Bible n’ọrụ, ha adịghị aghọ ahịa. Ha na-arụpụtakarị ihe dị mma!

18. N’ihi gịnị ka iṅomi Jehova ga-eji nyere anyị aka idozi nghọtahie dị n’etiti anyị na onye ọzọ?

18 Jehova bụ onye “na-agbaghara mmehie,” ọ bụkwa n’aka ya ka “mgbaghara dị.” (Abụ Ọma 86:5; 130:4) Anyị na-egosi na anyị bụ ụmụ Jehova hụrụ n’anya mgbe anyị na-eṅomi ya. (Ndị Efesọs 5:1) Anyị nile bụ ndị mmehie, mgbaghara Jehova dịkwa anyị ezigbo mkpa. N’ihi ya, anyị aghaghị ịkpachara anya ma ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ịgbaghara onye ọzọ. Anyị nwere ike ịdị ka ohu ahụ Jizọs kwuru okwu ya n’ilu ya, bụ́ onye jụrụ ịgbaghara ohu ibe ya ji ya ụgwọ, bụkwanụ ụgwọ na-enweghị ka ọ hà ma e jiri ya tụnyere nke nna ya ukwu gwarala ya ka ọ hapụzie ịkwụ. Mgbe a gwara nna ya ukwu ihe o mere, o kwuru ka a tụkpuo ohu ahụ na-agbagharaghị ohu ibe ya n’ụlọ mkpọrọ. Jizọs mechiziri ilu ahụ site n’ikwu, sị: “N’ụzọ yiri nke ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu adịghị agbaghara nwanna ya site n’obi unu.” (Matiu 18:21-35) Ịtụgharị uche n’ilu ahụ na iche echiche ugboro ole Jehova gbagharala anyị ga-enyere anyị aka mgbe anyị na-agbalị idozi nghọtahie dị n’etiti anyị na nwanna anyị!—Abụ Ọma 19:14.

Ịbụ Onye E Chebere “n’Ebe Nzuzo nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile”

19, 20. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ‘ebe nzuzo’ nke Jehova na “ndo” ya anya n’oge ndị a dị oké egwu?

19 Anyị bi n’oge dị oké egwu. E wezụga na Jehova ji ịhụnanya na-echebe anyị, Setan gaara ekpochapụwo anyị nile. N’ihi ya, iji zere ịbụ ndị ọnyà “osi ọnyà” ahụ matara, anyị aghaghị ịnọgide n’ebe nchebe ihe atụ ahụ, nke bụ́ ‘ibi n’ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu, na-anọ ọnọdụ abalị n’okpuru ndo nke Onye pụrụ ime ihe nile.’—Abụ Ọma 91:1.

20 Ya adịla mgbe anyị ga-ewere ihe ndị Jehova na-echetara anyị nakwa nduzi ya dị ka iwu ndị na-adịghị ekwe anyị megharịa ahụ́, kama nke ahụ, ka anyị were ha dị ka ihe ndị na-echebe anyị. Anyị nile nwere otu onye iro nwere ọgụgụ isi karịrị nke mmadụ. E wezụga enyemaka Jehova ji ịhụnanya na-enye anyị, Setan gaara amata anyị nile n’ọnyà. (Abụ Ọma 124:7, 8) N’ihi ya ka anyị na-ekpe ekpere ka Jehova napụta anyị n’igbudu nke “osi ọnyà”!—Matiu 6:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 11 Ụlọ Nche, June 1, 1983, peeji nke 3-7.

^ par. 13 Ụlọ Nche (Bekee) December 1, 1983, peeji nke 23.

Ì Chetara?

• Gịnị mere “egwu mmadụ” ji bụrụ ọnyà dị ezigbo njọ?

• Olee otú Ekwensu si eji ịhụ ihe onwunwe n’anya arata ụfọdụ?

• Olee otú Setan sirila jiri ntụrụndụ ndị rụrụ arụ rata ụfọdụ ndị?

• Olee ọnyà Ekwensu ji eme ka e nwee nkewa n’etiti anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 27]

Setan ejirila “egwu mmadụ” mata ụfọdụ n’ọnyà

[Foto dị na peeji nke 28]

Ị̀ na-ekwe ka ihe ndị Jehova kpọrọ asị bụrụ ihe i ji eme ihe ntụrụndụ?

[Foto dị na peeji nke 29]

Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na gị na Onye Kraịst ibe gị enwee nghọtahie?