Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Onye Ọchịchị Bụ́ Ọgaranya Ahọrọ Ime Ihe Ga-aghọ Ya Ahịa

Otu Onye Ọchịchị Bụ́ Ọgaranya Ahọrọ Ime Ihe Ga-aghọ Ya Ahịa

Otu Onye Ọchịchị Bụ́ Ọgaranya Ahọrọ Ime Ihe Ga-aghọ Ya Ahịa

NWA okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya na-akwụwa aka ya ọtọ, na-erube isi n’iwu, jirikwa okpukpe kpọrọ ihe. Mgbe ọ bịakwutere Jizọs, o gburu ikpere n’ala n’ihu ya wee jụọ ya, sị: “Onye Ozizi, olee ihe ọma m na-aghaghị ime iji wee nweta ndụ ebighị ebi?”

Jizọs gwara ya na ọ ghaghị idebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịdị ndụ. Mgbe nwoke ahụ rịọrọ ya ka o kwuo kpọmkwem iwu ndị a chọrọ ka mmadụ debe, Jizọs kwuru, sị: “Egbula ọchụ, Akwala iko, Ezula ohi, Agbala àmà ụgha, Sọpụrụ nna gị na nne gị, nakwa, Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” Ihe ndị a bụ iwu ndị bụ́ isi dị n’Iwu ahụ e si n’aka Mozis nye. Nwa okorobịa ahụ kwuziri, sị: “Edebewo m ihe ndị a nile; gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?”—Matiu 19:16-20.

Jizọs bịara “nwee ịhụnanya n’ebe ọ nọ” wee sị ya: “Otu ihe kọrọ gị: Laa, ree ihe ndị i nwere nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe, bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.”—Mak 10:17-21.

Nwa okorobịa ahụ enweela mkpebi tara akpụ ọ na-aghaghị ime ugbu a. Gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ ga-adị njikere ire ihe nile o nwere ma bịa bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ka ọ̀ ga-ejisi ihe ndị o nwere ike? Ọ̀ ga-achụwa akụ̀ nke ụwa a ka ọ̀ bụ nke eluigwe? Ọ ghaghị ịbụ na o siiri nwoke ahụ ike ịhọrọ nke ọ ga-eme. O doro anya na ihe ndị metụtara ofufe Chineke na-amasị ya ebe ọ bụ na ọ na-edebe Iwu ahụ ma jụọkwa ajụjụ iji mata ihe ndị ọzọ ọ pụrụ ime ka ya na Chineke wee dịkwuo ná mma. Gịnịzi ka o kpebiri ime? Ọ ‘pụrụ ná mwute, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe onwunwe.’—Mak 10:22.

Ihe nwa okorobịa ahụ họọrọ ime bụ ihe amamihe na-adịghị na ya. A sị na ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaara enweta ihe ọ chọrọ, nke bụ́ ndụ ebighị ebi. A gwaghị anyị ihe mesịrị mee nwa okorobịa ahụ. Ma otu ihe anyị maara bụ na ka ihe dị ka afọ iri anọ gasịrị, ndị agha Rom bibiri Jeruselem na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obodo Judia nile. Akụ̀ na ụba ọtụtụ ndị Juu kwakọbara funahụrụ ha, e gbuokwa ọtụtụ n’ime ha.

Pita onyeozi na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ họọrọ ihe ka ihe nwa okorobịa ahụ họọrọ mma. Ha ‘hapụrụ ihe nile’ ma soro Jizọs. Mkpebi ahụ ha mere baara ha nnọọ uru! Jizọs gwara ha na ha ga-enweta ihe ndị ha hapụrụ ọtụtụ okpukpu. Tụkwasị na nke ahụ, ha ga-enweta ndụ ebighị ebi. Mkpebi a ha mere bụ nke ha na-agaghị akwa ụta ma ọlị maka ya.—Matiu 19:27-29.

Anyị nile nwere mkpebi ndị anyị na-aghaghị ime ná ndụ—ụfọdụ n’ime ha adịchaghị mkpa ebe ndị ọzọ dị oké mkpa. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere banyere mkpebi ndị dị otú a? Ị̀ ga-anabata ndụmọdụ ya? Ọ bụrụ na ị nabata ya, ị ga-enweta ngọzi dị ukwuu. Ugbu a, ka anyị tụlee otú anyị ga-esi soro Jizọs ma rite uru na ndụmọdụ o nyere.