Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Ịdị Ndụ Nanị Maka Taa?

Ì Kwesịrị Ịdị Ndụ Nanị Maka Taa?

Ì Kwesịrị Ịdị Ndụ Nanị Maka Taa?

“ECHETỤBEGHỊ M banyere ọdịnihu. Ọ na-abịa ọsọ ọsọ.” E kwuru na ọ bụ ọkà mmụta sayensị a ma ama bụ́ Albert Einstein kwuru okwu ndị ahụ e kwughachirila ọtụtụ ugboro. Ọtụtụ ndị na-eche ihe ndị yiri nke ahụ. Ha nwere ike ikwu, sị: “Olee ihe mmadụ ga-eji chewe banyere ọdịnihu?” Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị nụla ebe ndị mmadụ kwuru ihe ndị dị ka: “Biri ndụ gị gaa n’ihu.” “Kporigodị ndụ taa.” “Chefuo echi.”

Otú ọ dị, isi otú ahụ eche echiche abụghị ihe ọhụrụ. “Rie, ṅụọ, kporie ndụ. Ihe ndị ọzọ bụ ihe efu.” Nke a bụ ụkpụrụ ndị Epikurọs oge ochie gbasoro. Ụfọdụ ndị ha na Pọl onyeozi dịkọrọ ndụ nwere echiche yiri nke ahụ. Echiche ha bụ: “Ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:32) Ha kweere na ndụ a dị mkpụmkpụ bụ nanị ndụ anyị ga-adị, n’ihi ya, ha gbara ndị mmadụ ume iji ndụ a mee ihe nile ha nwere ike ime.

Nye ọtụtụ nde mmadụ bi n’ụwa, iji ndụ a mee ihe nile ha nwere ike ime apụtaghị ikpori ndụ n’eleghị anya n’azụ. Ọnọdụ ọjọọ ọtụtụ ndị nọ na ya na-eme ka ịdị ndụ kwa ụbọchị bụụrụ ha ọgụ na mgba. Olee ihe mere ha ga-eji na-eche banyere ọdịnihu, ya bụ, “echi” nke na-eyikarị ihe ga-ajọgbu onwe ya?

Ànyị Kwesịrị Ime Atụmatụ Banyere Echi?

Ọbụna ndị ọnọdụ ha na-adịrughị njọ otú ahụ anaghị ahụcha mkpa ọ dị ime atụmatụ banyere echi. Ha nwere ike ịjụ, sị: “Olee ihe mere ị ga-eji na-echegbu onwe gị?” Ụfọdụ nwere ike ịnọ na-agwa onwe ha na ndị mere atụmatụ ná ndụ na-emesị kwaa ụta n’ihi enwetaghị ihe ndị ha tụrụ anya ha. Obi dara nnọọ ọbụna nna ochie ahụ dịrị ndụ n’oge ochie bụ́ Job mbà mgbe ọ hụrụ na “e mebiwo” nnọọ atụmatụ ya, mebiere ya ihe gaara enye ya na ezinụlọ ya obi ụtọ n’ọdịnihu.—Job 17:11; Eklisiastis 9:11.

Onye Scotland na-ede uri bụ́ Robert Burns ji ọnọdụ ọjọọ anyị nọ na ya tụnyere nke obere òké ọhịa Burns ji ọgụ ya gwupuo ọnụ ebe o bi n’amaghị ama. Òké ahụ gbara ọsọ ndụ mgbe ọ hụrụ na ihe nile o ji biri alaala n’iyi. Onye ahụ na-ede uri chere, sị: ‘Leenụ, ọ bụ otú a ka ọ na-adị anyị ọtụtụ ugboro mgbe anyị nọ n’ọnọdụ ebe ọ na-adịtụghị ihe anyị nwere ike ime iji nyere onwe anyị aka bụ́ nke na-emekarị ka ọbụna atụmatụ ndị kasị mma anyị tụrụ kụọ nnọọ afọ n’ala.’

Nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ baghị uru ime atụmatụ maka ọdịnihu? Nke bụ́ eziokwu bụ na emeghị ezigbo atụmatụ nwere ike imebi ihe mgbe e nwere ajọ ifufe ma ọ bụ ọdachi ndị ọzọ na-emere onwe ha. Ee, dị ka ihe atụ, ọ dịghị onye gaara egbochili Ajọ Ifufe Katrina. Ma, a sị na e lepụtụkwuru anya n’ihu ma mee atụmatụ maka ya, á gaaraghị ebelata ihe ndị o mebiiri obodo ahụ o mere na ya na ndị bi na ya?

Olee ihe i chere? Amamihe ọ̀ dị nnọọ n’ịdị ndụ nanị maka taa ma chefuo echi? Tụlee ihe isiokwu na-esonụ nwere ikwu maka nke a.

[Foto dị na peeji nke 3]

“Rie, ṅụọ, kporie ndụ. Ihe ndị ọzọ bụ ihe efu”

[Foto dị na peeji nke 4]

Ilepụ anya n’ihu na ime atụmatụ ọ̀ gaara ebelata ihe Ajọ Ifufe Katrina mebiri?

[Ebe E Si Nweta Foto]

U.S. Coast Guard Digital