Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịṅụrị Ọṅụ Maka ‘Mmeri O So Nwa Atụrụ ahụ Merie’

Ịṅụrị Ọṅụ Maka ‘Mmeri O So Nwa Atụrụ ahụ Merie’

Ịṅụrị Ọṅụ Maka ‘Mmeri O So Nwa Atụrụ ahụ Merie’

N’OTU akwụkwọ ozi Carey W. Barber dere n’afọ 1971, o chetara afọ iri ise ndị mbụ o ji jeere ezi Chineke ozi, ọ sịrị: “Oge ndị m ji jeere Jehova ozi atọọla m nnọọ ụtọ. Mkpakọrịta nke mụ na ndị ya; nchebe ọ na-echebe m pụọ n’aka ndị ọjọọ nọ n’ụwa Setan; olileanya nke iso Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, nwee mmeri; nakwa ihe àmà ndị na-egosi na Jehova hụrụ m n’anya na-enye m ezigbo udo nke obi na afọ ojuju na-eche obi m nche ma na-emesi m obi ike na m ga-enwe mmeri n’ikpeazụ.”

Ka afọ isii gasịrị, Nwanna Barber, bụ́ Onye Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, sonyere n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ka ọ na-eje ozi ahụ n’ime afọ iri atọ sochirinụ, ọ nọgidere na-elepụ anya n’ihu ‘iso Nwa Atụrụ ahụ nwee mmeri.’ O mezuru nke ahụ site n’ikwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ọ nwụrụ na Sunday, April 8, 2007, ka ọ gbasịrị otu narị afọ na otu.—1 Ndị Kọrint 15:57.

A mụrụ Carey Barber n’England, n’afọ 1905, e mekwara ya baptizim na Winnipeg, Canada, n’afọ 1921. Ka afọ abụọ gasịrị, ya na ejima ya, bụ́ Norman, gafere Brooklyn, New York, iji nye aka n’ọrụ ọhụrụ a malitere ebe ahụ. N’oge ahụ, ndị Jehova ka na-achọ ịmalite ibipụtawa akwụkwọ nke ha iji gbasaa ozi ọma nke Alaeze ahụ “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14) Otu n’ime ọrụ ndị mbụ Nwanna Barber rụrụ bụ iji obere ígwè obibi akwụkwọ na-ebipụta akwụkwọ. Otu ihe so n’ihe ndị e bipụtara bụ akwụkwọ ebe e deturu ikpe ndị a ga-ewega n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States. Ka oge na-aga, Nwanna Barber rụrụ ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi, na-ahụ maka ihe ndị metụtara ọgbakọ na ọrụ ikwusa ozi ọma ná mba ahụ nile.

N’ihi ọrụ ndị a ọ rụrụ, Nwanna Barber ruru nnọọ eru mgbe e zigara ya ịrụ ọrụ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’afọ 1948, ịdị na-eleta mgbakọ dị iche iche na ọgbakọ nile dị n’ebe ọdịda anyanwụ United States. O kwuru na ọ tọrọ ya nnọọ ụtọ ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ikuku ndụ ana-ekusa ya. Ozi a mere ka ọtụtụ ụmụnna mata Nwanna Barber. Amamihe na ịnụ ọkụ n’obi ya n’ebe ozi a dị bịara baa nnọọ uru mgbe o mesịrị gaa klas nke iri abụọ na isii nke Watchtower Bible School of Gilead. N’oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ya na otu nwa akwụkwọ si Canada, aha ya bụ Sydney Lee Brewer bịara mara onwe ha nke ọma. Mgbe ha gụsịrị akwụkwọ, ha lụrụ ma nwee ezumike ha dị ka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ mgbe ha na-eme obere njem ịga leta ọgbakọ ndị dị n’ógbè Chicago, Illinois. Nwanna Nwanyị Barber ghọọrọ nnọọ di ya ezigbo onye ibe na onye nkwado n’ime iri afọ abụọ ahụ ha rụrụ ọrụ njegharị ahụ.

Ndị ha na Nwanna Barber mekọrọ ihe na ndị matara ya n’ime iri afọ ndị ahụ o ji jee ozi dị ka onye nlekọta distrikti na sekit ma ọ bụ n’ime iri afọ atọ o ji rụọ ọrụ ma mee njem dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi ga na-echeta okwu ya na azịza ya ndị na-akpali akpali. Anyị nwere nnọọ ihe mere anyị ga-eji ṅụrịa ọṅụ ná ‘mmeri o so Nwa Atụrụ ahụ merie.’