Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ụgbọ Kitim” Na-agba n’Oké Osimiri

“Ụgbọ Kitim” Na-agba n’Oké Osimiri

“Ụgbọ Kitim” Na-agba n’Oké Osimiri

A LỤWO ọtụtụ agha mmiri n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Mediterenian. Gbalịa iji anya nke uche gị hụ otu nke a lụrụ narị afọ ise tupu Kraịst abịa n’ụwa. Otu ụgbọ mmiri na-efe ọsọ nke nwere ìgwè ndị ọkwọ ụgbọ mmiri atọ ji nnọọ ọsọ na-aga n’elu mmiri. Ihe dị ka otu narị ndị ọkwọ ụgbọ mmiri na iri asaa bụ́ ndị nọ n’ebe atọ dị iche iche n’ụgbọ ahụ ji nnọọ ike ha nile na-akwọ ụgbọ ahụ, ihe e ji akpụkpọ anụ mee e kenyere ha n’ike na-emekwa ka ike ghara ịfụ ha ụfụ ka ha na-akwagharị ụmara ụgbọ ahụ ihu na azụ.

Ụgbọ ahụ, bụ́ nke na-agba kilomita iri na atọ ruo iri na asaa n’otu awa, ji ọsọ na-agbafe ebili mmiri ma na-aga izute ụgbọ ndị iro. Ụgbọ ahụ ọ na-aga izute nwara ịgbalaga. Kpọmkwem mgbe ahụ ọ nọ n’ihe ize ndụ, ike ọsọ gwụrụ ya, nke ahụ mekwara ka akụkụ ya chee nnọọ ụgbọ ahụ ji ọsọ na-agbakwute ya ihu. Okporo ígwè ahụ e ji ọla nchara techie nke dị n’okpuru ụgbọ ahụ nke ìgwè ndị ọkwọ ụgbọ mmiri na-akwọ kpọkara akụkụ ụgbọ nke ọzọ ahụ bụ́ nke na-esighị ike. Ụda osisi ụgbọ ahụ a kpọkara akpọka na ụda mmiri ji ike na-asọbata n’ime ya menyere ndị na-akwọ ụgbọ ndị iro ahụ ụjọ. Obere ìgwè ndị agha ahụ bú ọtụtụ ngwá agha si n’ụgbọ nke ha gbaba n’ụgbọ ahụ e bibiri ebibi iji lụso ndị nọ na ya agha. Ee, a rụsiri nnọọ ụfọdụ ụgbọ ndị oge ochie ike!

Ndị na-amụ Bible enwewo nnọọ mmasị ịghọta akụkụ Bible ndị kwuru banyere “Kitim” na “ụgbọ Kitim,” bụ́ ndị ụfọdụ ha kwuru banyere ya n’ụzọ amụma. (Ọnụ Ọgụgụ 24:24; Daniel 11:30; Aịsaịa 23:1) Olee nnọọ ebe Kitim dị? Olee ihe ndị anyị maara banyere ụgbọ mmiri ya? Oleekwa ihe mere ị kwesịrị iji nwee mmasị n’azịza nke ajụjụ ndị ahụ?

Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kpọrọ Kitim “Chethimos,” jikọta ya na obodo Saịprọs mmiri gbara gburugburu. Obodo Kition (ma ọ bụ, Citium) nke dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke obodo a mmiri gbara gburugburu mekwuru ka e chee na e nwere ihe jikọtara Kitim na Saịprọs. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ụzọ ndị e si aga ahịa n’oge ochie sicha na Saịprọs gafee, obodo ahụ ritere nnọọ uru n’ihi ịnọ nso n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Mediterenian. Ebe Saịprọs dị na-amanye ya ịkwado otu n’ime mba abụọ ndị na-alụ agha, ọ ghọkwara onye nkwado ma ọ bụ onye mmegide siri ike.

Ndị Saịprọs na Oké Osimiri

Ihe ndị e gwutere n’ala mmiri na ndị a hụrụ n’ili, nakwa ihe odide oge ochie na ihe ndị e sere n’ahụ́ ite ụrọ, na-enyere anyị aka ịghọta otú ụgbọ ndị si Saịprọs na-adị. Ndị Saịprọs oge mbụ bụ aka ochie n’ịrụ ụgbọ mmiri. Obodo ahụ mmiri gbara gburugburu nwere nnọọ oké ọhịa, ebe ndị osimiri sọbatara n’ala ghọkwara nnọọ ọdụ ụgbọ mmiri. A na-egbutu osisi iji rụọ ụgbọ nakwa iji gbazee ọla kọpa—bụ́ akụ̀ dị n’ime ala nke mere Saịprọs ji bụrụ mba a ma ama n’ụwa n’oge ochie.

Ndị Fonishia, bụ́ ndị na-ehiwe ógbè ndị ha na-achị n’obodo ndị dị n’ụzọ ndị ha si aga ahịa, chọpụtara na ndị Saịprọs na-ebuga ọtụtụ ngwá ahịa ná mba ọzọ. Otu n’ime ógbè ndị ahụ bụ Kition, nke dị na Saịprọs.—Aịsaịa 23:10-12.

Mgbe Taịa dasịrị, o yiri ka ụfọdụ ndị bi na ya hà gbagara ọsọ ndụ na Kitim. Ikekwe, ndị Fonishia chịrị Saịprọs, bụ́ ndị nwere ahụmahụ n’ịkwọ ụgbọ mmiri, so nnọọ mee ka ndị Saịprọs ghọọ ndị ma nke a na-akọ n’ịrụ ụgbọ mmiri e ji alụ agha. Ebe dị mma Kition dị chebekwara nnọọ ụgbọ mmiri ndị Fonishia.

Ndị So Nnọọ Mba Ndị Ọzọ Zụkọrịta Ahịa

Azụmahịa nke ebe ọwụwa anyanwụ Mediterenian n’oge ahụ adịghị mfe. Ụgbọ mmiri na-esi na Saịprọs buru ngwá ahịa ndị dị oké ọnụ ahịa gaa Krit, Sardinia, na Sisili nakwa n’obodo ndị ọzọ Oké Osimiri Aegean gbara gburugburu. A hụla ite na ọkwá ndị si Saịprọs n’ebe ndị dị otú ahụ, a hụkwala ọtụtụ ọmarịcha ite ájá Mycenae (Gris) na Saịprọs. Mgbe ụfọdụ ndị ọkà mmụta tụlere ihe ụfọdụ e ji ọla kọpa kpụọ bụ́ ndị a chọtara na Sardinia, ha kweere na ihe ndị ahụ si Saịprọs.

N’afọ 1982, a chọtara otu ụgbọ mmiri kpuru ná ngwụsị narị afọ nke 14 T.O.A. na nso otu ụsọ oké osimiri dị n’ebe ndịda Turkey. E gwutere ọtụtụ ihe dị iche iche dị oké ọnụ ahịa n’ala mmiri—ihe ndị e ji ọla kọpa kpụọ, bụ́ ndị e chere sitere na Saịprọs, amber, ite ndị Kenan, ebony, ọdụ́ enyí, ọtụtụ ọla ndị Kenan e ji ọlaọcha na ọlaedo mee, na ihe ndị a kpụrụ akpụ yiri ébé na arịa ndị ọzọ si n’Ijipt. Mgbe ụfọdụ ndị nyochara ụrọ e ji kpụọ ite ndị ahụ, ha kwuru na ma eleghị anya ụgbọ ahụ bụ nke ndị Saịprọs.

Ọ bụ nnọọ ihe na-akpali mmasị na n’ihe dị ka n’oge ahụ e kwuru na ụgbọ mmiri a kpuru, Belam kwuru banyere ụgbọ Kitim ‘n’ilu ọ tụrụ.’ (Ọnụ Ọgụgụ 24:15, 24) O doro anya na ụgbọ Saịprọs aghọọla nnọọ ihe a ma ama n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Olee otú ụgbọ ahụ na-adị?

Ụgbọ Ahịa

A chọtala ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji ụrọ kpụọ n’ebe ndị a na-eli ozu n’obodo Amathus oge ochie dị na Saịprọs. Ihe ndị a a chọtara na-egosi nnọọ otú ụgbọ ndị Saịprọs na-adị, ụfọdụ dịkwa n’ebe ndebe ihe mgbe ochie.

Ihe ọkpụkpụ ndị ahụ na-egosi na e ji ụgbọ ndị ahụ zụọ ahịa nkịtị. Ọ bụ ndị ọkwọ ụgbọ mmiri iri abụọ na-akwọkarị ụgbọ mmiri ndị na-ebuchaghị ibu. A rụrụ ụgbọ ndị ahụ ime ha dị omimi ma dị obosara maka iji ha ebu ngwá ahịa na ndị njem gaa n’ebe ndị dịgasị n’ụsọ oké osimiri Saịprọs. Pliny nke Okenye kwuru na ndị Saịprọs rụrụ obere ụgbọ nke na-adịghị arọ e ji ụmara akwọ nke nwere ike ibu ibu dị iri tọn itoolu n’arọ.

E nwekwara ụgbọ mmiri ndị buru ibu karịa e ji zụọ ahịa, dị ka nke a hụrụ na nso ụsọ oké osimiri Turkey. Ụfọdụ nwere ike ibu ngwa ahịa ruru narị tọn anọ na iri ise n’arọ gbaa n’oké osimiri. Ụgbọ mmiri ndị buru ibu nwere ike inwe ihe ruru iri ndị ọkwọ ụgbọ ise, ha na-adị iri abụọ na ise nọrọ n’akụkụ nke ọ bụla, ụgbọ ahụ na-adịkwa mita iri atọ n’ogologo ma nwee ákwà ifufe dị elu karịa mita iri.

Ụgbọ Agha “Kitim” na Amụma Bible

E si n’ike mmụọ nsọ Jehova kwuo okwu a: “Ụgbọ ụfọdụ ga-esi n’akụkụ Kitim bịa, ha ga-ewedakwa Asiria n’ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 24:2, 24) Amụma a ò mezuru? Olee otú ụgbọ mmiri ndị si Saịprọs si soro mezuo amụma a? ‘Ụgbọ ụfọdụ ndị ahụ ga-esi n’akụkụ Kitim bịa’ abụghị ụgbọ ndị ahịa na-agba n’Oké Osimiri Mediterenian. Ha bụ ụgbọ agha ndị na-eweta nsogbu.

Ka ihe ndị agha chọrọ gbanwere, a rụpụtara ụgbọ mmiri ndị ka sie ike ma na-agba ọsọ karị. O nwere ike ịbụ na ụgbọ agha ndị Saịprọs oge mbụ yiri ụgbọ e sere ese nke a chọtara n’Amathus. Ọ bụ ụgbọ mmiri dị ogologo ma dị warawara nke ọdụ ya rọgoro elu ma rọba ime, bụ́ nke yiri ụgbọ agha ndị Fonishia. O nwere ọnụ toro ogologo na ọta ndị dị gburugburu n’akụkụ ya abụọ n’ebe dị nso n’ọdụ ụgbọ ahụ na n’ebe dị nso n’ebe ihu.

A rụpụtara ụgbọ mmiri mbụ nwere ebe abụọ ndị na-akwọ ya na-anọ na Gris na narị afọ nke asatọ T.O.A. Ụgbọ mmiri ndị a dị ihe dị ka mita iri abụọ na anọ n’ogologo na mita atọ n’obosara. Na mbụ, a na-eji ụgbọ mmiri ndị ahụ ebu ndị dike, ebe ha na-alụ agha bụkwanụ n’ala. N’oge na-adịghị anya, a hụrụ uru ọ bara ịrụnye ebe nke atọ ndị ọkwọ ụgbọ ga na-anọ, a rụnyekwara okporo ígwè e ji ọla nchara techie n’ihu ụgbọ ahụ. A bịara mara ụgbọ ọhụrụ ahụ dị ka ụgbọ nwere ebe atọ ndị na-akwọ ya na-anọ, dị ka e kwuru ná mmalite nke isiokwu a. Ụdị ụgbọ a wuru nnọọ ewu n’oge a lụrụ agha Salamis (n’afọ 480 T.O.A.), bụ́ mgbe ndị Gris meriri ndị agha mmiri ndị Peshia.

Ka e mesịrị, mgbe Alexander Onye Ukwu na-agba mbọ ịghọ eze na-achị ụwa, o ji ọtụtụ ụgbọ mmiri ya ndị nwere ebe atọ ndị na-akwọ ha na-anọ tinye isi n’ebe ọwụwa anyanwụ. A rụrụ ụdị ụgbọ mmiri ndị ahụ maka agha, ọ bụghị maka njem n’oké osimiri, n’ihi na ha enwechaghị ebe e nwere ike ịkwanye ihe. N’ihi nke a, ha na-akwụsị n’obodo dị iche iche Oké Osimiri Aegean gbara gburugburu iji were ihe ndị dị ha mkpa na iji rụzie ihe ụfọdụ. Ihe Alexander bu n’obi bụ ịga bibie ụgbọ agha mmiri ndị Peshia. Otú ọ dị, iji mezuo nke ahụ, ọ ghaghị ibu ụzọ gafee obodo Taịa e wusiri ike nke mmiri gbara gburugburu. Ọ kwụsịtụrụ na Saịprọs ka ọ na-aga.

Ndị Saịprọs kwadoro Alexander Onye Ukwu mgbe ọ nọchibidoro Taịa (n’afọ 332 T.O.A.), ha nyekwara ya otu narị ụgbọ na iri abụọ. Ndị eze Saịprọs atọ du ọtụtụ ụgbọ sonyere Alexander. Ha so nọchibido Taịa ruo ọnwa asaa. A kwaturu Taịa, dị ka amụma Bible si kwuo. (Ezikiel 26:3, 4; Zekaraịa 9:3, 4) Alexander nyere ndị eze Saịprọs ike ọchịchị pụrụ iche iji kelee ha.

Mmezu Dị Ịrịba Ama

Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ aha ya bụ Strabo kọrọ na Alexander ji ụgbọ mmiri ndị si Saịprọs na Fonishia mee ihe mgbe ọ na-alụso Arebia agha. Ụgbọ mmiri ndị a adịghị arọ, ha na-adịkwa mfe ntụghasị, n’ihi ya, ha na-eru Thapsacus (Tifsa) nke dị n’ebe ugwu Siria n’ime abalị asaa. (1 Ndị Eze 4:24) Site n’ebe ahụ, ọ ga-adịziri ha mfe ime njem site na mmiri ruo Babilọn.

Ya mere, ihe yiri ihe na-edoghị anya e kwuru na Bible mezuru nnọọ ihe dị ka narị afọ iri ka e mesịrị! N’ịkwekọ n’ihe dị n’Ọnụ Ọgụgụ 24:24, ndị agha Alexander Onye Ukwu zọọrọ nnọọ njem n’eleghị anya n’azụ banye n’ebe ọwụwa anyanwụ site na Masedonia ma merie ndị Asiria, mesịakwa merie Alaeze Ukwu Midia na Peshia.

Ọbụna akụkọ na-ezuchaghị ezu anyị nwetara banyere “ụgbọ Kitim” na-ekwu nnọọ banyere mmezu dị ịrịba ama nke amụma Bible. Ihe akaebe dị otú ahụ sitere n’akụkọ ihe mere eme na-eme ka anyị kwenyesikwuo ike na e kwesịrị ịtụkwasị amụma ndị dị na Bible obi. Ọtụtụ amụma ndị dị otú ahụ metụtara nnọọ ọdịnihu anyị, n’ihi ya, anyị kwesịrị iji ha kpọrọ ihe.

[Map dị na peeji nke 16, 17]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ỊTALI

Sardinia

Sisili

Oké Osimiri Aegean

GRIS

Krit

LIBIA

TURKEY

SAỊPRỌS

Kition

Taịa

IJIPT

[Foto dị na peeji nke 16]

Ihe osise nke ụgbọ agha ndị Gris, nke nwere ebe atọ ndị na-akwọ ya na-anọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ihe osise nke ụgbọ agha ndị Fonishia oge ochie, nke nwere ebe abụọ ndị na-akwọ ya na-anọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọkwá e sere ụgbọ ndị Saịprọs n’ahụ́ ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

E bipụtara ya site n’ikike a natara Onyeisi Na-elekọta Ihe Ochie na Ebe Ndebe Ihe Ochie nke Saịprọs

[Foto dị na peeji nke 18]

Ụgbọ ndị na-ebu ngwá ahịa n’oge ochie, dị ka ndị nke e kwuru banyere ha n’Aịsaịa 60:9