Gaa n’Ebe Ìhè ahụ Dị
Gaa n’Ebe Ìhè ahụ Dị
ÌHÈ sitere n’ụlọ nduzi ndị ọrụ ụgbọ mmiri azọọla ndụ ọtụtụ mmadụ. Ma, ihe ìhè onye njem ike gwụrụ hụrụ n’ebe dị anya na-eme abụghị nanị ime ka ọ mara na o ruwela ala nso bụ́ ebe ihe ndị dị n’okpuru mmiri nwere ike imebiri ya ụgbọ ya. Ọ na-emekwa ka ọ mara na o ruwela ebe ọ na-aga. N’ụzọ yiri nke ahụ, Ndị Kraịst taa na-eru nso n’ọgwụgwụ nke ogologo njem ha meworo n’ụwa gbara ọchịchịrị na nke na-anaghị ele ndị na-efe Chineke anya ọma. Na Bible, e ji ụmụ mmadụ—ọha mmadụ kewapụrụ onwe ha n’ebe Chineke nọ—tụnyere “oké osimiri nke na-amagharị amagharị: n’ihi na ọ pụghị ịdị jụụ, mmiri ya na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.” (Aịsaịa 57:20) Ọ bụ n’ụwa dị otú a ka ndị Chineke bi. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere olileanya na-enye ọṅụ na a ga-azọpụta ha, bụ́ olileanya bụụrụ ha ìhè ihe atụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi. (Maịka 7:8) N’ihi enyemaka Jehova na Okwu ya e dere ede, “a ghaworo onye ezi omume ìhè dị ka mkpụrụ, a ghawokwara ndị ziri ezi n’obi ọṅụ.”—Abụ Ọma 97:11. *
Otú ọ dị, Ndị Kraịst ụfọdụ ekwerela ka ihe ndị na-adọpụ uche mee ka ha si n’ìhè Jehova pụọ nke na okwukwe ha akpọkawo n’ihe a pụrụ iji tụnyere nkume ndị zoro ezo—dị ka ịhụ ihe onwunwe n’anya, omume rụrụ arụ, ma ọ bụ ọbụna ndapụ n’ezi ofufe. Ee, dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ‘ụgbọ ụfọdụ ndị taa ekpuwo n’ihe banyere okwukwe ha.’ (1 Timoti 1:19; 2 Pita 2:13-15, 20-22) A pụrụ iji ụwa ọhụrụ tụnyere ọdụ ụgbọ mmiri nke ebe anyị na-aga. Ebe ọ dị nnọọ nso ugbu a, ọ ga-abụ nnọọ ihe jọgburu onwe ya mmadụ imebi mmekọrịta ya na Jehova ugbu a!
Zere ‘Ụgbọ Gị Ikpu n’Ihe Banyere Okwukwe Gị’
Na narị afọ ndị gara aga, ụgbọ mmiri nwere ike ịgba n’ime oké osimiri n’enweghị ihe mere ya ma kpọkaa mgbe o rutewere n’ọdụ ụgbọ mmiri. Ọtụtụ mgbe, ebe kasị adị ize ndụ mgbe a na-eme njem bụ mgbe ụgbọ mmiri na-eru ala nso. N’otu aka ahụkwa, nye ọtụtụ ndị, oge kasị dịrị njọ n’akụkọ ihe mere eme nke ụmụ mmadụ bụ ‘ụbọchị ikpeazụ’ nke ụwa a anyị bi na ya. Bible kọwara ya nke ọma dị ka oge “siri ike obibi,” karịsịa nye Ndị Kraịst raara onwe ha nye Chineke.—2 Timoti 3:1-5.
Gịnị mere ụbọchị ikpeazụ a ji sie nnọọ ike? Setan maara na ya nwere nanị “oge dị mkpirikpi” iji lụsoo ndị Chineke agha. N’ihi ya, o tinyekwuola ihe ná mgbalị o ji obi ọjọọ na-eme imebi okwukwe ha. (Mkpughe 12:12, 17) Otú ọ dị, anyị na-enweta enyemaka na nduzi. Jehova anọgidela na-abụ ebe mgbaba nke ndị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ya. (2 Samuel 22:31) O nyewo anyị ịdọ aka ná ntị site n’ihe atụ ndị na-ekpughe atụmatụ ọjọọ Setan na-eji aghọgbu ndị mmadụ. Ugbu a, ka anyị tụlee ihe atụ abụọ dị otú ahụ nke gbasara mba Izrel ka ha na-abịaru Ala Nkwa ahụ nso.—1 Ndị Kọrint 10:11; 2 Ndị Kọrint 2:11.
Na Nso Ala Nkwa Ahụ
Mozis duuru ndị Izrel si n’Ijipt pụta. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, ha rutere nso n’ebe ndịda nke Ala Nkwa ahụ. N’ihi ya, Mozis zigara ndị ikom iri na abụọ ka ha gaa ledoo ala ahụ. Ndị nledo iri na-enweghị okwukwe ji akụkọ ọjọọ lọta, kwuo na ndị Izrel agaghị emerili ndị Kenan n’ihi na ha “toro ogologo” ma nwee ngwá agha. Olee otú nke ahụ si metụta ndị Izrel? Ọnụ Ọgụgụ 13:1, 2, 28-32; 14:1-4.
Akụkọ ahụ gwara anyị na ha malitere ịtamu ntamu megide Mozis na Erọn, na-asị: “N’ihi gịnị ka Jehova na-eme ka anyị baa n’ala nke a? Ndị inyom anyị na ụmụntakịrị anyị ga-aghọ ihe nlụta n’agha: . . . Ka anyị mee otu onye onyeisi, ka anyị laghachikwa n’Ijipt.”—Chetụdị echiche! Otu ndị a hụrụ otú Jehova si mechuo alaeze ukwu bụ́ Ijipt ihu—bụ́ mba na-achị ụwa n’oge ahụ—site n’iti ya ajọ ihe otiti iri, ha hụkwara ọrụ ebube dị egwu ọ rụrụ n’Oké Osimiri Uhie. Ha na-elekwa nnọọ Ala Nkwa ahụ anya, n’ihi ya, nanị ihe fọọrọ ha bụ iche ihu na ya dị ka ụgbọ mmiri na-eche ihu n’ìhè nke ụlọ nduzi nke ebe ọ na-aga. N’agbanyeghị nke ahụ, ha kweere na Jehova agaghị akwatuli obere alaeze ndị kewasịrị ekewasị dị na Kenan. Lee ka omume enweghị okwukwe nke ndị Izrel na-aghaghị isiwo wute Chineke na ndị nledo abụọ ahụ nwere obi ike, bụ́ Jọshụa na Keleb, bụ́ ndị kwetara na Kenan dị ka “nri [Izrel]”! Mmadụ abụọ ahụ ji anya ha hụ otú obodo ahụ dị n’ihi na ha ji ụkwụ ha gagharịa na Kenan. Mgbe ndị ahụ na-abaghị n’Ala Nkwa ahụ, Jọshụa na Keleb nọkwara n’ọzara ruo ọtụtụ afọ, ma ha esoghị ndị ahụ na-enweghị okwukwe nwụọ n’ebe ahụ. O doro anya na Jọshụa na Keleb duuru ọgbọ sochirinụ pụọ n’ọzara ahụ ma gawa n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 14:9, 30) Mgbe ndị Izrel bịaruru nso n’Ala Nkwa ahụ na nke ugboro abụọ ya, a ga-ele ha ule dị iche. Hà ga-agafeli ule ahụ?
Eze Belak nke Moab nwara ime ka onye amụma ụgha bụ́ Belam bụọrọ ya ndị Izrel ọnụ. Ma, Jehova mebiri atụmatụ ahụ site n’ime Ọnụ Ọgụgụ 22:1-7; 24:10) Nke ahụ emeghị ka ike gwụ Belam, kama nke ahụ, o ji aghụghọ kpaa nkata ọzọ, nke ga-eme ka ndị Chineke gharakwa iru eru ịbanye n’ala ahụ. Olee otú o si mee ya? Site n’ime ka ha daba n’omume rụrụ arụ na ife Bel. Ọ bụ ezie na atụmatụ ahụ agachaghị nke ọma, o mere ka iri puku ndị Izrel abụọ na anọ mee omume rụrụ arụ. Ha sooro ndị inyom Moab nwee mmekọahụ rụrụ arụ ma kekọta onwe ha n’ahụ́ Bel-peoa.—Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9.
ka Belam gọzie ha kama ịbụ ha ọnụ. (Cheedị echiche banyere nke ahụ! Ọtụtụ n’ime ndị Izrel ahụ ji nnọọ anya ha hụ otú Jehova si dufee ha ‘n’ọzara ukwu ahụ dị egwu’ n’udo. (Deuterọnọmi 1:19) N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ọ fọrọ nnọọ obere ka ha nweta ihe nketa ha, ndị Chineke dị puku iri abụọ na anọ dabara n’ọchịchọ anụ ahụ́, Jehova egbuokwa ha. Nke a bụ nnọọ ihe ịdọ aka ná ntị nye ndị ohu Chineke taa ka ha na-eru ihe nketa ka Ala Nkwa ahụ nso!
Ná mgbalị ikpeazụ Setan na-eme iji mee ka ndị ohu Jehova ghara inweta ụgwọ ọrụ ha, ọ na-ejikwa ụzọ ndị o ji na-eme ihe kemgbe ụwa eme ihe. Site n’ime ihe na-echetara anyị ihe mere mgbe mbụ ndị Izrel rutewere Ala Nkwa ahụ, Setan na-anwakarị ime ka anyị tụwa ụjọ ma nwewe obi abụọ, site n’iyi anyị egwu, ịkpagbu anyị, ma ọ bụ ịkwa anyị emo. Ụfọdụ Ndị Kraịst adawo n’ihi iyi egwu dị otú ahụ. (Matiu 13:20, 21) Ihe ọzọ o ji na-enweta ndị mmadụ bụ imebi omume ha. Mgbe ụfọdụ, ndị gbebatara n’ọgbakọ Ndị Kraịst agbaliwo imebi ndị okwukwe ha na-esighị ike, bụ́kwa ndị na-ejichaghị obi ha na-eje ije n’ìhè nke Chineke.—Jud 8, 12-16.
Ndị siri ike ma mụrụ anya n’ofufe ha na-efe Chineke maara na omume ọjọọ na-amụba amụba n’ụwa na-egosi nnọọ na Setan na-agbazi egwú ụla. Ee, Setan maara na n’oge na-adịghị anya, ọ dịkwaghị ihe ọ ga-emeli ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi. N’ihi ya, anyị kwesịrị nnọọ ịmụrụ anya ugbu a iji zere mgbalị ndị Setan na-eme imebi mmekọrịta anyị na Chineke.
Ihe Ndị Ga-enyere Anyị Aka Ịmụrụ Anya ná Mmekọrịta Anyị na Chineke
Pita onyeozi kọwara okwu amụma Chineke dị ka “oriọna na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị,” n’ihi na ọ na-enyere Ndị Kraịst aka ịhụ na ịghọta otú nzube Chineke si na-emezu. (2 Pita 1:19-21) Ndị zụlitere ịhụnanya maka Okwu Chineke ma nọgide bụrụ ndị ọ na-eduzi na-achọpụta na Jehova ga-eme ka ụzọ ha zie ezie. (Ilu 3:5, 6) Ebe ha nwere nnọọ olileanya, ndị dị otú ahụ nwere ekele ‘na-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma,’ ebe ndị na-amaghị Jehova ma ọ bụ ndị jụrụ ụzọ ya na-enwe nnọọ “ihe mgbu nke obi” na “ntiwa nke mmụọ.” (Aịsaịa 65:13, 14) N’ihi ya, site n’ịmụchi Bible anya na ime ihe ndị anyị mụtara, anyị ga-enwe ike ilegide anya n’olileanya anyị e ji n’aka kama ilegide anya n’ihe ụtọ ndị na-agaghị adịgide adịgide nke ụwa a.
Ekpere dịkwa mkpa ka anyị wee nwee ike ịmụrụ anya ná mmekọrịta anyị na Chineke. Mgbe Jizọs na-ekwu banyere ọgwụgwụ nke oge a, o kwuru, sị: “Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe nile ka unu wee nwee ihe ịga nke ọma n’ịgbanahụ ihe ndị a nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:34-36) Rịba ama otú Jizọs si jiri okwu ahụ bụ́ “arịrịọ” mee ihe, nke bụ́ ikpesi nnọọ ekpere ike. Jizọs maara na ọ ga-esi ike mmadụ inweta ndụ ebighị n’oge a tara akpụ. Ekpere gị ọ̀ na-egosi na ọ na-agụsi gị agụụ ike ịnọgide na-amụrụ anya ná mmekọrịta gị na Chineke?
Ka anyị ghara ichefu na ebe kasị adị ize ndụ na njem ụgbọ mmiri anyị na-eme iji rute n’ihe nketa anyị bụ ná ngwụsị nke njem anyị. N’ihi ya, ọ dị nnọọ mkpa ka anya anyị dịgide n’ìhè ahụ nke pụrụ iduga anyị ná nzọpụta.
Zere Ìhè Ọkụ Ndị Na-eduhie Eduhie
N’oge gara aga, mgbe a na-ejikarị ụgbọ mmiri eme njem, otu nsogbu e nwere bụ ndị ọjọọ na-eji abalị ndị ọnwa na-adịghị agba, bụ́ mgbe ọ na-esiri ndị na-akwọ ụgbọ ike ịma ebe ha na-aga, eme ihe. Ndị ọjọọ a nwere ike idebe ọkụ n’ebe okwute juru n’ụsọ oké osimiri iji ghọgbuo ndị isi ụgbọ iche ụgbọ ha ihu n’ebe ahụ.
Ndị e duhiere ga-akpọka ụgbọ ha n’ebe ahụ, e zukọrọ ngwá ahịa ha, ndị nọ n’ime ụgbọ ha anwụọkwa.N’otu aka ahụ, Setan, bụ́ onye nduhie nke na-eme onwe ya ka “mmụọ ozi nke ìhè,” na-achọ imebi mmekọrịta dị n’etiti Chineke na ndị Ya. Ekwensu nwere ike iji “ndịozi ụgha” na ndị si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị na-eme ka “ndị ozi nke ezi omume” ghọgbuo ndị na-esighị ike n’okwukwe. (2 Ndị Kọrint 11:13-15) Ma, dị nnọọ ka ọ na-eyighị ka onye ọkwọ ụgbọ mmiri nke anya dị nkọ, nke nwerela ahụmahụ, na ndị ha na ya so na-akwọ ụgbọ hà ga-ekwe ka ọkụ ndị na-eduhie eduhie megharịa ha anya, Ndị Kraịst “siteworo n’iji ikike nghọta ha eme ihe zụọ ikike a ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ” anaghị ekwe ka ndị na-akwalite ozizi ụgha na nkà ihe ọmụma ndị na-emebi ihe duhie ha.—Ndị Hibru 5:14; Mkpughe 2:2.
Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-eji akwụkwọ e depụtasịrị ụlọ nduzi ụgbọ mmiri ndị ha ga-ahụ mgbe ha na-aga. A na-edepụtasị njimara nke ụlọ nduzi ọ bụla, nke gụnyere ihe mgbaàmà ya pụrụ iche, n’akwụkwọ ahụ. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “Ndị na-akwọ ụgbọ na-ekpebi ụdị ụlọ nduzi ndị ọrụ ụgbọ mmiri nke ha na-ahụ—bụ́kwa nke ga-eme ka ha mata ebe ha onwe ha nọ—site n’ileru ọkụ dị n’ụlọ nduzi ahụ anya na ile anya n’ebe ndị e depụtasịrị ụlọ nduzi ndị ha ga-agafe.” N’otu aka ahụ, Okwu Chineke na-enyere ndị nwere ezi obi aka ịghọta ezi okpukpe na ndị na-ekpe ya, karịsịa n’oge ikpeazụ a Jehova bulirila ya elu karịa okpukpe ụgha. (Aịsaịa 2:2, 3; Malakaị 3:18) Iji mee ka a mata ezigbote ọdịiche dị n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha, Aịsaịa 60:2, 3 na-ekwu, sị: “Ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ́ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube Ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ́ gị. Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze ejeruo onwu maramara nke ọwụwa gị.”
Ka ìhè Jehova nọgidere na-eduzi ọtụtụ nde mmadụ sitere ná mba nile, okwukwe ha agaghị ada n’oge a ha nọ n’agba ikpeazụ nke njem ha. Kama, ha ga-akwọrọ ụgbọ ha gabiga ụbọchị ndị fọrọ n’ụwa nke oge a banye n’ụwa ọhụrụ nke udo n’enweghị nsogbu ọ bụla.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]
^ par. 2 Akwụkwọ Nsọ ji “ìhè” mee ihe ọtụtụ ugboro n’ụzọ ihe atụ. Dị ka ihe atụ, Bible kwuru na Chineke bụ ìhè. (Abụ Ọma 104:1, 2; 1 Jọn 1:5) E ji ihe ọmụma sitere n’Okwu Chineke tụnyere ìhè. (Aịsaịa 2:3-5; 2 Ndị Kọrint 4:6) Mgbe Jizọs na-eje ozi n’elu ala, ọ bụ ìhè. (Jọn 8:12; 9:5; 12:35) E nyere ụmụazụ Jizọs iwu ka ha kwe ka ìhè ha na-enwu.—Matiu 5:14, 16.
[Foto dị na peeji nke 15]
Dị ka ndị ọkwọ ụgbọ mmiri, Ndị Kraịst na-akpachara nnọọ anya ka ọkụ na-eduhie eduhie ghara iduhie ha