Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ige Akọnuche Gị Ntị

Ige Akọnuche Gị Ntị

Ige Akọnuche Gị Ntị

“Ihe nile dị ọcha nye ndị dị ọcha. Ma nye ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe, ọ dịghị ihe dị ọcha.” —TAỊTỌS 1:15.

1. Olee ihe jikọrọ Pọl na ọgbakọ ndị dị na Krit?

MGBE Pọl onyeozi jesịrị njem ozi ala ọzọ atọ, a kpọchiri ya ma mesịa ziga ya na Rom, bụ́ ebe a tụrụ ya mkpọrọ afọ abụọ. Gịnị ka o mere mgbe a tọhapụrụ ya? Ka oge ụfọdụ gasịrị, ya na Taịtọs letara Krit bụ́ obodo mmiri gbara gburugburu, Pọl degaara Taịtọs akwụkwọ, sị: ‘M hapụrụ gị na Krit, ka i nwee ike idozi ihe ndị gahiere agahie, nweekwa ike ịhọpụta ndị okenye.’ (Taịtọs 1:5) Taịtọs ịrụ ọrụ ahụ e nyere ya rụọ gụnyere iso ndị akọnuche ha na-arụ ọrụ nke ọma na ndị nke ha na-anaghị arụ ọrụ nke ọma mekọọ ihe.

2. Olee nsogbu ndị Taịtọs doziri na Krit mmiri gbara gburugburu?

2 Pọl gwara Taịtọs ihe ndị a chọrọ n’aka ndị okenye ọgbakọ ma kwuzie na e nwere “ọtụtụ ndị isi ike, ndị na-ekwu okwu na-abaghị uru, na ndị na-eduhie uche.” Ndị a “na-ekpu ezinụlọ dum ihu site n’izi ihe ndị ha na-ekwesịghị izi.” Taịtọs ‘ga-anọgide na-adọ ha aka ná ntị.’ (Taịtọs 1:10-14; 1 Timoti 4:7) Pọl kwuru na uche ha na akọnuche ha “rụrụ arụ,” jiri okwu nwere ike ịpụta ihe nwere ntụpọ mee ihe, dị ka ihe e ji esiji ákwà pụrụ igbu ákwà mara mma. (Taịtọs 1:15) Ụfọdụ ndị ikom ahụ nwere ike ịbụ ndị Juu, n’ihi na ha “na-arapara n’obibi úgwù.” Ndị ikom dị otú ahụ anakarịghị eduhie ọgbakọ dị iche iche taa; n’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe site na ndụmọdụ ahụ Pọl nyere Taịtọs.

Ndị Akọnuche Ha Rụrụ Arụ

3. Olee ihe Pọl deere Taịtọs banyere akọnuche?

3 Rịba ihe mere Pọl ji kwuo okwu banyere akọnuche ama. “Ihe nile dị ọcha nye ndị dị ọcha. Ma nye ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe, ọ dịghị ihe dị ọcha, kama ma uche ha ma akọ na uche ha rụrụ arụ. Ha na-ekwupụta n’ihu ọha na ha maara Chineke, ma ha na-agọnarị ya site n’ọrụ ha.” O doro anya na ọ dị ụfọdụ ndị oge ahụ mkpa ime mgbanwe iji mee ka ha “dị ike n’okwukwe.” (Taịtọs 1:13, 15, 16) Nsogbu ha nwere bụ ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha, nke a bụkwa n’ihi otú akọnuche ha dị.

4, 5. Olee ntụpọ ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche nwere, oleekwa otú nke a si metụta ha?

4 Ihe karịrị afọ iri tupu mgbe ahụ, òtù na-achị isi nke Ndị Kraịst kpebiri na ọ dịghị mkpa ka e bie mmadụ úgwù tupu ya aghọọ ezi Onye Kraịst, ha gwakwara ọgbakọ dị iche iche banyere ya. (Ọrụ 15:1, 2, 19-29) N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ndị nọ na Krit ka “na-arapara n’obibi úgwù.” Ha jụrụ mkpebi ahụ òtù na-achị isi mere n’ihu ọha, ‘na-ezi ihe ndị ha na-ekwesịghị izi.’ (Taịtọs 1:10, 11) Ebe ọ bụ na a gwagburu echiche ha agwagbu, ha nwere ike ịdị na-akwalite ihe Iwu ahụ kwuru banyere nri na ememe okpukpe ndị metụtara ịdị ọcha. O nwedịrị ike ịbụ na ha nọ na-agbakwụnye ihe n’ihe Iwu ahụ kwuru, dị ka ndị oge Jizọs mere tupu mgbe ahụ, o nwekwara ike ịbụ na ha nọ na-akụzi akụkọ ifo ndị Juu na iwu mmadụ.—Mak 7:2, 3, 5, 15; 1 Timoti 4:3.

5 Echiche dị otú ahụ mebiri ụzọ ha si ele ihe anya na omume ha, ya bụ akọnuche ha. Pọl dere, sị: “Nye ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe, ọ dịghị ihe dị ọcha.” Akọnuche ha ghọrọ nke na-eduhie eduhie nke na ọ naghị agwa ha eziokwu n’ihe banyere omume na mkpebi ha. Ọzọkwa, ha kpere Ndị Kraịst ibe ha ikpe n’ihe ndị na-agbasaghị ha, bụ́ ihe ndị Onye Kraịst nke ọ bụla nwere ike ịhọrọ ime otú o si chọọ. N’akụkụ a, ndị Krit a lere ihe dị nnọọ ọcha anya dị ka ihe rụrụ arụ. (Ndị Rom 14:17; Ndị Kọlọsi 2:16) Ọ bụ ezie na ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ọrụ ha gosiri na ha amaghị ya.—Taịtọs 1:16.

‘Ihe Dị Ọcha Nye Ndị Dị Ọcha’

6. Olee ụdị ndị abụọ Pọl kwuru okwu banyere ha?

6 Olee otú anyị nwere ike isi rite uru n’ihe Pọl deere Taịtọs? Ọ dị mma, lee ọdịiche dị n’okwu a anya: “Ihe nile dị ọcha nye ndị dị ọcha. Ma nye ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe, ọ dịghị ihe dị ọcha, kama ma uche ha ma akọ na uche ha rụrụ arụ.” (Taịtọs 1:15) Ihe Pọl na-ekwu abụghị na ihe nile dị nnọọ ọcha ma dị mma n’anya Onye Kraịst omume ya dị ọcha. Ihe anyị ji mara nke ahụ bụ na Pọl mere ka o doo anya n’akwụkwọ ozi ya ọzọ na onye na-akwa iko, onye na-ekpere arụsị, onye mgbaasị, na onye na-eme omume ọjọọ ndị ọzọ “agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ndị Galeshia 5:19-21) N’ihi ya, anyị aghaghị ikwubi na Pọl na-ekwu okwu banyere ụdị ndị abụọ, ndị dị ọcha n’omume na n’ofufe ha na-efe Chineke na ndị na-adịghị ọcha.

7. Olee ihe Ndị Hibru 13:4 kagburu, ma olee ajụjụ nke ahụ nwere ike ịkpata?

7 Ọ bụghị nanị ihe Bible kagburu kpọmkwem ka ezi Onye Kraịst kwesịrị izere. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu a doro anya e kwuru: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ nile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye bụrụkwa ihe na-enweghị mmerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” (Ndị Hibru 13:4) Ọbụna ndị na-abụghị Ndị Kraịst na ndị na-amatụghị ihe ọ bụla banyere Bible ga-ekwubi nnọọ na amaokwu a kagburu ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye. Amaokwu a na amaokwu Bible ndị ọzọ mere ka o doo anya na Chineke kagburu nwoke ji nwanyị na nwanyị lụrụ di iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ. Ma, gịnịkwanụ banyere mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ nwoke na nwanyị ha? Ọtụtụ ndị na-eto eto na-ekwu na omume a adịghị njọ n’ihi na ọ bụghị mmekọahụ. Onye Kraịst ò kwesịrị ile iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ nwoke na nwanyị anya dị ka ihe dị ọcha?

8. Olee otú echiche Ndị Kraịst banyere iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ nwoke na nwanyị si dị iche na nke ọtụtụ ndị ụwa?

8 Ndị Hibru 13:4 na 1 Ndị Kọrint 6:9 kwuru na Chineke kpọrọ ma ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye ma nke ndị na-alụghị di na nwunye asị (Grik, por·neiʹa). Gịnị ka ịkwa iko nke ndị na-alụghị di na nwunye gụnyere? Okwu Grik ahụ pụtara inwe mmekọahụ rụrụ arụ, ma ọ bụ n’otú e si enwe ya ma ọ bụ n’ụzọ megidere okike. Ọ gụnyere ụdị mmekọahụ nile nke ndị na-anọghị n’alụmdi na nwunye Akwụkwọ Nsọ kwadoro. N’ihi ya, ọ gụnyere iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ nwoke ma ọ bụ nwanyị, n’agbanyeghị na a gwala ọtụtụ ndị na-eto eto gburugburu ụwa ma ọ bụ na ha onwe ha ekwubiela na ọ dịghị ihe ọjọọ dị na ya. Ezi Ndị Kraịst anaghị ekwe ka echiche nke “ndị na-ekwu okwu na-abaghị uru, na ndị na-eduhie uche” na-eduzi echiche ha na omume ha. (Taịtọs 1:10) Ha na-agbaso ụkpụrụ ka elu nke Akwụkwọ Nsọ. Kama ikwu na iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ nwoke na nwanyị ziri ezi, ha ghọtara na Akwụkwọ Nso kpọrọ ya ịkwa iko, ma ọ bụ por·neiʹa, ha na-azụkwa akọnuche ha ka ha ghara ịnabata ya. *Ọrụ 21:25; 1 Ndị Kọrint 6:18; Ndị Efesọs 5:3.

Olu Dị Iche Iche, Mkpebi Dị Iche Iche

9. Olee ọrụ akọnuche na-arụ, ma ọ bụrụ na “ihe nile dị ọcha”?

9 Ma olee ihe Pọl na-ekwu mgbe o kwuru na “ihe nile dị ọcha nye ndị dị ọcha”? Pọl na-ekwu banyere Ndị Kraịst merela ka echiche ha na omume ha kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke, bụ́ ndị dị n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ. Ndị Kraịst dị otú ahụ maara na n’ọtụtụ ihe Bible na-akagbughị kpọmkwem, ndị kwere ekwe ibe ha nwere ike ikpebi ime ihe dị iche iche. Kama ịkatọ ha, ha ghọtara na ihe ndị Chineke na-akagbughị dị “ọcha.” Ha anaghị atụ anya na echiche ha na mmadụ nile ga-ekwekọcha n’ihe ndị Bible na-akapịghị ọnụ. Ka anyị tụlee ụfọdụ ihe atụ.

10. Olee otú agbamakwụkwọ (ma ọ bụ olili ozu) nwere ike isi weta ihe ịma aka?

10 E nwere ọtụtụ ezinụlọ ebe di ma ọ bụ nwunye bụ Onye Kraịst ma onye nke ọzọ abụghị. (1 Pita 3:1; 4:3) Nke a nwere ike ịkpata nsogbu dị iche iche, dị ka mgbe onye ikwu na-agba akwụkwọ ma ọ bụ mgbe a na-eli onye ikwu. Were nwanyị Onye Kraịst ya na di ya na-anaghị ekpe otu okpukpe dị ka ihe atụ. Otu n’ime ndị ikwu di ya na-agba akwụkwọ, a ga-anọkwanụ na chọọchị Krisendọm eme ememe agbamakwụkwọ ahụ. (Ma ọ bụ onye ikwu di ya, ikekwe nne ya ma ọ bụ nna ya nwụrụ, a ga-anọ na chọọchị eme ememe olili ozu ahụ.) A kpọrọ di na nwunye ahụ oku ka ha soro bịa, di ya chọkwaranụ ka nwunye ya soro ya gaa. Olee ihe akọnuche nwunye ya na-ekwu banyere ịga? Olee ihe nwunye ya ga-eme? Were anya nke uche gị hụ ihe abụọ a pụrụ ime eme.

11. Kọwaa otú otu nwanyị Onye Kraịst lụrụ di nwere ike isi tụlee ma ọ̀ ga-aga agbamakwụkwọ a ga-anọ na chọọchị mee, oleekwa ihe nke ahụ mere ka o kpebie?

11 Lọịs chesiri echiche ike banyere iwu ahụ siri ike Bible nyere, nke bụ́, ‘Sinụ n’ime Babilọn Ukwu ahụ pụta,’ bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:2, 4) Ọ nọbu na chọọchị ahụ a ga-anọ eme ememe agbamakwụkwọ ahụ, ọ makwaara na mgbe a na-eme ememe ahụ, a ga-agwa ndị nile nọ ebe ahụ ka ha soro mee ihe ndị a na-eme n’okpukpe ahụ, dị ka ikpe ekpere, ịbụ abụ, ma ọ bụ ime ihe ndị ọzọ a na-eme n’okpukpe. O kpebiri nnọọ na ya agaghị eso eme ihe ndị ahụ nakwa na ya agadịghị aga ebe ahụ ka a ghara ịmanye ya imebi ikwesị ntụkwasị obi ya. Lọịs na-akwanyere di ya ùgwù ma chọọ ịkwado ya, n’ihi na ọ bụ ya ka Akwụkwọ Nsọ kwuru bụ́ onyeisi ya; n’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọghị imebi ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị o ji kpọrọ ihe. (Ọrụ 5:29) N’ihi ya, o ji akọ kọwaara di ya na ọ bụrụgodị na ọ chọrọ ịga, na ya onwe ya agaghị aga. O nwere ike ịkọwara di ya na ọ bụrụ na ya agaa ma ghara iso mee ihe ụfọdụ a na-eme ebe ahụ, na o nwere ike imenye di ya ihere, n’ihi ya na ịghara ịga aga pụrụ ịkara di ya mma. Mkpebi ahụ nwanyị a mere mere ka akọnuche ya ghara inye ya nsogbu.

12. Olee otú mmadụ nwere ike isi tụlee ma ọ̀ ga-aga ịza oku a kpọrọ ya maka agbamakwụkwọ a ga-eme na chọọchị, oleekwa ihe onye ahụ nwere ike ime?

12 Rut nwere otu nsogbu ahụ. Ọ na-akwanyere di ya ùgwù, o kpebiri nnọọ ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke, ọ na-egekwa akọnuche ya e ji Bible zụọ ntị. Mgbe Rut tụlesịrị ihe ndị ahụ Lọịs tụlere, Rut ji ekpere tụlee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” bụ́ nke dị n’Ụlọ Nche nke May 15, 2002. O chetara na ndị Hibru atọ ahụ rubere isi n’iwu ahụ e nyere ka ndị mmadụ bịa n’ebe ahụ a ga-anọ ekpere arụsị, n’agbanyeghị nke ahụ, ha nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi site n’ịghara iso kpeere arụsị. (Daniel 3:15-18) O kpebiri iso di ya gaa ma na ya agaghị eso eme ihe ọ bụla a na-eme n’okpukpe, o mere ihe kwekọrọ n’akọnuche ya. O ji akọ kọwaara di ya n’ụzọ doro anya ihe akọnuche ya ga-ekwe ya mee na ihe ọ na-agaghị ekwe ya mee. Rut nwere olileanya na di ya ga-ahụ ọdịiche dị n’etiti ezi ofufe na ofufe ụgha.—Ọrụ 24:16.

13. Olee ihe mere ọ na-ekwesịghị iji wute anyị na Ndị Kraịst abụọ mere mkpebi dịgasị iche?

13 Ndị Kraịst abụọ inwe ike ime mkpebi dịgasị iche ọ̀ na-egosi na mmadụ nwere ike ime mkpebi ọ bụla sọrọ ya n’enweghị ihe ga-esi na ya pụta, ma ọ bụ na otu onye n’ime ha nwere akọnuche na-esighị ike? Ee e. N’ihi ihe merela Lọịs n’oge gara aga banyere egwú na ihe ndị e ji eme ememe chọọchị, ọ ghọtara na ịnọ ebe ahụ ga-etinye ya onwe ya ná nsogbu. Nkwurịta okwu ndị ya na di ya nwerela n’oge gara aga banyere ihe ndị metụtara okpukpe nwere ike imetụta akọnuche ya. N’ihi ya, o kwenyesiri ike na ya mere mkpebi kasị mma.

14. Olee ihe Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’uche banyere okwu ndị dịịrị mmadụ ikpebi?

14 Ma mkpebi ahụ Rut mere ọ̀ dị njọ? Nke ahụ adịịrịghị ndị ọzọ ikwu. Ha ekwesịghị ikpe ya ikpe ma ọ bụ katọọ ya n’ihi na ọ họọrọ ịga ebe ahụ ma ghara iso mee ihe omume okpukpe ọ bụla. Buru n’uche ndụmọdụ Pọl nyere banyere ihe ndị dịịrị mmadụ ikpebi ma a bịa n’ihe banyere iri ma ọ bụ ịghara iri nri ụfọdụ: “Ka onye na-eri ghara ilelị onye na-adịghị eri, ka onye na-adịghịkwa eri ghara ikpe onye na-eri ikpe . . . N’ebe nna ya ukwu nọ ka ọ na-eguzo ma ọ bụ na-ada. N’ezie, a ga-eme ka o guzo, n’ihi na Jehova pụrụ ime ka o guzo.” (Ndị Rom 14:3, 4) Ọ dịghị ezi Onye Kraịst ọ bụla ga-achọ ịgba mmadụ ume ka ọ leghara akọnuche ya a zụrụ azụ anya, n’ihi na ime nke ahụ ga-adị ka ileghara olu nwere nnọọ ike ịzọpụta ndụ mmadụ anya.

15. N’ihi gịnị ka e kwesịrị iji tụlee nnọọ akọnuche ndị ọzọ na otú obi ga-adị ha mgbe mmadụ na-eme ihe?

15 N’akụkọ ahụ anyị kọburu, ọ dị ihe ọzọ Ndị Kraịst abụọ ahụ kwesịrị ịtụle, otu bụ otú ihe ha na-eme kwesịrị isi metụta ndị ọzọ. Pọl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Meenụ ka nke a bụrụ mkpebi unu, na unu agaghị edebe ihe ịsụ ngọngọ ma ọ bụ ihe na-akpata mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna.” (Ndị Rom 14:13) Lọịs nwere ike ịma na ọnọdụ ndị yiri nke ahụ kpatara nnọọ ọgba aghara n’ọgbakọ ya ma ọ bụ n’ezinụlọ ya, nakwa na ihe ya mere nwere ike imetụta nnọọ ụmụ ya. N’ụzọ dị iche, Rut ma eleghị anya maara na ọnọdụ yiri nke ahụ akpatabeghị ọgba aghara n’ọgbakọ ma ọ bụ n’ógbè ya. Ụmụ nwanyị abụọ ahụ—na anyị nile—kwesịrị ịghọta na akọnuche a zụrụ azụ maara nnọọ otú ihe mmadụ na-eme nwere ike isi metụta ndị ọzọ. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme ka otu n’ime ndị a dị nta bụ́ ndị nwere okwukwe na m sụọ ngọngọ, ọ baara ya uru karị na e ji nkume igwe nri, ụdị nke ịnyịnya ibu na-akwagharị konye ya n’olu ya ma tụba ya n’ime ogbu oké osimiri.” (Matiu 18:6) Ọ bụrụ na mmadụ eleghara ihe metụtara ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ anya mgbe ọ na-eme ihe, ọ pụrụ inwe akọnuche e merụrụ emerụ, dị ka ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Krit nwere.

16. Olee mgbanwe anyị nwere ike ịtụ anya ka Onye Kraịst mee ka oge na-aga?

16 Onye Kraịst kwesịrị ịnọgide na-enwe ọganihu ná mmekọrịta nke ya na Chineke, otú ahụ ka o kwesịrị ịdị n’ịnụ nduzi nke akọnuche ya na ịgbaso ya. Ka anyị were Mak, bụ́ onye e mere baptizim mgbe na-adịbeghị anya dị ka ihe atụ. Akọnuche ya gwara ya ka o zere omume ndị Akwụkwọ Nsọ kagburu ọ na-emebu, ikekwe ndị gụnyere ikpere arụsị na ọbara. (Ọrụ 21:25) N’ezie, ọ na-akpachara anya ugbu a izere ọbụna ihe ndị ha na ihe ndị Chineke kagburu yitụrụ. N’aka nke ọzọ, o juru ya anya na ụfọdụ ndị na-ezere ihe ụfọdụ ya onwe nabatara, dị ka ihe ụfọdụ a na-egosi na televishọn.

17. Kọwaa otú oge na ọganihu n’ihe banyere mmekọrịta Onye Kraịst na Chineke nwere ike isi metụta akọnuche na mkpebi ya.

17 Ka oge na-aga, Mak nwetakwuru ihe ọmụma ma bịarukwuo Chineke nso. (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Olee otú nke ahụ si metụta ya? Olu na-agwa ya okwu n’ime nwetara nnọọ ọzụzụ. Ugbu a, Mak na-egekwu akọnuche ya ntị ma na-eji nlezianya atụle ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. N’eziokwu, ọ ghọtara na ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ọ na-ezere “ha na ihe ndị Chineke kagburu yitụrụ” emegideghị nnọọ echiche Chineke. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na Mak aghọtakwuola ụkpụrụ Bible ma dịrị njikere ige akọnuche ya a zụrụ azụ ntị, akọnuche ya na-akpali ya ugbu a izere ikiri ihe ndị ahụ o cheburu dị mma a na-egosi na televishọn. Ee, a nụchaala akọnuche ya.—Abụ Ọma 37:31.

18. Olee ihe na-enye anyị ọṅụ?

18 N’ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ, e nwere ndị nọ n’ogo dị iche iche n’uto ha dị ka Ndị Kraịst. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọhụrụ n’ọgbakọ. Ma eleghị anya, e nwere ihe ụfọdụ akọnuche ha na-adịchaghị ekwu okwu na ha, ma nwee ihe ndị ọzọ olu dị n’ime ha na-ekwusi okwu ike banyere ha. Ndị dị otú ahụ nwere ike ịchọ oge na enyemaka iji ghọtakwuo nduzi Jehova na iji gee akọnuche ha a zụrụ azụ ntị. (Ndị Efesọs 4:14, 15) Anyị nwere obi ụtọ ikwu na n’ọgbakọ ndị ahụkwa, e nwekwara ike inwe ọtụtụ ndị nwere ihe ọmụma miri emi, nwee ahụmahụ n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ma nwee akọnuche kwekọrọ nnọọ n’echiche Chineke. Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ ịnọ n’ebe ‘ndị dị otú ahụ dị ọcha’ nọ, bụ́ ndị weere ihe ndị Onyenwe anyị na-anara nke ọma dị ka ihe “dị ọcha” ma n’omume ma n’ofufe ha na-efe Chineke! (Ndị Efesọs 5:10) Ka anyị nile mee ya ihe mgbaru ọsọ anyị itoru ọnọdụ dị otú ahụ, ịnọgide na-enwe akọnuche nke kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ na ime ihe kwekọrọ n’uche Chineke.—Taịtọs 1:1.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 8 Ụlọ Nche nke September 15, 1983, peeji nke 30-31, kwuru ihe ndị lụrụ di na nwunye kwesịrị ịtụle.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Krit ji nwee akọnuche e merụrụ emerụ?

• Gịnị mere Ndị Kraịst abụọ nwere akọnuche a zụrụ azụ nwere ike iji mee mkpebi dịgasị iche?

• Olee ihe kwesịrị ime akọnuche anyị ka oge na-aga?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Map dị na peeji nke 26]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Sisili

GRIS

Krit

ESHIA MAỊNỌ

Saịprọs

OKÉ OSIMIRI MEDITERENIAN

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndị Kraịst abụọ chere otu ọnọdụ ihu nwere ike ime mkpebi dịgasị iche