Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Imeri Nsogbu Dị Iche Iche Iji Bugara Ndị Ọzọ Ozi Ọma

Imeri Nsogbu Dị Iche Iche Iji Bugara Ndị Ọzọ Ozi Ọma

Imeri Nsogbu Dị Iche Iche Iji Bugara Ndị Ọzọ Ozi Ọma

ỤGBỌALA anyị bịarutewere ebe ndị nche dị ihe dị ka iri ndị nwoke, ụmụ nwanyị, na ndị na-eto eto isii jicha ngwá ọgụ nọ. Ụfọdụ yi uwe ndị agha; ndị ọzọ yi uwe nkịtị. Ụfọdụ n’ime ha jicha égbè ndị bụ́ ọkpọka. O yiri ka hà na-eche anyị. E nwere ọgba aghara n’obodo ahụ.

Anyị emeela njem ruo ụbọchị anọ, anyị bukwa tọn iri nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Anyị nọ na-eche ma hà ga-ekwe anyị gafere. Hà ga-asị anyị nye ha ego? Olee oge o nwere ike iwe anyị iji mee ka ha kweta na njem anyị emetụtaghị agha?

Otu nwoke ọ dị ọkụ n’ahụ́ ịgba égbè gbaliri égbè elu iji chetara anyị na ike dị ya n’aka. O lepụrụ anya hụ ekwe ntị anyị ma sị anyị nye ya ha. Mgbe anyị ka nọ na-egbu oge, o bere aka ya n’olu ya iji gosi anyị na ha ga-egbu anyị ma ọ bụrụ na anyị emee isi ike. Anyị nyere ya ekwe ntị ndị ahụ.

Ozugbo ahụ, otu nwanyị yi uwe ndị agha buuru égbè ya bịakwutewe anyị. Ọ bụ ya bụ “odeakwụkwọ,” ọ chọkwara ka anyị chọọrọ ya ihe. Ihe siri ike, obere “onyinye” ga-abakwara ya uru. Onye agha ọzọ kwụgheziri ebe a na-agbanye mmanụ n’ụgbọala anyị iji gbajuo ihe e ji agbanye mmanụ ụgbọala o bu. Anyị gwara ya ka ọ kwụsị, ma, ọ gara n’ihu, gwa anyị na nanị ihe ya na-eme bụ ihe a sịrị ya mee. Ọ dịghị ihe anyị maara anyị ga-eme. Nanị ihe anyị mere bụ ikpe ekpere ka ndị ọzọ ghara ime otú ahụ.

N’ikpeazụ, ha wepụrụ ihe ha ji dochie ụzọ, anyị gafekwara. Mụ na onye mụ na ya so kudara ume. Ọ dịghị mfe, ma ịhụ ụdị ndị nche a na-amapụ obi amaala anyị ahụ́. N’agbata ọnwa April 2002 na January 2004, anyị si n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Douala, Cameroon, gaa Bangui, nke bụ́ isi obodo Central African Republic, ugboro iri na asatọ. Ihe ize ndụ na ihe ijuanya na-ejupụta na njem ahụ dị otu puku kilomita na narị isii mgbe nile. *

Joseph na Emmanuel, bụ́ ndị ọkwọ ụgbọala merela njem a ọtụtụ ugboro, kọwara, sị: “Njem ndị a akụzierela anyị ọtụtụ ihe. Ọ dị mkpa ikpe ọtụtụ ekpere n’obi gị ma gharazie ichegbu onwe gị. Ọbụ abụ ahụ dere, sị, ‘Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịworo obi, m gaghị atụ egwu; gịnị ka anụ ahụ́, bụ́ mmadụ, ga-eme m?’ Anyị na-agbalị ịtụkwasị Chineke obi otú ahụ. O doro anyị anya na Jehova maara na njem anyị bụ iji bugara ndị ozi olileanya dị ezigbo mkpa ozi dị otú ahụ.”—Abụ Ọma 56:11.

Mgbalị A Na-eme ná Mba Dị Iche Iche Iji Bugara Ndị Ọzọ Ihe Ndị E Ji Amụ Bible

Ọtụtụ ndị bi n’akụkụ ebe a n’Africa na-enwe nnọọ mmasị ịnụ ozi ọma nke Alaeze Chineke. Akwụkwọ ndị anyị na-ebuga na-enye nnọọ aka n’izi ha ozi ọma dị otú ahụ. (Matiu 5:3; 24:14) Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke Cameroon, bụ́ nke dị na Douala, na-enye ihe karịrị iri puku ndị nkwusa Alaeze atọ na ndị nwere mmasị bi na Cameroon na mba anọ ha na ha gbara akwụkwọ mgbe nile.

Akwụkwọ ndị a si ebe dị anya. E biri ihe ka ọtụtụ n’ime ha n’England, Finland, Germany, Ịtali, na Spen. E jizi ụgbọ mmiri si France bute ha. A na-ejikarị ụgbọ mmiri ebute akwụkwọ ndị e ji amụ Bible kwa izu abụọ n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Douala.

A na-adọnye akwụkwọ ndị ahụ n’ụgbọala ndị ga-ebuga ha n’alaka ụlọ ọrụ. Ndị na-arụ ná Ngalaba Mbupụ Akwụkwọ na-edebe akwụkwọ ndị ahụ iche iche dabere n’ebe ha na-aga. Ibuga akwụkwọ n’ebe ndị kasị dịba n’ime anaghị adị mfe. Ma nke a so n’iji ozi ọma ahụ aga “n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Ụjọ anaghị atụ alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ihi na o nwere ndị ji obi ha wepụta onwe ha iji ụgbọala mee njem ndị a dị ize ndụ. A na-esi otú a ebugara ọtụtụ nde mmadụ bi n’ebe etiti Africa ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible mgbe nile.

Otú Njem ahụ Na-adị

A na-eji ụgbọala ebugara ndị Cameroon, Chad, Equatorial Guinea, Gabon, na Central African Republic akwụkwọ ha. Ka anyị soro otu ụgbọala na ndị na-anya ya ka ha na-aga ibuga akwụkwọ n’ebe ndị ahụ. Were ya na gị na ndị ọkwọ ụgbọala ahụ nọ n’ime ụgbọala, jikerekwa iso ha mee njem dị ize ndụ nke ga-ewe ụbọchị iri ma ọ bụ karịa.

Ọ bụ ndị ọkwọ ụgbọala isii na-aga njem a. Ha aghaghị ịbụ ndị gbasiri ike, ndị ruru eru, ndị nwere ndidi, ha aghaghịkwa iji ejiji nke ọma. Ha na-eyi uwe ndị Africa ma ọ bụ yiri uwe elu na taị. N’oge gara aga, ndị na-ahụ maka mbubata ngwá ahịa kwuru, sị: “Leenụ otú nnukwu ụgbọala a si dị ọcha na otú ndị na-anya ya si jie ejiji dị mma, dị nnọọ ka foto ndị na-adị n’akwụkwọ ha na-adị.” Ihe dị mkpa karịa ejiji dị mma ndị ọkwọ ụgbọala ahụ na-eji bụ otú ha si dị njikere ịga ebe ọ bụla ọ dị mkpa ka ha gaa iji jeere ndị ọzọ ozi.—Abụ Ọma 110:3.

Anyị pụrụ na Douala n’ihe dị ka elekere isii nke ụtụtụ, ka ìhè pụtatụwara, iji zere ọnọdụ agaghị ihu na agaghị azụ nke ụgbọala n’ime obodo a a rụrụ ụlọ aghara aghara na ya. Mgbe anyị gafesịrị àkwà mmiri dị nso n’alaka ụlọ ọrụ ahụ ma gafee obodo ahụ na-ekwo ekwo, anyị tinyere isi n’ebe mbụ anyị na-aga nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ—nke bụ́ Yaoundé, isi obodo Cameroon.

Ndị ọkwọ ụgbọala isii ahụ ga-agwa gị otú o si esi ike ịnya ụgbọala bu tọn akwụkwọ iri. Anyị enwechaghị nsogbu n’ụbọchị atọ mbụ anyị mere njem n’ụzọ ndị e tere ete, ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ka uche ha dị n’ebe ha na-aga. Na mberede, mmiri maliteziri izo. E teghị ụzọ ebe anyị nọ ugbu a ete. Anyị anakwaghị ahụ ụzọ nke ọma, okporo ụzọ na-amị amị, anyị aghaghịkwa iji nwayọọ na-agba n’ihi okporo ụzọ ahụ na-adịghị mma. Chi jiwere. Oge eruola ka anyị kwụsị, rie nri, gbalịakwa ịchịkwasị ụkwụ anyị n’ihu ụgbọala ma hie ụra. Ọ bụ otú ahụ ka ọ na-adị na njem ndị a!

N’isi ụtụtụ echi ya, anyị maliteghachiri njem anyị. Otu n’ime ndị ọkwọ ụgbọala ahụ nyeere anyị aka ilegide anya n’otú ụzọ dị. Ọ na-agbara anyị àmà ozugbo anyị rutewere nnọọ nso n’olulu ndị e gwuru n’akụkụ ụzọ. Ndị ọkwọ ụgbọala maara nke ọma na ọ bụrụ na ụgbọala ha abaa n’olulu na o nwere ike iwe ha ihe karịrị otu ụbọchị iji si na ya pụta. Ụzọ ka dịtụkwa otú ọ dị mgbe anyị gafere Cameroon ma banye Central African Republic. Na narị kilomita isii na iri ise ọzọ anyị gara, anyị gbafere ime obodo ndị mara mma, ndị ugwu na ahịhịa ndụ jupụtakwara na ha. Ụmụaka, ndị agadi, na ụmụ nwanyị kwọ ụmụ ha n’azụ nọcha na-efere anyị aka ka ụgbọala anyị ji nwayọọ nwayọọ na-agbafe obodo ha dị iche iche. N’ihi agha ahụ a na-alụ, ọ bụ ụgbọala ole na ole ka a na-ahụzi n’okporo ụzọ, n’ihi ya, ndị mmadụ na-elekwasị anyị anya iji mata ndị na-agafenụ.

Ahụmahụ Ndị Na-enye Ọṅụ

Janvier, bụ́ otu n’ime ndị ọkwọ ụgbọala anyị, gwara anyị na n’agbanyeghị na ha anaghị enwe ohere, ha na-akwụsịtụ n’otu obere obodo iji zurutụ ike ma kesaa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. O chetara, sị: “Mgbe ọ bụla anyị rutere Baboua, anyị na-agbalị ịgwa otu onye na-arụ n’ụlọ ọgwụ nke gosiri mmasị n’ozi Alaeze okwu, anyị na-eduzitụkwara ya ọmụmụ Bible. Otu ụbọchị, anyị gosidịrị ya na ezinụlọ ya vidio ahụ kwuru banyere Noa. Ndị ikwu na ibe ya gbakọtara, n’oge na-adịghịkwa anya, ndị bịara ilere anya ọṅụ juru obi juru n’ụlọ ya. Mmadụ nile anụla banyere Noa, ugbu a, ha pụziri ile akụkọ ya na televishọn. O metụrụ anyị n’ahụ́ ịhụ otú ekele si jupụta ha obi. Mgbe e mesịrị, ha siiri anyị nri pụrụ iche iji kelee anyị, ha rịọkwara anyị ka anyị hibọọ chi na nke ha. Anyị aghaghị ịhapụ ha ozugbo ma gaa n’ihu n’ogologo njem anyị, ma obi tọrọ anyị ụtọ na anyị kwusaara ndị a dị umeala n’obi ozi ọma.”

Ọkwọ ụgbọala ọzọ, bụ́ Israel, chetara ihe ndị mere mgbe ọzọ ha gara Bangui, nke bụ́ ebe anyị na-aga. Ọ kọrọ, sị: “Ka anyị na-erukwu nso na Bangui, otú ahụ ka anyị na-ahụkwu ebe ndị e ji ihe dochisie ụzọ. Ọ dabara nnọọ na ọtụtụ n’ime ndị agha anyị zutere mesoro anyị omume ọma ma cheta na ha ahụla ụgbọala anyị n’oge ndị ọzọ anyị garala ebe ahụ. Ha gwara anyị ka anyị nọdụ ala, ha jikwa obi ụtọ nara anyị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Ha na-eji akwụkwọ anyị akpọrọ ihe nke ukwuu, n’ihi ya, ha na-ede aha ha na ya, dee ụbọchị ha natara ya, nakwa aha onye nyere ha ya. Ụfọdụ ndị agha ahụ nwere ndị ikwu bụ́ Ndịàmà, nke a bụkwa ihe ọzọ mere ha ji meso anyị omume ọma.”

Joseph, bụ́ ọkwọ ụgbọala nke kasị nwee ahụmahụ, kọọrọ anyị ihe kasị atọ ya ụtọ na njem ndị dị otú ahụ—iru ebe ọ na-aga. O chetara otu njem o mere, wee sị: “Mgbe anyị ruwere Bangui, anyị kpọrọ ụmụnna anyị na telefon iji gwa ha na anyị ga-erute n’oge na-adịghị anya. Ha duuru anyị ruo n’ókè obodo ahụ na obodo ya na ya gbara ma nyere anyị aka inwetazu akwụkwọ anyị ga-eji gafee. Mgbe anyị rutere, mmadụ nile nọ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ bịara makụọ anyị iji kelee anyị. Ụmụnna si n’ọgbakọ ndị dị nso bịara nye aka, n’ime awa ole na olekwa, e butuola ọtụtụ narị katọn Bible, akwụkwọ, akwụkwọ nta, na magazin ma hazie ha n’ebe mbusa akwụkwọ.”

Joseph kwukwara, sị: “Mgbe ụfọdụ, ákwà, akpụkpọ ụkwụ, na ihe ụmụaka e nyere n’onyinye bụ́ ndị e bu aga Democratic Republic of Congo na-eso n’ibu anyị. Lee ka o si atọ anyị ụtọ ịhụ ọnụ ọchị nke ụmụnna ndị ahụ obi dị ụtọ!”

Mgbe anyị jisịrị otu ụbọchị zuo ike, anyị kwadoro ụgbọala anyị ma sikwa otú anyị si bịa laghachiwe. Anyị ga-ezute nsogbu dị iche iche n’ụzọ, ma ọṅụ ndị anyị nwerela karịrị nnọọ ihe isi ike ọ bụla anyị ga-ezute.

Ụzọ ịdị anya, oké mmiri ozuzo, ụzọ ọjọọ, ụgbọala ịda afọ, na ụgbọala imebinahụ mmadụ nwere ike ịgbakasị mmadụ ahụ́. A na-ahụ ndị agha na-adịghị agbaso iwu mgbe nile. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị ihe na-eme ndị ọkwọ ụgbọala ahụ obi ụtọ karịa ibuga ozi ọma Alaeze ahụ n’akụkụ ndị kasị dịba n’ime n’Africa na ịhụ otú ozi ahụ si emetụta ndụ nke ndị natara ya.

Dị ka ihe atụ, n’ihi akwụkwọ ndị a a na-ebuga, otu onye bi n’obere obodo dịbara n’ime na Central African Republic, bụ́ ebe dị nso n’ókè ha na Sudan, na-agụzi Bible a sụgharịrị gaa n’asụsụ a na-asụ n’oge a. Nwunye ya na-amụ Ụlọ Nche ndị e bipụtara ọhụrụ, ụmụ ya na-amụkwa akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. * Ha na ọtụtụ ndị ọzọ bi n’ime ime obodo ndị a na-enweta ọzụzụ dabeere n’Okwu Chineke, dịkwa ka ụmụnna ha ndị bi n’ọtụtụ obodo ndị mepere emepe. Nke a na-enye nnọọ afọ ojuju!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 6 Kemgbe oge a, e meela ihe gbara ọkpụrụkpụ iji mee ka a kwụsị inwe nsogbu n’okporo ụzọ dị n’agbata Douala na Bangui.

^ par. 25 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Map/Foto dị na peeji nke 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

CAMEROON

Douala

CENTRAL AFRICAN REPUBLIC

Bangui

[Foto dị na peeji nke 9]

Joseph

[Foto dị na peeji nke 9]

Emmanuel

[Foto dị na peeji nke 10]

Alaka ụlọ ọrụ Central African Republic, nke dị na Bangui

[Foto dị na peeji nke 10]

Ka a na-ebutusị ihe n’ụgbọala na Bangui