Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mkpebi Ya Siri Nnọọ Ike Dọọrọ Mmasị M”

“Mkpebi Ya Siri Nnọọ Ike Dọọrọ Mmasị M”

“Mkpebi Ya Siri Nnọọ Ike Dọọrọ Mmasị M”

GÜNTER GRASS, bụ́ onye Germany na-ede akwụkwọ na onye nwetara Ihe Nrite Nobel Maka Edemede n’afọ 1999, bipụtara akụkọ ndụ ya n’afọ 2006. N’ime ya, ọ kọwara ihe mere mgbe a manyere ya isonyere ndị agha nchebe Germany. N’akwụkwọ ahụ, o kwuru banyere otu nwoke àgwà ya masịrị ya nke ukwuu nke na ọ ka na-echeta ya ka iri afọ isii gasịrị. Ọ bụ otu nwoke nọgidesiri ike n’okwukwe ya mgbe a na-akpagbu ya.

N’otu ajụjụ ọnụ e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Frankfurter Allgemeine Zeitung, Grass chetara onye a pụrụ nnọọ iche, bụ́ onye jụrụ ibu ngwá agha. Grass kwuru na nwoke ahụ “ekwenyeghị n’ihe ndị mmadụ kweere n’oge ahụ n’ihi na ọ bụghị onye Nazi, onye Communist, nke o jikwanụ abụ onye Socialist. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.” Grass echetaghị aha Onyeàmà ahụ, bụ́ onye ọ kpọrọ Anyị-anaghị-eme-ụdị-ihe-ndị-ahụ. Ndị na-emere Ndịàmà Jehova nnyocha chọpụtara na aha nwoke ahụ bụ Joachim Alfermann. E tiri ya ihe ma mechuo ya ihu ọtụtụ ugboro ma mesịa tụba ya n’ụlọ mkpọrọ otu onye na-anọ. Ma Alfermann nọgidesiri ike ma jụ ibu ngwá agha.

Grass kwuru, sị: “Mkpebi ya siri nnọọ ike dọọrọ mmasị m. Ajụrụ m onwe m, sị: Olee otú ọ ga-esi die ihe nile a? Olee otú o si eme ya?” Mgbe Alfermann disịrị mgbalị e mere ruo ogologo oge ime ka ọ kwụsị ịkwesị ntụkwasị obi nye Chineke, e mesịrị ziga ya n’ogige ịta ahụhụ dị na Stutthof na February 1944. A tọhapụrụ ya n’April 1945, ọ lanahụkwara agha ahụ ma nọgide bụrụ Onyeàmà Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1998.

Alfermann bụ otu n’ime ihe dị ka puku Ndịàmà iri na atọ na narị anọ—na Germany na ná mba ndị Nazi nọchiri—bụ́ ndị e mesoro omume obi ọjọọ n’ihi okwukwe ha. Ha rubeere Bible isi site n’ịnọpụ iche n’ihe banyere ọchịchị na ịjụ ibu ngwá agha. (Matiu 26:52; Jọn 18:36) A kpọgara ihe dị ka puku Ndịàmà anọ na narị abụọ n’ogige ịta ahụhụ, otu puku na narị anọ na iri itoolu n’ime ha nwụkwara. Ọbụna taa, nnọgidesi ike ha na-amasị ọtụtụ ndị, bụ́ ndị ọ bụ ezie na ha abụghị Ndịàmà, nwere mmasị n’ikwesị ntụkwasị obi ha.

[Foto dị na peeji nke 32]

Joachim Alfermann