Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nụrụ Olu Na-agwa Gị Okwu n’Ime Gị

Nụrụ Olu Na-agwa Gị Okwu n’Ime Gị

Nụrụ Olu Na-agwa Gị Okwu n’Ime Gị

“Ndị mba ọzọ, bụ́ ndị na-enweghị iwu [Chineke], sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu.”—NDỊ ROM 2:14.

1, 2. (a) Olee otú ọtụtụ ndị siworo mesoo ndị ọzọ omume ọma n’ihi mmasị ha nwere n’ebe ha nọ? (b) Oleekwa ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi mmasị ndị mmadụ nwere n’ebe ndị ọzọ nọ?

AKWỤKWỤ dọbara otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ guzo n’ebe a na-anọ echere ụgbọ okporo ígwè n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè. Mgbe otu nwoke nọ ebe ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ hapụrụ ụmụ ya nwanyị o sekpụ n’aka ma wụtuo iji nyere ya aka. Ọ dọbara nwa okorobịa ahụ akwụkwụ na-adọ n’otu olulu dị n’agbata ụzọ ụgbọ okporo ígwè abụọ ma nọkwasị ya n’elu iji mee ka ụgbọ okporo ígwè na-agbalịsi ike ịkwụsị ghara igbu ya. Ụfọdụ ndị nwere ike ịkpọ nwoke a dike, ma o kwuru, sị: “Mmadụ kwesịrị ime ihe dị mma. Emere m ya n’ihi ebere. Ọ bụghị iji ghọọ onye a ma ama ma ọ bụ ka ndị mmadụ towe m.”

2 O nwere ike ịbụ na o nwere onye ị maara tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ iji nyere ndị ọzọ aka. Ọtụtụ ndị mere otú ahụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, zoo ndị ha na-amaghị ndị ha bụ. Chetakwa ihe mere Pọl onyeozi na narị mmadụ abụọ na iri asaa na ise ndị ọzọ ụgbọ ha kpuru n’obodo Mọlta, bụ́ nke dị nso na Sisili. Ndị obodo ahụ bịara nyere ndị a ha na-amaghị aka, ma gosi ha “obiọma pụrụ iche.” (Ọrụ 27:27–28:2) Gịnịkwanụ banyere nwa agbọghọ onye Izrel ahụ, bụ́ onye ọ pụrụ ịbụ na o tinyeghị ndụ ya n’ihe ize ndụ, chebaara ọdịmma nke otu n’ime ndị Siria dọọrọ ya n’agha echiche ma meso ya omume obiọma? (2 Ndị Eze 5:1-4) Cheekwa echiche banyere ilu ahụ a ma ama Jizọs tụrụ banyere onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi. Onye nchụàjà na onye Livaị hapụrụ inyere onye Juu ibe ha a hapụrụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma aka, ma onye Sameria gbalịrị nnọọ inyere ya aka. Ilu a emetụla ọtụtụ ndị nọ ebe dị iche iche n’obi kemgbe ọtụtụ narị afọ.—Luk 10:29-37.

3, 4. Olee ihe aka ndị mmadụ na-enyere ibe ha n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha na-akụziri anyị banyere ozizi evolushọn?

3 N’ezie, anyị bi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi’; ọtụtụ ndị bụ “ndị na-eme ihe ike ike” na “ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe.” (2 Timoti 3:1-3) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ̀ bụ na anyị ahụbeghị ebe ndị mmadụ mesoro ndị ọzọ omume obiọma, ikekwe, anyị erite uru na ha? Ọtụtụ mmadụ na-achọ inyere ndị ọzọ aka, ọbụna mgbe ọ ga-efu ha ihe, nke na ụfọdụ na-akpọ ya “inwe obi mmadụ.”

4 A na-ahụ ọchịchọ dị otú ahụ ndị mmadụ nwere inyere ndị ọzọ aka ọbụna mgbe o nwere ike ifu ha ihe n’agbụrụ na n’omenala nile, o megidekwara ozizi bụ́ na ihe na-achịkwa ụmụ mmadụ bụ iwu “onye ike kwere mere nke ya.” Francis S. Collins, bụ́ ọkà n’ihe metụtara mkpụrụ ndụ, nke bụ́ onye ndú nke ndị gọọmenti mba U.S. wepụtara ịmụ banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa (DNA), kwuru, sị: “Obiọma ndị mmadụ na-eme n’echeghị banyere onwe ha na-ara ndị kweere n’ozizi evolushọn ahụ́ nkọwa. . . . O nweghị ike isite ná mkpụrụ ndụ dị iche iche ịgbalị ịdịgide ndụ n’achọghị ịma banyere ibe ha.” O kwukwara, sị: “Ụfọdụ ndị na-ewepụta onwe ha inyere ndị na-enwetụghị ihe jikọrọ ha na ha aka. . . . O yighị ka ò kwekọrọ n’ozizi Darwin.”

“Olu Akọnuche”

5. Olee ihe ndị a na-achọpụtakarị n’ebe ndị mmadụ nọ?

5 Dr. Collins kwuru banyere otu ihe mere anyị ji emeso ndị ọzọ omume obiọma, sị: “Olu akọnuche anyị na-agwa anyị ka anyị nyere ndị ọzọ aka n’agbanyeghị na ọ dịghị ihe anyị nwere ike irite n’aka ha.” * “Akọnuche” ahụ o kwuru banyere ya pụrụ ichetara anyị otu ihe dị mkpa Pọl onyeozi kwuru: “Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ, bụ́ ndị na-enweghị iwu, sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu, ndị a, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, bụ iwu nye onwe ha. Ha onwe ha bụ kpọmkwem ndị na-egosipụta isi ihe dị n’iwu ahụ ịbụ nke e dere n’obi ha, ebe akọ na uche ha so ha na-agba àmà, n’echiche nke ha kwa, ha bụ ndị a na-ebo ebubo ma ọ bụ ọbụna ndị a na-agọpụ.”—Ndị Rom 2:14, 15.

6. N’ihi gịnị ka mmadụ nile ga-eji zaa Onye Okike ajụjụ?

6 Pọl gosiri n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom na ụmụ mmadụ ga-aza Chineke ajụjụ n’ihi na ihe ndị a na-ahụ anya na-egosi àgwà Ya, na-egosikwa na Ọ dị adị. Otú ahụ ka ọ dị “site n’okike nke ụwa gaa n’ihu.” (Ndị Rom 1:18-20; Abụ Ọma 19:1-4) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ jụrụ Onye Okike ha ma na-ebi ndụ rụrụ arụ. N’agbanyeghị nke ahụ, uche Chineke bụ ka ụmụ mmadụ nabata ezi omume ya ma chegharịa n’omume ọjọọ ha. (Ndị Rom 1:22–2:6) Ndị Juu nwere nnọọ ihe mere ha ga-eji mee otú ahụ—e si n’aka Mozis nye ha Iwu Chineke. Ma ọbụna ndị na-enweghị “okwu dị nsọ nke Chineke” kwesịrị ikweta na Chineke dị adị.—Ndị Rom 2:8-13; 3:2.

7, 8. Olee otú ụkpụrụ nke ihe ziri ezi si zuo ebe nile, gịnịkwa ka nke ahụ na-egosi?

7 Otu ihe dị mkpa mere mmadụ nile kwesịrị iji kweta na Chineke dị adị ma bie ndụ kwekọrọ na nke ahụ bụ ihe dị ha n’ime nke na-enyere ha aka ịma ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọchịchọ ime ihe ziri ezi anyị nwere na-egosi na anyị nwere akọnuche. Were anya nke uche gị tụlee ihe atụ a: Ụfọdụ ụmụaka kwụ n’ahịrị na-eche ka o ruoro ha ịnya janglova. Otu n’ime ụmụaka ahụ gafere ndị kwụ ya n’ihu gaa nọrọ n’ihu. Ọtụtụ n’ime ụmụaka ahụ kwuru, sị, ‘Ihe ahụ i mere adịghị mma!’ Ugbu a jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú ọbụna ọtụtụ ụmụaka ji mara ihe dị mma?’ Ime otú ahụ gosiri na ọ dị ihe dị ha n’ime nke na-enyere ha aka ịma ihe ziri na ihe na-ezighị ezi. Pọl dere, sị: “Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ, bụ́ ndị na-enweghị iwu, sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu.” O kwughị na “ọ bụrụ na,” dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe na-anaghị eme mgbe nile. O kwuru na “mgbe ọ bụla,” ma ọ bụ “mgbe,” bụ́ nke na-egosi na ọ bụ ihe na-eme mgbe nile. Nke bụ́ na ndị mmadụ “sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu,” nke pụtara na omume ọma ndị dị n’ime ha na-akpali ha ime ihe ndị kwekọrọ n’ihe ndị anyị na-agụ n’iwu Chineke e dere ede.

8 A na-ahụ ọchịchọ a ndị mmadụ nwere ime ihe ziri ezi n’ọtụtụ mba. Otu prọfesọ nke Mahadum Cambridge kwuru na ụkpụrụ omume ọma nke ndị Babilọn, ndị Ijipt, na ndị Gris nakwa nke ndị Aborigine Australia na ndị American India gụnyere “nkatọ nke mmegbu, igbu ọchụ, ịghọ aghụghọ na ịgha ụgha, ha nile kwuchara na e kwesịrị ịdị na-emeso ndị agadi, ụmụaka na ndị na-adịghị ike omume obiọma.” Dr. Collins dekwara, sị: “O yiri ka ụmụ mmadụ nile n’ebe nile hà nwere ụkpụrụ nke ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” Nke ahụ ọ́ dịghị echetara gị ihe Ndị Rom 2:14 kwuru?

Akọnuche Gị—Olee Otú O Si Arụ Ọrụ?

9. Gịnị bụ akọnuche, oleekwa otú o nwere ike isi nyere gị aka tupu i mee ihe?

9 Bible gosiri na akọnuche bụ ihe dị n’ime gị nke na-enyere gị aka ịtụle omume gị. Ọ dị ka à ga-asị na olu dị n’ime gị na-agwa gị ma ihe ị chọrọ ime ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi. Pọl kwuru banyere olu a nke dị n’ime ya, sị: “Akọ na uche m so m na-agba àmà n’ime mmụọ nsọ.” (Ndị Rom 9:1) Dị ka ihe atụ, olu a nwere ike ibu ụzọ gwa gị okwu mgbe ị ka na-eche ma ị̀ ga-eme ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi. Akọnuche gị nwere ike i nyere gị aka ịtụle ihe ị chọrọ ime n’ọdịnihu ma gwa gị otú obi ga-adị gị ma i mechaa ya.

10. Olee ụzọ akọnuche na-esikarị arụ ọrụ?

10 Akọnuche gị na-arụkarị ọrụ mgbe i mesịrị ihe. Mgbe Devid na-agba ọsọ ndụ ka Eze Sọl ghara igbu ya, Devid nwetara ohere ọ ga-eji mee ihe na-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka eze Chineke tere mmanụ, o mekwara ya. Mgbe e mesịrị, “obi Devid tara ya ụta.” (1 Samuel 24:1-5; Abụ Ọma 32:3, 5) E jighị okwu ahụ bụ́ “akọnuche” mee ihe n’amaokwu Bible ahụ; ma ọ bụ akọnuche mere ka Devid kwaa ụta—nke bụ́ na akọnuche ya nyere ya nsogbu. Akọnuche anyị nile enyewo anyị nsogbu otú ahụ nke Devid nyere ya. Nke bụ́ na anyị mere ihe, obi anyị emechaa mawa anyị ikpe, nyewe anyị nsogbu, n’ihi ihe ahụ anyị mere. Akọnuche nke ụfọdụ ndị na-akwụghị ụtụ isi ha nyere ha nnọọ nsogbu nke na ha mesịrị gaa kwụọ ụgwọ ha ji. O meela ka ndị ọzọ gwa di ma ọ bụ nwunye ha na ha kwara iko. (Ndị Hibru 13:4) N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe mmadụ mere ihe kwekọrọ n’akọnuche ya, ọ na-enwe afọ ojuju na udo nke obi.

11. Olee ihe mere o nwere ike iji bụrụ ihe ize ndụ ‘ikwe nnọọ ka akọnuche gị duzie gị’? Nye ihe atụ.

11 N’ihi ya, ànyị nwere nnọọ ike ‘ikwe ka akọnuche anyị duzie anyị’? Ọ dị mma ige akọnuche anyị ntị, ma olu ya nwere nnọọ ike iduhie anyị. Ee, olu nke “mmadụ anyị bụ n’ime” nwere ike iduhie anyị. (2 Ndị Kọrint 4:16) Tụlee otu ihe atụ. Bible gwara anyị na Stivin bụ ezigbo onye na-eso ụzọ Kraịst nke “jupụtara n’amara na ike.” Ụfọdụ ndị Juu tụpụrụ Stivin n’azụ Jeruselem ma tụgbuo ya na nkume. Sọl (bụ́ onye mesịrị ghọọ Pọl onyeozi) guzo n’ebe ahụ ma ‘kwado ogbugbu e gburu’ Stivin. O yiri ka ndị Juu ahụ hà kwenyesiri nnọọ ike na ha mere ihe ziri ezi nke na akọnuche ha enyeghị ha nsogbu. Ọ ghaghị ịbụ otú ahụ ka ọ dị Sọl, n’ihi na mgbe nke ahụ gasịrị, ọ “ka na-ekupụ iyi egwu na igbu ọchụ dị ka ume megide ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị.” O doro anya na akọnuche ya anaghịzi agwa ya eziokwu.—Ọrụ 6:8; 7:57–8:1; 9:1.

12. Olee otu ụzọ a pụrụ isi mee ka akọnuche anyị gharazie ịgwa anyị eziokwu?

12 Olee ihe nwere ike ime ka akọnuche Sọl gharazie ịgwa ya eziokwu? Otu ihe nwere ike ịkpatawo ya bụ ndị ya na ha kpachiri anya. Ọtụtụ n’ime anyị esorola onye olu okwu ya yiri nke nna ya kwuo okwu na telefon. O nwere ike ịbụ na nwa ahụ ketara olu okwu nna ya, ma o nwekwara ike ịbụ na ọ mụtara ikwu okwu otú nna ya si ekwu site n’ige ya ntị. N’otu aka ahụ, ndị megharịrị Sọl anya nwere ike ịbụ ndị Juu ha na ya na-akpachi anya, bụ́ ndị kpọrọ Jizọs asị ma na-emegide ozizi ya. (Jọn 11:47-50; 18:14; Ọrụ 5:27, 28, 33) Ee, ndị ha na Sọl na-akpa nwere ike imetụta olu ọ nụrụ n’ime ya, ya bụ akọnuche ya.

13. Olee otú ebe mmadụ bi nwere ike isi metụta akọnuche ya?

13 Ihe ndị gbara mmadụ gburugburu na-eme na ebe mmadụ bi nwekwara ike imetụta akọnuche ya, dị nnọọ ka ebe mmadụ bi nwere ike imetụta ire okwu onye ahụ. (Matiu 26:73) Nke ahụ aghaghị ịdị otú ahụ n’ebe ndị Asiria oge ochie nọ. A maara ha dị ka ndị na-alụkarị agha, ihe ndị ha kpụrụ akpụ gosiri ebe ha na-emekpọ ndị ha dọtara n’agha ọnụ. (Nehum 2:11, 12; 3:1) A kọwara ndị Ninive nke oge Jona dị ka ndị na-amaghị nke bụ́ “aka nri ha na aka ekpe ha.” Nke bụ́ na ha enweghị ụkpụrụ ziri ezi ha ji ama ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi dị ka Chineke si ele ihe anya. Cheedị nnọọ echiche otú omume ndị obodo ahụ nwere ike isiwo metụta akọnuche nke onye na-eto eto bi na Ninive! (Jona 3:4, 5; 4:11) N’otu aka ahụ taa, àgwà nke ndị gbara mmadụ gburugburu na-akpa nwere ike imetụta akọnuche ya.

Meziwanye Olu Na-agwa Gị Okwu n’Ime Gị

14. Olee otú akọnuche anyị si gosi na ihe Jenesis 1:27 kwuru bụ eziokwu?

14 Jehova nyere Adam na Iv akọnuche, anyị ketakwara akọnuche anyị n’aka ha. Jenesis 1:27 gwara anyị na Chineke kere mmadụ n’oyiyi ya. Nke ahụ apụtaghị na anyị yiri Chineke n’ọdịdị ahụ́, n’ihi na ọ bụ mmụọ, anyị abụrụkwanụ anụ ahụ́. Otú anyị si yie Chineke bụ na anyị nwere àgwà ya n’ime anyị, gụnyere ịma ezi ihe na ihe ọjọọ na akọnuche na-arụ ọrụ. Nke a na-egosi otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ka akọnuche anyị sikwuo ike, bụ́ nke ga-eme ka anyị nwee ike ịdaberekwu na ya. Ya bụ, mụtakwuo ihe banyere Onye Okike anyị, bịarukwuokwa ya nso.

15. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi rite uru site n’ịmara Nna anyị nke eluigwe?

15 Bible na-egosi na apụrụ ịkpọ Jehova Nna anyị nile. (Aịsaịa 64:8) Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, ma olileanya ha ọ̀ bụ ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa paradaịs, pụrụ ịkpọ Chineke Nna ha. (Matiu 6:9) Anyị kwesịrị inwe ọchịchọ ịbịarukwu Nna anyị nso ma si otú ahụ mụta echiche ya na ụkpụrụ ya. (Jems 4:8) Ọtụtụ enweghị mmasị ime otú ahụ. Ha yiri ndị Juu ahụ Jizọs kwuru banyere ha, sị: “Unu anụbeghị olu ya mgbe ọ bụla ma ọ bụkwanụ hụ ọdịdị ya; okwu ya adịgideghịkwa n’ime unu.” (Jọn 5:37, 38) Anyị anụbeghị nnọọ olu Chineke, n’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere ike ịmata otú o si eche echiche site n’ịgụ okwu ya, ma si otú ahụ yie ya ma na-eche echiche otú o si eche.

16. Gịnị ka akụkọ banyere Josef na-akọwara anyị banyere ịzụ akọnuche anyị na ige ya ntị?

16 Akụkọ Josef mgbe ọ nọ n’ụlọ Pọtịfa gosiri nke ahụ. Nwunye Pọtịfa gbara mbọ ịrata Josef. Ọ bụ ezie na Josef dịrị ndụ mgbe a na-edebeghị Bible na mgbe a na-enyebeghị Iwu Iri ahụ, Josef jụrụ, sị: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” (Jenesis 39:9) Ihe ahụ o kwuru abụghị iji mee ihe ga-atọ ezinụlọ ya ụtọ; ha ebighị nso. Ihe bụ́ isi o ji kwuo ya bụ na ọ chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Josef maara ụkpụrụ Chineke banyere alụmdi na nwunye—nke bụ́ otu nwoke otu nwanyị, ha abụọ abụrụkwa “otu anụ ahụ́.” O yikwara ka ọ̀ nụrụ otú obi dị Abimelek mgbe ọ matara na Rebeka lụrụ di—nke bụ́ na ọ dị njọ ịkpọrọ ya, na ọ ga-ewetakwara ndị ya amamikpe. Ee, Jehova gọzikwara ihe si na ya pụta, na-egosi otú o si ele ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye anya. O yiri ka Josef ịma ihe a nile ò nyeere akọnuche ya o ketara eketa aka ịjụ mmekọahụ rụrụ arụ.—Jenesis 2:24; 12:17-19; 20:1-18; 26:7-14.

17. N’ihi gịnị ka ọnọdụ anyị ji ka nke Josef mma mgbe a bịara n’ihe banyere iyi Nna anyị?

17 N’ezie, ọnọdụ anyị nọ na ya ugbu a ka mma. Anyị nwere Bible n’ozuzu ya, bụ́ ebe anyị ga-esi mụta echiche Nna anyị na mmetụta ọ na-enwe banyere ihe dị iche iche, gụnyere ihe ndị ọ kwadoro na ihe ndị ọ na-akwadoghị. Ka anyị na-amụkwu Akwụkwọ Nsọ, otú ahụ ka anyị ga na-abịarukwu Chineke nso ma na-eyi ya. Ka anyị na-eme otú ahụ, o yiri ka ihe akọnuche anyị na-agwa anyị ọ̀ ga na-ekwekọkwu n’echiche nke Nna anyị. Ọ ga na-ekwekọkwu n’uche ya.—Ndị Efesọs 5:1-5.

18. Olee ihe anyị nwere ike ime iji mee ka anyị tụkwasịkwuo akọnuche anyị obi, n’agbanyeghị otú ihe ndị anyị mere n’oge gara aga siri metụta anyị?

18 Olee maka ebe anyị bi imetụta akọnuche anyị? O nwere ike ịbụ na echiche na omume nke ndị ikwu anyị na ihe ndị a na-eme ebe a zụlitere anyị emetụtala anyị. N’ihi ya, olu akọnuche anyị nwere ike gharakwa ịdị na-adasi ụda ike. O ji “ire okwu” nke ndị gbara anyị gburugburu na-agwa anyị okwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị enweghị ike ịgbanwe ihe anyị mere n’oge gara aga, ma anyị pụrụ ikpebi ịhọrọ ndị enyi na ebe ga-abara akọnuche anyị uru. Otu ihe bụ́ isi anyị ga-eme bụ iso ezi Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-agbalị iṅomi Nna ha kemgbe ọtụtụ afọ na-akpachi anya. Ọmụmụ ihe ọgbakọ, gụnyere iso ụmụnna anyị ekwurịta okwu tupu a malite ọmụmụ ihe na mgbe a gbasara ọmụmụ ihe na-enye anyị ohere magburu onwe ha ime nke ahụ. Anyị nwere ike ịhụ echiche na omume kwekọrọ na Bible nke Ndị Kraịst ibe anyị, nke gụnyere ha ịdị njikere ige ntị mgbe akọnuche ha na-agwa ha echiche na ụzọ nke Chineke. Ka oge na-aga, nke a pụrụ inyere anyị aka ime ka akọnuche anyị kwekọọ n’ụkpụrụ Bible, na-eme ka anyị yikwuo Chineke. Mgbe anyị mere ka olu nke dị anyị n’ime kwekọkwuo n’ụkpụrụ Nna anyị ma na-agbaso ezi ihe nlereanya nke Ndị Kraịst ibe anyị, anyị ga-atụkwasikwu akọnuche anyị obi, anyị ga-enwekwukwa mmasị ige ntị n’ihe ọ na-agwa anyị.—Aịsaịa 30:21.

19. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịtụle banyere akọnuche?

19 Ka o sina dị, ụfọdụ na-agbalị ige akọnuche ha ntị kwa ụbọchị. Isiokwu ọzọ ga-atụle ọnọdụ ụfọdụ cherela Ndị Kraịst ihu. Site n’ịtụle ọnọdụ ndị dị otú ahụ, anyị pụrụ ịhụ nnọọ ọrụ akọnuche na-arụ, ihe mere akọnuche pụrụ iji dị iche iche, nakwa otú anyị nwere ike isi na-egekwu ntị n’olu akọnuche anyị.—Ndị Hibru 6:11, 12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 5 Owen Gingerich, bụ́ prọfesọ na-eme nnyocha na ngalaba na-ahụ maka mbara igwe na Mahadum Harvard dere, sị: “Omume obiọma pụrụ nnọọ igosi na ụmụ mmadụ nwere àgwà . . . nke sayensị na-enweghị ike ịhụ n’ime ụmụ anụmanụ. O nwere nnọọ ike ịbụ na ọ dị ebe ọzọ ha si nweta ya, o nwekwara nnọọ ike isite n’àgwà ọma ndị Chineke nyere ndị mmadụ bụ́ nke gụnyere akọnuche.”

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• N’ihi gịnị ka agbụrụ nile ji nwee ihe dị ha n’ime na-agwa ha ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ, ma ọ bụ akọnuche?

• Gịnị mere o ji dị anyị mkpa ịkpachara anya banyere ikwe ka akọnuche anyị nanị na-eduzi anyị?

• Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi meziwanye olu anyị na-anụ n’ime anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Akọnuche Devid nyere ya nsogbu . . .

ma nke Sọl onye Tasọs enyeghị ya

[Foto dị na peeji nke 24]

Anyị nwere ike ịzụ akọnuche anyị