Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eche Banyere Echi

Na-eche Banyere Echi

Na-eche Banyere Echi

MGBE Jizọs Kraịst na-ekwu otu okwu wuru ewu n’akụkụ otu ugwu na Galili, o kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere echi.” Ná nsụgharị The New English Bible, Jizọs gara n’ihu kwuo, sị: “Echi ga-elekọta onwe ya.”—Matiu 6:34.

Olee ihe i chere okwu ahụ bụ́ “echi ga-elekọta onwe ya” pụtara? Ọ̀ pụtara na i kwesịrị ịdị ndụ nanị maka taa ma leghara echi anya? Nke ahụ ò kwekọrọ nnọọ n’ihe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kweere?

“Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu”

Jiri anya gị gụọ ihe nile Jizọs kwuru n’oge ahụ na Matiu 6:25-32. Ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru bụ: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi. . . . Leruonụ anụ ufe nke eluigwe anya nke ọma, n’ihi na ha adịghị akụ mkpụrụ ma ọ bụ na-aghọrọ ma ọ bụ na-ekpokọta ihe n’ụlọ nkwakọba ihe; ma Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. . . . Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit ná ndụ ya site n’ichegbu onwe ya? Ọzọ, n’ihe banyere uwe, gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu? Mụtanụ ihe site n’okooko lili nke ọhịa, otú ha si eto; ha adịghị adọgbu onwe ha n’ọrụ, ha adịghịkwa akpa ogho . . . Ya mere, ya adịla mgbe unu ga-echegbu onwe unu wee sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyikwasị?’ N’ihi na ihe a nile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsosi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa.”

Jizọs ji ndụmọdụ abụọ mechie akụkụ a nke okwu ya. Nke mbụ bụ: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze [Chineke] na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” Nke abụọ abụrụ: “N’ihi ya, unu echegbula onwe unu ma ọlị maka echi, n’ihi na ụbọchị na-esonụ ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.”—Matiu 6:33, 34.

Nna Unu Maara Mkpa Unu

Ì chere na Jizọs nọ na-agwa ndị na-ege ya ntị, nke gụnyere ndị ọrụ ubi, ka ha ghara ‘ịgha mkpụrụ, iwe ihe ubi, ma ọ bụ ịchịkọta ihe ubi ha n’ọba’? Ma ọ bụ ka ha ghara ‘ịdọgbu onwe ha n’ọrụ ma ọ bụ ịkpa ogho’ iji nweta uwe dị ha mkpa? (Ilu 21:5; 24:30-34; Eklisiastis 11:4) Mbanụ. Ọ bụrụ na ha akwụsị ịrụ ọrụ, o yikarịrị nnọọ ka hà ‘ga-arịọrịrị arịrịọ na mgbe owuwe ihe ubi,’ ha agaghịkwa enwe ihe ha ga-eri ma ọ bụ ihe ha ga-eyi.—Ilu 20:4.

Olee banyere nchegbu? Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ na ndị na-ege ya ntị agatụghị echegbukwa onwe ha? Nke ahụ agaghị ekwe omume. Jizọs n’onwe ya nwere nnọọ obi erughị ala na nchegbu n’abalị ahụ e jidere ya ma gbuo ya.—Luk 22:44.

Nanị ihe Jizọs mere bụ ikwu otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ. Ichegbubiga onwe gị ókè adịghị mgbe ọ ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị chere gị ihu. Dị ka ihe atụ, ọ gaghị agbatịkwu ndụ gị. Jizọs kwuru na ọ pụghị “ịgbakwụnye otu kubit ná ndụ” gị. (Matiu 6:27) Kama nke ahụ, mmadụ ichegbubiga onwe ya ókè ruo ogologo oge yiri nnọọ ka ọ̀ ga-egbubilata ndụ onye ahụ.

Ndụmọdụ ya bara nnọọ uru. Ọtụtụ ihe na-echegbu anyị anakwanụghị emecha mee. Onye Britain ọnụ na-eru n’okwu, bụ́ Winston Churchill, ghọtara nke a banyere oge ihe siri ike n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. O dere banyere ụfọdụ nchegbu ndị o nwere n’oge ahụ, sị: “Mgbe m chetara ihe a nile chegburu m n’oge ahụ, ana m echeta akụkọ nke otu agadi nwoke bụ́ onye kwuru mgbe ọ na-achọ ịnwụ na ya echegbuola onwe ya banyere ọtụtụ ihe ná ndụ ya, na ihe kakwa n’ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ chegburu ya emechabeghị mee.” N’ezie, ọ bụ ihe amamihe dị na ya iche nanị banyere ụbọchị nke anyị hụrụ anya, karịsịa mgbe nsogbu ndị chere anyị ihu nwere nnọọ ike ịkpatara anyị oké nchegbu.

‘Nọgidenụ Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Chineke’

N’ezie, ihe Jizọs bu n’obi abụtụghị nnọọ nanị ọdịmma anụ ahụ́ na nke uche nke ndị na-ege ya ntị. Ọ maara na nchegbu banyere inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ, nakwa inwe oké mmasị n’ihe onwunwe na ihe ụtọ, nwere ike ime ka anyị chefuo ihe ndị ka mkpa. (Ndị Filipaị 1:10) I nwere ike iche, sị: ‘Olee ihe ga-adị mkpa karịa inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ?’ Azịza ya bụ ihe ndị metụtara ofufe anyị na-efe Chineke. Jizọs mere ka o doo anya na ihe kasị mkpa ná ndụ anyị kwesịrị ịbụ ‘ịnọgide buru ụzọ na-achọ alaeze Chineke na ezi omume ya.’—Matiu 6:33.

N’oge Jizọs, ọtụtụ ndị ji ike ha nile na-achụso ihe onwunwe. Ihe kasị ha mkpa ná ndụ bụ ịkpakọta nnọọ akụ̀. Ma, Jizọs gbara ndị na-ege ya ntị ume ịghara ịdị otú ahụ. Dị ka ndị raara onwe ha nye Chineke, “ọrụ” ha bụ ‘ịtụ egwu Chineke, debekwa ihe nile o nyere n’iwu.’—Eklisiastis 12:13.

Nchegbu banyere ihe onwunwe—“nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba”—pụrụ ime ka ndị na-ege ya ntị kwụsị iche banyere ofufe Chineke. (Matiu 13:22) Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi.” (1 Timoti 6:9) Iji nyere ụmụazụ ya aka izere “ọnyà” a, Jizọs chetaara ha na Nna ha nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị ha mkpa. Chineke ga-enye ha ihe ndị dị ha mkpa dị ka ọ na-enye “anụ ufe nke eluigwe” ihe ndị na-akpa ha. (Matiu 6:26, 32) Kama ikwe ka nchegbu rikpuo ha, ha kwesịrị ime ike ha iji gboo mkpa ha ma hapụziere Jehova okwu, obi esiekwa ha ike na ọ ga-emere ha mkpa ha.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Mgbe Jizọs kwuru na “echi ga-elekọta onwe ya,” nanị ihe ọ na-ekwu bụ na anyị ekwesịghị iji nchegbu banyere ihe nwere ike ime echi tụkwasị ná nsogbu ndị anyị nwere taa. Bible ọzọ si otú a sụgharịa okwu ahụ Jizọs kwuru: “Unu echegbula onwe unu banyere echi; nchegbu nke ya ga-ezuru ya. Ọ dịghị mkpa ịtụkwasị ihe n’elu nsogbu ndị ha na ụbọchị nke ọ bụla na-eso.”—Matiu 6:34, Today’s English Version.

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Ma, e nwere nnukwu ọdịiche dị ná mmadụ ịghara ichegbubiga onwe ya ókè banyere echi na mmadụ ileghara ya anya kpamkpam. Ọ dịghị mgbe Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha leghara echi anya. Kama nke ahụ, ọ gbara ha ume ka ha nwee nnọọ mmasị n’ọdịnihu. Ha kwesịrị nnọọ ikpe ekpere maka mkpa ndị ha nwere n’oge ahụ—nri ụbọchị. Ma ha kwesịrị ibu ụzọ kpee ekpere banyere ihe ndị ga-abịa n’ọdịnihu—ka Alaeze Chineke bịa nakwa ka e mee uche Chineke n’ụwa.—Matiu 6:9-11.

Anyị ekwesịghị ịdị ka ndị oge Noa. Ha nọ nnọọ “na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di” nke na ha ‘amaghị’ ihe na-aga ime. Olee ihe si na ya pụta? “Iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.” (Matiu 24:36-42) Pita onyeozi ji akụkọ a mere eme chetara anyị mkpa ọ dị anyị ịdị na-eche banyere echi. O dere, sị: “Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a nile, lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche!”—2 Pita 3:5-7, 11, 12.

Kpakọba Akụ̀ n’Eluigwe

Ee, ka anyị “buru” ụbọchị Jehova “n’uche.” Ime otú ahụ ga-emetụta nnọọ otú anyị si eji oge anyị, ume anyị, nkà anyị, ihe onwunwe anyị, na ike anyị eme ihe. Anyị ekwesịghị ikwe ka nchụso nke ihe onwunwe—ma ihe ndị dị mkpa ma ihe ụtọ—rie anyị isi nke na anyị ga-enwezi nanị obere oge maka ọrụ ndị ‘na-asọpụrụ Chineke.’ Iche nanị banyere taa nwere ike iyi ka ọ̀ na-aba uru ozugbo, ma uru ọ bụla ọ ga-abara anyị agaghị adịte aka. Jizọs kwuru na anyị ga-aka nnọọ bụrụ ndị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị ‘akpakọbara onwe anyị akụ̀ n’eluigwe’ kama ịkpakọba akụ̀ n’ụwa.—Matiu 6:19, 20.

Jizọs mere ka nke ahụ pụta ìhè n’ihe atụ o nyere banyere nwoke mere oké atụmatụ banyere ọdịnihu. Atụmatụ ndị ahụ agụnyeghị ime uche Chineke. Ubi nwoke ahụ mepụtara nnọọ ihe. O kpebiri ịkwatu ọba ya ma wuo ndị ka buo ibu iji bie ndụ nke ntụsara ahụ́, iri ihe, ịṅụ ihe, na ime onwe ya obi ụtọ. Olee ihe dị njọ na nke ahụ? Ọ nwụrụ tupu ya enwee ike iri uru nke atụmatụ ndị o mere. Ma, nke ka njọ bụ na ya na Chineke adịghị ná mma. Jizọs mechiri site n’ikwu, sị: “Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:15-21; Ilu 19:21.

Olee Ihe I Nwere Ike Ime?

Adịla ka nwoke ahụ Jizọs kwuru banyere ya. Chọpụta ihe Chineke zubere maka echi ma bie ndụ gị n’ụzọ kwekọrọ na ya. Chineke agbachighị ụmụ mmadụ nkịtị banyere ihe ọ gaje ime. Onye amụma oge ochie bụ́ Emọs dere, sị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.” (Emọs 3:7) Ugbu a, i nwere ike ịgụ ihe ndị Jehova ji ndị amụma ya kpughee n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible.—2 Timoti 3:16, 17.

Otu n’ime ihe ndị Bible kpughere bụ ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya bụ́ nke ga-emetụta ụwa nile otú ihe ọ bụla na-emetụtatụbeghị ya. Jizọs kwuru, sị: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwebeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a.” (Matiu 24:21) Ọ dịghị mmadụ ga-egbochili oké mkpagbu ahụ. N’ezie, o nweghị ihe kwesịrị ime ka ndị na-efe Chineke ezi ofufe chọwa igbochi ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na oké mkpagbu ahụ ga-ewepụ ihe ọjọọ nile n’ụwa, ọ ga-ewetakwa “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” nke pụtara ọchịchị ọhụrụ ga-adị n’eluigwe na ụmụ mmadụ ọhụrụ ga-ebi n’ụwa. N’ụwa ọhụrụ ahụ, Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya [ụmụ mmadụ], ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:1-4.

N’ihi ya, ọ́ bụghị ihe amamihe dị na ya ugbu a iwepụta oge tụlee ihe Bible kwuru banyere nke ahụ? Ị̀ ga-achọ ka mmadụ nyere gị aka ime otú ahụ? Gwa Ndịàmà Jehova ka ha nyere gị aka. Ma ọ bụkwanụ gị edetara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ. Gbalịsie ike ịhụ na ị naghị ebi ndụ nanị maka taa, kamakwa maka ọdịnihu magburu onwe ya.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

“Kwụsịnụ ichegbu onwe unu . . . Ụbọchị na-esonụ ga-enwe nchegbu nke ya”