Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Sirakus Ebe Pọl Kwụsịtụrụ na Njem Ya

Sirakus Ebe Pọl Kwụsịtụrụ na Njem Ya

Sirakus Ebe Pọl Kwụsịtụrụ na Njem Ya

IHE dị ka n’afọ 59 O.A., otu ụgbọ mmiri si obodo Mọlta oké osimiri Mediterenian gbara gburugburu na-aga Ịtali. Ụgbọ ahụ nwere ihe a tụrụ atụ n’isi ya nke a kpọrọ “Ụmụ Zus,” bụ́ chi ndị e chere na ha na-echebe ndị ụgbọ mmiri. Luk, bụ́ onye so dee Bible, kọrọ na ụgbọ mmiri ahụ ruru “n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Sirakus” bụ́ nke dị n’akụkụ mmiri nke ndịda ebe ọwụwa anyanwụ Sisili ma ‘nọrọ ebe ahụ ruo ụbọchị atọ.’ (Ọrụ 28:11, 12) Ndị ha na Luk nọ n’ụgbọ ahụ bụ Arịstakọs na Pọl onyeozi, bụ́ onye a na-aga ikpe ikpe na Rom.—Ọrụ 27:2.

Anyị amaghị ma è kwere ka Pọl rịtuo na Sirakus. Ọ bụrụ na e kwere ka Pọl ma ọ bụ ndị ya na ha so na njem ahụ rịtuo, olee ihe ha pụrụ ịhụwo?

N’oge ndị Gris na ndị Rom, ọ fọrọ obere ka Sirakus wuo ewuo ka Atens na Rom. Dị ka omenala si kwuo, ọ bụ ndị Kọrịnt chọpụtara ya n’afọ 734 T.O.A. Ọ dị mgbe Sirakus wuru ewu, e nwekwara ndị a ma ama n’oge ochie a mụrụ n’ebe ahụ, dị ka onye na-ede egwuregwu bụ́ Epicharmus na onye ọkà ná mgbakọ na mwepụ bụ́ Archimedes. N’afọ 212 T.O.A., ndị Rom meriri Sirakus n’agha.

Ileta obodo Sirakus n’oge a nwere ike ime ka ị matatụ otú obodo ahụ dị n’oge Pọl. E kewara obodo ahụ ụzọ abụọ—otu bụ obere obodo Ortygia mmiri gbara gburugburu, bụ́ ebe o yiri ka ụgbọ mmiri ahụ Pọl nọ na ya ọ̀ kwụsịrị, akụkụ ya nke ọzọ dị n’elu ala.

Taa, i nwere ike ịhụ ụlọ arụsị ndị a rụrụ otú ndị Gris oge ochie si arụ ụlọ n’obodo Sisili mmiri gbara gburugburu—ụlọ arụsị Apollo, bụ́ nke a rụrụ na narị afọ nke isii T.O.A. E nwekwara ogidi ụlọ arụsị a raara nye Atena, bụ́ nke a rụrụ na narị afọ nke ise T.O.A., ma e jizi ya mere katidral.

Etiti obodo ahụ n’oge a dị n’elu ala, bụ́ ebe i nwere ike ịhụ ebe a na-edebe ihe ochie na Niapọlis. Ebe ndị Gris na-eme egwuregwu dị nnọọ nso n’ọnụ ụzọ e si abanye na ya. Ọ bụ otu n’ime ebe kasị ukwuu ndị Gris rụrụ a na-eme egwuregwu n’oge ochie. Ihu o chere n’oké osimiri mere ka ọ maa nnọọ mma ịnọ eme egwuregwu. E nwere ọgbọ egwuregwu ndị Rom na ndịda ndịda nke ebe ndebe ihe ochie ahụ, bụ́ nke a rụrụ na narị afọ nke atọ O.A. Ọ fọrọ obere ya agbaa gburugburu, ọ dị otu narị na iri mita anọ n’ogologo, ma dịrị otu narị mita na iri na itoolu n’obosara, ọ bụkwa ọgbọ egwuregwu nke atọ kasị buo ibu n’Ịtali.

Ọ bụrụ na i nwee ike ịga leta Sirakus, i nwere ike ịnọ ọdụ na bench, chee ihu n’osimiri dị n’Ortygia, mepee Bible gị n’Ọrụ 28:12, ma jiri anya nke uche gị hụ Pọl onyeozi ka ọ nọ n’ụgbọ na-abata ebe a.

[Ihe Osise/Map dị na peeji nke 30]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Mọlta

Sisili

Sirakus

ỊTALI

Rijiọm

Putiolaị

Rom

[Foto dị na peeji nke 30]

Mkpọmkpọ ebe nke ebe ndị Gris na-eme egwuregwu dị na Sirakus