Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-eji Ohere Ọ bụla Dapụtaranụ Akọrọ Ndị Mmadụ Ihe Ndị I Kweere?

Ị̀ Na-eji Ohere Ọ bụla Dapụtaranụ Akọrọ Ndị Mmadụ Ihe Ndị I Kweere?

Ị̀ Na-eji Ohere Ọ bụla Dapụtaranụ Akọrọ Ndị Mmadụ Ihe Ndị I Kweere?

“È NWERE ihe a ga-asị nnọọ na ọ bụcha eziokwu?” Nke a bụ isiokwu nke otu asọmpi edemede e nwere na Poland. Ihe a gwara ndị na-ede ya bụ: “Ọ dịghị anyị mkpa inwe ihe bụcha nnọọ eziokwu. Ọ dịghị onye ọ dị mkpa. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị ihe bụcha nnọọ eziokwu.” Agata, nwa akwụkwọ dị afọ iri na ise na-aga ụlọ akwụkwọ kọleji onye bụ́kwa otu n’ime Ndịàmà Jehova, kpebiri iji ohere a kọọrọ ndị ọzọ ihe ndị o kweere.

Iji kwadebe maka ihe odide ahụ, Agata buru ụzọ gwa Jehova n’ekpere ka o duzie ya, ma malitezie ime nnyocha n’isiokwu ahụ. Ọ hụrụ ebe a kọwara isiokwu yiri isiokwu edemede ahụ n’Ụlọ Nche nke July 1, 1995. Ọ jụghachiri ajụjụ ahụ a na-ekwesịghị ichefu echefu Pọntiọs Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” (Jọn 18:38) O kwuru na Paịlet jụrụ ajụjụ ahụ n’ụdị ịkwa emo. A pụrụ ikwu na ihe ahụ ọ jụrụ bụ: ‘Eziokwu? Gịnị ka ọ̀ bụ? E nweghị ihe bụ́ eziokwu!’ Agata dere, sị: “Ajụjụ ahụ Paịlet jụrụ chetaara m isiokwu nke edemede a na ntụziaka e nyere maka ya.”

Ọ kọwaziri echiche ndị mmadụ nwere taa nke bụ́ na ihe otu onye weere na ọ bụ eziokwu nwere ike ọ gaghị abụ eziokwu n’anya onye ọzọ, ihe ha abụọ chere nwekwara ike ịbụ “eziokwu.” Ọ jụrụ ajụjụ ndị dị ka, “Olee onye n’ime anyị ga-ekweta ịgba ụgbọelu ma ọ bụrụ na o kwenyesighị ike na e nwere ikike na-eme ka ụgbọelu na-efe n’elu?” Mgbe ahụ, o rụtụrụ aka n’ihe e dere na Bible ma kwuo, sị: “E nwere ihe àmà ndị a pụrụ inyochapụta enyochapụta kwadoro na ihe Okwu Chineke kwuru bụ nnọọ eziokwu.” O kwukwara na ya nwere olileanya na ndị ji obi ha nile na-achọ ihe bụ́ eziokwu ga-enwe ndidi iji chọta ya, ọ bụrụkwa na ha achọta ya, ha kwesịrị iji umeala n’obi nakwere ya.

E nyere Agata ihe nrite pụrụ iche nyekwa ya ohere ịgụ ihe a o dere n’ihu ụmụ klas ya nile. Nke a mere ka ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ibe ya kweta ka ọ mụwara ha Bible. Obi tọrọ nnọọ Agata ụtọ na ya jiri ohere a kọọrọ ọtụtụ ndị ọzọ ihe ndị o kweere. N’ezie, iji ohere ọ bụla dapụtaranụ kọọrọ ndị ọzọ ihe ndị i kweere na-arụpụta ihe. Olee ohere ndị i nwere iji kọọrọ ndị ọzọ ihe ndị i kweere?