Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amụtara M Ịtụkwasị Jehova Obi M Nile

Amụtara M Ịtụkwasị Jehova Obi M Nile

Akụkọ Ndụ

Amụtara M Ịtụkwasị Jehova Obi M Nile

Dị Ka Aubrey Baxter Si Kọọ

N’uhuruchi nke otu Saturday n’afọ 1940, ụmụ nwoke abụọ bara m ọgụ ma kụtuo m n’ala. Ndị uwe ojii abụọ nọ nnọọ n’akụkụ na-ele mụ na ha, kama ha ga-enyere m aka, ha nọ na-akpọ m iyi ma na-aja ndị na-eti m ihe ike. Ihe dugara n’ihe a malitere ihe dị ka afọ ise gara aga mgbe e were m n’ọrụ n’ebe a na-egwupụta kol. Ka m kọọrọ gị ihe ndị merenụ.

AMỤRỤ m na 1913 na Swansea, bụ́ obodo dị n’ụsọ oké osimiri na New South Wales nke dị n’Australia. Abụ m nke atọ n’ime ụmụ nwoke anọ nne na nna m mụrụ. Mgbe m dị afọ ise, mmadụ nile nọ n’ezinụlọ anyị butere ọrịa a na-atụ ajọ egwu bụ́ Spanish influenza, bụ́ nke gburu ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa dum. Obi dị m ụtọ ikwu na ọ dịghị onye n’ime anyị o gburu. Otú ọ dị, na 1933, njiji jiri, mama m nwụrụ n’afọ ahụ mgbe ọ dị afọ iri anọ na asaa. Mama m bụ nwanyị na-atụ egwu Chineke, o nwetakwara mpịakọta abụọ nke akwụkwọ a na-akpọ Light, bụ́ akwụkwọ e ji amụ Bible nke Ndịàmà Jehova kesara mgbe ahụ.

N’oge ahụ, m na-arụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta kol. E nwere mgbe anyị na-enwe ọrụ na mgbe anyị na-adịghị enwecha ọrụ, n’ihi ya, ana m eji akwụkwọ ndị ahụ aga ọrụ ma jiri ọkụ a rụnyere n’okpu ọrụ m na-agụ ha. N’oge na-adịghị anya, achọpụtara m na achọtala m eziokwu ahụ. Amalitekwara m ige okwu Bible Ndịàmà Jehova na-akpọsa na redio. Ihe ọzọ mekwara ka m nwekwuo ọṅụ bụ na papa m na ụmụnne m malitere nwewe mmasị n’eziokwu Bible.

Na 1935, njiji ọzọ jiri n’ezinụlọ anyị mgbe oyi bara nwanne m nta bụ́ Billy n’ahụ́ ya anwụọkwa. Ọ dị nanị afọ iri na isii mgbe ọ nwụrụ. Mgbe ọ nwụrụ, olileanya mbilite n’ọnwụ kasiri ezinụlọ anyị obi. (Ọrụ 24:15) Ka oge na-aga, papa m na ụmụnne m nwoke ndị tọrọ m, bụ́ Verner na Harold, nakwa ndị nwunye ha, raara onwe ha nye Chineke. Ndị mụrụ m na ụmụnne m anwụọla, ọ bụ nanị m fọdụrụ. Ma nwunye nke abụọ nke Verner, bụ́ Marjorie, na nwunye Harold, bụ́ Elizabeth, ka na-ejekwara Jehova ozi.

Ịmụta Ịtụkwasị Jehova Obi

Mgbe mbụ mụ na Onyeàmà Jehova kwurịtara okwu bụ n’afọ 1935, mgbe otu nwanyị bụ́ onye Ukraine gbaara ígwè otu ụbọchị bịa n’ụlọ anyị. Na Sunday ya, agara m ọmụmụ ihe mbụ m, mgbe otu izu gasịkwara, esooro m ha gaa ozi ọma. Onyeàmà duziri nzukọ maka ozi ubi n’ụbọchị ahụ nyere m akwụkwọ nta ụfọdụ ma mee ihe tụrụ m n’anya nke bụ́ ịgwa m gawa nanị m! Ahụ́ nọ na-ama m jijiji n’ụlọ mbụ m gara, ọ dịkwa m ka ala meghee ka m daba! Ma onye nwe ụlọ ebe m gara bụ nnọọ ezigbo mmadụ, ọ natadịrị m akwụkwọ.

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Eklisiastis 12:1 na Matiu 28:19, 20 kpaliri nnọọ mmasị m, meekwa ka m chọọ ịghọ onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye ozi oge nile. Papa m kwadoro mkpebi m. Ọ bụ ezie na e mebeghị m baptizim mgbe ahụ, ekpebiri m ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ na July 15, 1936. N’ụbọchị ahụ, agara m n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Sydney, bụ́ ebe a gwara m ka m sonyere ndị ọsụ ụzọ iri na abụọ nọ na Dulwich Hill, bụ́ obere obodo dị ná mpụga Sydney. Ha kụziiri m otú e si eji njin aka akwọ ọka wit, bụ́ ihe ndị ọsụ ụzọ ji akwọpụta ntụ ọka ha ji eme ihe oriri iji mee ka nri ghara ifu ha oké ego.

Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ n’Ime Ime Obodo

Mgbe e mesịrị m baptizim ná ngwụsị afọ 1936, e zigara mụ na ndị ọsụ ụzọ abụọ ọzọ, bụ́ Aubrey Wills na Clive Shade, ije ozi n’ebe etiti obodo Queensland. Ihe anyị ji gaa bụ ụgbọala Aubrey, ịnyịnya ígwè ole na ole, obere phonograph anyị ga-eji na-akpọrọ ndị mmadụ okwu Bible, ụlọ ntu, bụ́ nke anyị ji mere ụlọ ruo afọ atọ, àkwà ndina atọ, otu tebụl, na ite ígwè anyị ga-eji na-esi nri. Otu uhuruchi, mgbe o ruru m n’aka isi nri, echere m na m siiri ha nri “pụrụ iche” m ji akwụkwọ nri na ọka sie. Ma o nweghị onye n’ime anyị riliri ya. Ebunyere m ya ịnyịnya ibu nọ nso ebe ahụ. O siri ya imi, fufee isi ya, ma gawara onwe ya! Nke a mere ka m kwụsị isi ụdị nri na-edochaghị m anya.

Ka oge na-aga, anyị kpebiri ịrụcha ókèala anyị ngwa ngwa site n’ike ya ụzọ atọ, onye nke ọ bụla n’ime anyị na-arụ otu akụkụ. Ebe m na-emechikarị ozi n’uhuruchi na-adị anya n’ebe anyị bi nke na anaghị m enwe ike ịgbara ígwè lawa, nke a na-emekwa mgbe ụfọdụ ka m na-ehi n’ụlọ ndị nwere obiọma n’ebe m gara ozi ọma. N’otu oge, ehiri m ụra n’ákwà ndina mara nnọọ mma nke dị n’ụlọ ndị ọbịa n’otu ebe a na-azụ ehi, n’echi ya mụ ehie n’ala ruru unyi n’ụlọ onye na-agba nta, bụ́ ebe a tọgbọchara akpụkpọ anụ ndị na-esi ísì. Ehiri m n’ime ọhịa ọtụtụ mgbe. N’otu oge, nkịta ọhịa gbara ọhịa ebe m dina gburugburu, ube ha na-adachisị ntị. Ụra ekweghị m ohihi. Mgbe chi bọrọ, achọpụtara m na ọ bụghị m ka ha chọ bịa kama ọ bụ iberibe anụ ndị e kposara nso ebe ahụ.

Iji Ụgbọala A Kwụnyere Ígwè Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma

Anyị jiri nnọọ ụgbọala a kwụnyere ígwè okwu na ya kwusaa banyere Alaeze Chineke. N’obodo Townsville nke dị n’ebe ugwu nke obodo Queensland, ndị uwe ojii kwere ka anyị nọrọ n’etiti obodo ahụ na-ekwusa ozi ọma. Ma okwu ahụ e tinyere na teepụ nke anyị na-akpọ kpasuru ndị òtù Salvation Army iwe nke mere ka ha gwa anyị ka anyị pụọ. Mgbe anyị jụrụ ịpụ, mmadụ ise n’ime ha kwara nnọọ ụgbọala anyị ajọ aka. Anọ m n’ime ụgbọala ahụ na-agbanye ígwè okwu ahụ mgbe ha na-eme nke a! Anyị bịara hụ na ọ baghị uru isiwe ọnwụ, n’ihi ya, mgbe ha kwụsịrị ịkwagharị ụgbọala anyị, anyị siri n’ebe ahụ pụọ.

Na Bundaberg, otu nwoke nwere mmasị n’ozi anyị gbazinyere anyị ụgbọ epeepe ya ka anyị wee nwee ike isi n’Osimiri Burnett, bụ́ nke gbara obodo ahụ gburugburu, na-ekwusa ozi ọma. Aubrey na Clive ji ụgbọ epeepe ahụ na-agbagharị ma na-ekwusa ozi ọma, ebe mụ onwe m nọ n’ụlọ ezumezu anyị gbazitere na-ekwusa nke m. N’abalị ahụ na Bundaberg, a nọ na-anụ olu na-ede ude e tinyere na teepụ nke Joseph F. Rutherford, onye si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ka ọ na-akpọsa ozi dị ike sitere na Bible. N’ezie, oge ndị ahụ bụ nnọọ oge pụrụ iche nke chọrọ ka ndị Chineke nwee okwukwe na obi ike.

Agha Ewetakwuo Nsogbu Ndị Ọzọ

Obere oge ka Agha Ụwa nke Abụọ malitesịrị na September 1939, Ụlọ Nche nke November 1 kọwara mkpa ọ dị ka Ndị Kraịst ghara itinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha. Ihe mere ka oge na-aga mere ka m nwee obi ụtọ na m mụrụ Ụlọ Nche ahụ bịara n’ezi oge. Ka ọ dịgodị, mgbe mụ na Aubrey na Clive jekọrọ ozi ruo afọ atọ, e zigara anyị n’ebe dịgasị iche. A họpụtara m ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ebe ugwu nke obodo Queensland, nke a nwalekwara m ọtụtụ ugboro ma m tụkwasịrị Jehova obi.

N’August 1940, eletara m ọgbakọ dị na Townsville, bụ́ ebe e nwere ndị ọsụ ụzọ anọ, ha bụ Percy na Ilma Iszlaub * na ụmụnne abụọ bụ́ Norman na Beatrice Bellotti. Mgbe afọ isii gasịrị, Beatrice ghọrọ nwunye m. Ọ bụ n’uhuruchi nke otu ụbọchị Saturday, mgbe anyị zichara ozi ọma n’okporo ámá, ka ihe ahụ m kọrọ ná mmalite mere. Ma, nanị ihe mmeso ọjọọ ahụ mere bụ ime ka m gakwuo n’ihu n’ozi Jehova.

Ụmụnna nwanyị abụọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ, bụ́ Una na Merle Kilpatrick ji nnọọ ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi n’ebe ugwu. Ozi ọma m so ha jee otu ụbọchị tọgburu m atọgbu, ha gwakwara m ka m jiri ụgbọ epeepe kwọfee ha ka ha gaa na nke otu ezinụlọ nwere mmasị. Nke a pụtara na m ga-egwuru mmiri gaa bute ụgbọ epeepe ahụ n’ofe ọzọ nke osimiri ahụ ma bịazie kwọrọ ụmụnna nwanyị ndị ahụ gafee. Ma mgbe m ruru ebe ụgbọ epeepe ahụ dị, ahụghị m osisi e ji akwọ ya! Anyị mesịrị chọpụta na ọ bụ otu onye na-emegide anyị zoro ha. Ma aghụghọ ya ahụ egbochighị anyị. Arụrụ m ọrụ ịgụpụta ndị mmiri na-eri ruo ọtụtụ afọ, m ka bụkwa aka ochie n’igwu mmiri. N’ihi ya, ekere m eriri e ji kegide ụgbọ ahụ n’úkwù m, dọrọ ya gaa n’ebe ụmụnna nwanyị ndị ahụ nọ ma kwọfetazie ha. Jehova gọziri mgbalị anyị n’ihi na ka oge na-aga, ezinụlọ ahụ nwere mmasị ghọrọ Ndịàmà.

Jehova Echebe Anyị

Iji zere ndị ọjọọ ịbata n’obodo, ndị agha bịara nwee ebe ndị ha na-anọgasị eche nche n’obodo Innisfail. Ebe ọ bụ na m bi ebi n’ime obodo ahụ, enwere m akwụkwọ ikike iji gafee, bụ́ nke nyeere m nnọọ aka nke ukwuu mgbe ndị si n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova bịara ileta anyị. Iji kwọfee ha n’ebe ndị nche nọ, m na-ezo ha n’ebe zoro ezo n’oche azụ ụgbọala m.

Mmanụ ụgbọala dị ụkọ n’oge ahụ, a rụnyekwara ihe e ji emepụta gas n’ọtụtụ ụgbọala ndị e nwere n’oge ahụ. Iji nye ụgbọala ikike ịgba, ihe a a rụnyere na-esi n’unyì dị ọkụ emepụta gas. M na-ejikarị abalị aga, m na-ebukwa akpa unyì n’azụ oche ebe ahụ nwanna m kwọ n’ụgbọala m zoro. Mgbe m kwụsịrị n’ebe a na-eche nche, m na-emegharị ndị nche anya site n’ịghara imenyụ ụgbọala m ma hụ na ihe ahụ e ji akpọ unyì ọkụ dị nnọọ ọkụ. Mgbe ndị nche jụrụ m ihe mere na achọghị m imenyụ ụgbọala m, ana m eji olu dara ụda agwa ha sị: “Ọ bụrụ na m kwụsị, ọ ga-emeghasị ihe e ji emepụta gas na-enye ụgbọala m ikike, ọ ga-arakwa ahụ́ ụgbọala m amaliteghachi.” N’ihi oké ọkụ na-eku ebe ahụ, mkpọtụ ụgbọala ahụ na-eme, na ntụ ọkụ ahụ na-efesasị ebe ahụ, onye nche ahụ nyochara ụgbọala m ngwa ngwa ma sị m gawa.

N’oge ndị ahụ, a gwara m gaa nye aka hazie mgbakọ a ga-enwe na Townsville maka Ndịàmà nọ n’ebe ahụ. Ihe oriri kọrọ ụkọ n’oge ahụ, ijikwa nweta ihe oriri ndị bịara mgbakọ ahụ ga-eri, aghaghị m ịgakwuru onye ọrụ gọọmenti na-elekọta obodo ahụ. A tụrụ ụmụnna anyị mkpọrọ n’oge ahụ n’ihi na ha ekweghị eso aga agha. N’ihi ya, mgbe m chọrọ ịga hụ onye ahụ na-elekọta obodo, m nọ na-eche n’obi m ma amamihe ọ̀ dị n’ihe a m na-achọ ime, ka ọ́ bụghị ịga kpaa nwa agụ aka n’ọdụ? Ma otú ọ dị, agakwuuru m ya dị ka a gwara m mee.

Nwoke ahụ diga nnọọ n’oche ya, nnukwu tebụl dịkwa ya n’ihu. Ọ gwara m nọdụ ala. Mgbe m gwara ya ihe kpọtara m na nke ya, ọ kụjara ma lee m otu anya o lere m. O kwuziri, sị, “Olee ókè nri ị chọrọ?” Enyere m ya akwụkwọ m ji detuo ihe ndị anyị chọrọ. Ha dịcha obere obere. O lechara ha anya ma kwuo, sị: “Echeghị m na ihe ndị a ga-ezu. Ọ ga-aka mma ma anyị nye gị nke ọ bụla n’ime ha okpukpu abụọ.” Mgbe m si n’ọfịs ya pụta, ekelere m nnọọ Jehova bụ́ onye si ụzọ a kụziere m ịtụkwasị ya obi.

Na January 1941, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’Australia. Ọtụtụ ndị malitere inyo anyị enyo ọbụna na-ebo anyị ebubo na anyị na-eledoro ndị Japan ala! N’otu oge, ụgbọala abụọ bujuru ndị uwe ojiji wụchiri n’Ugbo Alaeze, nke bụ́ obere ala dị n’Atherton Plateau, bụ́ ebe anyị zụrụ iji na-akọ nri. Ha sị na ha na-achọ ígwè na-enye ọkụ a sị na anyị ji ezigara ndị iro ozi. Ha bokwara anyị ebubo na anyị na-akụ ọka anyị n’usoro n’usoro otú ndị ji ụgbọelu ga-eji ya ghọta ihe a chọrọ ka ha mee! N’ezie, ha chọpụtara na ebubo ndị a nile bụcha ụgha.

N’ihi iwu ahụ a machibidoro ọrụ anyị, anyị bịara dịrị akọ ma na-elezi anya nke ọma mgbe anyị na-ebubata akwụkwọ anyị. Dị ka ihe atụ, mgbe e wepụtara akwụkwọ ahụ bụ́ Children, agara m Brisbane buru otu katọn, jiri ụgbọ okporo ígwè gaa n’ebe ugwu, ma dọsazie akwụkwọ ndị ahụ n’ebe ndị e nwere ọgbakọ. Iji mee ka ndị uwe ojii na ndị agha na-eche nche ghara imeghe katọn ahụ, ana m anyagide mma nkwọ dị gburugburu n’elu ya tupu m na-esi n’ụgbọ okporo ígwè rịtuo. Ọ bụ ezie na atụmatụ a dị mfe nchọpụta, ọ dịghị mgbe e jidere m. Na June 1943 ndị Jehova nwere obi ụtọ dị ukwuu mgbe a kwụsịrị ịmachibido ọrụ anyị iwu. Otu ọkàikpe kọwara mmachibido iwu ahụ dị ka nke e mere n’ajụghị ase, nke a na-echeghị echiche mee na nke mmegbu.

A Kpọọ Anyị Ka Anyị Bịa Debanye Aha Maka Ịga Agha

N’afọ sochirinụ, a kpọrọ mụ na Aubrey Wills na Norman Bellotti ka anyị bịa debanye aha anyị n’akwụkwọ maka ịga agha. E bu ụzọ kpọọ Aubrey na Norman n’ụlọ ikpe, a makwara ha ikpe ịga mkpọrọ ọnwa isii. Ka otu izu gasịrị, a kpọkwara m n’ụlọ ikpe. N’oge ahụ, ndị na-arụ na post ọfịs na-ejichi Ụlọ Nche e dere aha Ndịàmà ha maara ma na-ahapụ Ụlọ Nche nke ndị na-abụghị Ndịàmà tụrụ ọda ha. Ọrụ anyị bụ ịchọpụta ndị a na-atụ ọda ma jiri ígwè e ji emepụtaghachi ibe akwụkwọ mepụtaghachi Ụlọ Nche ndị a ma kee ha ụmụnna anyị. N’ụzọ dị otú a, anyị nwetara nri ime mmụọ mgbe nile.

Mgbe a mara m ikpe ịga mkpọrọ ọnwa isii ahụ m na-atụ anya na a ga-ama m, etinyere m akwụkwọ ozugbo ka e kpegharịa ikpe m, dị ka alaka ụlọ ọrụ dị na Sydney gwara m mee. Ihe anyị ji mee nke a bụ iji gbutụ oge ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ga-elekọta ọrụ anyị. M ji oge a m na-eche ka e kpegharịa ikpe m leta ihe dị ka Ndịàmà iri abụọ na otu a tụrụ mkpọrọ n’ebe ugwu nke obodo Queensland. A tụkpuru ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha n’otu ụlọ mkpọrọ, onye na-elekọta ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ebe ahụ ha nọ kpọkwara anyị asị. Mgbe m gwara ya na a na-ekwe ka ndị chọọchị ndị ọzọ na-abịa eleta ndị òtù ha, iwe were ya. Ọ baara m mba, sị: “A sị na ọ dị m n’aka, m ga-akwụwa Ndịàmà Jehova nile n’ahịrị ma gbagbusịa ha!” Ndị nche nọ ebe ahụ si n’ihu ya kpọpụ m ngwa ngwa.

Mgbe oge ruru ka e kpegharịa ikpe m, a kpọnyere m ọkàiwu dị ka iwu kwuru ka a na-eme. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ m kpechiteere onwe m, nke pụtakwara na m ga-atụkwasị Jehova obi kpamkpam. Jehova agbakụtaghịkwa m azụ. (Luk 12:11, 12; Ndị Filipaị 4:6, 7) Ọ tụrụ m n’anya na ikpe ahụ laara m, ihe kpatara ya bụ na e nwere ihe ndị onye na-edere ụlọikpe akwụkwọ dehiere n’akwụkwọ e ji gbaa m akwụkwọ!

Na 1944, e zigara m ịga lekọtawa otu nnukwu sekit nke gụnyere Ebe Ndịda Australia nile, ebe ugwu Victoria, na obodo New South Wales nke dị na Sydney. N’afọ sochiri ya, e kwuru ka a malite ikwu okwu ihu ọha n’ụwa nile, a gwakwara ọkà okwu ọ bụla ka o jiri isiokwu ọgbakọ Jehova wepụtara kwuo okwu ihu ọha ga-eru otu awa. Ikwu okwu ihu ọha ga-eru otu awa abụghị obere okwu, ma anyị gara n’ihu ime ya na-atụkwasị Jehova obi kpamkpam, Jehova gọzikwara mgbalị anyị.

Ịlụ Nwanyị na Ibu Ọrụ Ndị Ọhụrụ

Na July 1946, mụ na Beatrice Bellotti lụrụ, anyị jekọkwara ozi ọsụ ụzọ ọnụ. E ji osisi plywood rụọ ụlọ anyị nke e ji ụgbọala adọkpụgharị. A mụrụ nwa anyị nwanyị bụ́ Jannyce (Jann), nke bụ́kwanụ otu mkpụrụ nwa anyị nwere, na December 1950. Anyị rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’ọtụtụ ebe gụnyere obodo Kempsey, New South Wales, bụ́ ebe nanị anyị bụ Ndịàmà. Na Sunday ọ bụla, anyị na-aga n’ụlọ ezumezu e nwere n’ebe ahụ, m na-adịkwa njikere ikwu okwu ihu ọha anyị jiri mpempe akwụkwọ kpọsaa. Ruo ọnwa ole na ole, ọ bụ nanị Beatrice na obere nwa anyị bụ́ Jann bụ ndị na-ege m ntị. Ma ka oge na-aga, ndị ọzọ jiri nwayọọ nwayọọ na-abata. Taa, e nwere ọgbakọ abụọ na-amụba n’ike n’ike na Kempsey.

Mgbe Jann gbara afọ abụọ, anyị gara birizie na Brisbane. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, anyị atọ rụkọrọ ọrụ ọsụ ụzọ ruo afọ anọ n’obodo Cessnock nke dị na New South Wales tupu anyị alaghachi Brisbane iji nyere mama Beatrice na-ejighị ahụ́ aka. Ugbu a, enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka okenye n’ọgbakọ dị na Chermside.

Mụ na Beatrice na-ekele Jehova maka ngọzi ya a na-apụghị ịgụta ọnụ, nke gụnyere ihe ùgwù nke inyere mmadụ iri atọ na abụọ aka ịbịa jewere ya ozi. M na-ekele nnọọ Jehova maka ụdị nwunye o nyere m, bụ́ onye, ọ bụ ezie na ọ dị nwayọọ ma dịrị umeala n’obi, na-eji obi ike agbachitere eziokwu Bible. Ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ na otú o si tụkwasị ya obi, tinyere ‘anya dị mfe’ o nwere, mere ya ka ọ bụrụ ezigbo nwunye na nne. (Matiu 6:22, 23; Ilu 12:4) Mụ na ya pụrụ iji obi anyị nile kwuo, sị: “Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ nke na-atụkwasị Jehova obi.”—Jeremaịa 17:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 19 Akụkọ ndụ Percy Iszlaub gbara n’Ụlọ Nche nke November 15, 1981.

[Foto dị na peeji nke 9]

Anyị ji ụgbọala a a kwụnyere ìgwè okwu na ya kwusaa ozi ọma n’ebe ugwu nke obodo Queensland

[Foto dị na peeji nke 10]

Ka m na-enyere Ụmụnna nwanyị si Kilpatrick aka ịkwọfe ụgbọala ha n’oge udu mmiri n’ebe ugwu nke obodo Queensland

[Foto dị na peeji nke 12]

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ