Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inyocha “Ihe Ndị Miri Emi nke Chineke”

Inyocha “Ihe Ndị Miri Emi nke Chineke”

Inyocha “Ihe Ndị Miri Emi nke Chineke”

“Mmụọ ahụ na-enyocha ihe nile, ọbụna ihe ndị miri emi nke Chineke.”—1 NDỊ KỌRINT 2:10.

1. Olee eziokwu ụfọdụ dị na Bible ndị na-eme ka onye malitere ịmụ Bible ọhụrụ nwee obi ụtọ?

ỌTỤTỤ n’ime anyị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa pụrụ icheta ọṅụ anyị nwere mgbe mbụ anyị mụtara eziokwu. Anyị matara ihe mere aha Jehova ji dị mkpa, ihe mere o ji kwe ka nhụjuanya dịrị, ihe mere ụfọdụ ndị ga-eji aga eluigwe, na ihe bụ́ olileanya ụmụ mmadụ ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi. O nwere ike ọ dịla mgbe anyị gụtụrụ Bible ma ihe ndị a adị ka ihe e zonahụrụ anyị ezonahụ dịkwa nnọọ ka ọ dị ọtụtụ ndị bi n’ụwa taa. Anyị dị ka onye nọ n’elu mmiri na-ekiri ọmarịcha azụ na ihe ndị ọzọ e kere eke mara nnọọ mma nọ n’ala mmiri. Ma ó jighị ugegbe anya pụrụ iche nke na-enyere mmadụ aka ịhụ ihe ndị a nọ n’ala mmiri nke ọma, ọ gaghị enwe ike ịhụ ọmarịcha ihe ndị ahụ. Ma o jiri ugegbe anya a baruo n’ala mmiri, anya ọ hụrụ ihe ndị a ga-atọgbu ya atọgbu. N’otu aka ahụ, mgbe mmadụ malitere inyere anyị aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ, mgbe ahụ ka anyị na-amalite ịhụ “ihe ndị miri emi nke Chineke.”—1 Ndị Kọrint 2:8-10.

2. Gịnị ga-eme ka anyị nọgide na-enwe ọṅụ ka anyị na-amụ Okwu Chineke?

2 Ànyị kwesịrị ịkwụsị nanị n’ịmara eziokwu ụfọdụ ndị dị na Bible? Okwu ahụ bụ́ “ihe ndị miri emi nke Chineke” gụnyere ịghọta ihe bụ́ amamihe Chineke, bụ́ nke mmụọ nsọ kpugheere Ndị Kraịst ma ya abụrụ ihe nzuzo nye ndị ọzọ. (1 Ndị Kọrint 2:7) Amamihe Chineke adịghị agwụ agwụ, anyị ga-enwekwa ọṅụ dị ukwuu ka anyị na-enyocha ha! O nweghị otú anyị ga-esi amatacha ihe nile banyere amamihe Chineke. Ọṅụ anyị nwere mgbe mbụ anyị mụtara ozizi ndị bụ́ isi dị na Bible ga-adịgide ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-enyocha “ihe ndị miri emi nke Chineke” n’esepụghị aka.

3. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị ghọta nke ọma ihe mere anyị ji kwenye n’ihe ndị anyị kweere?

3 N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị ghọta ihe ndị ahụ “miri emi”? Ịghọta ihe ndị anyị kweere na ihe mere anyị ji kwere na ha—ya bụ́ ihe ndị kara anyị obi anyị ji kwere n’ihe ndị ahụ—ga-eme ka okwukwe anyị sie ike meekwa ka anyị kwenyesikwuo ike n’ihe ndị ahụ anyị kweere. Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị ka anyị jiri “ikike iche echiche” anyị “na-anwapụtara [onwe anyị] ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.” (Ndị Rom 12:1, 2) Ịghọta ihe mere Jehova ji chọọ ka anyị na-ebi ndụ n’ụzọ ụfọdụ ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike irubere ya isi. N’ihi ya, ịmata “ihe ndị miri emi” nke Chineke pụrụ inye anyị ike iji merie ọnwụnwa nke itinye aka n’ihe ọjọọ ma kpalie anyị ịbụ ndị “na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ.”—Taịtọs 2:14.

4. Gịnị ka ịmụ Bible gụnyere?

4 Anyị aghaghị ịmụ ihe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta ihe ndị miri emi nke Chineke. Ma ịmụ ihe na ịgụ ihe elu elu abụghị otu. Ịmụ ihe chọrọ mmadụ ichebara ihe ọ na-amụ echiche iji mara otú ya na ihe ndị ọ maara mbụ si kwekọọ. (2 Timoti 1:13) Ọ gụnyere ịghọta ihe mere e ji kwuo ihe e kwuru. Ịmụ Bible kwesịrị ịgụnye ịtụgharị uche n’otú anyị pụrụ isi jiri ihe ndị anyị mụtara na-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha nakwa otú anyị ga-esi jiri ya na-enyere ndị ọzọ aka. Ebe ọ bụkwa na “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru,” ọmụmụ ihe anyị ekwesịghị ịbụ ịgụ nanị akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ, kama o kwesịrị ịgụnye ‘okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.’ (2 Timoti 3:16, 17; Matiu 4:4) Ịmụ Bible chọrọ mgbalị siri ike! Ma ọ pụrụ ịbụ ihe na-atọ ụtọ, ịghọtakwa “ihe ndị miri emi nke Chineke” esighịkwa oké ike.

Jehova Na-enyere Ndị Dị Umeala n’Obi Aka Ịghọta Ihe

5. Olee ndị pụrụ ịghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke”?

5 Ọ bụrụgodị na ị maghị akwụkwọ mgbe ị ka na-aga akwụkwọ, echela na ịghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke” ga-esiri gị ike nghọta. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa na-eje ozi, Jehova mere ka a mata nzube Ya, ọ bụghị ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi ka o kpugheere ya, kama o kpugheere ya ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị, bụ́ ndị dị obi umeala nke na ha kwere ka ohu Chineke zi ha ihe. Ha yiri ụmụ ọhụrụ ma e jiri ha tụnyere ndị gụrụ oké akwụkwọ. (Matiu 11:25; Ọrụ 4:13) Mgbe Pọl onyeozi na-edegara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ ozi banyere “ihe Chineke kwadebewooro ndị hụrụ ya n’anya,” o kwuru, sị: “Ọ bụ anyị ka Chineke kpughewooro ha site na mmụọ ya, n’ihi na mmụọ ahụ na-enyocha ihe nile, ọbụna ihe ndị miri emi nke Chineke.”—1 Ndị Kọrint 2:9, 10.

6. Gịnị ka ihe e dere ná 1 Ndị Kọrint 2:10 pụtara?

6 Olee otú mmụọ Chineke si enyocha “ihe nile, ọbụna ihe ndị miri emi nke Chineke”? Kama ikpughere Onye Kraịst nke ọ bụla ihe ndị ahụ miri emi, Jehova ji mmụọ ya na-eduzi nzukọ ya, bụ́ nke na-enyere ndị Chineke dị n’otu aka ịghọta Bible. (Ọrụ 20:28; Ndị Efesọs 4:3-6) Ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na-amụkwa otu ihe. N’ime afọ ole na ole, ha na-amụcha ozizi ndị bụ́ isi nke Bible. Jehova na-esite n’ọgbakọ ya eji mmụọ nsọ ya enyere ndị mmadụ aka inweta àgwà a chọrọ iji ghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke.”—Ọrụ 5:32.

Gịnị Ka “Ihe Ndị Miri Emi nke Chineke” Gụnyere?

7. Gịnị mere ọtụtụ mmadụ adịghị aghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke”?

7 Anyị ekwesịghị iche na “ihe ndị miri emi” a na-ekwu okwu ya bụ ihe ndị siri ike nghọta. Ihe mere “ihe ndị miri emi nke Chineke” ji bụrụ ihe e kpuchiri ekpuchi n’anya ọtụtụ mmadụ abụghị n’ihi na amamihe Chineke siri ike nghọta, kama ọ bụ n’ihi na Setan na-eduhie ndị mmadụ site n’ime ka ha jụ enyemaka Jehova ji nzukọ Ya na-enye.—2 Ndị Kọrint 4:3, 4.

8. Olee ihe ndị miri emi Pọl kwuru okwu ha n’isi nke atọ nke akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bi n’Efesọs?

8 Isi nke atọ nke akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst bi n’Efesọs na-egosi na “ihe ndị miri emi nke Chineke” gụnyere ọtụtụ eziokwu nke ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova maara nnọọ nke ọma, ndị gụnyere onye bụ́ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ndị a ga-esi n’ụwa họrọ iso chịa n’eluigwe, nakwa ihe banyere Alaeze Mezaịa ahụ. Pọl dere, sị: “N’ọgbọ ndị ọzọ, e meghị ka ụmụ mmadụ mara ihe nzuzo a dị ka mmụọ nsọ kpugheworo ya ugbu a nye ndịozi na ndị amụma ya dị nsọ, ya bụ, na ndị mba ọzọ kwesịrị ịbụ ndị so na-eketa ihe na ndị so bụrụ akụkụ nke ahụ́ ahụ na ndị so anyị na-eketa nkwa ahụ n’ịdị n’otu nke anyị na Kraịst Jizọs.” Pọl kwuru na e nyere ya ọrụ ‘ime ka ụmụ mmadụ hụ ụzọ e si ahụ maka ihe nzuzo ahụ dị nsọ bụ́ nke e zoworo site na mgbe gara aga a na-amaghị ama n’ime Chineke.’—Ndị Efesọs 3:5-9.

9. Gịnị mere ịghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke” ji bụrụ ihe ùgwù?

9 Pọl gara n’ihu ịkọwa nzube Chineke nke bụ́ na ‘n’ebe ndị dị n’eluigwe na a ga-amara amamihe dịgasị iche iche nke Chineke site n’ọgbakọ ahụ.’ (Ndị Efesọs 3:10) Ndị mmụọ ozi na-erite uru site n’ikiri na ịghọta amamihe dị n’otú Jehova si na-emeso ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụụrụ anyị nnọọ ihe ùgwù ịghọta ọbụna ihe ndị mmụọ ozi nwere mmasị na ya! (1 Pita 1:10-12) Pọl kwukwara na anyị kwesịrị ịgbalị “isoro ndị nsọ nile jiri uche ghọta ihe bụ ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” nke ihe Ndị Kraịst kweere. (Ndị Efesọs 3:11, 18) Ugbu a, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe ndị miri emi, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na anyị aghọtachabughị nke ọma.

Ụfọdụ Ihe Ndị Miri Emi

10, 11. Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kọwaa, olee mgbe Jizọs ghọrọ “mkpụrụ” bụ́ isi nke “nwanyị” eluigwe Chineke?

10 Anyị maara na Jizọs bụ mkpụrụ bụ́ isi ná “mkpụrụ” nke “nwanyị” eluigwe Chineke nke e kwuru okwu ya na Jenesis 3:15. Iji ghọtakwuo nke a, anyị nwere ike ịjụ, sị: ‘Olee mgbe Jizọs ghọrọ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa? Ọ̀ bụ mgbe ọ nọ n’eluigwe, ụbọchị a mụrụ ya, mgbe e mere ya baptizim, ka ọ̀ bụ mgbe o si n’ọnwụ bilie?’

11 Chineke kwere nkwa na ọ bụ site ná nzukọ ya nke dị n’eluigwe, bụ́ nke a kpọrọ “nwanyị” ya n’amụma Aịsaịa, ka a ga-esi nweta mkpụrụ nke ga-echifịa isi agwọ ahụ. Ma ọtụtụ puku afọ gafere ma nwanyị Chineke ahụ ewepụtaghị mkpụrụ ruru eru ibibi Setan na ọrụ ya nile. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya nwanyị “aga” kwuokwa na “ọ na-ewutekwa ya n’ime mmụọ ya” n’amụma Aịzaịa. (Aịsaịa 54:1, 5, 6) N’ikpeazụzi, a mụrụ Jizọs na Betlehem. Ma ọ bụ nanị mgbe e mere ya baptizim, bụ́ mgbe e ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ ka o wee ghọọ nwa Chineke e ji mmụọ nsọ mụọ ka Jehova kwuziri, sị: “Nke a bụ Ọkpara m.” (Matiu 3:17; Jọn 3:3) “Mkpụrụ” bụ́ isi ná mkpụrụ nwanyị ahụ apụtaziela n’ikpeazụ. Ka e mesịrị, e tekwara ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ ma jiri mmụọ nsọ mụọ ha. “Nwanyị” Jehova, bụ́ onye nọ kemgbe ọtụtụ afọ dị ka “nwanyị na-amụghị nwa,” nweziri ike “iti mkpu ọṅụ” ugbu a.—Aịsaịa 54:1; Ndị Galeshia 3:29.

12, 13. Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi na ọ bụ Ndị Kraịst nile e tere mmanụ nọ n’ụwa bụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche”?

12 Ihe ọzọ bụ́ ihe miri emi nke Chineke, bụ́ nke e kpugheere anyị bụ nzube Chineke isi n’etiti ụmụ mmadụ họrọ mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Mkpughe 14:1, 4) Anyị kweere na ọ bụ Ndị Kraịst nile e tere mmanụ nọ n’ụwa n’oge ọ bụla bụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ndị Jizọs kwuru na ọ bụ ha ga-enye ezinụlọ ya “nri” n’oge kwesịrị ekwesị. (Matiu 24:45) Olee akụkụ Bible ndị na-egosi na nkọwa a ziri ezi? Ka ọ̀ ga-abụ na Jizọs na-ekwu banyere Onye Kraịst ọ bụla nke na-enye ụmụnna ya nri ime mmụọ?

13 Chineke gwara mba Izrel, sị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, . . . na ohu m nke M họpụtara.” (Aịsaịa 43:10) Ma na Naịsan 11 nke afọ 33 O.A., Jizọs gwara ndị ndú Izrel na Chineke ajụla mba ha na ha agaghịzi abụ ndị ohu ya. Ọ gwara ha, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” Jizọs gwara ìgwè mmadụ na-ege ya ntị, sị: “Lee! A gbahapụworo unu ụlọ unu.” (Matiu 21:43; 23:38) Ụlọ Izrel, bụ́ ohu Jehova, ekwesịghị ntụkwasị obi, o nweghịkwa uche. (Aịsaịa 29:13, 14) Ka e mesịrị, n’otu ụbọchị ahụ, Jizọs jụrụ ajụjụ, sị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche?” A pụrụ ikwu na ihe ọ nọ na-ajụ bụ, ‘Olee mba nwere uche nke ga-anọchi anya Izrel, ma bụrụ ohu na-ekwesị ntụkwasị obi?’ Pita onyeozi zara ajụjụ a mgbe ọ gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: “Unu bụ . . . ‘mba dị nsọ, otu ndị bụ́ maka ihe onwunwe pụrụ iche.’” (1 Pita 1:4; 2:9) Mba ime mmụọ ahụ, nke bụ́ “Izrel nke Chineke,” ghọrọ ohu ọhụrụ nke Jehova nwere. (Ndị Galeshia 6:16) Dị nnọọ ka ndị Izrel oge ochie nile bụ otu “ohu” Jehova, otú ahụkwa ka Ndị Kraịst nile e tere mmanụ nọ n’ụwa n’oge ọ bụla si bụrụ “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù na anyị na-esi n’aka ohu Chineke na-enweta “nri”!

Ọmụmụ Ihe Onwe Onye Gị Pụrụ Ịdị Na-atọ Gị Ụtọ

14. Gịnị mere ịmụ Bible, ọ bụghị ịgụ ya elu elu, ji bụrụ ihe na-atọ ụtọ?

14 Mgbe e mere ka anyị mata nkọwa ọhụrụ nke akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ, ọ́ dịghị atọ anyị ụtọ nke ukwuu n’ihi otú ihe ahụ si mee ka okwukwe anyị sikwuo ike? Ọ bụ nke a na-eme ka ọmụmụ Bible, ọ bụghị ịgụ ya elu elu, bụrụ nnọọ ihe na-atọ ụtọ. N’ihi ya, mgbe ị na-agụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú nkọwa a e nyere si kwekọọ n’ihe m maara mbụ banyere ihe a a na-ekwu okwu ya? Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ m ga-akpọtụ uche ma ọ bụ ihe ndị ọzọ m ga-ekwu iji kwadoo ihe a e kwuru n’ebe a?’ Ọ bụrụ na ọ ga-adị mkpa ka i metụkwuo nchọnchọ, detuo ihe ị ga-achọ ịchọpụta ma hụ na i nyochara isiokwu ahụ n’oge ọzọ.

15. Olee isiokwu ndị nwere ike inye gị obi ụtọ ma ị na-amụ ha, oleekwa otú ha ga-esi baara gị uru ga-adịte aka?

15 Olee isiokwu ndị ọ̀ ga-abụ ị na-amụ banyere ha ha emee ka i nwee ọṅụ a na-enweta site n’ịghọta ihe ọhụrụ? Anyị nwere ike ịmụtakwu ihe ma ọ bụrụ na anyị emee nnyocha miri emi iji ghọtakwuo ihe banyere ọgbụgba ndụ dị iche iche Chineke na ụmụ mmadụ gbara iji nyere ụmụ mmadụ aka. I nwere ike ime ka okwukwe gị sikwuo ike site n’ịmụ banyere amụma ndị kwuru maka Jizọs Kraịst ma ọ bụ ịmụ otu n’ime akwụkwọ amụma ndị dị na Bible n’amaokwu n’amaokwu. Ihe ọzọ ga-eme ka okwukwe gị sikwuo ike bụ iji akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, ma ọ bụrụ na e nwere ya n’asụsụ gị, mụọ banyere Ndịàmà Jehova nke oge a. * Ịtụlekwa ihe ndị a zara n’oge ndị gara aga n’isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” bụ́ nke na-agba n’Ụlọ Nche, ga-eme ka anyị ghọtakwuo akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ. Lekwasị anya n’otú e si jiri Akwụkwọ Nsọ kọwaa ihe ndị a kọwara. Nke a ga-enyere gị aka ịzụ “ikike nghọta” gị ma mee ka i nwee nghọta. (Ndị Hibru 5:14) Ka ị na-amụ ihe, dee ihe ụfọdụ dị gị mkpa ma ọ bụ kanye akara n’ebe ụfọdụ n’ime Bible gị ma ọ bụ n’ibe akwụkwọ ọzọ ka ha wee baara gị uru na-adịte aka, gị ejirikwa ha nyere ndị ọzọ aka.

Mee Ka Ọmụmụ Bible Na-atọ Ndị Na-eto Eto Ụtọ

16. Olee otú ị pụrụ isi mee ka ọmụmụ Bible na-atọ ndị na-eto eto ụtọ?

16 E nwere ọtụtụ ihe ndị nne na nna nwere ike ime iji nyere ụmụ ha aka inwe mmasị ịmụ Bible. Echekwala na ụmụaka agaghị aghọtali ihe ndị miri emi nke Chineke. Ọ bụrụ na ị gwa ụmụ gị ka ha mee nchọnchọ n’otu isiokwu unu ga-amụ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ unu, hụ na ị jụrụ ha ihe ndị ha chọpụtara. Unu nwekwara ike ime ihe ngosi ụfọdụ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ unu otú ụmụ unu ga-esi azaghachi onye jụrụ ha ajụjụ banyere ihe ndị ha kweere nakwa iji nyere ha aka ime ka onye ahụ ghọta na ihe ndị a kụziiri ha bụ eziokwu. Ihe ọzọ ga-enye aka bụ iji broshuọ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ * na-egosi ụmụ unu ebe ala ndị a kpọrọ aha ha na Bible dị na iji ya nyere ha aka ịghọta ebe ndị unu na-agụ banyere ha mgbe unu na-agụ ọgụgụ Bible dịịrị izu.

17. Gịnị mere anyị ekwesịghị ikwe ka ọmụmụ Bible onwe onye gbochie anyị ịkwadebe ọmụmụ ihe ọgbakọ?

17 Ọmụmụ Bible onwe onye pụrụ ịbụ ihe na-atọ ụtọ, ọ na-emekwa ka okwukwe sikwuo ike, ma ekwela ka o gbochie gị ịkwadebe ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ọmụmụ ihe ọgbakọ bụ ụzọ ọzọ Jehova si akụziri anyị ihe site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” N’ihi ya, imekwu nchọnchọ n’ihe a chọrọ ịmụ n’ọgbakọ ga-enyere gị aka inye azịza ndị mara mma n’ọmụmụ ihe—dị ka ihe atụ n’oge a na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ma ọ bụ n’oge a na-atụle isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible dịịrị izu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

18. Gịnị mere mgbalị i tinyere iji mụọ “ihe ndị miri emi nke Chineke” ji bụrụ ihe na-efughị ọhịa?

18 Ime ezigbo nnyocha mgbe ị na-amụ Okwu Chineke n’onwe gị pụrụ inyere gị aka ịbịarukwu Jehova nso. Bible kwuru banyere uru a na-erite site n’inwe ọmụmụ ihe dị otú ahụ, sị: “Amamihe bụ ndò, ego bụkwa ndò: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) N’ihi ya, mgbalị i tinyere iji ghọtakwuo eziokwu nke dị n’Okwu Chineke efughị ọhịa. Bible na-ekwe ndị nọgidere na-enyocha ihe ndị miri emi nke Chineke nkwa, sị: “Ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.”—Ilu 2:4, 5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 15 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ par. 16 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị bụ “ihe ndị miri emi nke Chineke”?

• N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji kwụsị ịmụ banyere ihe ndị miri emi nke Chineke?

• N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na Ndị Kraịst nile pụrụ inwe ọṅụ a na-enweta site n’ịghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke”?

• Olee otú ị pụrụ isi ritekwuo uru n’ịmụ “ihe ndị miri emi nke Chineke”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Olee mgbe Jizọs ghọrọ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa?

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị nne na nna nwere ike ịgwa ụmụ ha ka ha buru ụzọ mee nchọnchọ n’otu isiokwu ha ga-amụ n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ ha