Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Obadaịa, Jona, na Maịka

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Obadaịa, Jona, na Maịka

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Obadaịa, Jona, na Maịka

“ỌHỤỤ Obadaịa.” (Obadaịa 1) Otú a ka e si malite akwụkwọ Bible ahụ bụ́ Obadaịa. Ọ dịghị ihe ọzọ onye amụma ahụ gwara anyị banyere onwe ya n’akwụkwọ ahụ o dere na 607 T.O.A ma ọ bụghị nanị aha ya. N’akwụkwọ ya nke o dechara ihe karịrị narị afọ abụọ tupu nke Obadaịa, Jona onye amụma ezoghị ihe ọ bụla mgbe ọ kọrọ ahụmahụ o nwere mgbe e dunyere ya ozi n’ala ọzọ. Afọ iri isii Maịka ji buo amụma bụ n’agbata oge Obadaịa na nke Jona, site na 777 T.O.A. ruo na 717 T.O.A. Nanị ihe Maịka gwara anyị banyere onwe ya bụ na ya bụ “onye [obodo] Moreshet” nakwa na okwu Jehova ruru ya ntị “n’ụbọchị Jotam na Ehaz na Hezekaịa, bụ́ ndị eze Juda.” (Maịka 1:1) Ụdị ihe atụ ndị onye amụma a ji mee ka a ghọta ihe ọ na-ekwu gosiri na ndụ ime obodo doro ya anya.

“A GA-EBIPỤKWA [EDỌM] RUO MGBE EBIGHỊ EBI”

(Obadaịa 1-21)

Obadaịa kwuru banyere Edọm, sị: “N’ihi ihe ike e mere nwanne gị, bụ́ Jekọb, ka ihere ga-ekpuchi gị, a ga-ebipụkwa gị ruo mgbe ebighị ebi.” Onye amụma ahụ ka na-echeta nnọọ otú ndị Edọm si meso ụmụ Jekọb, ya bụ ụmụ Izrel, ihe ike. Na 607 T.O.A., bụ́ mgbe ndị Babilọn bibiri Jeruselem, ndị Edọm “guzoro iche” ma tinyere “ndị ala ọzọ” na-awakpo ndị Izrel aka.—Obadaịa 10, 11.

A ga-ekpochapụ ndị Edọm, ma a ga-eme ka ụlọ Jekọb lọghachi. Obadaịa onye amụma kwuru, sị: “N’ugwu Zaịọn ka ụfọdụ ndị gbapụrụ agbapụ ga-adị, ọ ga-adịkwa nsọ.”—Obadaịa 17.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

5-8—Gịnị dị ịrịba ama banyere otú e si jiri mbibi Edọm tụnyere ndị na-apụnara mmadụ ihe n’abalị na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịn? Ọ bụrụ na ndị ohi abata n’Edọm, ihe ha ga-ewere bụ nanị ihe ndị ha chọrọ. Ọ bụrụ na ndị na-ewe ihe ubi abata, ha ga-ahapụ ihe ụfọdụ maka ndị na-abịa ewere ihe a hapụrụ n’ubi. Ma mgbe a ga-ebibi Edọm, ndị bịara bibie ya agaghị ahapụ ihe ọ bụla, “ndị ya na ha nọ n’udo,” ya bụ ndị Babilọn, ga-akwakọrọ akụ̀ ya nile dị oké ọnụ ahịa.—Jeremaịa 49:9, 10.

10—Olee otú e si ‘bipụ Edọm ruo mgbe ebighị ebi’? Dị ka e buru n’amụma, mba Edọm, nke bụ́ mba dịbu adị n’ezie, nke nwere ndị ọchịchị na ndị a na-achị achị, adịghịzi n’ụwa. Eze Babilọn bụ́ Nabonidus meriri Edọm n’ihe dị ka n’etiti narị afọ nke isii T.O.A. Ka ọ na-eru na narị afọ nke anọ T.O.A., ndị Nabataea bizi n’ókèala Edọm, ndị Edọm agazie biri n’ebe ndịda Judia, n’ókèala ndị Negeb nke e mesịrị mara dị ka Idumea. Mgbe ndị Rom bibisịrị Jeruselem na 70 O.A., e nweghịzi ndị a na-akpọ ndị Edọm.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

3, 4. Ndị Edọm nwere ike ịdị na-eduhie onwe ha iche na o nweghị ihe ga-eme ha n’ihi na ụzọ e si erute n’obodo ha nke dị n’elu ugwu bụ okwute okwute, e nweekwa ndagwurugwu miri emi n’ebe ahụ nke na-eme ka o sie ike ndị iro ịbịarute n’obodo ha. Ma o nweghị otú mmadụ ga-esi gbanahụ ikpe Jehova.

8, 9, 15. Amamihe na ike mmadụ apụghị ichebe onye ọ bụla ‘n’ụbọchị Jehova.’—Jeremaịa 49:7, 22.

12-14. Ihe mere ndị Edọm na-adọ ndị na-achị ndị ohu Chineke ọchị mgbe ha na-ata ahụhụ aka ná ntị. Jehova adịghị ele ndị na-emeso ndị ya mmeso ọjọọ anya ọma.

17-20. Amụma a e buru banyere mgbe a ga-eme ka ụmụ Jekọb lọghachite malitere imezu mgbe ihe fọdụrụ ná ndị Izrel si Babilọn lọghachi na Jeruselem na 537 T.O.A. Okwu Jehova na-emezu mgbe nile. Anyị pụrụ inwe nnọọ obi ike na nkwa ya ga-emezu.

“E WEE KWATUO NINIVE”

(Jona 1:1–4:11)

Kama irube isi n’iwu Chineke nyere ya ka o “jeruo Ninive, bụ́ obodo ukwu ahụ, kpọsaa okwu [ikpe] megide ya,” Jona tinyere isi ebe ọzọ. Site n’ịtụba “ifufe dị ukwuu n’oké osimiri” ahụ na izite “otu azụ ukwu,” Jehova kpọghachiri Jona n’ebe o dunyere ya ozi ma nyeghachi ya ọrụ ka ọ gaghachi n’isi obodo Asiria.—Jona 1:2, 4, 17; 3:1, 2.

Jona banyere na Ninive ma kpọsaara ha ozi ya na-ezoghị ọnụ, sị: “Ọ fọdụrụ [iri ụbọchị anọ], e wee kwatuo Ninive.” (Jona 3:4) Ihe Jona na-atụghị anya ya ozi ọma ya rụpụtara mere ka o ‘wee iwe dị ọkụ.’ Jehova jiri “ogiri ụgba” kụziere Jona mkpa ọ dị ime ebere.—Jona 4:1, 6.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

3:3—Ninive ọ̀ bụ n’ezie obodo ga-ewe “ije nke ụbọchị atọ,” ya bụ, ihe dị ka kilomita iri anọ, iji gazuo ya? Ee. N’oge ochie, eleghị anya a na-eche na Ninive gụnyere obere obodo ndị ọzọ dị site na Khorsabad nke dị n’ebe ugwu ruo na Nimrud nke dị ná ndịda. Obodo nile a gụnyere na Ninive dị otu narị kilomita gburugburu.

3:4—Jona ọ mụrụ asụsụ Asiria iji nwee ike ikwusara ndị Ninive ozi ọma? O nwere ike ịbụ na Jona amaralarị asụsụ Asiria, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na Chineke si ụzọ ọrụ ebube mee ka ọ mụta ya. O nwekwara ike ịbụ na o ji asụsụ Hibru zie ozi ya ahụ dị mfe, onye ọzọ asụgharịa ya. Ọ bụrụ na a sụgharịrị ya asụgharị, ọ ghaghị ịbụ na ozi ya kpaliri mmasị ọtụtụ ndị.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:1-3. Mmadụ ịma ama kee ihe ọzọ ọ ga-eme n’oge ozi ọma iji ghara iso gaa ozi ọma ma nyere ndị mmadụ aka ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs gosiri na onye ahụ achọghị ije ozi ọma. A pụrụ ikwu na onye na-eme otú a na-agbara ọrụ Chineke nyere ya ọsọ.

1:1, 2; 3:10. Ọ bụghị nanị otu mba ma ọ bụ otu agbụrụ ma ọ bụ otu ndị pụrụ iche ka Jehova na-emere ebere. “Jehova dị mma n’ebe ihe nile e kere eke dị; obi ebere Ya nile dịkwasịkwa n’ọrụ Ya nile.”—Abụ Ọma 145:9.

1:17; 2:10. Abalị atọ ahụ Jona nọrọ n’afọ azụ̀ ahụ ehihie na abalị na-ezo aka n’ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jizọs.—Matiu 12:39, 40; 16:21.

1:17; 2:10; 4:6. Jehova napụtara Jona n’oké osimiri ahụ na-akpa ike. Chineke wee ‘gụpụtakwa otu ogiri ụgba, mee ka o tolite n’elu Jona, ka o wee bụrụ ndò n’elu isi ya, ịnapụta ya n’ọnọdụ ọjọọ ya.’ Ndị na-efe Jehova ofufe n’oge a aghaghị ịtụkwasị Chineke ha obi, nweekwa obi ike na ọ ga-echebe ma napụta ha n’ihi obiọma ya.—Abụ Ọma 13:5; 40:11.

2:1, 2, 9, 10. Jehova na-anụ ekpere nke ndị ohu ya ma na-aṅa ntị n’arịrịọ ha.—Abụ Ọma 120:1; 130:1, 2.

3:8, 10. Ezi Chineke ahụ wee “chegharịa uche,” ma ọ bụ gbanwee obi, banyere ihe ọjọọ ahụ nke o kwuru na ọ ga-eme, “o meghịkwa ha.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị Ninive “siri n’ụzọ ọjọọ ha chegharịa.” N’otu aka ahụ taa, onye mmehie nwere ike ịgbanahụ ikpe Chineke ma ọ bụrụ na o jiri obi ya nile chegharịa.

4:1-4. Ọ dịghị mmadụ e kere eke nke pụrụ ime ka Chineke kwụsị ime ebere. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịkatọ otú Jehova si egosi ebere ya.

4:11. Jehova ji ndidi na-eche ka e kwusaa ozi Alaeze ahụ n’ụwa nile n’ihi na, dị ka o meere otu narị puku na iri puku mmadụ abụọ ahụ bi na Ninive ebere, ọ na-emekwara “ndị na-amaghị nke bụ́ aka nri ha na aka ekpe ha” ebere. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị imere ndị bi n’ókèala anyị ebere ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ma na-enyere ndị mmadụ aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs?—2 Pita 3:9.

‘A GA-EME HA ISI NKWỌCHA’

(Maịka 1:1–7:20)

Maịka kpughere mmehie nke Izrel na Juda, ma buo amụma banyere mgbe isi obodo ha ga-atọgbọrọ n’efu, buokwa amụma banyere mgbe a ga-eme ka ha lọghachi n’ala ha. Sameria ga-aghọ “obo ihe nke ọhịa.” N’ihi na ha na-ekpere arụsị, Izrel na Juda kwesịrị ka e mee ha “isi nkwọcha,” ma ọ bụ menye ha ihere. A ga-eme ka isi nkwọcha ha saa mbara “ka nke udele” site n’ime ka ha gaa biri n’ala ọzọ. Jehova kwere nkwa, sị: “Gị Jekọb, aghaghị m ime ka ndị gị nile zukọọ.” (Maịka 1:6, 16; 2:12) N’ihi ndị ndú ya na-akpa àgwà ọjọọ na ndị amụma ya dị isi ike, Jeruselem “ga-aghọkwa obo ihe obo ihe.” Ma Jehova ‘ga-achịkọta ndị ya.’ “Onye na-achị achị [n’Izrel]” ga-esi na “Betlehem Efrata” pụta.—Maịka 3:12; 4:12; 5:2.

Jehova ò megburu Izrel? Ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme hà siri oké ike? Ee e. Nanị ihe Jehova chọrọ n’aka ndị na-efe ya ofufe bụ ka ha ‘na-eme ihe e kpere n’ikpe, na-ahụ ebere n’anya, ma jiri obi umeala’ soro Chineke ha na-eje ije. (Maịka 6:8) Ma omume nke ndị ha na Maịka bikọrọ ndụ jọrọ nnọọ njọ ruo n’okè nke na “onye nke ha nke kachasị mma dị ka uke: onye ziri ezi jọrọ njọ karịa ogige ogwu,” nke na-emerụsị onye na-abịa ya nso ahụ́. Ma onye amụma ahụ jụrụ, sị: “Ònye bụ Chineke dị ka [Jehova]?” Chineke ga-emere ndị ya ebere ọzọ ma ‘tụba mmehie nile ha n’ebe dịkarịsịrị omimi nke oké osimiri.’—Maịka 7:4, 18, 19.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:12—Olee mgbe amụma ahụ e buru banyere “ịchịkọta ndị Izrel fọdụrụ” mezuru? O mezuru nke mbụ ya na 537 T.O.A., mgbe ndị Juu fọdụrụnụ si na Babilọn laghachi n’ala ha. N’oge anyị a, amụma ahụ mezuru n’ahụ́ “Izrel nke Chineke.” (Ndị Galeshia 6:16) Kemgbe 1919, a chịkọtawo Ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka “ìgwè ewu na atụrụ n’etiti ebe ịta nri.” Kemgbe 1935 “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ ahụ” sonyeere ha, ha na-emezi “oké mkpọtụ n’ihi ụba mmadụ.” (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Ha nile gbakọrọ aka jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eme ka ezi ofufe na-aga n’ihu.

4:1-4—Olee otú Jehova si ‘na-ekpe ikpe n’etiti ọtụtụ ndị dị iche iche, na-edozikwara mba dị iche iche nwere ume okwu ha’ “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a”? Okwu ahụ bụ́ “ndị dị iche iche” na “mba dị iche iche nwere ume” adịghị ezo aka n’otu mba nkịtị ma ọ bụ ndị ọchịchị. Kama okwu ndị a na-ezo aka n’ebe ndị mmadụ si ná mba nile nọ, bụ́ ndị ghọworo ndị na-efe Jehova. Jehova na-ekpe ikpe n’etiti ha ma na-edoziri ha okwu n’echiche bụ na ọ na-eme ka ha na ya dị ná mma.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:6, 9; 3:12; 5:2. Ndị Asiria bibiri Sameria na 740 T.O.A.—n’oge Maịka nọ ndụ. (2 Ndị Eze 17:5, 6) Ha bịarutere Jeruselem n’oge ọchịchị Hezekaịa. (2 Ndị Eze 18:13) Ndị Babilọn gbara Jeruselem ọkụ na 607 T.O.A. (2 Ihe E Mere 36:19) Dị ka e buru n’amụma, a mụrụ Mezaịa ahụ na “Betlehem Efrata.” (Matiu 2:3-6) Okwu amụma Jehova na-emezu kpọmkwem dị ka e si buo ya.

2:1, 2. Ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya ịsị na anyị na-ejere Chineke ozi ma buru ụzọ na-achụ akụ̀ na ụba kama ibu ụzọ “na-achọ Alaeze ahụ na ezi omume ya.”—Matiu 6:33; 1 Timoti 6:9, 10.

3:1-3, 5. Jehova na-atụ anya ka ndị nwere ibu ọrụ n’etiti ndị ya na-ekpe ikpe ziri ezi.

3:4. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova na-aza ekpere anyị, anyị agaghị na-eme mmehie ma ọ bụ na-ebi ndụ ihu abụọ.

3:8. Anyị ga-enwe ike ịrụzu ọrụ ikwusa ozi ọma e nyere anyị, nke gụnyere ịkpọsa ikpe Jehova, nanị ma ọ bụrụ na Jehova ejiri mmụọ nsọ ya wusie anyị ike.

5:5. Amụma a e buru banyere Mezaịa ahụ na-eme ka obi sie anyị ike na mgbe ndị iro ga-amalite ịkpagbu ndị Chineke, a na-ahọpụta “ndị ọzụzụ atụrụ asaa [asaa na-anọchi anya ihe zuru ezu]” na “ndị isi mmadụ asatọ”—ya bụ ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị ikom ruru eru—ka ha duzie ndị Jehova.

5:7, 8. Ndị Kraịst e tere mmanụ taa dị ọtụtụ ndị “ka igirigi sitere n’ebe Jehova nọ”—ngọzi sitere n’aka Chineke. Nke a bụ n’ihi na Jehova ji Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ya. “Atụrụ ọzọ” ahụ na-enye aka eme ka ndị mmadụ na Jehova dịrị ná mma site n’inyere nnọọ ndị ahụ e tere mmanụ aka n’ọrụ nkwusa. (Jọn 10:16) Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù iso na-arụ ọrụ a, bụ́ nke na-eme ka ndị ọzọ nwee ume ọhụrụ!

6:3, 4. Anyị kwesịrị iṅomi Jehova Chineke ma nwee obiọma na ọmịiko ọbụna n’ahụ́ ndị ihe na-adịghị adabachara anyị na ha ma ọ bụ ndị mmekọrịta ha na Jehova na-esichaghịzi ike.

7:7. Ka anyị na nsogbu na-alụ n’ụwa ochie a, anyị ekwesịghị ịda mbà n’obi. Kama nke ahụ, dị ka Maịka mere, ọ dị mkpa ka anyị ‘chere Chineke nke nzọpụta anyị.’

7:18, 19. Ebe ọ bụ na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị mmehie anyị, anyị onwe anyị kwesịkwara ịdị njikere ịgbaghara ndị mehiere anyị.

Nọgide ‘Na-eje Ije n’Aha Jehova’

‘A ga-ebipụ ndị na-emegide Chineke na ndị ya ruo mgbe ebighị ebi.’ (Obadaịa 10) Ma, ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke ma si ‘n’ụzọ ọjọọ anyị chegharịa,’ iwe Jehova nwere ike ịjụrụ. (Jona 3:10) “N’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” ya bụ, “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a, a na-ebuli ezi ofufe elu karịa okpukpe ụgha nile, ndị na-erube isi na-enubakwa n’ime ya. (Maịka 4:1; 2 Timoti 3:1) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịdị “na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Maịka 4:5.

E nwere ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha anyị na-amụta n’akwụkwọ Obadaịa, Jona, na Maịka! Ọ bụ ezie na e dere ha ihe karịrị puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga, ozi ndị dị na ha “dị ndụ ma na-akpa ike,” ọbụna taa.—Ndị Hibru 4:12.

[Foto dị na peeji nke 13]

Obadaịa buru amụma, sị: “A ga-ebipụkwa [Edọm] ruo mgbe ebighị ebi”

[Foto dị na peeji nke 15]

Maịka ‘cheere Jehova,’ anyị pụkwara ime otú ahụ

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọrụ ikwusa ozi ọma bụ ihe ùgwù anyị kwesịrị nnọọ iji kpọrọ ihe