Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mụ Nwe Ọlaọcha Nile, Ọ Bụkwa Mụ Nwe Ọlaedo Nile”

“Mụ Nwe Ọlaọcha Nile, Ọ Bụkwa Mụ Nwe Ọlaedo Nile”

“Mụ Nwe Ọlaọcha Nile, Ọ Bụkwa Mụ Nwe Ọlaedo Nile”

NA NARỊ afọ nke isii T.O.A., Eze Saịrọs nke Peasia tọhapụrụ ndị Chineke site na Babilọn. Ọtụtụ puku n’ime ha laghachiri Jeruselem ịga wughachi ụlọ nsọ Jehova, bụ́ nke tọgbọrọ n’efu. Ndị ahụ si esi lọta amaghị otú ha ga-esi akpata ego, ndị agbata obi ha kpọrọ ha asị na-agbalịkwa igbochi ha iwughachi ụlọ nsọ. N’ihi ya, ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-ewu ụlọ nsọ bịara chewe ma ha ga-arụchalikwa nnukwu ọrụ ahụ.

Jehova si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Hagaị mee ka obi sie ndị ahụ na-ewu ụlọ nsọ ahụ ike na Ya nọnyeere ha. Chineke kwuru, sị: “M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube.” Hagaị zikwara ndị ahụ ozi ga-eme ka ha kwụsị ichegbu onwe ha banyere otú a ga-esi nweta ego a ga-eji rụọ ọrụ ahụ. Ọ sịrị: “Mụ nwe ọlaọcha nile, ọ bụkwa Mụ nwe ọlaedo nile; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.” (Hagaị 2:7-9) Afọ ise ka Hagaị kwusịrị okwu ndị a na-agba ume, e wuchara ụlọ nsọ ahụ.—Ezra 6:13-15.

N’oge anyị a, ihe ndị ahụ Hagaị kwuru agbakwaala ndị ohu Chineke ume ka ha ghara ịda mbà mgbe ha na-arụ nnukwu ọrụ ndị metụtara ofufe Jehova. Na 1879, mgbe ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche malitere ibipụta Ụlọ Nche, nke a na-akpọ Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence n’oge ahụ, ha kwuru ihe na-esonụ: “Anyị kweere na onye na-akwado mbipụta nke magazin bụ́ ‘Zion’s Watch Tower’ bụ JEHOVA. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ dịghị mgbe a ga-arịọ ego ma ọ bụ rịọ ndị mmadụ arịrịọ maka enyemaka iji na-ebipụta ya. Mgbe Onye ahụ nke kwuru, sị: ‘Ọlaọcha na ọlaedo nile dị n’elu ugwu bụ nke m,’ kwụsịrị iweta ego a ga-eji na-ebipụta ya, anyị ga-aghọta na oge eruola ka a kwụsị ibipụta ya.”

Ọ dịbeghị mgbe a kwụsịrị ibipụta Ụlọ Nche. Ọ bụ nanị n’asụsụ Bekee ka e bipụtara Ụlọ Nche mbụ, ọ bụkwa nanị puku isii ka e bipụtara ya mgbe ahụ. Taa, a na-ebipụta nde iri abụọ na asatọ narị puku ise na iri puku asaa na asatọ nke Ụlọ Nche nke ọ bụla n’asụsụ otu narị na iri isii na otu. * A na-ebipụta Teta!, nke ya na Ụlọ Nche so aga, nde iri atọ na anọ, narị puku abụọ na iri puku isii na asaa n’asụsụ iri asatọ.

Ndịàmà Jehova arụwo ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ ndị ha na Ụlọ Nche na-arụzu otu ihe—ya bụ ibuli Jehova elu dị ka Eze Nwe eluigwe na ala na ikwusa ozi ọma nke Alaeze ya. (Matiu 24:14; Mkpughe 4:11) Obi ike Ndịàmà nwere taa yiri nke ahụ e kwuru n’Ụlọ Nche na 1879. Ha kweere na ọ bụ Chineke na-akwado ọrụ ha nakwa na a ga-enwetarịrị ego a ga-eji rụọ ọrụ ọ bụla ọ kwadoro. Ma olee kpọmkwem otú Ndịàmà Jehova si enweta ego ha ji arụ ọrụ ha? Ọrụ ndị dịkwa aṅaa ka ha na-arụ iji kwusaa ozi ọma ahụ n’ụwa nile?

Olee Otú E Si Enweta Ego E Ji Arụ Ọrụ Ndị A?

Ka Ndịàmà Jehova na-ekwusara ọha mmadụ ozi ọma, ndị mmadụ na-ajụkarị ha sị, “À na-akwụ unu ụgwọ maka ọrụ a unu na-arụ?” Azịza ya bụ ee e, adịghị akwụ ha ụgwọ. Ha na-etinye oge ha n’efu. N’ihi ekele ha nwere maka ihe Jehova meere ha, ndị a na-ekwusa ozi ọma na-eji ọtụtụ awa akọrọ ndị ọzọ banyere Jehova na nkwa o kwere na Bible na a ga-enwe ọnọdụ ka mma n’ọdịnihu. Ha nwere ekele maka ihe Chineke meere ha nakwa maka otú ozi ọma a sirila gbanwee ndụ ha, meekwa ka ha nwee olileanya. N’ihi ya, ha na-achọ izi ndị ọzọ ozi ọma a. Site n’ime nke a, ha na-eme ihe Jizọs kwuru mgbe ọ sịrị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) N’ezie otú o si agụ ha agụụ ịgbara Jehova na Jizọs àmà na-akpali ha inye ego ha iji nwee ike ịkọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere, ọbụna ndị bi n’ebe dị nnọọ anya site n’ebe ha bi.—Aịsaịa 43:10; Ọrụ 1:8.

Ọrụ nkwusa a ga-efu nnukwu ego n’ihi otú o bururu n’ibu na n’ihi ihe ndị a ga-eji arụzu ya, ndị gụnyere ebe obibi akwụkwọ, alaka ụlọ ọrụ, Ụlọ Mgbakọ, ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, na ihe ndị ọzọ. Olee otú e si enweta ego e ji eme ihe ndị a? Ọ bụ onyinye afọ ofufo ka e ji arụzu ha. Ndịàmà Jehova adịghị amanye ndị òtù ha ịtụ ụtụ maka ọrụ ndị ha na-arụ ná nzukọ ha, ha adịghịkwa agwa ndị mmadụ ka ha kwụọ ụgwọ maka akwụkwọ a na-enye ha. Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ inye ego iji kwadoo ọrụ ịkụzi Bible ha na-arụ, Ndịàmà na-eji obi ụtọ anata ya. Otu n’ime ụzọ e si na-agbalị ịhụ na e kwusara ozi ọma a n’ụwa nile bụ site n’ịsụgharị akwụkwọ. Ka anyị tụlee ihe ọ na-efu iji mee nke a.

Akwụkwọ Ndị A Na-ebipụta n’Asụsụ Narị Anọ na Iri Atọ na Asaa

Kemgbe ọtụtụ iri afọ, akwụkwọ Ndịàmà Jehova so n’akwụkwọ ndị a kacha asụgharị n’ụwa. A sụgharịala traktị, broshuọ, magazin, na akwụkwọ ukwu dị iche iche gaa n’asụsụ narị anọ na iri atọ na asaa. Nsụgharị, dịkwa ka ọrụ ndị ọzọ ha na ikwusa ozi ọma so aga, na-efu ihe dị ukwuu. Olee ọrụ dị n’ịsụgharị akwụkwọ anyị gaa n’asụsụ dị iche iche?

Mgbe ndị na-ede akwụkwọ Ndịàmà Jehova dechara ha na Bekee, a na-esi n’Intanet ezitere ha ndị nsụgharị e nyere ọzụzụ nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa. Òtù ndị nsụgharị nke ọ bụla na-ahụ maka otu n’ime asụsụ ndị a na-ebipụta akwụkwọ anyị na ha. Na-adabere n’akwụkwọ ole ha na-asụgharị nakwa otú asụsụ ha na-asụgharị akwụkwọ anyị gaa na ya si taa akpụ, òtù ndị nsụgharị nke ọ bụla na-adị site na mmadụ ise ruo mmadụ iri abụọ na ise.

Otu onye nsụgharị na-enyocha ihe onye ọzọ sụgharịrị iji mara ma o kwekọrọ na nke Bekee, e mesịa, onye ọzọ agụgharịakwa ya. Nzube e ji eme nke a bụ ka ihe a sụgharịrị bụrụ kpọmkwem ihe dị na Bekee ma doo anya ruo n’okè o kwere omume. E nwere ọtụtụ ihe mere na ọrụ nsụgharị abụghị obere ọrụ. Mgbe ha na-asụgharị isiokwu ndị a na-amachaghị n’ókèala ha, ndị nsụgharị na-eme nnọọ nnyocha sara mbara n’asụsụ e ji dee isiokwu ahụ (nke nwere ike ịbụ asụsụ Bekee ma ọ bụ asụsụ ndị ọzọ, dị ka French, Russian, ma ọ bụ Spanish) nakwa n’asụsụ ha na-achọ ịsụgharị isiokwu ahụ gaa na ya iji hụ na ihe ha sụgharịrị na ihe e dere bụ otu. Dị ka ihe atụ, mgbe isiokwu e nwere na Teta! na-akọ banyere nkà mmụta sayensị ma ọ bụ akụkọ ihe mere eme, ndị nsụgharị na-eme nnyocha dị nnọọ ukwuu iji nwee ike ịsụgharịta ha.

E nwere ọtụtụ ndị nsụgharị na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. Ọtụtụ na-arụ ọrụ nsụgharị n’ebe ahụ mgbe nile ebe ndị ọzọ na-abịa enye aka mgbe a chọrọ enyemaka ha. Ndị ọzọ na-anọ n’ebe a na-asụ asụsụ ha na-arụ ọrụ ha. A dịghị akwụ ndị nsụgharị ụgwọ maka ọrụ ha na-arụ. Ihe a na-emere ndị na-arụ ọrụ a mgbe nile bụ inye ha ụlọ na nri na obere ego mmachi akpa maka mkpa ha ụfọdụ. N’ụwa nile, e nwere puku Ndịàmà abụọ na narị asatọ na-eje ozi dị ka ndị nsụgharị. Ka ọ dị ugbu a, alaka ụlọ ọrụ iri itolu na asatọ nwere ndị nsụgharị, e nwekwara alaka ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka ndị na-anọghị n’alaka ha na-arụ ọrụ nsụgharị. Dị ka ihe atụ, alaka ụlọ ọrụ dị na Russia na-elekọta ihe karị ndị nsụgharị narị abụọ na iri atọ na-arụ ọrụ nsụgharị mgbe nile ma ọ bụ mgbe a chọrọ enyemaka ha. Ndị a na-asụgharị akwụkwọ anyị gaa n’asụsụ iri atọ, gụnyere ndị nke a na-amachaghị, dị ka asụsụ Chuvash, Ossetian, na Uighur.

Ime Ka Ihe Ndị A Na-asụgharị Ka Mma

Dị nnọọ ka onye ọ bụla gbalịtụrụla ịmụta asụsụ ọhụrụ maara, ịsụgharị ahịrịokwu ndị tara akpụ abụghị obere ọrụ. A na-agbalị ịhụ na ihe a sụgharịrị kwekọrọ n’ihe e dere n’ebe e si sụgharịta ya ma sụgharịa ya otú ga-ekwe ọgụgụ na otú ndị a na-asụgharịrị ya si ekwu ihe ahụ a sụgharịrị, ka o wee dị onye ahụ na-agụ ya ka ọ bụ asụsụ ya ka e ji dee ihe ahụ ná mmalite. Ọ chọrọ onye maara nke a na-akọ iji mee nke a. Ọ na-ewe onye nsụgharị ọhụrụ ọtụtụ afọ iji mụta ịsụgharị ihe, Ndịàmà Jehova na-anọgidekwa na-enye ha ọzụzụ. Mgbe ụfọdụ, a na-enwe ndị na-abịa enye ndị nsụgharị ọzụzụ iji nyere ha aka ime ka ihe ha na-asụgharị ka mma, a na-kụzikwara ha otú ha ga-esi jiri kọmputa na-arụ ọrụ ha.

Ọzụzụ a anọwo na-arụpụta ezigbo ihe. Dị ka ihe atụ, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Nicaragua na-akọ, sị: “Nke a bụ nke mbụ ndị na-asụgharị ihe gaa n’asụsụ Miskito na-enweta ọzụzụ maka usoro a ga na-agbaso n’ime nsụgharị nakwa banyere otú a ga-esi na-eme nsụgharị. Ọ bụ onye si n’alaka ụlọ ọrụ dị na Mexico bịara nye ha ọzụzụ a. Nke a emewo nnọọ ka e nwee nnukwu ọdịiche n’otú ndị nsụgharị anyị si arụ ọrụ ugbu a na otú ha si arụbu ọrụ. Ihe ndị ha na-asụgharị ugbu a akala nnọọ mma.”

Okwu Ndị Na-eru n’Obi

Ihe mere e ji agbalị ibipụta Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’asụsụ ndị mmadụ na-asụ n’ógbè ha bụ ka ihe a na-ekwu wee nwee ike iru ha n’obi, nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe na-emenụ. Na 2006, Ndịàmà Jehova nọ na Bulgaria nwere obi ụtọ mgbe e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Bulgarian. Alaka ụlọ ọrụ dị na Bulgaria kwuru na ha nwetara ọtụtụ ozi ekele maka nke a. Ndị nọ n’ọgbakọ kwuru na “ugbu a ka Bible ruru n’obi ha n’ezie, ọ bụghị nanị n’uche ha.” Otu nwoke merela agadi nke si obodo Sofia kwuru, sị: “Agụọla m Bible ọtụtụ afọ ma agụtụbeghị m Bible dị mfe nghọta ma na-eru n’obi ka Bible a.” N’otu aka ahụ, n’Albania, mgbe otu Onyeàmà nwetasịrị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ zuru ezu, o kwuru, sị: “Leenụ otú Okwu Chineke si atọ ụtọ n’asụsụ Albanian! Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù n’ezie na Jehova na-agwa anyị okwu n’asụsụ nke anyị!”

Ọ pụrụ iwe òtù ndị nsụgharị ọtụtụ afọ iji sụgharịa Bible dum. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekwe na nke a ruru mgbalị e tinyere maka ya mgbe Bible a a sụgharịrị mere ka ọtụtụ nde mmadụ ghọta Okwu Chineke n’ezie.

“Anyị Bụ Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ”

N’ezie, nsụgharị bụ nanị otu n’ime ọrụ ndị dị mkpa a na-arụ iji hụ na e kwusara ozi ọma otú o kwesịrị. Ide akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ibipụta ha, na ibuga ha n’ebe ndị na-agụ ha nọ nakwa ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ ha na ha na-agakọ, bụ́ ndị a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche, na sekit dị iche iche, na n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, chọrọ mgbalị dị ukwuu ma na-efu ezigbo ego. Ma, ndị Chineke ‘na-enye onwe ha n’afọ ofufo’ iji rụọ ọrụ a. (Abụ Ọma 110:3) Ha na-agụ ya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ime okè ha n’ozi Jehova, ha na-elekwa ya anya dị ka ihe ùgwù na Jehova na-ewere ha ka ‘ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ’ n’ihi mgbalị ha na-eme.—1 Ndị Kọrint 3:5-9.

Ọ bụ eziokwu na onye ahụ kwuru sị, “mụ nwe ọlaọcha nile, ọ bụkwa mụ nwe ọlaedo nile” adịghị adabere n’ego anyị na-enye iji rụzuo ọrụ ya. Ma Jehova enyewo ndị ya ihe ùgwù nke iso doo aha ya nsọ site n’onyinye ha na-enye maka ikwusara “mba nile” eziokwu ahụ nke na-azọpụta ndụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Nke a ọ̀ dịghị akpali gị ime ihe nile i nwere ike ime iji kwadoo ọrụ a a na-agaghị arụghachi?

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 5 Ị chọọ ịma asụsụ nile a na-ebipụta Ụlọ Nche na ha, lee peeji nke 2 nke Ụlọ Nche a.

[Igbe dị na peeji nke 18]

“HA NA-ENYERE ANYỊ AKA ICHEBARA NDỤ ANYỊ ECHICHE”

Otu nwa agbọghọ nta dị afọ iri na anọ degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Cameroon akwụkwọ ozi, sị: “Mgbe m zụchara akwụkwọ m ga-eji aga akwụkwọ n’afọ a, erere m abụọ n’ime ndị nke afọ gara aga puku francs abụọ na narị ise [$5 U.S.]. M na-enye nke a n’onyinye tinyere narị francs itolu na iri ọzọ [$1.82 U.S.] site n’ego m m chekwara. Achọrọ m ịgba unu ume ka unu nọgide na-arụ ọrụ ọma unu na-arụ. Unu emeela maka Ụlọ Nche na Teta! unu na-ebipụta. Ha na-enyere anyị aka ichebara onwe anyị echiche.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

ONYINYE PỤRỤ ICHE

Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico natara akwụkwọ ozi na-esonụ n’aka nwatakịrị dị afọ isii nwere ekele maka ọrụ a na-arụ, onye aha ya bụ́ Manuel, onye bi na Chiapas State. Ebe ọ bụ na ọ maghị ede ihe, enyi ya nyeere ya aka dee ya. Manuel kwuru, sị: “Nne nne m liweere m otu nne ezì. Mgbe ọ mụrụ ụmụ, ahọọrọ m nke kasị mma n’ime ha, ụmụnne m enyekwara m aka zụọ ya. Eji m nnọọ ịhụnanya na-ezitere unu ihe m retere ezì ahụ. Ọ dị otu narị kilogram n’arọ, eretere m ya otu puku pesos na narị abụọ na iri ise [$110 U.S.]. Biko jirinụ ego a na-arụrụ Jehova ọrụ.”

[Igbe dị na peeji nke 19]

‘WERENỤ NKE A SỤGHARỊA BIBLE’

Ná mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova e nwere na Ukraine n’afọ 2005, e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Ukrainian. N’ụbọchị na-eso ya, a hụrụ otu mpempe akwụkwọ n’ime igbe onyinye. Ihe e dere ná mpempe akwụkwọ ahụ na-asị: “Adị m afọ itoolu. Unu emeela nke ukwuu maka Akwụkwọ Nsọ Grik unu wepụtara. Mama m na-enye mụ na nwanne m nwoke nke m tọrọ ego a ka anyị jiri gbaa moto gaa ụlọ akwụkwọ. Ma mgbe mmiri na-adịghị ezo, anyị na-eji ụkwụ aga ụlọ akwụkwọ ma dokọta ego a bụ́ hryvnia iri ise [$10 U.S.]. Mụ na nwanne m nwoke ga-achọ ka unu jiri ya sụgharịa Bible dum n’asụsụ Ukrainian.”

[Igbe dị na peeji nke 20, 21]

ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ NA-AHỌRỌ ISI NA-ENYE IHE

ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ na-amawapụta ego iche, bụ́ nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ e dere “Contributions for the Worldwide Work—Matthew 24:14” (“Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ—Matiu 24:14”).

Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-eziga ego ndị a n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba ha. Mmadụ pụkwara iziga ego onyinye n’onwe ya n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ya. A ga-ede “Watch Tower” n’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla a na-ezigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. A pụkwara inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. Onye na-ezite ihe ndị a kwesịrị ide obere akwụkwọ ozi iji kọwaa na ihe ndị a bụ onyinye ma zitekọta ya na onyinye ya.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

Tinyere inye onyinye, e nwekwara ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi nye ihe ka o wee baa uru n’ozi Alaeze ahụ a na-eje n’ụwa nile. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị ahụ anwụọ ma ọ bụkwanụ dị ka ndị ga-eso keta ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: Mmadụ pụrụ ime ndokwa ka e nye Watch Tower ego o debere n’ụlọ akụ̀, ego ọ gbazinyere ụlọ akụ̀, ma ọ bụ ego ezumike nká ya mgbe ọ nwụrụ, a ga-eme nke a n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ya na-agbaso.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere dị ka onyinye, ọ bụrụkwanụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, ọ pụkwara inye ya dị ka onyinye ma ka biri na ya n’oge nile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-edenyere ya ala na ụlọ ọ bụla.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: A pụrụ idenyere Watch Tower ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Watch Tower aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ka onye na-enye ya mee atụmatụ nke ọma.

Iji matakwuo banyere ụzọ ndị a e si enye onyinye, ị pụrụ ịkpọtụrụ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova na Nigeria, site n’ịkpọ ha na telefon ma ọ bụ idegara ha akwụkwọ ozi, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba unu.

Treasurer’s Office

Jehovah’s Witnesses

P.M.B. 1090,

Benin City 300001,

Edo State, Nigeria.

Telefon: (052) 202020

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ndị nsụgharị nke asụsụ Miskito n’alaka ụlọ ọrụ dị na Nicaragua