Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Jehova Na-emezu Mgbe Nile

Okwu Jehova Na-emezu Mgbe Nile

Okwu Jehova Na-emezu Mgbe Nile

“Ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.”—JOSHUA 23:14.

1. Ònye bụ Jọshụa, oleekwa ihe o mere mgbe oge ọnwụ ya na-eru nso?

E NWERE otu nwoke ume juru n’ahụ́ onye bụ́ ọchịagha ụjọ na-adịghị atụ, onye nwere okwukwe ma kwesị ntụkwasị obi. Ya na Mozis jekọrọ ozi, ọ bụkwa Jehova n’onwe ya ji aka ya họpụta ya ka o si n’ọzara ukwu ahụ dị egwu duba mba Izrel n’ala ahụ nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ka oge ọnwụ ya na-eru nso, nwoke a a na-akwanyere ùgwù dị ukwuu, bụ́ Jọshụa, gwara ndị okenye Izrel okwu ikpeazụ na-emetụ nnọọ n’ahụ́. Obi abụọ adịghị ya na ihe ahụ o kwuru mere ka okwukwe nke ndị gere ya ntị sikwuo ike. Ọ pụkwara ime ka okwukwe gị onwe gị sikwuo ike.

2, 3. Mgbe Jọshụa gwara ndị okenye Izrel okwu, olee otú ọnọdụ dị n’Izrel n’oge ahụ, oleekwa ihe Jọshụa kwuru?

2 Weregodị ya na ị nọ mgbe ihe a a kọrọ na Bible na-eme: “O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị site na mgbe Jehova mere ka Izrel zuru ike pụọ n’aka ndị iro ha nile gburugburu, mgbe Jọshụa ghọrọ agadi, mgbe ụbọchị ndụ ya na-agwụ, na Jọshụa kpọrọ Izrel nile, bụ́ ndị okenye ha, na ndị isi ha, na ndị ikpe ha, na ndị odozi okwu ha, sị ha, Mụ onwe m aghọwo agadi, ụbọchị ndụ m na-agwụ.”—Joshua 23:1, 2.

3 Ọ fọrọ obere ka Jọshụa ruo otu narị afọ na iri. O biri ndụ n’otu n’ime oge ndị e nwere ihe ndị pụrụ iche mere ná ndụ ndị Chineke. O ji anya ya hụ ọrụ ebube dị iche iche Chineke rụụrụ ndị ya, ọ hụkwara otú Jehova si mezuo ọtụtụ nkwa ndị o kwere. N’ihi ya, ihe ndị a nile o ji anya ya hụ mere obi ji sie ya ike ikwu, sị: “Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.”—Joshua 23:14.

4. Olee nkwa ndị Jehova kwere ndị Izrel?

4 Olee ihe ndị Jehova kwuru mezurunụ n’oge Jọshụa? Anyị ga-atụle nkwa atọ Jehova kwere ndị Izrel. Nke mbụ, Chineke kwere nkwa ịnapụta ha n’ịgba ohu. Nke abụọ, ọ ga-echebe ha. Nke atọ, ọ ga-elekọta ha. Jehova ekwekwala ndị ya nke oge a nkwa ndị yiri ndị a o kwere ndị Izrel, anyị ahụkwala ka ọtụtụ n’ime ha na-emezu n’oge a. Ma tupu anyị atụlewe ihe ndị Jehova merela n’oge anyị a, ka anyị buru ụzọ tụlee ndị nke o mere n’oge Jọshụa.

Jehova Anapụta Ndị Ya

5, 6. Olee otú Jehova si napụta ndị Izrel n’Ijipt, oleekwa ihe nke a na-egosi?

5 Mgbe ndị Izrel tikuru Chineke mkpu ákwá n’ihi ohu e ji ha mere n’Ijipt, Jehova wee mara. (Ọpụpụ 2:23-25) Jehova si n’etiti osisi ahụ na-agba ọkụ gwa Mozis, sị: “M wee rịdata ịnapụta [ndị m] n’aka ndị Ijipt, na ime ka ha si n’ala ahụ rịgoruo ala dị mma nke sakwara mbara, ruo ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ọpụpụ 3:8) Ọ ghaghị ịbụ na ndị Izrel nwere obi ụtọ dị ukwuu mgbe Jehova mezuru nkwa a! Mgbe Fero na-ekweghị ka ndị Izrel si n’Ijipt pụọ, Mozis gwara ya na Chineke ga-eme ka mmiri dị n’Osimiri Naịl ghọọ ọbara. Okwu Jehova mezuru. Osimiri Naịl ghọrọ ọbara. Azụ̀ nile dị ná mmiri ahụ nwụrụ, ọ dịghịkwa onye nwere ike ịṅụ mmiri sitere n’osimiri ahụ. (Ọpụpụ 7:14-21) Fero kpọrọ ekwo nkụ, Jehova wee mee ka ihe otiti itoolu ndị ọzọ bịakwasị ya na ndị ya. Jehova bukwa ụzọ kwuo ihe ọ chọrọ ime tupu o weta nke ọ bụla n’ime ihe otiti ndị ahụ. (Ọpụpụ, isi 8-12) Mgbe ihe otiti nke iri gbusịrị nwa mbụ ọ bụla a mụrụ n’Ijipt, Fero nyere ndị Izrel iwu ka ha si n’Ijipt pụọ—ha mekwara otú ahụ ozugbo!—Ọpụpụ 12:29-32.

6 Ọ bụ mgbe Jehova napụtachara ndị Izrel ka ọ họọrọ ha ịbụ mba ya. Nnapụta ahụ mekwara ka e bulie aha Jehova elu dị ka Onye na-emezu nkwa ya, onye okwu ya na-aghaghị imezu. O gosikwara na Jehova karịrị chi nile nke ndị mba ọzọ. Ịgụ akụkọ otú Jehova si napụta mba Izrel n’Ijipt na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Chezienụ otú ọ ga-adị onye ji anya ya hụ mgbe ihe a nile na-eme! Jọshụa hụrụ na Jehova bụ n’ezie “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.”—Abụ Ọma 83:18.

Jehova Echebe Ndị Ya

7. Olee otú Jehova si chebe ndị Izrel ka ndị agha Fero ghara igbu ha?

7 Oleekwanụ maka nkwa nke abụọ Jehova kwere—nke bụ́ na ya ga-echebe ndị ya? Jehova mere ka nkwa a pụta ìhè mgbe o kwuru na ya ga-akpọpụta ndị ya n’Ijipt ma kpọba ha n’Ala Nkwa ahụ. Cheta na Fero oké iwe jidere mechara chịrị ndị agha ya na ọtụtụ narị ụgbọ ịnyịnya chụwa ụmụ Izrel. Obi abụọ adịghị ya na obi siri nwoke mpako ahụ ike na ya ga-ejide ndị Izrel, karịsịa mgbe o yiri ka ha tọrọ atọ n’agbata oké osimiri na ugwu! Chineke gbataara ndị ya ọsọ enyemaka ozugbo iji zọpụta ha site n’itinye igwe ojii n’etiti ndị Ijipt na ụmụ Izrel. Ọchịchịrị gbara n’ebe ndị Ijipt nọ; ebe ìhè dị n’ebe ndị Izrel nọ. Mgbe igwe ojii ahụ mere ka ndị Ijipt kwụsịzie ịchụ ndị Izrel, Mozis weere mkpanaka ya kụọ n’elu Oké Osimiri Uhie ahụ, ya ekewaa ụzọ abụọ si otú a gbugheere ndị Izrel ụzọ ha si gbapụ, ma ghọọrọ ndị Ijipt ọnyà. Jehova gbuchapụrụ ndị agha Fero nile n’ime oké osimiri ahụ. Jehova si otú a chebe ndị ya, ma ọ bụghị ya, ọ dịghị ihe ga-eme ka a ghara imeri ha.—Ọpụpụ 14:19-28.

8. Olee otú Jehova si chebe ndị Izrel (a) mgbe ha nọ n’ọzara nakwa (b) mgbe ha banyere n’Ala Nkwa ahụ?

8 Mgbe ndị Izrel gafechara Oké Osimiri Uhie ahụ, ha wagharịrị n’ala a kọwara dị ka “ọzara ukwu ahụ nke dị egwu, nke agwọ nke yiri ọkụ na akpị dị n’ime ya, na ala akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri na-adịghị ya.” (Deuterọnọmi 8:15) Jehova chebekwara ndị ya mgbe ha nọ n’ọzara ahụ. Oleekwanụ maka mgbe ha na-aba n’Ala Nkwa ahụ? Ndị agha ndị Kenan siri ike busoro ha agha. Ma, Jehova gwara Jọshụa, sị: “Bilie, gabiga Jọdan nke a, gị onwe gị, na ndị nke a nile, ruo ala ahụ nke Mụ onwe m na-enye ha, bụ́ ụmụ Izrel. Ọ dịghị nwoke ọ bụla ga-eguzo onwe ya n’ihu gị ụbọchị nile nke ndụ gị: dị ka M nọnyeere Mozis, otú a ka M ga-anọnyere gị: M gaghị aha gị aka, M gaghị ahapụkwa gị.” (Joshua 1:2, 5) Jehova mezuru ihe a o kwuru. N’ime ihe dị ka afọ isii, Jọshua meriri ndị eze iri atọ na otu, ndị Izrel ewegharakwa ihe ka ukwuu n’Ala Nkwa ahụ. (Joshua 12:7-24) Ha agaraghị enwe mmeri ndị a nile ma a sị na Jehova echebeghị ha.

Jehova Elekọta Ndị Ya

9, 10. Olee otú Jehova si lekọta ndị ya mgbe ha nọ n’ọzara?

9 Ka anyị tụlee nkwa nke atọ Jehova kwere—nke bụ́ na ya ga-elekọta ndị ya. Obere oge ka ndị Izrel sisịrị n’Ijipt pụta, Chineke kwere ha nkwa, sị: “Lee, M gaje ime ka nri si n’eluigwe zooro unu dị ka mmiri; ndị m ga-apụ, chịkọta ihe nke otu ụbọchị n’ụbọchị ya.” Chineke nyere ha ‘nri si n’eluigwe’ dị nnọọ ka o kwere ná nkwa. “Ụmụ Izrel wee hụ ya, sịrịta onwe ha, Gịnị ka ọ bụ?” Ọ bụ mana, nke bụ́ nri Jehova kwere nkwa inye ha.—Ọpụpụ 16:4, 13-15.

10 Jehova lekọtara ndị Izrel ruo iri afọ anọ ha wagharịrị n’ọzara, o nyere ha ma mmiri ma ihe oriri. Ọbụna o mere nnọọ ka uwe ha ghara ịka nká meekwa ka ụkwụ ha ghara ịza aza. (Deuterọnọmi 8:3, 4) Jọshụa ji anya ya hụ ihe a nile. Jehova napụtara, chebe ma lekọta ndị ya dị nnọọ ka o kwere ná nkwa.

Otú Jehova Si Anapụta Ndị Ya n’Oge Anyị A

11. Gịnị mere na Brooklyn, New York, na 1914, oleekwa ihe oge ya ruru mgbe ahụ?

11 Oleekwanụ maka oge anyị a? N’ụtụtụ Friday, October 2, 1914, Charles Taze Russell, bụ́ onye na-edu ndú n’etiti Ndị Mmụta Bible n’oge ahụ batara n’ụlọ ebe a na-eri nri na Betel nke dị na Brooklyn, New York. O ji ihu ọchị kwuo, sị: “Ùnu abọọla chi?” Tupu ya anọrọ ọdụ, o jiri obi ụtọ kwuo, sị: “Oge ndị Jentaịl abịala ná ngwụsị; ụbọchị ndị eze ha agwụla.” Oge eruokwala ọzọ ka Jehova, bụ́ Eze eluigwe na ala, gosi ike ya n’ihi ndị ya. O mekwara otú ahụ!

12. Olee nnapụta weere ọnọdụ na 1919, oleekwa ihe nke a meghere ụzọ maka ya?

12 Nanị afọ ise ka e mesịrị, Jehova napụtara ndị ya n’aka “Babịlọn Ukwu ahụ,” nke bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:2) Ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime anyị hụrụ mgbe ihe a na-enye obi ụtọ mere. Ma taa anyị na-ahụ nnọọ uru nnapụta ahụ bara. Jehova mere ka a maliteghachi ife ya ezi ofufe, meekwa ka ndị nile ọ na-agụ agụụ ife ya ofufe dịrị n’otu. Aịzaịa onye amụma ebula ụzọ kwuo na nke a ga-eme, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri.”—Aịsaịa 2:2.

13. Olee mmụba e nwere n’etiti ndị Jehova nke i jirila anya gị hụ?

13 Okwu Aịzaịa mezuru. N’afọ 1919 ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ malitere ịgba àmà n’ụwa nile n’atụghị ụjọ, nke mekwara ka ofufe nke ezi Chineke ahụ bụrụ nke e buliri elu. Mgbe afọ 1930 gasịrị, ọ bịara doo anya na achịkọtawala “atụrụ ọzọ” ahụ. (Jọn 10:16) Na mbụ, ha dị puku ole na ole, ka oge na-aga, ha eruo narị puku ole na ole, ugbu a kwa, ihe karịrị nde isii na-akwadozi ezi ofufe! N’otu ọhụụ nke e mere ka Jọn onyeozi hụ, a kọwara ha dị ka “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta.” (Mkpughe 7:9) Gịnị ka gị onwe gị jirila anya gị hụ? Ndịàmà Jehova ole ka e nwere n’ụwa mgbe ị natara eziokwu? Taa, ndị na-ejere Jehova ozi karịrị nde isii na narị puku asaa. Ọ bụ nnapụta ahụ Jehova napụtara ndị ya n’aka Babịlọn Ukwu ahụ mere e ji nwee mmụba a na-enye obi ụtọ anyị na-ahụ n’ụwa nile taa.

14. Olee ụdị nnapụta ga-abịa n’ọdịnihu?

14 Jehova ka ga-anapụta ndị ya ọzọ n’ọdịnihu—nnapụta nke a ga-emetụtakwa onye ọ bụla bi n’ụwa. Jehova ga-egosi ike ya n’ụzọ dị egwu site n’ikpochapụ ndị iro ya nile ma mee ka ndị ya banye n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi na ya. Ọ ga-abụ nnọọ ihe na-enye ọṅụ ịhụ mgbe a ga-ekpochapụ ihe ọjọọ nile, e nweekwa oge kasị mma n’ụwa!—Mkpughe 21:1-4.

Otú Jehova Si Echebe Ndị Ya Taa

15. Gịnị mere o ji dị mkpa ka Jehova chebe ndị ya n’oge a?

15 Dị ka anyị hụrụla, ọ dị ndị Izrel mkpa n’oge Jọshụa ka Jehova chebe ha. Ọ̀ dị ndị Jehova mkpa taa ka Jehova chebe ha? À na-ajụkwa ajụ! Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ndị mmadụ ga-enyefe unu ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu, mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 24:9) Kemgbe ọtụtụ afọ, a kpagbuola ma megide Ndịàmà Jehova n’ọtụtụ mba n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ma Jehova nọgidere na-anọnyere ndị ya. (Ndị Rom 8:31) Okwu Ya na-eme ka obi sie anyị ike na ‘ọ dịghị ihe agha ọ bụla nke a kpụrụ imegide anyị’ ga-akwụsịli ọrụ nkwusa Alaeze na ọrụ izi ihe anyị na-arụ.—Aịsaịa 54:17.

16. Olee ihe ndị ị hụrụla na-egosi na Jehova na-echebe ndị ya?

16 N’agbanyeghị na ụwa kpọrọ ndị Jehova asị, ha anọgidela na-amụba. Ndịàmà Jehova agbasaruola ná mba dị narị abụọ na iri atọ na isii—nke bụ́ ihe na-egosi nnọọ na Jehova nọnyeere anyị ichebe anyị pụọ n’aka ndị chọrọ igbu anyị ma kwụsị ọrụ anyị. Ì nwere ike icheta aha ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị ndú okpukpe ị maara bụ́ ndị ji obi ọjọọ kpagbuo ndị Chineke? Gịnị mechara mee ha? Olee ebe ha nọ ugbu a? Ọtụtụ n’ime ha alaala n’iyi dị nnọọ ka Fero nke oge Mozis na Jọshụa. Oleekwanụ maka ndị ohu Chineke nke oge a ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha? E chebere ha n’ebe Jehova ga-echeta ha. Ọ dịghị ebe ọzọ ka nchebe ha nwere ike ịnọ. N’eziokwu, a bịa n’ihe banyere ichebe ndị ya, Jehova na-emezu ihe o kwuru.

Jehova Na-elekọta Ndị Ya Taa

17. Olee nkwa Jehova kwere banyere nri ime mmụọ?

17 Jehova lekọtara ndị ya mgbe ha nọ n’ọzara, ọ na-elekọtakwa ha taa. E si n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” enye anyị nri ime mmụọ. (Matiu 24:45) Anyị na-amụta eziokwu ndị e zochiri ezochi kemgbe ọtụtụ narị afọ. Mmụọ ozi gwara Daniel, sị: “Zobe okwu ndị a, kachitekwa akwụkwọ a akara, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a: ọtụtụ mmadụ ga na-ejegharị, ihe ọmụma ga-abakwa ụba.”—Daniel 12:4.

18. N’ihi gịnị ka anyị nwere ike iji kwuo na ezi ihe ọmụma abaala ụba taa?

18 Anyị bi ugbu a n’oge ikpeazụ, ihe ọmụma abakwaala ụba n’ezie. N’ụwa nile, mmụọ nsọ enyerela ndị hụrụ eziokwu n’anya aka ịmụta eziokwu banyere ezi Chineke ahụ na nzube ya. E nwere Bible n’ebe nile n’ụwa taa, otú a kwa ka e nwere akwụkwọ ndị na-enyere mmadụ aka ịmụta eziokwu ndị ahụ na-enweghị atụ dị n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, tụlee, isiokwu ndị dị n’ime akwụkwọ ahụ e ji amụ Bible bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?  * Ụfọdụ isiokwu ndị dị na ya bụ: “Olee Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?,” “Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Gara?,” “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?,” na “N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?” Ọ dịla anya ụmụ mmadụ na-achọ ịmata azịza nke ajụjụ ndị dị otú a. Ugbu a ọ dị mfe inweta azịza ha. Ọ bụ ezie na o ruola ọtụtụ narị afọ ndị mmadụ na-amaghị ihe Bible na-akụzi, Krisendọm anọgidekwa na-ezi ha ihe ndị na-esiteghị na Bible, Okwu Chineke emeriela. O nyerela ndị nile ọ na-agụ agụụ ijere Jehova ozi aka ka ha bịa mara ya.

19. Olee nkwa ndị ị hụrụla ka ha mezuru, oleekwa ihe nke a mere ka i kwenyesie ike na ya?

19 N’ezie, n’ihi ihe ndị anyị jirila anya anyị hụ, anyị nwere ike ikwu, sị: “Ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.” (Joshua 23:14) Jehova na-anapụta, na-echebe ma na-elekọta ndị ohu ya. Ì nwere ike icheta nkwa ọ bụla Jehova kwere nke na-emezughị n’oge Jehova chọrọ ka o mezuo? Ọ gaghị ekwe omume icheta nke ọ bụla. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịtụkwasị obi n’Okwu Chineke nke na-emezu mgbe nile.

20. Gịnị mere anyị ga-eji nwee olileanya na nkwa Jehova ga-emezu n’ọdịnihu?

20 Oleekwanụ maka ọdịnihu? Jehova agwala anyị na ọtụtụ n’ime anyị ga-ebi ndụ n’ime ụwa nke e mere ka ọ ghọọ paradaịs mara mma. Mmadụ ole na ole n’ime anyị nwere olileanya nke iso Kraịst chịa n’eluigwe. Ebe ọ bụla ọ sọrọ olileanya anyị ya bụrụ, anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka Jọshụa. Oge na-abịa mgbe a ga-emezu olileanya anyị nile. Mgbe ahụ anyị ga-eleghachi anya azụ ná nkwa nile Jehova kwere, anyị onwe anyị ga-asịkwa: ‘Ha nile emezuwo.’

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 18 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee nkwa ndị Jehova kwere bụ́ ndị Jọshụa hụrụ mgbe ha mezuru?

• Olee nkwa ndị Chineke kwere ndị ị hụrụla ka ha mezuru?

• Olee obi ike anyị nwere banyere okwu Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Jehova gbataara ndị ya ọsọ enyemaka iji napụta ha

[Foto dị na peeji nke 23]

Olee otú Jehova si chebe ndị ya n’Oké Osimiri Uhie ahụ?

[Foto dị na peeji nke 24]

Olee otú Jehova si lekọta ndị ya n’ọzara?

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Jehova na-elekọta ndị ya taa