‘Yikwasịnụ Onwe Unu Ịdị Umeala n’Obi’
‘Yikwasịnụ Onwe Unu Ịdị Umeala n’Obi’
E NWERE otu nwoke si n’otu obodo a ma ama. Nwoke a nwere ihe ùgwù nke ịbụ onye a mụrụ dị ka nwa amaala Rom, eleghịkwa anya o si n’ezinụlọ a na-anụ aha ya. Ọ gụrụ ezigbo akwụkwọ dị ka ụdị agụmakwụkwọ e nwere na narị afọ mbụ si dị. Ọ maara asụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ asụsụ abụọ, ọ bụkwa onye Farisii, bụ́ òtù okpukpe ndị Juu a ma ama. Ị̀ ma onye a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ Sọl.
Ọ ga-abụrịrị na Sọl mụtara ileda ndị na-abụghị ndị Farisii anya, ma na-anya isi na ya bụ onye ezi omume. (Luk 18:11, 12; Ọrụ 26:5) Ndị Farisii ibe Sọl chere na ha karịrị ndị ọzọ, ọ na-amasịkarị ha ịnọ n’isị, ịza oké aha na-atọgbukwa ha atọgbu. (Matiu 23:6, 7; Luk 11:43) Eleghị anya iso ụdị ndị a na-akpakọ mere ka Sọl dịrị mpako. Anyị maara na o ji ịnụ ọkụ n’obi kpagbuo Ndị Kraịst. Mgbe ọtụtụ afọ gafechara, bụ́ mgbe a bịaziri mara ya dị ka Pọl onyeozi, o kwuru na o nwedịrị mgbe ya bụ “onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ.”—1 Timoti 1:13.
N’ezie, Sọl ghọrọ Onye Kraịst, onye a maara dị ka Pọl onyeozi, àgwà ya gbanwekwara kpamkpam. Ebe ọ bụzi Onye Kraịst bụ́ onyeozi, o ji obi umeala kwuo na ya bụ “onye dị ala karịa onye kasị nta n’ime ndị nsọ nile.” (Ndị Efesọs 3:8) O nwere ihe ịga nke ọma n’ozi ya, ma o toghị onwe ya maka nke a. Kama nke ahụ, o nyere Chineke otuto nile. (1 Ndị Kọrint 3:5-9; 2 Ndị Kọrint 11:7) Ọ bụdị Pọl dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ, sị: “Yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:12.
Ndụmọdụ a Pọl nyere ọ̀ gbasara oge anyị a? Ịdị umeala n’obi ọ̀ bara uru? Ịdị umeala n’obi ò nwere ike ịbụ ihe e ji ama onye dị ike?
Onye Kere Ihe Nile Ọ̀ Dị Umeala n’Obi?
Mgbe ọ bụla a na-ekwu okwu banyere ịdị umeala n’obi, e kwesịrị ịtule otú Chineke si ele ya anya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ Onye Kasị Ihe Nile Elu na Onye Okike anyị. Anyị na Onye Okike anyị abụghị otu, n’ihi ya, anyị kwesịrị ịma ebe ike anyị ruru. Anyị dabeere n’ebe ọ nọ. Otu nwoke maara ihe n’oge ochie, onye aha ya bụ Elaịhu kwuru, sị: “Onye pụrụ ime ihe nile, anyị achọpụtaghị Ya; Ọ dị ukwuu n’ike.” (Job 37:23) Nanị ịtụgharị uche n’otú e si kee mbara igwe na ụwa anyị ezuola ime ka anyị dị umeala n’obi! Aịsaịa onye amụma gwara anyị, sị: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? Ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka ụsụụ ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.”—Aịsaịa 40:26.
E wezụga na Jehova Chineke bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, ọ dịkwa umeala n’obi. Eze Devid kpegaara ya ekpere, sị: “I nyewokwa m ọta nzọpụta Gị: umeala n’obi nke Gị na-emekwa m ka m baa ụba.” (2 Samuel 22:36) A pụrụ ikwu na Chineke dị umeala n’obi n’ihi na ihe banyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, bụ́ ndị na-agbalị ime ihe dị ya ụtọ, na-emetụ ya n’ahụ́, ọ na-emekwara ha ebere. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Jehova na-ewedata onwe ya ala iji gosi ndị na-atụ egwu ya obiọma.—Abụ Ọma 113:5-7.
Jehova adịghịkwa eleghara ịdị umeala n’obi nke ndị na-ejere ya ozi gosipụtara anya. Pita onyeozi dere, sị: “Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala obiọma na-erughịrị mmadụ.” (1 Pita 5:5) Otu onye so dee Bible kwuru otú Chineke si ele ndị mpako anya, sị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye ọ bụla bụ nke obi ya dị elu.” (Ilu 16:5) Ma oleekwanụ otú ịdị umeala n’obi pụrụ isi bụrụ ihe e ji ama onye dị ike?
Ihe Ịdị Umeala n’Obi Na-abụghị
Ịdị umeala n’obi na ịbụ onye e wedara n’ala abụghị otu ihe. N’ebe ụfọdụ n’oge ochie, onye e weere na ọ dị nnọọ umeala n’obi bụ ohu—nke bụ́ onye na-erube isi, onye a na-emetere ebere na onye na-enweghị ka ọ hà ya. Ma, Bible gosiri na mmadụ ịdị umeala n’obi na-eme ka a na-akwanyere onye ahụ ùgwù. Dị ka ihe atụ, nwoke ahụ maara ihe dere, sị: “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.” (Ilu 22:4) Anyị na-agụkwa n’Abụ Ọma 138:6, sị: “Jehova dị elu, ma ọ bụ onye dị umeala n’obi ka Ọ na-ahụ anya: ma onye mpako, Ọ na-esite n’ebe dị anya mara ya.”
Ịdị umeala n’obi apụtaghị na mmadụ esighị ike ma ọ bụkwanụ na onye ahụ adịghị agba mbọ. Dị ka ihe atụ, ọ dịtụghị mgbe Jizọs Kraịst kwuru na ya abụghị Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya, ọ dịtụghịkwa mgbe o mere ka à ga-asị na ozi ya n’elu ala adịghị mkpa. (Mak 14:61, 62; Jọn 6:51) N’agbanyeghị nke a, Jizọs gosiri na ya dị umeala n’obi site n’ikwu na ọ bụ Nna ya nyere ya ikike ịrụzu ihe ndị ọ rụrụ, nakwa site n’iji ike ya jeere ndị ọzọ ozi ma nyere ha aka kama ịchọ ka ha jewere ya ozi ma ọ bụkwanụ na-eme ihe na-egosi na ọ karịrị ha.
Ọ Bụ Ihe E Ji Ama Onye Dị Ike
O doro anya na ndị oge Jizọs Kraịst ‘sitere n’ọrụ ndị dị ike’ ọ rụrụ mara ya. (Ọrụ 2:22) N’agbanyeghị nke a, ụfọdụ ndị lere ya anya dị ka “onye dị ala karịa mmadụ nile.” (Daniel 4:17) Ọ bụghị nanị na ọ dị umeala n’obi kama ọ nọgidekwara na-akụzi uru ịdị umeala n’obi bara. (Luk 9:48; Jọn 13:2-16) Otú ọ dị, ịdị umeala n’obi ya emeghị ka ọ ghara ịdị ike. O jiri obi ike gbachitere aha Nna ya ma jezuo ozi ya. (Ndị Filipaị 2:6-8) N’ime Bible, a kọwara Jizọs dị ka ọdụm nwere obi ike. (Mkpughe 5:5) Otú Jizọs si bie ndụ gosiri na mmadụ nwere ike ịdị umeala n’obi ma n’otu oge ahụ bụrụ onye kwụsiri ike n’omume ọma.
Ka anyị na-anwa ike anyị iji zụlite ezi ịdị umeala n’obi, anyị na-achọpụta na ọ na-ewe mgbalị dị ukwuu iji mee ka ọ mara anyị ahụ́. Ọ gụnyere ịdị na-eme uche Chineke mgbe nile kama ime ihe anyị lere anya na ọ bụ ụzọ ka mfe isi mee ihe ma ọ bụ na-eme ihe na-agụ anụ ahụ́ anyị agụụ. Iji bụrụ ndị dị umeala n’obi, ọ dị anyị mkpa ịnọgidesi ike na-eme omume ọma, n’ihi na anyị kwesịrị ịhapụ ọchịchọ onwe onye iji bute ijere Jehova na ndị ọzọ ozi ụzọ.
Uru Ịdị Umeala n’Obi Bara
Ịdị umeala n’obi na-agụnye ịkwụsị nganga ma ọ bụ itu ọnụ. Ihe ga-enyere anyị aka ịbụ ndị dị umeala n’obi bụ inyocha onwe anyị nke ọma, nke gụnyere ịma ebe ndị anyị dị ike na ebe ndị anyị na-adịghị ike na ịma ebe ndị anyị na-eme nke ọma na ebe ndị anyị na-adịghị eme nke ọma. Pọl nyere ndụmọdụ mara nnọọ mma n’okwu a mgbe o dere, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka ọ dị mkpa iche; kama ka ọ na-eche echiche iji wee nwee uche zuru okè.” (Ndị Rom 12:3) Onye ọ bụla mere ihe a Pọl kwuru dị umeala n’obi.
Anyị na-egosikwa na anyị dị umeala n’obi mgbe anyị butere ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ. Site n’ike mmụọ nsọ, Pọl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “[Gharanụ] ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama site n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” (Ndị Filipaị 2:3) Nke a kwekọrọ nnọọ n’iwu Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye kasị ukwuu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi. Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Matiu 23:11, 12.
N’ezie, Chineke na-ebuli ndị dị umeala n’obi elu. Jems onye na-eso ụzọ mesiri okwu a ike mgbe o dere, sị: “Wedanụ onwe unu ala n’anya Jehova, ọ ga-ebulikwa unu elu.” (Jems 4:10) Ọ̀ dị onye na-agaghị achọ ka Chineke bulie ya elu?
Adịghị umeala n’obi emebiela ọtụtụ ihe, ọ kpatakwala esemokwu n’etiti òtù dị iche iche nakwa n’etiti ndị mmadụ n’otu n’otu. Ma ịdị umeala n’obi na-arụpụta nnọọ ihe ndị dị mma. Ọ na-eme ka anyị na Chineke dị nnọọ ná mma. (Maịka 6:8) Ọ na-eme ka obi ruo anyị ala n’ihi na o yikarịrị ka onye dị umeala n’obi ọ̀ na-enwekarị obi ụtọ na afọ ojuju karịa onye dị mpako. (Abụ Ọma 101:5) Iso ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, ndị ọrụ ibe anyị na ndị ọzọ na-emekọrịta ihe agaghị esiziri anyị ike kama ọ ga na-atọ anyị ụtọ. Ndị dị umeala n’obi adịghị abụ ekwe ekwe na ndị na-achọkarị ka okwu na-ebi ha n’ọnụ, bụ́ àgwà ndị na-edugakarị n’iwe, nkewa, ibu iwe n’obi na obi ilu.—Jems 3:14-16.
N’ezie, ịdị umeala n’obi bụ ihe magburu onwe ya na-eme ka anyị na ndị ọzọ nọgide na-adị ná mma. Ọ pụrụ inyere anyị aka ịnagide ihe ịma aka ndị anyị na-enweta n’ụwa a nke ịsọ mpi na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị juru na ya. Site n’enyemaka Chineke, Pọl onyeozi kwụsịrị ịdị mpako na ileda ndị ọzọ anya. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị ịkwụsị ihe ọ bụla pụrụ ime ka anyị na-adị mpako ma ọ bụ ihe ga-eme ka anyị chewe na anyị ka ndị ọzọ mma. Bible dọrọ aka ná ntị, sị: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.” (Ilu 16:18) Ọ bụrụ na anyị agbasoo ihe nlereanya Pọl na ndụmọdụ o nyere, anyị ga-ahụ na amamihe dị ‘n’iyikwasị onwe anyị ịdị umeala n’obi.’—Ndị Kọlọsi 3:12.
[Foto dị na peeji nke 4]
Pọl kwụsịrị ịdị mpako na ileda ndị ọzọ anya
[Foto dị na peeji nke 7]
Ịdị umeala n’obi na-enye aka eme ka anyị na ndị ọzọ dịrị ná mma
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 5]
Anglo-Australian Observatory/David Malin Images