Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-eme Ka Ahụ́ Ruo Ndị Ọzọ Ala?

Ị̀ Na-eme Ka Ahụ́ Ruo Ndị Ọzọ Ala?

Ị̀ Na-eme Ka Ahụ́ Ruo Ndị Ọzọ Ala?

UGWU HEMỌN nke ji puku mita abụọ, narị asatọ na iri na anọ dị elu karịa ịdị elu nke oké osimiri dị ná ngwụsị nke ebe ndịda usoro Ugwu Anti-Lebanọn. Snow na-ekpuchi elu Ugwu Hemọn ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile n’afọ, nke a na-eme ka alụlụ ọkụ na-agafe n’elu ya n’abalị gbazee ma ghọọ igirigi. Igirigi ahụ na-adakwasị ahịhịa na osisi ndị na-amị mkpụrụ bụ́ ndị dị ná mkpọda ugwu ahụ na ubi vaịn ndị dị na ndagwurugwu ya. N’oge ogologo ọkọchị a na-enwe n’Izrel oge ochie, ọ bụ igirigi dị otú ahụ bụ ebe bụ́ isi ihe ọkụkụ na-esi enweta mmiri.

N’abụ e dere n’ike mmụọ nsọ, e ji ịdị n’otu nke na-enye ume ọhụrụ na-adị n’etiti ndị na-efe Jehova tụnyere “igirigi Hemọn, nke na-adakwasị n’ugwu nile nke Zaịọn.” (Abụ Ọma 133:1, 3) Dị nnọọ ka igirigi si n’Ugwu Hemọn na-eme ka ihe ọkụkụ na-eme nke ọma, anyị pụrụ ime ka ahụ́ ruo ndị anyị na-ezute ala. Olee otú anyị nwere ike isi mee nke ahụ?

Ihe Nlereanya Jizọs nke Na-enye Ume Ọhụrụ

Jizọs Kraịst nwere mmetụta miri emi n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọbụna ịnọnyere ya ruo obere oge pụrụ ime nnọọ ka mmadụ nwee ume ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, onye so dee Oziọma bụ́ Mak kọrọ, sị: “[Jizọs] kukwaara ụmụaka ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha, na-ebikwasị ha aka n’isi.” (Mak 10:16) Lee ka nke ahụ na-aghaghị isiwo mee ka ahụ́ ruo ụmụaka ahụ ala!

N’abalị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa dị ka mmadụ, ọ sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya. Ịdị umeala n’obi ya aghaghị imetụ ha n’obi. Jizọs gwaziri ha, sị: “M na-esetịpụrụ unu ụkpụrụ, ka unu, dị nnọọ ka m meere unu, meekwa otú ahụ.” (Jọn 13:1-17) Ee, ọ dịkwa ha onwe ha mkpa ịdị umeala n’obi. Ọ bụ ezie na ndịozi Jizọs aghọtaghị ihe ahụ ọ chọrọ ịkụziri ha ozugbo ma mesịa n’abalị ahụ malite ịrụ ụka banyere onye o yiri ka ọ̀ bụ ya kasị ukwuu, Jizọs eweghị iwe. Kama nke ahụ, o ji ndidi gwa ha okwu mere ka ha chee echiche. (Luk 22:24-27) Ọbụna ‘mgbe a na-ekwujọ Jizọs, ọ dịghị ekwujọgwara.’ N’ezie, “mgbe ọ na-ata ahụhụ, ọ nọghị na-eyi egwu, kama ọ nọgidere na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ na-ekpe ikpe n’ezi omume.” Ihe nlereanya Jizọs nke na-enye ume ọhụrụ kwesịrị ka anyị ṅomie ya.—1 Pita 2:21, 23.

Jizọs kwuru, sị: “Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ.” (Matiu 11:29) Cheedị otú obi ga-adị gị ma a sị na Jizọs ji aka ya kụziere gị ihe. Mgbe ndị nọ n’obodo ya nụsịrị ihe ọ kụziri n’ụlọ nzukọ ha, o juru ha anya, ha ekwuo, sị: “Olee ebe nwoke a si nweta amamihe a na ọrụ ndị a dị ike?” (Matiu 13:54) Ịgụ ihe banyere ndụ na ozi Jizọs ga-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere ime ka ahụ́ ruo ndị ọzọ ala. Ka anyị tụlee otú Jizọs si setịpụ ihe nlereanya pụtara ìhè site n’ikwu okwu ndị na-ewuli elu na inyere ndị ọzọ aka.

Na-ekwu Okwu Na-ewuli Elu Mgbe Nile

Ọ dị nnọọ mfe ịkwada ụlọ karịa ịrụ nke ọhụrụ. Otu ụkpụrụ ahụ dị n’ịkwada na ịrụ ụlọ metụtakwara okwu anyị. Dị ka ndị na-ezughị okè, anyị nile nwechara ebe ndị anyị na-emejọ. Eze Solomọn kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ezi omume n’ụwa, nke na-eme ezi ihe, na-adịghị emehiekwa.” (Eklisiastis 7:20) Ọ na-adị mfe ịhụta ebe onye ọzọ mejọrọ ihe na iji okwu ọjọọ katọọ ya. (Abụ Ọma 64:2-4) N’aka nke ọzọ, ịnọgide na-ekwu okwu ndị na-ewuli elu chọrọ anyị inwe nkà.

Jizọs ji okwu ya wulie ndị mmadụ elu. O mere ka ahụ́ ruo ha ala site n’ikwusara ha ozi ọma Alaeze. (Luk 8:1) Jizọs mekwara ka ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya nwee ume ọhụrụ site n’ime ka ha mara Nna ya nke bi n’eluigwe. (Matiu 11:25-27) Ka a sịkwa ihe mere ndị mmadụ ji nwee mmasị ịbịa Jizọs nso!

N’adịghị ka Jizọs, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii echebaraghị mkpa nke ndị ọzọ echiche. Jizọs kwuru na “ha na-enwe mmasị ịnọ n’ebe kasị ùgwù ná nri anyasị nakwa n’ihu oche n’ụlọ nzukọ.” (Matiu 23:6) N’ezie, ha ledara ndị nkịtị anya, na-ekwu, sị: “Ìgwè mmadụ a nke na-amaghị Iwu ahụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.” (Jọn 7:49) Àgwà dị otú ahụ adịtụghị eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala!

Okwu anyị na-egosikarị ụdị mmadụ anyị bụ n’ime na otú anyị si were ndị ọzọ. Jizọs kwuru, sị: “Ezi mmadụ na-ewepụta ezi ihe site n’ezi akụ̀ nke obi ya, ma ajọ mmadụ na-ewepụta ajọ ihe site n’ajọ akụ̀ ya; n’ihi na ọnụ ya na-ekwu okwu site n’ihe jupụtara n’obi ya.” (Luk 6:45) Oleezi ihe anyị nwere ike ime iji hụ na okwu anyị na-eme ka ahụ́ ruo ndị ọzọ ala?

Otu ihe anyị nwere ike ime bụ ịkwụsịtụ ma chee echiche tupu anyị ekwuo okwu. Ilu 15:28 kwuru, sị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu.” Ntụgharị uche dị otú ahụ ekwesịghị igbu anyị oge. Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ jiri obere oge chebatụrụ okwu anyị echiche, mgbe mgbe, anyị ga-enwe ike ịmata otú a ga-esi lee ya anya. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe a m na-achọ ikwu ọ̀ ga-egosi ịhụnanya? Ọ̀ bụ eziokwu, ka ọ̀ bụ nanị asịrị? Ọ̀ bụ “okwu e kwuru na mgbe ya?” Ọ̀ ga-eme ka ahụ́ ruo ndị m na-agwa ya ala ma wulie ha elu?’ (Ilu 15:23) Ọ bụrụ na anyị ahụ na okwu ahụ bụ okwu ọjọọ ma ọ bụkwanụ na ọ bụghị ihe anyị kwesịrị ikwu mgbe ahụ, ka anyị gbalisie ike ghara ikwu ya. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị gbalịa iji okwu na-ewuli elu na nke kwesịrị ekwesị dochie ya? Okwu ndị a na-echeghị echiche kwuo dị ka “ndụpu nke mma agha,” ebe okwu na-ewuli elu bụ “ihe na-agwọ mmadụ.”—Ilu 12:18.

Ihe ọzọ ga-enye aka bụ anyị ilekwasị anya n’ihe mere ndị kwere ekwe ibe anyị ji dịrị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. Jizọs kwuru, sị: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.” (Jọn 6:44) Jehova na-ahụ àgwà ọma ohu ya nke ọ bụla nwere—ọbụna ndị ohu ya ndị anyị nwere ike iche na ha nwere àgwà ọjọọ. Anyị itinye mgbalị ịchọpụta àgwà ọma ha ga-eme ka anyị nwee ihe mere anyị ga-eji na-ekwu okwu ọma banyere ha.

Na-enyere Ndị Ọzọ Aka

Jizọs ghọtara nnọọ ọnọdụ ndị a na-emegbu emegbu nọ na ya. N’ezie, “mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Ma nanị ihe Jizọs mere abụghị ịhụ na ndị ahụ nọ n’ọnọdụ ọjọọ; o mere ihe banyere ọnọdụ ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.” O mekwara ka obi sie ha ike, sị: “Yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28, 30.

Taa, anyị bi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) “Nchegbu nke usoro ihe a” na-anyịgbu ọtụtụ ndị. (Matiu 13:22) Ndị ọzọ na-enwe obi erughị ala n’ihi ọnọdụ ọjọọ ndị ha nọ na ya. (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka obi ruo ndị nọ ná mkpa ala? Dị ka Kraịst, anyị nwere ike ime ka ibu ha dị mfe.

Ụfọdụ na-achọ imeda onwe ha obi site n’ịgwa ndị ọzọ nsogbu ha. Ọ bụrụ na ndị nwere nkụda mmụọ abịakwute anyị maka enyemaka, ànyị na-ewepụta oge gee ha ntị nke ọma? Ọ chọrọ mmadụ inye onwe ya ọzụzụ iji bụrụ onye na-eji ọmịiko ege ntị. Ọ gụnyere itinye uche n’ihe onye nke ọzọ na-agwa anyị, kama ịnọ na-eche ihe anyị ga-aza ya ma ọ bụ otú anyị ga-esi gbooro ya mkpa ya. Site n’ige ntị nke ọma, ile onye ahụ anya n’ihu, na ịmụmụ ọnụ ọchị mgbe o kwesịrị ekwesị, anyị na-egosi na anyị na-eche banyere onye ahụ.

N’ọgbakọ Ndị Kraịst, e nwere ọtụtụ ohere anyị ga-eji gbaa ndị kwere ekwe ibe anyị ume. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị gara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị nwere ike ịchọpụta ndị ahụ́ na-adịghị. Mgbe ụfọdụ, ihe ọ chọrọ iji wulie ha elu bụ iji nkeji ole na ole gwa ha okwu agbamume tupu a malite ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbe e mechiri. Anyị nwekwara ike ịchọpụta ndị na-abịaghị Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Eleghị anya, anyị nwere ike ịkpọ ha na fon iji gosi na anyị na-eche maka ọdịmma ha ma ọ bụ iji nyere ha aka.—Ndị Filipaị 2:4.

Ndị okenye ọgbakọ nwere ibu dị arọ ha na-ebu n’ọgbakọ. Anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eme iji mee ka ibu ha dị mfe site n’ikwenyere ha na site n’iji obi umeala na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere anyị. Okwu Chineke na-agba anyị ume, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndu n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị n’isu ude, n’ihi na nke a ga-ebibiri unu ihe.” (Ndị Hibru 13:17) Site n’ịdị njikere ime ihe a gwara anyị mee, anyị nwere ike ime ka ahụ́ ruo “ndị na-arụ ọrụ nlekọta n’ụzọ dị mma” ala.—1 Timoti 5:17.

Na-ekwu Okwu Na-ewuli Elu Ma Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Mgbe Nile

Igirigi nke na-eme ka ihe a kụrụ n’ubi na-eme nke ọma bụ ọtụtụ puku nta mmiri na-atapụ obere obere, ndị yiri ka o nweghị ebe ha si. N’otu aka ahụ, ime ka ahụ́ ruo ndị ọzọ ala abụghị ihe a ga-eme site n’ịja ha mma nanị otu ugboro, kama ọ bụ site n’anyị ịdị na-emeso ha omume yiri nke Kraịst mgbe nile.

Pọl onyeozi dere, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ mmetụta dị nro maka ibe unu. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Ka anyị tinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ. Ka anyị site n’okwu na n’omume na-eme nnọọ ka ahụ́ ruo ndị ọzọ ala.

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Igirigi nke Ugwu Hemọn —ebe bụ́ isi ihe ọkụkụ si enweta mmiri

[Foto dị na peeji nke 17]

Onye na-eji ọmịiko ege ntị na-eme ka ahụ́ ruo ndị ọzọ ala