Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ṅomie Nnukwu Onye Na-eme Ndị Na-eso Ụzọ

Ṅomie Nnukwu Onye Na-eme Ndị Na-eso Ụzọ

Ṅomie Nnukwu Onye Na-eme Ndị Na-eso Ụzọ

“Lezienụ anya otú unu si aṅa ntị.”—LUK 8:18.

1, 2. Gịnị mere i kwesịrị iji tụlee otú Jizọs si meso ndị mmadụ ihe mgbe ọ na-eje ozi ya?

JIZỌS KRAỊST nọ na-arụ ọrụ ya dị ka Nnukwu Onye Ozizi Ukwu na Onye Na-eme Ndị Na-eso Ụzọ mgbe ọ gwara ụmụazụ ya, sị: “Lezienụ anya otú unu si aṅa ntị.” (Luk 8:16-18) Ụkpụrụ ahụ metụtara ozi gị dị ka Onye Kraịst. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị n’ihe ndị metụtara Chineke na nzube ya, ị ga-eme ha eme ma bụrụ onye nkwusa Alaeze na-arụpụta ihe. N’ezie, i nweghị ike ịnụ olu Jizọs taa, ma i nwere ike ịgụ banyere ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere, dị ka e si dee ha n’Akwụkwọ Nsọ. Gịnị ka ihe ndị ahụ na-egosi banyere otú Jizọs si meso ndị mmadụ ihe mgbe ọ na-eje ozi ya?

2 Jizọs bụ ezigbo onye nkwusa nke ozi ọma na aka ochie n’ịkụzi eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ. (Luk 8:1; Jọn 8:28) Ọrụ ime ndị na-eso ụzọ gụnyere ma izi ozi ọma ma izi ihe, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-esiri ụfọdụ Ndị Kraịst na-ezi ozi ọma nke ọma ike izi ndị mmadụ ihe nke ọma. Ime nkwusa bụ ịkpọsa ozi, ma ịkụziri ndị mmadụ banyere Jehova na nzube ya na-achọ ka onye na-eme ndị na-eso ụzọ meta ndị ọ na-akụziri ihe enyi. (Matiu 28:19, 20) A pụrụ ime nke a site n’iṅomi Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Ozizi Ukwu na Nnukwu Onye Na-eme Ndị Na-eso Ụzọ.—Jọn 13:13.

3. Olee mmetụta iṅomi Jizọs nwere ike inwe ná mgbalị ndị ị na-eme iji mee ndị na-eso ụzọ?

3 Ọ bụrụ na i ṅomie ụzọ Jizọs si zie ihe, ọ pụtara na ị na-agbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi, nke bụ́: “Nọgidenụ na-eje ije n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ, na-azụpụtaranụ onwe unu oge ahụ kwesịrị ekwesị. Kwenụ ka okwu unu dịrị n’amara mgbe nile, bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:5, 6) Iṅomi Jizọs n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ chọrọ mgbalị, ma ọ ga-eme ka izi ihe gị ka mma n’ihi na ọ ga-enyere gị aka ‘ịzaghachi onye ọ bụla’ dị ka mkpa ya si dị.

Jizọs Gbara Ndị Ọzọ Ume Ikwu Okwu

4. Olee ihe mere e nwere ike iji kwuo na Jizọs bụ onye na-ege ntị nke ọma?

4 Site n’oge Jizọs bụ nwata gaa n’ihu, o mere ka ọ bụrụ àgwà ya ige ndị mmadụ ntị na ịgba ha ume ikwu echiche ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, ndị mụrụ ya chọtara ya ebe ọ nọ n’etiti ndị nkụzi n’ụlọ nsọ, ‘na-ege ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ.’ (Luk 2:46) Jizọs agaghị n’ụlọ nsọ iji jiri amamihe ya menye ndị nkụzi ahụ ihere. Ọ gara ebe ahụ ige ntị, ọ bụ ezie na ọ jụkwara ajụjụ. Ọchịchọ o nwere ige ntị nke ọma nwere ike ịbụ otu n’ime àgwà ndị mere ka ihe ya dị Chineke na ụmụ mmadụ mma.—Luk 2:52.

5, 6. Olee otú anyị si mara na Jizọs gere ndị ọ kụziiri ihe ntị mgbe ha na-ekwu okwu?

5 Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim ma tee ya mmanụ dị ka Mezaịa, ọ nọgidere na-enwe mmasị ige ndị mmadụ ntị. O tinyeghị uche ya nile n’ihe ọ na-akụzi nke na o chebaaraghị ndị bịara ige ya ntị echiche. Ọtụtụ mgbe, ọ na-akwụsịtụ, jụọ ha ihe ha chere, ma gee ntị n’ihe ha ga-aza. (Matiu 16:13-15) Dị ka ihe atụ, mgbe nwanne Mata bụ́ Lazarọs nwụsịrị, Jizọs gwara Mata, sị: “Onye ọ bụla nke dị ndụ ma na-egosipụta okwukwe na mụ adịghị mgbe ọ ga-anwụ ma ọlị.” Ọ jụziri ya, sị: “Ì kwere nke a?” O dokwara anya na Jizọs gere ntị mgbe Mata zaghachiri ya, sị: “Ee, Onyenwe anyị; ekwewo m na ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke.” (Jọn 11:26, 27) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo mee Jizọs obi ụtọ ịnụ ka Mata si otú ahụ kwupụta okwukwe o nwere!

6 Mgbe ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsịrị iso ya, o nwere mmasị ịnụ ihe bụ́ echiche ndịozi ya. N’ihi ya, ọ jụrụ ha, sị: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” Saịmọn Pita zara, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-agakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi; anyị ekwerewokwa ma mara na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.” (Jọn 6:66-69) Lee ka okwu ndị ahụ na-aghaghị isiwo tọọ Jizọs ụtọ! Obi ga-atọkwa gị ụtọ mgbe onye ị na-amụrụ Bible kwuru ihe yiri nke ahụ gosiri na o nwere okwukwe.

Jizọs Ji Nkwanye Ùgwù Gee Ndị Ọzọ Ntị

7. Gịnị mere ọtụtụ ndị Sameria ji kwere na Jizọs?

7 Ihe ọzọ mere Jizọs ji bụrụ onye na-eme ndị na-eso ụzọ nke nwere ihe ịga nke ọma bụ na o chebaara ndị mmadụ echiche ma jiri nkwanye ùgwù gee ha ntị. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, Jizọs ziri otu nwanyị Sameria ozi ọma na nso olulu mmiri Jekọb nke dị na Saịka. Mgbe ha na-akparịta ụka, ọ bụghị Jizọs kwuru ihe nile; o gere nwanyị ahụ ntị mgbe ọ na-ekwu echiche ya. Ka Jizọs na-ege ya ntị, ọ chọpụtara na nwanyị ahụ nwere mmasị n’ihe banyere ofufe ma gwa ya na Chineke na-achọ ndị ga-efe Ya ofufe n’ime mmụọ na eziokwu. Jizọs kwanyeere nwanyị a ùgwù ma gosi mmasị n’ebe ọ nọ, nke mere nwanyị ahụ ji gaa gwa ndị ọzọ ihe banyere Jizọs, ‘ọtụtụ n’ime ndị Sameria si n’obodo ahụ pụta etinyekwa okwukwe na ya n’ihi ihe nwanyị ahụ kwuru.’—Jọn 4:5-29, 39-42.

8. Olee otú mmasị ndị mmadụ nwere ikwu echiche ha ga-esi nyere gị aka ịmalite mkparịta ụka n’ozi ọma?

8 Ndị mmadụ na-enwekarị mmasị ikwu echiche ha. Dị ka ihe atụ, ndị bi n’Atens oge ochie na-enwe mmasị ikwu echiche ha na ige ihe ọhụrụ. Nke a mere Pọl ji nwee ihe ịga nke ọma n’okwu o kwuru n’Ariopagọs nke dị n’obodo ahụ. (Ọrụ 17:18-34) Taa, mgbe ị na-achọ ịmalite ịgwa onye nwe ụlọ okwu n’ozi ọma, i nwere ike ịsị, “Abịara m na nke gị n’ihi na achọrọ m ịma ihe i chere banyere [otu isiokwu].” Gee ntị n’echiche onye ahụ, kwuo okwu banyere ihe ahụ o kwuru, ma ọ bụ jụọ ya ajụjụ n’ihe ahụ o kwuru. Jirizie obiọma gosi ya ihe Bible kwuru n’isiokwu ahụ.

Jizọs Maara Ihe Ọ Ga-ekwu

9. Gịnị ka Jizọs mere tupu ya ‘emepeere Kliopas na onye ya na ya so Akwụkwọ Nsọ nke ọma?’

9 Ọ dịghị mgbe Jizọs chọrọ ihe ọ ga-ekwu achọ. E wezụga na ọ bụ onye na-ege ntị nke ọma, mgbe mgbe, ọ na-ama ihe ndị mmadụ na-eche, ọ na-amakwa kpọmkwem ihe ọ ga-ekwu. (Matiu 9:4; 12:22-30; Luk 9:46, 47) Dị ka ihe atụ: Ntakịrị oge ka Jizọs bilitesịrị n’ọnwụ, mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya si Jeruselem na-aga Emeọs. Oziọma Luk kwuru, sị: “Ka ha na-akparịta ụka ma na-ekwurịta okwu, Jizọs n’onwe ya bịaruru nso wee malite iso ha na-aga; ma e gbochiri anya ha ịmata onye ọ bụ. Ọ sị ha: ‘Gịnị bụ ihe ndị a unu na-arụrụ ụka n’etiti onwe unu ka unu na-aga n’ụzọ?’ Ha wee guzo n’otu ebe ná mgbarụ ihu. Ná nzaghachi, onye nke aha ya bụ Kliopas sịrị ya: ‘Ì bi dị ka onye ala ọzọ nanị gị na Jeruselem, nke mere na ị maghị ihe ndị werewooro ọnọdụ n’ime ya n’ụbọchị ndị a?’ O wee sị ha: ‘Ihe ndị dị aṅaa?’” Onye Ozizi Ukwu ahụ gere ha ntị ka ha nọ na-akọwara ya na Jizọs onye Nazaret ziri ndị mmadụ ihe, rụọ ọrụ ebube, e gbuokwa ya. Ugbu a, ụfọdụ na-ekwu na a kpọlitela ya n’ọnwụ. Jizọs kwere ka Kliopas na onye ya na ya so kwuo ihe dị ha n’obi. Mgbe ahụzi, ọ kọwaara ha ihe ha kwesịrị ịma, ‘mepeere ha Akwụkwọ Nsọ nke ọma.’—Luk 24:13-27, 32.

10. Olee otú i nwere ike isi chọpụta ihe onye i zutere n’ozi na-eche banyere okpukpe?

10 O nwere ike ị gaghị ama ihe bụ́ echiche onye nwe ụlọ banyere okpukpe. Iji mata ya, i nwere ike ikwu na ị na-enwe mmasị ịnụ ihe ndị mmadụ na-eche banyere ekpere. I nweziri ike ịjụ ya, sị, “Ì chere na o nwere onye na-anụ nnọọ ekpere ndị mmadụ na-ekpe?” Ihe onye ahụ zara nwere ike ikpughe ọtụtụ ihe banyere echiche ya na ụdị okpukpe ọ na-ekpe. Ọ bụrụ na ọ bụ onye ji okpukpe kpọrọ ihe, i nwere ike ịmatakwu ihe dị ya n’obi site n’ịjụ ya, sị, “Ì chere na Chineke na-anụ ekpere nile, ka ò nwere ike ịbụ na ọ dị ekpere ụfọdụ ọ na-adịghị anabata?” Ajụjụ ndị dị otú ahụ nwere ike iduga ná mkparịta ụka si n’obi. Mgbe o kwesịrị ekwesị ka i gosi ya ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, i kwesịrị iji akọ mee nke ahụ, ghara ịkatọ ihe o kweere. Ọ bụrụ na ihe i kwuru masịrị ya, o nwere ike inwe mmasị ka ị bịa ọzọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọ jụrụ gị ajụjụ ị na-agaghị azali? I nwere ike ime nnyocha ma gaghachi mgbe ị dịrịla njikere ịza ya ‘ihe mere i ji nwee olileanya i nwere, jiri obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi na-eme nke ahụ.’—1 Pita 3:15.

Jizọs Kụziiri Ndị Nwere Ezi Ọchịchọ Obi Ihe

11. Gịnị ga-enyere gị aka ịchọpụta ndị kwesịrị ka e zie ha ihe?

11 Nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jizọs nwere nghọta bụ́ nke mere ka o nwee ike ịmata ndị kwesịrị ka e zie ha ihe. Ọ na-esiri anyị nnọọ ike karịa ka o siiri Jizọs ịchọta ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Ọ bụkwa otú ahụ ka o si siere ndịozi ahụ ike bụ́ ndị Jizọs gwara, sị: “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu na-abanye, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya.” (Matiu 10:11) Dị ka ndịozi Jizọs, ị ghaghị ịchọ ndị dị njikere ige ntị na ndị chọrọ ka a kụziere ha eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ. I nwere ike ịchọta ndị kwesịrị ekwesị site n’ige ndị nile gị na ha kwuru okwu ntị nke ọma, na-ahụwa àgwà onye nke ọ bụla ama.

12. Olee otú i nwere ike isi nọgide na-enyere onye nwere mmasị aka?

12 Mgbe i si na nke onye gositụrụ mmasị n’ozi Alaeze ahụ laa, ọ ga-adị mma ma ị nọgide na-eche banyere eziokwu Bible ndị onye ahụ kwesịrị ịmụta. Ọ bụrụ na i detuo ihe ndị ị chọpụtara ka i zisịrị mmadụ ozi ọma, nke a ga-enyere gị aka ịnọgide na-enyere onye ahụ aka ịghọta eziokwu Bible. Mgbe ị na-agara ya nletaghachi, ọ dị gị mkpa ige ya ntị nke ọma ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị onye ahụ kweere, àgwà ya, ma ọ bụ ọnọdụ ọ nọ na ya.

13. Gịnị nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe mmadụ na-eche banyere Bible?

13 Olee otú i nwere ike isi gbaa ndị mmadụ ume ịgwa gị ihe ndị ha chere banyere Okwu Chineke? N’ebe ụfọdụ, ọ na-akpali mmasị ịjụ, sị, “Bible ọ̀ na-esiri gị ike nghọta?” Azịza nke ajụjụ ahụ na-ekpughekarị otú mmadụ si were Okwu Chineke. Otú ọzọ e nwere ike isi mee ya bụ ịgụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma jụọ onye ahụ, sị, “Olee ihe ị ghọtara n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a gụrụ?” Dị ka Jizọs, i nwere ike ịrụpụta ezi ihe n’ozi gị site n’ịjụ ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịkpachara anya.

Jizọs Ji Ajụjụ Mee Ihe nke Ọma

14. Olee otú i nwere ike isi gosi ndị mmadụ na i nwere mmasị n’echiche ha n’ajụghị ha oké ajụjụ?

14 Gosi mmasị n’echiche ndị ọzọ n’emenyeghị ha ihere. Gbasoo ụzọ Jizọs si mee nke ya. Ọ bụghị onye na-agba ndị mmadụ ajụjụ ọnụ n’echebaraghị ha echiche, ma ọ jụrụ ndị mmadụ ajụjụ ndị kpaliri ha iche echiche. Jizọs bụkwa onye na-eji obiọma ege ntị, bụ́ onye mere ka ndị nwere ezi obi nwee ume ọhụrụ ma mee ka ahụ́ ruo ha ala. (Matiu 11:28) Ụdị mmadụ nile nweere onwe ha iji mkpa ha bịakwute ya. (Mak 1:40; 5:35, 36; 10:13, 17, 46, 47) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ndị mmadụ nwere onwe ha ịgwa gị ihe ha chere banyere Bible na ihe ndị ọ na-akụzi, ị ghaghị izere ịjụwa ha oké ajụjụ.

15, 16. Olee otú i nwere ike isi kpalie ndị mmadụ ikwu ihe ndị metụtara okpukpe?

15 Tinyere ịjụ ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị, i nwere ike ịmalite mkparịta ụka site n’ikwu otu ihe ga-amasị mmadụ, mgbe ahụzi gee ntị n’ihe onye ahụ ga-ekwu. Dị ka ihe atụ, Jizọs gwara Nikọdimọs, sị: “Ọ gwụla ma à mụrụ mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.” (Jọn 3:3) Okwu ahụ kpaliri nnọọ mmasị Nikọdimọs nke na o jidelighị onwe ya ịghara ịzaghachi Jizọs ma gee ya ntị. (Jọn 3:4-20) I nwere ike isi otú ahụ kpalie ndị mmadụ ikwu okwu.

16 Taa, otú okpukpe ọhụrụ na-esi epu ka ero bụ okwu a kpụ n’ọnụ n’ebe ndị dị ka n’Africa, Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, nakwa na Latin America. N’ebe ndị dị otú ahụ, ọtụtụ mgbe i nwere ike ịmalite mkparịta ụka site n’ikwu, sị: “Ọ na-ewute m ịhụ otú okpukpe si jupụta ebe nile. Ma enwere m olileanya na n’oge na-adịghị anya ndị si ná mba nile ga-adị n’otu n’ezi ofufe. Nke ahụ ọ̀ ga-amasị gị?” Site n’ikwu ihe ga-atụ ndị mmadụ n’anya banyere olileanya gị, i nwere ike ime ka ha kwuo echiche ha. Ajụjụ na-adịkwu mfe ọzịza mgbe e nwere nanị ihe abụọ e nwere ike ịza na ya. (Matiu 17:25) Mgbe onye nwe ụlọ zara ajụjụ ị jụrụ ya, jiri otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ zaa ya n’onwe gị. (Aịsaịa 11:9; Zefanaịa 3:9) Site n’ige ntị nke ọma na ịhụwa ihe onye ahụ zara ama, ị ga-enwe ike ikpebi ihe gị na ya ga-atụle mgbe ọzọ ị bịara.

Jizọs Gere Ụmụaka Ntị

17. Olee ihe gosiri na Jizọs nwere mmasị n’ebe ụmụaka nọ?

17 Jizọs enweghị mmasị nanị n’ebe ndị toro eto nọ, o nwekwara mmasị n’ebe ụmụaka nọ. Ọ maara ụdị egwuregwu ụmụaka na-egwu na ihe ndị ha na-ekwu. Mgbe ụfọdụ, ọ na-agwa ụmụaka ka ha bịakwute ya. (Luk 7:31, 32; 18:15-17) Ọtụtụ ụmụaka so n’ìgwè ndị gere Jizọs ntị. Mgbe ụmụaka nwoke ji olu dara ụda too Mezaịa, Jizọs nụrụ ya ma gosi na Akwụkwọ Nsọ buru amụma banyere nke a. (Matiu 14:21; 15:38; 21:15, 16) Taa, ọtụtụ ụmụaka na-aghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi ya, olee otú i nwere ike isi nyere ha aka?

18, 19. Olee otú i nwere ike isi nyere nwa gị aka ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs?

18 Iji nyere nwa gị aka ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs, ị ghaghị ige ya ntị. I kwesịrị ịma echiche ya ndị o nwere ike ịbụ na ha ekwekọghị n’echiche Jehova. N’ihi ya, n’agbanyeghị ihe nwa gị kwuru, o kwesịrị ekwesị ka i buru ụzọ jaa ya mma. I nweziri ike iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị mee ka ọ ghọta otú Jehova si ele ihe anya.

19 Ịjụ ụmụaka ajụjụ bara uru. Ma, ụmụaka anaghị achọ ka a na-ajụ ha oké ajụjụ dịkwa ka ndị toro eto. Kama ibokwasị nwatakịrị ibu nke ịza ọtụtụ ajụjụ siri ike, gịnị ma i kwuo obere ihe banyere onwe gị. Dabere n’ihe unu na-ekwu, i nwere ike ikwu na o nwere otú i sibu ele otu ihe anya ma kọwaa ihe mere i jibu na-ele ihe ahụ anya otú ahụ. I nweziri ike ịjụ, sị, “Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si elekwa ya anya?” Ihe nwa gị zara nwere nnọọ ike iduga n’iji Akwụkwọ Nsọ kwurịta ihe ndị ga-enyere ya aka ma gbaa ya ume.

Nọgide Na-eṅomi Nnukwu Onye Na-eme Ndị Na-eso Ụzọ

20, 21. Olee ihe mere i kwesịrị iji bụrụ onye na-ege ntị nke ọma n’ọrụ gị dị ka onye na-eme ndị na-eso ụzọ?

20 Ma ọ̀ bụ nwa gị ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ka gị na ya na-ekwurịta okwu, ige ntị nke ọma dị gị nnọọ mkpa. N’ezie, ọ bụ ụzọ e si egosipụta ịhụnanya. Site n’ige ntị, ị na-egosipụta na ị dị umeala n’obi, nakwa na ị na-akwanyere onye nke na-ekwu okwu ùgwù ma jiri ịhụnanya na-echebara ya echiche. N’ezie ige ntị pụtara na ị ga-echebara ihe onye ahụ na-ekwu echiche.

21 Ka ị na-aga ozi Ndị Kraịst, nọgide na-ege ndị nwe ụlọ ntị nke ọma. Ọ bụrụ na i chebara ihe ha kwuru echiche nke ọma, o yiri ka ị̀ ga-aghọta eziokwu Bible ndị ga-akasị amasị ha. Mgbe ahụzi, gbalịa inyere ha aka site n’ịgbaso ụzọ dị iche iche Jizọs si zie ihe. Ka ị na-eme nke a, ị ga-enwe ọṅụ na afọ ojuju n’ihi na ị na-eso nzọụkwụ Nnukwu Onye Na-eme Ndị Na-eso Ụzọ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú Jizọs si gbaa ndị mmadụ ume ikwu echiche ha?

• Gịnị mere Jizọs ji gee ndị ọ kụziiri ihe ntị?

• Olee otú i nwere ike isi jụọ ajụjụ mgbe ị nọ n’ozi?

• Olee ihe i nwere ike ime iji nyere ụmụaka aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Mgbe ị na-ezi ozi ọma, hụ na ị na-ege ntị

[Foto dị na peeji nke 30]

Anyị na-eṅomi Jizọs mgbe anyị na-enyere ụmụaka aka ịghọ ndị na-eso ụzọ ya