“Biko Nabatanụ Obere Onyinye M”
“Biko Nabatanụ Obere Onyinye M”
Edere okwu ndị a n’otu akwụkwọ ozi alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Russia natara. E zitekọtara akwụkwọ ozi ahụ na otu igbe sọks e ji owu kpaa juru.
Ọ bụ Alla dị iri afọ isii na asaa, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nke na-eje ozi n’ọgbakọ dị n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Russia, zitere onyinye ahụ. Alla ejeworo Jehova ozi ruo ihe karịrị afọ iri, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Ma, na mberede, ọrịa strok kpọnwụrụ ọkara ahụ́ ya. Ma, ịhụnanya kpaliri Alla ime ihe yiri ihe nwanyị Onye Kraịst dịrị ndụ na narị afọ mbụ bụ́ Dọkas mere, bụ́ onye kwaara ndị kwere ekwe ibe ya ákwà.—Ọrụ 9:36, 39.
Alla dere n’akwụkwọ ozi ya, sị: “Enwekwaghị m ike iji ụkwụ m aga ije, ma m ka pụrụ iji aka m rụọ ọrụ. N’ihi ya, m na-eji akwụkwọ ozi ezi ozi ọma.” O kwukwara, sị: “Ekpebiri m na ugbu a m ka nwere ike iji aka m arụ ọrụ, na m ga-akpa sọks ole na ole e ji achụ oyi. M ga-achọ ka e nye ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị na-aga iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe ndị oyi na-atụ, dị ka n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nakwa na Siberia, sọks ndị a.”
Jizọs Kraịst kwuru banyere ezi ụmụazụ ya, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ụdị ịhụnanya ahụ Alla gosiri bụ ihe e ji amata ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs.