Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iberibe Ite Ájá Oge Ochie Akwado Ihe Ndị Dị na Bible

Iberibe Ite Ájá Oge Ochie Akwado Ihe Ndị Dị na Bible

Iberibe Ite Ájá Oge Ochie Akwado Ihe Ndị Dị na Bible

BIBLE bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. (2 Timoti 3:16) Ihe o kwuru banyere ndị mmadụ, ebe dị iche iche, na ọnọdụ okpukpe na nke ọchịchị n’oge ochie bụ eziokwu. Ọ bụtụghị ihe ochie ndị e gwutere n’ala na-eme ka anyị kweta na ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ ziri ezi, ọ bụ ezie na ihe ndị dị otú ahụ na-akwado ihe ndị Bible kwuru ma ọ bụ na-eme ka anyị ghọtakwuo ha.

Ihe ndị ọkà n’ihe ochie na-akasị achọta mgbe ha na-egwu ala n’ebe ndị mmadụ biri n’oge ochie bụ iberibe ite ájá. N’ọtụtụ ebe n’Izrel oge ochie na obodo ndị gbara ya gburugburu, gụnyere Ijipt na Mesopotemia, e ji iberibe ite ájá mere ihe e ji ede ihe n’ihi na ọ na-adị ọnụ ala. E ji iberibe ite ájá dekọọ nkwekọrịta, akụkọ, ihe ndị e rere ere, na ihe ndị ọzọ, dị nnọọ ka e si eji mpempe akwụkwọ edekọ ihe n’oge a. A na-ejikarị ink edetu ihe n’iberibe ite ájá, ihe ndị a na-edekwa na ya nwere ike ịbụ nanị otu mkpụrụ okwu, nweekwa ike ịbụ ọtụtụ ahịrịokwu ma ọ bụ ọtụtụ paragraf.

E gwupụtala ọtụtụ iberibe ite ájá e ji mee ihe n’oge Bible n’Izrel. Ụzọ iberibe ite ájá atọ a chọtara bụ́ ndị e ji mee ihe na narị afọ nke asaa na nke asatọ T.O.A. na-adọrọ nnọọ mmasị n’ihi otú ha si kwado akụkọ dị iche iche a kọrọ na Bible. Ha bụ iberibe ite ájá Sameria, iberibe ite ájá Erad, na iberibe ite ájá Lekish. Ka anyị tụlekwuo nke ọ bụla n’ụzọ iberibe ite ájá atọ ndị a.

Iberibe Ite Ájá Sameria

Sameria bụ isi obodo nke alaeze ebo iri dị n’ebe ugwu nke Izrel ruo mgbe ndị Asiria meriri obodo ahụ n’afọ 740 T.O.A. Ndị Eze nke Mbụ 16:23, 24 kwuru banyere mmalite nke Sameria, sị: “N’afọ nke [iri atọ na otu] nke Esa, bụ́ eze Juda [947 T.O.A.], ka Ọmri malitere ịbụ eze Izrel . . . Ọ zụrụ ugwu Sameria n’aka Shema na talent ọlaọcha abụọ; o wuo ụlọ n’ugwu ahụ, kpọọ aha obodo ahụ o wuru Sameria.” Obodo ahụ dị adị n’oge ndị Rom na-achị, bụ́ mgbe a gbanwere aha ya ịbụ Sebaste. O mesịrị kwụsị ịdị adị dị ka obodo na narị afọ nke isii O.A.

Mgbe a na-egwu ihe n’obodo Sameria oge ochie n’afọ 1910, otu ìgwè ndị na-amụ banyere ihe mgbe ochie hụrụ otu ikpo iberibe ite ájá, bụ́ ndị ha kwuru na e jiri ha mee ihe na narị afọ nke asatọ T.O.A. Ihe dị na ha bụ ihe ndekọ nke mmanụ na mmanya ndị e si n’obodo dị iche iche gbara Sameria gburugburu bute n’obodo ahụ. Mgbe akwụkwọ bụ́ Ancient Inscriptions—Voices From the Biblical World na-ekwu banyere ihe ahụ a chọtara, o kwuru, sị: “O kwesịrị nnọọ ekwesị na e weere iberibe ite ájá iri isii na atọ ahụ a chọtara n’afọ 1910 . . . dị ka otu n’ime ihe odide ndị kasị ochie a chọtara n’ala Izrel oge ochie. Ihe mere iberibe ite ájá Sameria a ji dị mkpa abụghị ihe ndị ha na-ekwu . . . kama ọ bụ ọtụtụ aha ndị mmadụ, aha ezinụlọ, na aha ebe dị iche iche n’Izrel dị na ha.” Olee otú aha ndị a si akwado ihe ndị a kọrọ na Bible?

Mgbe ndị Izrel meriri Ala Nkwa ahụ ma kee ya ebo ha nile, Sameria dị n’ókèala nke ebo Manase. Joshua 17:1-6 kwuru na ezinụlọ iri n’ebo Manase nwetara ala dị n’ebe a site n’aka nwa nwa Manase bụ́ Gilied. Ezinụlọ ndị a bụ nke Abieza, Hilek, Asriel, Shikem, na nke Shemida. Nwa ya nwoke nke isii, bụ́ Hifa, enweghị ụmụ ụmụ ndị nwoke kama o nwere ụmụ ụmụ ndị nwanyị ise—Mahla, Noa, Họgla, Milka, na Tiaza—onye nke ọ bụla n’ime ha nwetakwara ala.—Ọnụ Ọgụgụ 27:1-7.

Iberibe ite ájá Sameria nwere asaa n’ime aha ezinụlọ ndị a—ụmụ nwoke ise nile Gilied mụrụ na abụọ n’ime ụmụ ụmụ Hifa ndị nwanyị, bụ́ Họgla na Noa. Akwụkwọ bụ́ NIV Archaeological Study Bible kwuru, sị: “Aha ezinụlọ ndị dị n’Iberibe Ite Ájá Sameria mere ka e nwee ebe na-abụghị Bible nke gosiri na ezinụlọ dị iche iche nke ebo Manase biri n’ebe Bible kwuru na ha biri.” Ya mere, iberibe ite ájá ndị a kwadoro akụkụ a nke akụkọ Bible banyere otú ebo dị iche iche nke Izrel si malite.

O yikwara ka iberibe ite ájá Sameria ọ̀ kwadoro ihe Bible kọwara banyere ofufe ndị Izrel. N’oge e dere ihe ndị dị n’iberibe ite ájá Sameria, ndị Izrel gwakọtara ofufe ha na-efe Jehova na ofufe nke chi ndị Kenan a na-akpọ Bel. Amụma Hosea, bụ́kwa nke e dere na narị afọ nke asatọ T.O.A., kwuru banyere mgbe Izrel ga-echegharị ma kpọọ Jehova “Ishi [ma ọ bụ, Di M]” ọ bụkwaghị “Beli,” ma ọ bụ “Bel M.” (Hosea 2:16, 17) Aha ụfọdụ ndị a chọtara n’iberibe ite ájá Sameria pụtara “Bel bụ nna m,” “Bel na-abụ abụ,” “Bel dị ike,” “Bel na-echeta,” na ihe ndị ọzọ yiri ha. Mgbe ị ga-ahụla aha iri na otu nwere ụdị ụfọdụ nke aha ahụ bụ́ Jehova, ị ga-ahụ asaa metụtara “Bel.”

Iberibe Ite Ájá Erad

Erad bụ obodo oge ochie dị n’ebe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọzara bụ́ nke a na-akpọ Negeb, n’ebe ndịda Jeruselem. E gwupụtara ebe isii e wusiri ike n’Izrel n’Erad bụ́ ndị e ji mee ihe otu gasịa ibe ya esochie, malite n’oge ọchịchị Solomọn (1037-998 T.O.A.) ruo mgbe ndị Babilọn bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. Ihe ndị ahụ gwuru ihe n’Erad chọtara bụ iberibe ite ájá kasị ọtụtụ a chọtatụrụla banyere oge Bible. Ọ gụnyere narị ihe abụọ e ji asụsụ Hibru, Aramaic, na asụsụ ndị ọzọ dee ihe na ha.

Ụfọdụ n’ime iberibe ite ájá ndị ahụ a chọtara n’Erad kwadoro ihe Bible kwuru banyere ezinụlọ ndị nchụàjà. Dị ka ihe atụ, otu iberibe ite ájá kwuru banyere “ụmụ ndị ikom Kora,” bụ́ ndị a kpọtụrụ aha n’Ọpụpụ 6:24 na Ọnụ Ọgụgụ 26:11. Ihe ndị e dekwasịrị n’elu Abụ Ọma nke 42, 44-49, 84, 85, 87, na nke 88 kwuru hoo haa na ọ bụ “ụmụ Kora,” dere abụ ọma ndị a. Ezinụlọ ndị ọzọ nke ndị nchụàjà a kpọrọ aha n’iberibe ite ájá Erad bụ ndị nke Pashụa na Meremọt.—1 Ihe E Mere 9:12; Ezra 8:33.

Tụlee ihe atụ ọzọ. Ná mkpọmkpọ ebe nke ebe e wusiri ike, bụ́ nke e kwuru na e bibiri obere oge tupu ndị Babilọn ebibie Jeruselem, ndị na-egwu ihe chọtara otu iberibe ite ájá e dere ozi e zigaara otu ọchịagha nke ebe e wusiri ike. Akwụkwọ bụ́ The Context of Scripture kwuru na akụkụ ya ụfọdụ kwuru, sị: “Nye onyenwe m Elyashib. Ka Yahweh [Jehova] lekọta gị. . . . Banyere okwu ahụ i nyere m iwu banyere ya: ihe nile adịla mma ugbu a: ọ nọ n’ụlọ nsọ Yahweh.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na ụlọ nsọ a na-ekwu banyere ya ebe a bụ ụlọ nsọ dị na Jeruselem, bụ́ nke e wuru nke mbụ ya n’oge Solomọn.

Iberibe Ite Ájá Lekish

Obodo oge ochie e wusiri ike bụ́ Lekish dị kilomita iri anọ na atọ site na ndịda nke ebe ọdịda anyanwụ Jeruselem. Mgbe e gwuru ihe n’ebe ahụ n’afọ 1930, a chọtara otu ùkwù iberibe ite ájá, nakwa ya dịkarịa ala akwụkwọ ozi iri na abụọ a kọwara dị ka “ndị dị oké mkpa . . . n’ihi otú ha si nye aka n’ịghọtakwu ọnọdụ ọchịchị na ọgba aghara jupụtara ebe nile ka Juda na-akwadebe maka mwakpo ahụ o dorola anya na [Eze] Nebukadneza [nke Babilọn] ga-awakpo obodo ahụ.”

Akwụkwọ ozi ndị kasị mkpa n’ime ha bụ akwụkwọ ozi ndị Yaosh, onye nwere ike ịbụ ọchịagha Lekish, na onye ọ ka n’ọkwá derịtara. Okwu ndị e ji dee akwụkwọ ozi ndị ahụ yiri ndị nke onye amụma bụ́ Jeremaịa, bụ́ onye dịrị ndụ n’otu oge ahụ, jiri dee ihe. Tụlee otú akwụkwọ ozi ndị a si kwado ihe Bible kọwara banyere oge ahụ dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke ndị Juu.

Na Jeremaịa 34:7, onye amụma ahụ kọwara oge “mgbe usuu ndị agha nke eze Babilọn na-ebuso Jeruselem, na-ebusokwa obodo Juda nile fọdụrụ, agha, bụ́ Lekish na Azeka; n’ihi na nanị ndị a fọdụrụ n’ime obodo nile nke Juda, bụ́ obodo e wusiri ike.” O yiri ka onye dere otu n’ime Akwụkwọ Ozi Lekish ndị ahụ ọ̀ na-akọwa otu ihe ahụ. O dere, sị: “Anyị na-eche ịhụ [ọkụ] mgbaàmà nke Lekish . . . , n’ihi na anyị enweghị ike ịhụ Azeqah.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na nke a na-egosi na ndị Babilọn emeriela Azeqah, ma ọ bụ Azeka, nakwa na obodo ọzọ ha na-aga imeri bụ Lekish. Otu ihe na-adọrọ mmasị n’ihe odide a bụ na o kwuru banyere “ọkụ mgbaàmà.” Jeremaịa 6:1 kwukwara na e ji ụdị ihe mgbaàmà ahụ mee ihe.

E kweere na Akwụkwọ Ozi Lekish ọzọ na-akwado ihe ndị amụma bụ́ Jeremaịa na Ezikiel kwuru banyere mbọ eze Juda gbara inweta enyemaka site n’Ijipt mgbe ọ na-enupụrụ Babilọn isi. (Jeremaịa 37:5-8; 46:25, 26; Ezikiel 17:15-17) Akwụkwọ Ozi Lekish ahụ kwuru, sị: “Ugbu a ohu gị enwetala ihe ọmụma ndị na-esonụ: Ọchịagha Konyahu nwa Elnetan agaala n’ebe ndịda iji banye Ijipt.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-akọwa na nke a na-egosi mbọ a gbara inweta enyemaka site n’Ijipt.

Iberibe ite ájá Lekish kpọkwara ọtụtụ aha ndị dị n’akwụkwọ Jeremaịa. Ha bụ Neraịa, Jeazanaịa, Gemaraịa, Elnetan, na Hoshaịa. (Jeremaịa 32:12; 35:3; 36:10, 12; 42:1) A machaghị ma aha ndị a hà na-ekwu banyere otu ndị ahụ dị n’akwụkwọ Jeremaịa. Ma, ebe ọ bụ na Jeremaịa dịrị ndụ n’oge ahụ, ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị ịhụ na otu aha ndị ahụ dị n’ụzọ ebe abụọ ahụ.

Ihe Jikọrọ Ha Nile

Iberibe ite ájá Sameria, Erad, na nke Lekish kwadoro ọtụtụ ihe dị na Bible. Ihe ndị a gụnyere aha ezinụlọ dị iche iche, aha ebe dị iche iche, na ihe ndị metụtara ọnọdụ okpukpe na nke ọchịchị n’oge ahụ. Ma, ọ dị otu ihe dị mkpa ụzọ iberibe ite ájá atọ ahụ nwechara.

Akwụkwọ ozi ndị ahụ a chọtara n’Erad na Lekish nwechara okwu ndị dị ka “Ka Jehova jụọ ajụjụ maka udo gị.” N’asaa n’ime ozi ndị ahụ a chọtara na Lekish, a kpọrọ aha Chineke ugboro iri na otu. Ọzọkwa, ọtụtụ aha Hibru ndị a hụrụ n’ụzọ iberibe ite ájá atọ ndị ahụ nwere ndebiri nke aha ahụ bụ́ Jehova. N’ihi ya, iberibe ite ájá ndị a gosiri na ndị Izrel ji aha Chineke mee ihe kwa ụbọchị n’oge ahụ.

[Foto dị na peeji nke 13]

Otu iberibe ite ájá a hụrụ ná mkpọmkpọ ebe nke Erad bu ozi e degaara otu nwoke aha ya bụ Elyashib

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto © Ebe Ndebe Ihe Ochie Izrel, Jeruselem; site n’ikike a natara Ndị Na-ahụ Maka Ihe Ochie n’Izrel

[Foto dị na peeji nke 14]

Akwụkwọ Ozi Lekish bú aha Chineke

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto e sere n’ihi ikike a natara Ebe Ndebe Ihe Ochie Britain