Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Luk Onye Ndị Ọrụ Ibe Ya Hụrụ n’Anya

Luk Onye Ndị Ọrụ Ibe Ya Hụrụ n’Anya

Luk Onye Ndị Ọrụ Ibe Ya Hụrụ n’Anya

IHE anyị na-abịa ịkọ ugbu a mere n’afọ 65 O.A. Ebe ọ nọ mee bụ Rom. Luk maara ihe ize ndụ dị na ya ime ka a mara na ya bụ enyi Pọl onyeozi, bụ́ onye a na-ekpe ikpe mgbe ahụ n’ihi okwukwe ya. O yiri ka à ga-ama Pọl ikpe ọnwụ. Ma n’oge ahụ ihe siri ike, ọ bụ Luk—nanị Luk—nọnyeere onyeozi ahụ.—2 Timoti 4:6, 11.

Ndị na-agụ Bible maara aha ahụ bụ́ Luk nke ọma n’ihi na Oziọma o dere bu aha ya. Luk so Pọl, bụ́ onye kpọrọ ya “dibịa a hụrụ n’anya” na ‘onye ọrụ ibe ya,’ mee ọtụtụ ogologo njem. (Ndị Kọlọsi 4:14; Faịlimọn 24) Akwụkwọ Nsọ akọọrọghị anyị ọtụtụ ihe banyere Luk, ebe ọ bụ na ọ kpọrọ ya aha nanị ugboro atọ. Ma, ka ị na-atụle ihe a chọpụtarala banyere Luk, o yiri ka ị̀ ga-amalite ịkwanyere Onye Kraịst a kwesịrị ntụkwasị obi ùgwù otú Pọl si kwanyere ya.

Onye Edemede na Onye Ozi Ala Ọzọ

Ọ bụ Tiofilọs ka e degaara Oziọma Luk na akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, bụ́ nke na-egosi na ọ bụ Luk dere akwụkwọ abụọ a sitere n’ike mmụọ nsọ. (Luk 1:3; Ọrụ 1:1) Luk ekwughị na ya ji anya ya hụ mgbe Jizọs Kraịst jere ozi. Kama nke ahụ, Luk kwuru na ya jụtara ndị ji anya ha hụ ihe merenụ ma ‘site ná mmalite tụleghachi ihe nile n’ụzọ ziri ezi.’ (Luk 1:1-3) N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na Luk ghọrọ onye na-eso ụzọ Kraịst mgbe Pentikọst afọ 33 O.A., gasịrị.

Ụfọdụ ndị na-eche na Luk bụ onye Antiọk nke dị na Siria. Ha chọpụtara na akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kọruru akụkọ ndị mere n’obodo ahụ ala nakwa na ọ kọwara otu n’ime “ndị ikom asaa a gbaara ezi àmà” dị ka “onye Antiọk a tọghatara atọghata,” ma ghara ikwu aha obodo nke ndị ikom isii ndị nke ọzọ. N’ezie, anyị enweghị ike ikwu kpọmkwem na nke a na-egosi na Luk nwere mmasị pụrụ iche n’Antiọk n’ihi na ọ bụ obodo ya.—Ọrụ 6:3-6.

Ọ bụ ezie na a kpọghị Luk aha n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, amaokwu ụfọdụ ji nnọchiaha bụ́ “anyị” mee ihe, bụ́ nke na-egosi na o so mee ihe ụfọdụ a kọrọ banyere ha n’akwụkwọ ahụ. Mgbe Luk na-akọ ụzọ Pọl na ndị ya na ha so si gafee n’Eshia Maịnọ, o kwuru, sị: “Ha gafeere Mishia gbadata Troas.” Ọ bụ na Troas ka Pọl nọ hụ ọhụụ nke nwoke Masedonia ahụ na-arịọ ya arịrịọ, sị: “Gafeta na Masedonia nyere anyị aka.” Luk kwuziri, sị: “Ma ozugbo ọ hụworo ọhụụ ahụ, anyị gbalịrị ịbanye Masedonia.” (Ọrụ 16:8-10) Nkwụsị ahụ ọ kwụsịrị iji “ha” eme ihe ma jiwezie “anyị” nwere ike ịpụta na Luk sonyeere Pọl na ndị ya na ha so na Troas. Mgbe Luk na-ekwuzi banyere ọrụ nkwusa a rụrụ na Filipaị, ọ nọ na-eji nnọchiaha bụ́ “anyị” na-eme ihe, bụ́ nke gosiri na ya onwe ya so rụọ ọrụ nkwusa n’ebe ahụ. O dere, sị: “N’ụbọchị izu ike, anyị gakwara n’azụ ọnụ ụzọ ámá dị n’akụkụ osimiri, bụ́ ebe anyị chere na e nwere ebe a na-ekpe ekpere; anyị wee nọdụ ala ma malite ịgwa ndị inyom gbakọworonụ okwu.” N’ihi ya, Lidia na ezinụlọ ya dum nabatara ozi ọma ahụ, e meekwa ha baptizim.—Ọrụ 16:11-15.

Ha zutere mmegide na Filipaị, bụ́ ebe Pọl gwọrọ nwa agbọghọ bụ́ odibo nke “mmụọ ọjọọ nke a na-ajụta ase” mere ka ọ na-akọ ọdịnihu. Mgbe ndị nwe ya hụrụ na ụzọ ha si enweta ego echiela, ha jidere Pọl na Saịlas, kụọ ha ihe ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Ọ dị ka e jideghị Luk, n’ihi na o ji nnọchiaha bụ́ “ha” mee ihe mgbe ọ na-akọ banyere ihe Pọl ha gabigara. Mgbe a tọhapụrụ Pọl na Saịlas, “ha gbara [ụmụnna] ume wee pụọ.” Luk maliteghachiri ịgụnye onwe ya n’akụkọ ahụ mgbe Pọl lọghachiri na Filipaị ka oge ụfọdụ gasịrị. (Ọrụ 16:16-40; 20:5, 6) O nwere ike ịbụ na Luk nọgidere na Filipaị iji lekọta ọrụ ahụ n’ebe ahụ.

Otú O Si Nweta Ihe Ndị O Dere

Olee otú Luk si nweta ihe ndị o dere n’Oziọma ya nakwa n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi? Ebe ndị Luk gụnyere onwe ya n’akụkọ ndị dị n’Ọrụ Ndịozi na-egosi na o so Pọl si Filipaị gaa Jeruselem, bụ́ ebe e jidere onyeozi ahụ ọzọ. N’ụzọ, Pọl na ndị ha na ya so nọrọ na nke Filip onye na-ezisa ozi ọma na Sesaria. (Ọrụ 20:6; 21:1-17) O nwere ike ịbụ na Luk jụtara Filip ihe ndị o dere banyere otú ozi ọma si malite na Sameria, ebe ọ bụ na ọ bụ Filip duziri ọrụ ahụ n’ebe ahụ. (Ọrụ 8:4-25) Ma olee ndị ọzọ Luk jụtara ihe o dere?

O yiri ka afọ abụọ ahụ Pọl ji nọọ mkpọrọ na Sesaria ò nyere Luk ohere zuru ezu inyocha ihe ndị ọ chọrọ ideba n’Oziọma ya. Sesaria adịghị anya na Jeruselem, bụ́ ebe o nwere ike inweta ihe ndekọ usoro ọmụmụ Jizọs. Ọ dị ọtụtụ ihe ndị Luk dere n’Oziọma ya banyere ndụ Jizọs ndị ọ na-adịghị onye ọzọ dere banyere ha. Otu ọkà mmụta chọpụtara ihe iri asatọ na abụọ dị otú ahụ a na-ahụghị ebe ọzọ.

O nwere ike ịbụ na Luk nụrụ ihe ndị banyere ọmụmụ Jọn n’ọnụ Elizabet, nne Jọn Onye Na-eme Baptizim. O nwere ike ịbụ na ọ nụrụ ihe ndị banyere ọmụmụ Jizọs na ihe ndị mere mgbe ọ dị obere n’ọnụ nne Jizọs, bụ́ Meri. (Luk 1:5–2:52) O nwere ike ịbụ Pita, Jems, ma ọ bụ Jọn gwara Luk banyere azụ ahụ ha gbutere n’ụzọ ọrụ ebube. (Luk 5:4-10) Ọ bụ nanị n’Oziọma Luk ka anyị gụrụ banyere ilu ụfọdụ Jizọs tụrụ, dị ka nke onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi, ọnụ ụzọ ahụ dị warara, mkpụrụ ego drakma ahụ furu efu, nwa mmefu, na nke ọgaranya ahụ na Lazarọs.—Luk 10:29-37; 13:23, 24; 15:8-32; 16:19-31.

Luk nwere nnọọ mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. O dere banyere àjà Meri chụrụ iji mee ka ọ dị ọcha, mkpọlite n’ọnwụ nke nwa nwoke nke nwanyị di ya nwụrụ, na otú otu nwanyị si tee ụkwụ Jizọs mmanụ. Luk kwuru banyere ụmụ nwanyị jeere Kraịst ozi ma gwa anyị na Mata na Meri kpọrọ Ya oriri n’ụlọ ha. Oziọma Luk kwuru banyere ọgwụgwọ a gwọrọ otu nwanyị huuru ehuru na otu nwoke na-arịa ọrịa ahụ́ mmiri na otú e si mee ndị ekpenta iri ka ha dị ọcha. Luk gwara anyị banyere onye mkpụmkpụ bụ́ Zakịọs, bụ́ onye rigooro n’elu osisi iji hụ Jizọs, o kwukwara banyere nchegharị nke otu onye ajọ omume a kpọgburu n’akụkụ Kraịst.—Luk 2:24; 7:11-17, 36-50; 8:2, 3; 10:38-42; 13:10-17; 14:1-6; 17:11-19; 19:1-10; 23:39-43.

Ọ na-adọrọ mmasị ịhụ na Oziọma Luk kwuru banyere otú onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi Jizọs kwuru banyere ya n’ilu ya si kechie ọnyá. O doro anya na Luk ji anya dibịa dekọọ otú Jizọs kọwara e si lekọta nwoke ahụ, bụ́ nke gụnyere iji mmanya emere ọgwụ nje, ite ọnyá mmanụ iji mee ka ọ ghara ịza aza, na iji ihe kechie ya.—Luk 10:30-37.

Onye Nọnyeere Onye Mkpọrọ

Luk metaara Pọl onyeozi ebere. Mgbe e ji Pọl eji na Sesaria, onye ọchịchị Rom bụ́ Filiks nyere iwu ka ‘a ghara ịmachibido onye ọ bụla n’ime ndị nke Pọl ilekọta ya.’ (Ọrụ 24:23) O yiri ka Luk ò so ná ndị ahụ jeere ya ozi. Ebe ọ bụ na ọ bụghị mgbe nile ka ahụ́ na-adị Pọl, o nwere ike ịbụ na otu n’ime ozi ndị “dibịa [ahụ] a hụrụ n’anya” jere bụ ilekọta ya.—Ndị Kọlọsi 4:14; Ndị Galeshia 4:13.

Mgbe Pọl rịọrọ ka Siza kpegharịa ikpe ya, onye ọchịchị Rom bụ́ Festọs zigara onyeozi ahụ Rom. Luk nọnyeere nnọọ onye mkpọrọ ahụ n’ogologo njem o ji ụgbọ mmiri mee gaa Ịtali ma dekọọ akụkọ doro anya nke otú ụgbọ ha si kpuo. (Ọrụ 24:27; 25:9-12; 27:1, 9-44) Mgbe e ji Pọl eji n’ụlọ ya na Rom, Pọl dere ọtụtụ akwụkwọ ozi site n’ike mmụọ nsọ, o kwukwara banyere Luk n’abụọ n’ime ha. (Ọrụ 28:30; Ndị Kọlọsi 4:14; Faịlimọn 24) O nwere ike ịbụ n’afọ abụọ a ka Luk dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi.

Ọ ghaghị ịbụ na ọtụtụ ndị na-abịa n’ebe Pọl bi na Rom n’ihi ihe ndị metụtara ofufe Chineke. Luk ga na-ahụ ndị ọzọ ha na Pọl rụkọrọ ọrụ n’ebe ahụ—Tikikọs, Arịstakọs, Mak, Jọstọs, Epafras, na Onesịmọs, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.—Ndị Kọlọsi 4:7-14.

N’oge a tụrụ Pọl mkpọrọ nke ugboro abụọ, bụ́ mgbe o chere na ọnwụ ya adịla nso, Luk bụ́ onye na-ekwesị ntụkwasị obi na onye nwere obi ike nọ n’akụkụ ya mgbe mmadụ nile hapụrụ onyeozi ahụ. O nwere ike ịbụ na ọnụnọ Luk nọ ebe ahụ nwere ike ime ka a tụkwuo ya onwe ya mkpọrọ. O nwere ike ịbụ Luk nyeere Pọl aka detuo okwu ndị bụ́: “Nanị Luk ka mụ na ya nọ.” Akụkọ mgbe ochie kwuru na e gbupụrụ Pọl isi obere oge ka nke ahụ gasịrị.—2 Timoti 4:6-8, 11, 16.

Luk bụ onye na-achụ onwe ya n’àjà na onye dị umeala n’obi. O jighị agụmakwụkwọ ya tuo ọnụ ma ọ bụ mewe ka a hụ ya. Ee, a sị na ọ chọrọ, ọ gaara etinye oge ya nile n’ọrụ ya dị ka dibịa, ma ọ họọrọ ịrụ ọrụ iji kwado Alaeze ahụ. Dị ka Luk, ka anyị jiri achọghị ọdịmma onwe anyị nanị kwusaa ozi ọma ahụ ma jiri ịdị umeala n’obi jee ozi iji too Jehova.—Luk 12:31.

[Igbe dị na peeji nke 19]

ÒNYE BỤ TIOFILỌS?

Ọ bụ Tiofilọs ka Luk degaara ma Oziọma ya ma akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. N’Oziọma Luk, a kpọrọ nwoke a “Tiofilọs onye ukwu.” (Luk 1:3) “Onye ukwu” bụ utu aha a na-enye ndị a ma ama bara ọgaranya na ndị nọ n’ọkwá dị elu n’ọchịchị ndị Rom. Pọl onyeozi kpọrọ Festọs, bụ́ onye Rom na-achị Judia, aha dị otú ahụ.—Ọrụ 26:25.

Ọ ga-abụ nnọọ na Tiofilọs anụla ozi banyere Jizọs ma nwee mmasị na ya. Luk nwere olileanya na Oziọma ya ga-enyere Tiofilọs aka ‘ịmara n’ụzọ zuru ezu ịbụ eziokwu nke ihe ndị a kụziwooro ya n’ọnụ.”—Luk 1:4.

Ọkà mmụta bụ́ onye Gris, bụ́ Richard Lenski, kwuru na o yighị ka Tiofilọs ọ̀ bụ onye kwere ekwe mgbe Luk kpọrọ ya “onye ukwu,” n’ihi na “n’akwụkwọ nile nke Ndị Kraịst, . . . ọ dịghị nwanna Onye Kraịst e turu etutu ndị ụwa dị otú ahụ.” Mgbe Luk mesịrị dee akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, o jighị utu aha ahụ bụ́ “onye ukwu” mee ihe, kama nke ahụ, ọ kpọrọ ya nanị: “Tiofilọs.” (Ọrụ 1:1) Lenski kwubiri, sị: “Mgbe Luk degaara Tiofilọs Oziọma ya, nwoke a a ma ama aghọbeghị Onye Kraịst ma o nwere nnọọ mmasị n’ihe banyere Ndị Kraịst; ma mgbe Luk zigaara Tiofilọs akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, ọ ghọọla onye kwere ekwe.”