Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Na-enye Gị Afọ Ojuju ná Ndụ?

Olee Ihe Na-enye Gị Afọ Ojuju ná Ndụ?

Olee Ihe Na-enye Gị Afọ Ojuju ná Ndụ?

KENNY na-arụ ọrụ ná nnukwu ụlọ ọrụ na-agba mgbere ụlọ na ihe ndị ọzọ, ọ na-agba oké ụgbọala, nweekwa ọmarịcha ụlọ elu n’ebe ndị oké ozu bi n’obodo ukwu. Ebe ọ bụ ọkà n’isi n’ụgbọelu awụpụ, ọ na-atọ ya ụtọ isi n’ụgbọelu nọ ọtụtụ kilomita wụpụ. Ihe ndị ahụ hà nyere ya afọ ojuju ná ndụ? Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal, kwuru na ọ sịrị: “Leenụ m, adị m iri afọ anọ na ise ugbu a, ma ọ dịghị olileanya m nwere maka ọdịnihu . . . Ndụ m enweghị isi.”

Elyn rụsiri ọrụ ike iji ghọọ onye a ma ama n’ịgba ọsọ na snow. O mechara ghọọ onye a ma ama n’egwuregwu ahụ. Aha Elyn na-ewu ewu otú ọ chọrọ. Ọ kwara arịrị, sị: “Oleekwanụ obi ụtọ nile ahụ m tụrụ anya inweta? Ezigbo owu na-ama m. M ga-emecha kaa nká, n’agbanyeghịkwa na m bara ọgaranya, ndụ m ga-atọgbọ chakoo ma ọ bụrụ na ọ bụ nanị ihe a ka m rụzuru ná ndụ.”

Hideo bụ́ onye a ma ama maka ise ihe ndị mara mma tinyere ndụ ya nile n’ise ihe. Ọ naghị ere ihe ndị o sere ere; o chere na ime otú ahụ ga-eme ka e leda ya anya dị ka ọkà n’ise ihe. Ná ngwụsị nke ndụ ya, mgbe ọ gbasịrị iri afọ itoolu na asatọ, o nyere ụlọ ndebe ihe ochie ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị o sere n’onyinye. O tinyere ndụ ya nile n’ise ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, o nweghị afọ ojuju, n’ihi na o chere na ọ dịghị mgbe ya ga-eru ebe ya chọrọ iru n’ise ihe.

Ụfọdụ ndị na-etinye oge buru nnọọ ibu n’inyere ndị ọzọ aka. Dị ka ihe atụ, tụlee ọnọdụ otu onye isi nke otu ụlọ ọrụ na-emepụta ihe nkiri na Hollywood. Ebe ọ bụ osote onyeisi oche nke otu n’ime ụlọ ọrụ a kasị mara amara n’imepụta ihe nkiri na United States, ya na ndị a ma ama na-eme egwuregwu kpara, o bikwa n’ebe ndị oké ozu bi. Mgbe ọ gara ezumike na Cambodia, otu nwata nwanyị bịakwutere ya ma rịọ ya ego ka ọ na-eri nri n’otu ụlọ oriri na nkwari dị na Phnom Penh. O nyere ya otu dọla na otu karama mmanya ọtọ bịrịbịrị. Obi tọrọ nwata nwanyị ahụ ụtọ. N’agbanyeghị nke ahụ, nwata nwanyị ahụ bịaghachiri ebe ahụ n’abalị echi ya, na-arịọkwa arịrịọ. Osote onyeisi oche ahụ chọpụtara na obere enyemaka ahụ ya nyeere nwata nwanyị ahụ ezughị.

Otu afọ ka e mesịrị, nwoke a a ma ama kpebiri ịgbanwe ọrụ—kwụsị ịrụrụ ụlọ ọrụ na-eme ihe nkiri ọrụ ma malite inyere ndị ogbenye nọ na Cambodia aka. O hiwere otu ụlọ akwụkwọ na-enye ndị ogbenye ụlọ, ihe oriri, ma na-akụziri ha ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mgbe obi na-ezu ya ike—o nwere obi ụtọ na afọ ojuju n’ihi ihe ndị ọ na-arụzu ma na-enwe nkụda mmụọ na ahụ́ mgbakasị n’ihi otú mkpa ndị ọ ga-egbo si na-arị ibe ha elu.

Mmadụ anọ ahụ a kpọrọ aha n’elu chere na ha maara ihe ndị ha chọrọ inweta ná ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ha enwetaghị afọ ojuju mgbe ha nwetara ihe ndị ha rụsiri ọrụ ike inweta. Olee ihe ị na-etinye oge gị na ya? Olee ihe ị na-ebute ụzọ ná ndụ gị? Ì ji n’aka na ị gaghị emecha kwaa mmakwaara n’ihi otú i si na-ebi ndụ gị ugbu a?