Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Zụlite Àgwà Ndị Nwere Ike Inyere Gị Aka Ime Ndị Na-eso Ụzọ

Zụlite Àgwà Ndị Nwere Ike Inyere Gị Aka Ime Ndị Na-eso Ụzọ

Zụlite Àgwà Ndị Nwere Ike Inyere Gị Aka Ime Ndị Na-eso Ụzọ

“Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—MATIU 28:19.

1. Olee nkà na àgwà ndị dị ụfọdụ ndị ohu Chineke mkpa n’oge ochie?

MGBE ụfọdụ, ndị ohu Jehova aghaghị ịzụlite nkà na àgwà ndị ga-enyere ha aka ime uche ya. Dị ka ihe atụ, Ebreham na Sera rubeere Chineke isi mgbe ọ gwara ha ka ha si n’ala Ọọ bara ọgaranya pụọ, o mesịkwara dị ha mkpa ịzụlite nkà na àgwà ndị a chọrọ iji bie n’ụlọ ntú. (Ndị Hibru 11:8, 9, 15) Ka Jọshụa wee nwee ike iduru ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, ọ ghaghị inwe obi ike, tụkwasị Jehova obi ma mụta Iwu ya. (Joshua 1:7-9) O dokwara anya na mmụọ Chineke meziwanyere nkà ọ bụla Bezalel na Ọhọliab nwerela enwe ka ndị ikom ahụ wee nwee nnọọ ike iso lekọta owuwu nke ụlọikwuu ahụ na ọrụ ndị ọzọ metụtara ya.—Ọpụpụ 31:1-11.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle banyere ọrụ ime ndị na-eso ụzọ?

2 Ka ọtụtụ narị afọ gasịrị, Jizọs Kraịst nyere ụmụazụ ya ọrụ a: “Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ọ dịtụbeghị mgbe e nyerela ndị mmadụ ihe ùgwù nke ịrụ ọrụ yiri nke a. Olee àgwà ndị dị mkpa n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ? Olee otú anyị pụrụ isi zụlite àgwà ndị dị otú ahụ?

Gosipụta Ịhụnanya Miri Emi Maka Chineke

3. Iwu e nyere anyị ime ndị na-eso ụzọ na-enye anyị ohere ime gịnị?

3 Ịgwa ndị mmadụ okwu na ịgbalị ime ka ha kweta ife ezi Chineke ahụ chọrọ ka anyị nwee ịhụnanya miri emi maka Jehova. Ụmụ Izrel pụrụ igosi na ha hụrụ Chineke n’anya site n’iji obi ha nile na-erubere iwu ndị o nyere ha isi, ịchụ àjà ndị Jehova na-anabata, na site n’iji abụ eto ya. (Deuterọnọmi 10:12, 13; 30:19, 20; Abụ Ọma 21:13; 96:1, 2; 138:5) Dị ka ndị na-eme ndị na-eso ụzọ, anyị na-edebekwa iwu Chineke, ma anyị na-egosipụtakwa na anyị hụrụ Jehova n’anya site n’ịgwa ndị ọzọ banyere ya na nzube ya. Ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekwu okwu dị ka ndị ihe ha na-ekwu doro anya, na-eji okwu ndị kwesịrị ekwesị na-akọwa nnọọ otú olileanya Chineke nyere anyị dị anyị n’obi.—1 Ndị Tesalonaịka 1:5; 1 Pita 3:15.

4. Gịnị mere o ji masị Jizọs ịkụziri ndị mmadụ banyere Jehova?

4 N’ihi ịhụnanya miri emi Jizọs nwere n’ebe Jehova nọ, ọ masịrị ya nke ukwuu ịgwa ndị ọzọ banyere nzube Chineke, Alaeze ahụ, na ezi ofufe. (Luk 8:1; Jọn 4:23, 24, 31) Ee, Jizọs kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m nakwa ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Okwu ndị a onye ọbụ abụ kwuru metụtara Jizọs: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu Gị dịkwa n’ime obi m. Ezisawo m ozi ọma nke ezi omume n’ime mkpọkọta Gị bara ụba; lee, adịghị m egbochi egbugbere ọnụ m abụọ, Jehova, Gị onwe gị amawo.”—Abụ Ọma 40:8, 9; Ndị Hibru 10:7-10.

5, 6. Olee àgwà bụ́ isi dị ndị na-eme ndị na-eso ụzọ mkpa?

5 Ịhụnanya maka Chineke na-akpali ndị mụtara eziokwu Bible ọhụrụ mgbe ụfọdụ ịgwa nnọọ ndị ọzọ ihe ndị ha kwenyesiri ike na ha banyere Jehova na Alaeze ya nke na ha na-enwe nnọọ ihe ịga nke ọma n’ime ka ndị ọzọ kweta ịmụ Akwụkwọ Nsọ. (Jọn 1:41) Ịhụnanya anyị nwere maka Chineke bụ isi ihe na-akpali anyị ịrụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. N’ihi ya, ka anyị nọgide na-ahụ Chineke n’anya site n’ịgụ na ịtụgharị uche mgbe nile n’Okwu ya.—1 Timoti 4:6, 15; Mkpughe 2:4.

6 O doro anya na ịhụnanya Jizọs Kraịst nwere maka Jehova nyeere ya aka ịbụ onye nkụzi na-anụ ọkụ n’obi. Ma nke ahụ abụghị nanị ihe mere o ji rụpụta ezigbo ihe dị ka onye nkwusa Alaeze. Ya bụrụ otú ahụ, olee àgwà ọzọ mere Jizọs ji bụrụ onye na-eme ndị na-eso ụzọ nke nwere ihe ịga nke ọma?

Na-egosi Ịhụnanya na Nchegbu Maka Ndị Mmadụ

7, 8. Olee otú Jizọs si were ụmụ mmadụ?

7 Jizọs chebaara ndị mmadụ echiche ma gosi na o nwere mmasị dị ukwuu n’ebe ha nọ. Ọbụna mgbe ọ ka nọ n’eluigwe dị ka “onye ọkà” nke Chineke, ihe banyere ụmụ mmadụ tọrọ ya ụtọ. (Ilu 8:30, 31) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa dị ka mmadụ, ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma mee ka ndị bịakwutere ya nwee ume ọhụrụ. (Matiu 11:28-30) Jizọs gosipụtara ịhụnanya na ọmịiko Jehova, nke a dọtakwara ndị mmadụ ife nanị ezi Chineke ahụ. Ụdị mmadụ dị iche iche gere Jizọs ntị, n’ihi na o ji ịhụnanya chebara ha na ọnọdụ ha echiche.—Luk 7:36-50; 18:15-17; 19:1-10.

8 Mgbe otu nwoke jụrụ Jizọs ihe ya kwesịrị ime iji keta ndụ ebighị, “Jizọs legidere ya anya ma nwee ịhụnanya n’ebe ọ nọ.” (Mak 10:17-21) Anyị na-agụ banyere ụfọdụ ndị Jizọs ziri ihe na Betani, sị: “Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwanyị na Lazarọs n’anya.” (Jọn 11:1, 5) Jizọs chebaara ndị mmadụ echiche nke ukwuu nke na ọ hapụrụ izu ike dị ya mkpa iji kụziere ha ihe. (Mak 6:30-34) Nchegbu miri emi na ịhụnanya dị otú ahụ Jizọs nwere maka ụmụ mmadụ ibe ya mere ka o nwee ihe ịga nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ n’ime ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ezi ofufe.

9. Olee àgwà Pọl nwere dị ka onye na-eme ndị na-eso ụzọ?

9 Pọl onyeozi nwekwara mmasị dị ukwuu n’ebe ndị o ziri ozi ọma nọ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ndị ghọrọ Ndị Kraịst na Tesalonaịka, sị: “N’inwe mmetụta dị nro maka unu, ọ masịrị anyị inye unu, ọ bụghị nanị ozi ọma Chineke, kamakwa mkpụrụ obi anyị onwe anyị, n’ihi na unu ghọrọ ndị anyị hụrụ n’anya.” N’ihi otú Pọl si jiri ịhụnanya mee mgbalị, ụfọdụ ndị Tesalonaịka ‘hapụrụ arụsị ha iji bụrụ ohu Chineke dị ndụ.’ (1 Ndị Tesalonaịka 1:9; 2:8) Ọ bụrụ na anyị nwere nnọọ mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ, dị ka Jizọs na Pọl nwere, anyị pụkwara inweta ọṅụ nke ịhụ ka ozi ọma ahụ ruru n’obi nke ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 13:48.

Nwee Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà

10, 11. Gịnị mere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ji dị mkpa mgbe anyị na-agbalị ime ndị na-eso ụzọ?

10 Ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ime ndị na-eso ụzọ na-enwe mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Ha adịtụghị ewere inwe akụnụba dị ka ihe kasị mkpa ná ndụ. N’ezie, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lee otú ọ ga-esi siere ndị nwere ego ike ịba n’alaeze Chineke!” Nke ahụ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya, ma Jizọs kwukwara, sị: “Ụmụntakịrị, lee otú o si bụrụ ihe siri ike ịba n’alaeze Chineke! Ọ dịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa onye bara ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.” (Mak 10:23-25) Jizọs nyere ụmụazụ ya ndụmọdụ ka ha bie ndụ dị mfe ka ha wee nwee ike itinye uche ha n’ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 6:22-24, 33) Gịnị mere mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà na-eji enyere anyị aka ime ndị na-eso ụzọ?

11 Ịkụzi ihe nile Jizọs nyere n’iwu chọrọ mgbalị dị ukwuu. Onye na-eme ndị na-eso ụzọ na-agbalịkarị nnọọ ịmụrụ onye nwere mmasị Bible kwa izu. Iji mụbaa ohere ha nwere ịchọta ndị obi ha ziri ezi, ụfọdụ ndị nkwusa Alaeze agbanweela ọrụ ha site n’ịrụ ọrụ oge nile gaa n’ịrụ nke nwa oge. Ọtụtụ puku Ndị Kraịst amụọla asụsụ ọzọ iji nwee ike izi ndị agbụrụ ụfọdụ bi n’ógbè ha ozi ọma. Ndị ọzọ na-eme ndị na-eso ụzọ ahapụwo ụlọ ha ma kwaga n’ógbè ọzọ ma ọ bụ ná mba ọzọ iji rụchikwuo ọrụ owuwe ihe ubi ahụ anya. (Matiu 9:37, 38) Ihe a nile chọrọ inwe mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ime ndị na-eso ụzọ.

Nwee Ndidi Ma Ghara Igbu Oge

12, 13. Gịnị mere ndidi ji dị nnọọ mkpa n’ime ndị na-eso ụzọ?

12 Ndidi bụ àgwà ọzọ na-enyere anyị aka ime ndị na-eso ụzọ. Ozi anyị na-eje dị ka Ndị Kraịst kwesịrị ka e jee ya ngwa ngwa, ma ime ndị na-eso ụzọ na-ewe nnọọ oge ma chọọ ndidi. (1 Ndị Kọrint 7:29) Jizọs nwere ndidi n’ebe onye otu nne ji ya na ya bụ́ Jems nọ. Ọ bụ ezie na o yiri ka Jems ọ̀ maara ọtụtụ ihe banyere ozi Jizọs, ma, o nwere ihe gbochiri ya ịghọ onye na-eso ụzọ ruo oge ụfọdụ. (Jọn 7:5) Otú ọ dị, o doro anya na Jems ghọrọ onye na-eso ụzọ n’ime mkpirikpi oge dị n’agbata ọnwụ Kraịst na Pentikọst afọ 33 O.A., n’ihi na Akwụkwọ Nsọ kwuru na o so ná ndị gbakọtaranụ maka ikpe ekpere, bụ́ ndị gụnyere nne ya, ụmụnne ya ndị nwoke, na ndịozi. (Ọrụ 1:13, 14) Jems nwere nnọọ ọganihu dị ka onye na-eso ụzọ, mechaa nwee ọtụtụ ihe ùgwù n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—Ọrụ 15:13; 1 Ndị Kọrint 15:7.

13 Dị ka ndị ọrụ ugbo, ọtụtụ mgbe Ndị Kraịst na-akụ ihe ndị na-eto nwayọọ nwayọo—ịghọta Okwu Chineke, ịhụ Jehova n’anya, na ịzụlite mmụọ yiri nke Kraịst. Nke a na-achọ ndidi. Jems dere, sị: “Ụmụnna m, nweenụ ndidi ruo n’ọnụnọ nke Onyenwe anyị. Lee! Onye ọrụ ubi na-anọgide na-echere mkpụrụ dị oké ọnụ ahịa nke ala, na-enwere ya ndidi ruo mgbe o nwetara mmiri ozuzo mbụ na ụla mmiri ozuzo. Unu onwe unu kwa, nweenụ ndidi; meenụ ka obi sie unu ike, n’ihi na ọnụnọ nke Onyenwe anyị abịaruwo nso.” (Jems 5:7, 8) Jems na-agba ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha ‘nwee ndidi ruo n’ọnụnọ nke Onyenwe anyị.’ Ọ bụrụ na e nwee ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aghọtaghị, ọ na-eji ndidi akọwara ha ihe ndị ahụ ma ọ bụ jiri ihe atụ kọwaa ha. (Matiu 13:10-23; Luk 19:11; 21:7; Ọrụ 1:6-8) Ugbu a anyị nọ n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị, e nwekwara mkpa yiri nke ahụ maka inwe ndidi ka anyị na-agbalị ime ndị na-eso ụzọ. Ọ dị mkpa ka e jiri ndidi zie ndị ghọrọ ụmụazụ Jizọs n’oge anyị ihe.—Jọn 14:9.

14. Ọ bụ ezie na anyị na-enwe ndidi, olee otú anyị nwere ike isi jiri oge anyị mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka ndị na-eme ndị na-eso ụzọ?

14 N’agbanyeghị na anyị na-enwe ndidi, okwu ahụ anaghị amị mkpụrụ n’ime ihe ka ọtụtụ ná ndị anyị malitere ịmụrụ Bible. (Matiu 13:18-23) N’ihi ya, mgbe anyị merela mgbalị kwesịrị ekwesị iji nyere ndị dị otú ahụ aka, ọ ga-adị mma ka anyị kwụsị ịdị na-egbu oge n’ebe ha nọ ma chọọ ndị o yiri ka hà ga-aka eji eziokwu Bible kpọrọ ihe. (Eklisiastis 3:1, 6) N’eziokwu, ọ pụkwara ịdị mkpa ka e nyere ọbụna ndị nwere mmasị aka ruo ọtụtụ oge iji mee ka ha gbanwee otú ha si ele ihe anya, àgwà ha, na ihe ndị ha weere dị ka ihe kasị mkpa ná ndụ. N’ihi ya, anyị na-enwe ndidi dị ka Jizọs nwere n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ bụ́ ndị o siiri ike ịzụlite àgwà kwesịrị ekwesị.—Mak 9:33-37; 10:35-45.

Zụlite Nkà Izi Ihe

15, 16. Gịnị mere ime ka ihe anyị na-ezi dị mfe na ịkwadebe nke ọma ji dị mkpa mgbe anyị na-eme ndị na-eso ụzọ?

15 Ịhụnanya maka Chineke, ichebara ndị mmadụ echiche, mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà, na inwe ndidi bụ ihe ndị dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ime ndị na-eso ụzọ. Anyị kwesịkwara ịzụlite nkà izi ihe, n’ihi na ọ na-eme ka anyị kọwaa ihe n’ụzọ doro anya ma dị mfe. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ihe Onye Ozizi Ukwu, bụ́ Jizọs Kraịst, kwuru rụpụtara nnọọ ihe dị mma n’ihi na ha dị mfe nghọta. Ikekwe i chetara ihe ndị Jizọs kwuru dị ka ndị a: “Na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe.” “Unu enyela nkịta ihe dị nsọ.” “A na-anwapụta na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” “Kwụghachinụ Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 6:20; 7:6; 11:19; 22:21) Ma nke ahụ apụtaghị na ọ bụ nanị okwu ndị dị mkpirikpi ka Jizọs kwuru. O ziri ihe n’ụzọ doro anya ma kọwaa ihe mgbe ọ dị mkpa ka e mee otú ahụ. Olee otú ị pụrụ isi ṅomie ụzọ Jizọs si zie ihe?

16 Ịkwadebe nke ọma bụ isi ihe na-eme ka ihe anyị na-ezi dị mfe ma doo anya. Onye nkwusa na-akwadebeghị nke ọma na-ekwukarị oké okwu. O nwere ike iji oké okwu kpuchie isi ihe ndị kwesịrị ịpụta ìhè, na-ekwu ihe nile ọ maara banyere isiokwu ahụ. N’aka nke ọzọ, onye nkwusa kwadebere nke ọma na-echebara onye ọ na-ezi ihe echiche, na-atụgharị uche n’isiokwu ahụ, ma na-akọwa nanị ihe ndị dị mkpa. (Ilu 15:28; 1 Ndị Kọrint 2:1, 2) Ọ na-eburu n’uche ihe onye ahụ ọ na-amụrụ ihe mabu ama na ihe ndị o kwesịrị ime ka ha pụta ìhè mgbe ha na-amụ ihe. Onye ozi ahụ nwere ike ịma ọtụtụ ihe na-adọrọ mmasị banyere isiokwu ahụ, ma ime ka ihe doo anya pụtara ịghara ikwu ihe ndị na-adịghị mkpa.

17. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị mmadụ aka ichebara ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ echiche?

17 Jizọs nyekwaara ndị mmadụ aka iche echiche, kama nanị ịkọwara ha ihe nile n’onwe ya. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka i chere, Saịmọn? Ọ̀ bụ n’aka ole ndị ka ndị eze nke ụwa na-anata ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ isi? N’aka ụmụ ha ka ọ̀ bụ n’aka ndị bịara abịa?” (Matiu 17:25) O nwere ike ịdị na-atọ anyị nnọọ ụtọ ịkọwa Bible nke na anyị aghaghị inwe njide onwe onye iji nye onye ahụ anyị na-amụrụ ihe ohere ikwu ihe dị ya n’obi ma ọ bụ iji kọwaa ihe mgbe anyị na-amụrụ mmadụ Bible n’ụlọ ya. N’ikwu eziokwu, anyị ekwesịghị ịjụgbu ndị mmadụ n’ajụjụ. Kama nke ahụ, site n’anyị iji akọ, ihe atụ ndị dị mma, na ajụjụ ezi uche dị na ya, anyị nwere ike inyere ha aka ịghọta isi ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị a kọwara n’akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible.

18. Gịnị ka ịzụlite “nkà izi ihe” na-agụnye?

18 Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere “nkà izi ihe.” (2 Timoti 4:2; Taịtọs 1:9) Nkà izi ihe dị otú ahụ gụnyere ihe karịrị inyere mmadụ aka iburu ihe n’isi. Anyị kwesịrị ịgbalị inyere onye anyị na-amụrụ Bible aka ịghọta ọdịiche dị n’etiti eziokwu na ụgha, ihe ọma na ihe ọjọọ, amamihe na nzuzu. Ka anyị na-eme nke a ma na-agbalị ịzụlite ịhụnanya maka Jehova n’obi onye ahụ, ọ ga-abịa ghọta ihe mere o kwesịrị iji na-erubere Ya isi.

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-arụ Ọrụ Ime Ndị Na-eso Ụzọ

19. Olee otú Ndị Kraịst nile na-esi eso eme ndị na-eso ụzọ?

19 Ọgbakọ Ndị Kraịst bụ nzukọ na-eme ndị na-eso ụzọ. Mgbe onye ọhụrụ ghọrọ onye na-eso ụzọ, Onyeàmà Jehova ahụ chọtara ya ma nyere ya aka ịmụta ihe Bible na-akụzi abụghị nanị onye ga-aṅụrị ọṅụ. Mgbe ndị mmadụ gbakọtara ọnụ ịchọ nwa furu efu, o nwere ike ịbụ nanị otu onye n’ime ha ga-achọta nwatakịrị ahụ. Ma mgbe a chọtara nwa ahụ, onye ọ bụla tinyere aka n’ịchọ nwa ahụ ga-aṅụrị ọṅụ. (Luk 15:6, 7) N’otu aka ahụ, ime ndị na-eso ụzọ bụ mgbalị a na-agbakọ aka eme. Ndị Kraịst nile na-eso achọ ndị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe onye ọhụrụ malitekwara ịbịa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, Onye Kraịst ọ bụla bịara ọmụmụ ihe na-eso ewulite mmasị ya n’ezi ofufe. (1 Ndị Kọrint 14:24, 25) N’ihi ya, Ndị Kraịst nile kwesịrị ịṅụrị ọṅụ na a na-eme ka ọtụtụ narị puku mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ kwa afọ.

20. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Bible?

20 Ọ ga-atọ ọtụtụ Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi ụtọ izi mmadụ ihe banyere Jehova na ezi ofufe. Otú ọ dị, n’agbanyeghị mgbalị nile ha na-eme, o nwere ike ịbụ na ha enwebeghị ike ime otú ahụ. Ọ bụrụ na i so ná ndị dị otú ahụ, nọgide na-eme ka ịhụnanya i nwere maka Jehova sie ike, na-eche banyere ndị mmadụ, na-achụ onwe gị n’àjà, nwee ndidi ma na-emeziwanye nkà izi ihe gị. Nke kasị nke, kpee ekpere maka ọchịchọ i nwere izi ndị ọzọ eziokwu ahụ. (Eklisiastis 11:1) Kara obi ebe ị maara na ihe nile ị na-eme n’ozi Jehova na-atụnye ụtụ n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nke na-ewetara Chineke otuto.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị mere ime ndị na-eso ụzọ na-eji etinye ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ n’ule?

• Olee àgwà ndị na-eme ndị na-eso ụzọ kwesịrị inwe?

• Gịnị ka “nkà izi ihe” gụnyere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndị Kraịst na-egosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ site n’ime ndị na-eso ụzọ

[Foto dị na peeji nke 23]

Olee ihe mere ndị na-eme ndị na-eso ụzọ na-aghaghị iji nwee mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ?

[Foto dị na peeji nke 24]

Olee àgwà ụfọdụ ndị na-eme ndị na-eso kwesịrị inwe?

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị Kraịst nile na-enwe mmasị ịhụ ihe ọma ndị na-esi n’ime ndị na-eso ụzọ apụta