Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-akwado Ọbụbụeze Jehova?

Ị̀ Na-akwado Ọbụbụeze Jehova?

Ị̀ Na-akwado Ọbụbụeze Jehova?

“Sịnụ n’etiti mba nile, Jehova bụ eze.”—ABỤ ỌMA 96:10.

1, 2. (a) Olee ihe dị mkpa mere n’ihe dị ka n’October 29 O.A.? (b) Olee otú nke ahụ ga-esi emetụta ndụ Jizọs?

N’IHE dị ka October 29 O.A, otu ihe dị mkpa bụ́ nke a na-ahụtụbeghị mbụ n’ụwa, mere. Matiu bụ́ onye dere otu n’ime ozi ọma anọ ahụ kọrọ, sị: “Mgbe e mesịrị ya baptizim, Jizọs siri na mmiri ahụ pụta ozugbo; ma, lee! eluigwe meghere, [Jọn Onye Na-eme Baptizim] wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru na-abịakwasị [Jizọs]. Lee! E nwekwara olu sitere n’eluigwe nke sịrị: ‘Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.’” Nke a bụ otu n’ime ihe ole na ole mere ná ndụ Jizọs bụ́ nke Matiu, Mak, Luk na Jọn kọchara banyere ya.—Matiu 3:16, 17; Mak 1:9-11; Luk 3:21, 22; Jọn 1:32-34.

2 Mmụọ nsọ ahụ a hụrụ a wụsara Jizọs gosiri na ọ bụ Onye E Tere Mmanụ, nke pụtara Mezaịa ma ọ bụ Kraịst. (Jọn 1:33) “Mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa e mechaala pụta! Ọ bụ ya guzo n’akụkụ Jọn Onye Na-eme Baptizim, ọ bụkwa ya ka Setan gaje ịzọpịa n’ikiri ụkwụ, ọ gajekwa ịzọpịa Setan bụ́ onye iro Jehova na onye iro nke ọchịchị Ya n’isi. (Jenesis 3:15) Site mgbe ahụ gaa n’ihu, Jizọs maara nke ọma na ya ga-agbalịsi ike imezu nzube Jehova banyere ọchịchị Ya na Alaeze ahụ.

3. Olee otú Jizọs si kwadebe onwe ya maka ọrụ ọ ga-arụ iji gosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị?

3 Iji kwadebe maka ọrụ a chere ya ihu, “Jizọs, n’ịbụ onye jupụtara na mmụọ nsọ, si na Jọdan pụọ, mmụọ nsọ wee na-edugharị ya n’ala ịkpa.” (Luk 4:1; Mak 1:12) Jizọs nọrọ n’ebe ahụ ruo ụbọchị iri anọ, na-eche banyere aka Setan mara Jehova, na-echekwa ihe ọ ga-eme iji gosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. Okwu ahụ gbasara ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi—ma n’eluigwe ma n’ụwa. N’ihi ya anyị kwesịrị inyocha otú Jizọs si kwadosie ọchịchị Jehova ike ma hụ ihe anyị ga-eme iji gosi na anyị chọkwara igosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị.—Job 1:6-12; 2:2-6.

Ihe Iseokwu Banyere Onye Kwesịrị Ịchị Apụta Nnọọ Ìhè

4. Olee ihe Setan mere bụ́ nke mere ka a mata na e nwere esemokwu dịnụ banyere onye kwesịrị ịchị?

4 N’ezie, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a anyị ka kwupụrụ okwu ha Setan na-amaghị. N’egbughị oge ọ bụla, o busoro onye bụ́ isi ná “mkpụrụ” nke “nwanyị” Chineke agha. (Jenesis 3:15) Setan nwara Jizọs ugboro atọ, na nke ọ bụla, ọ gwara Jizọs ka o mee ihe yiri ka ọ ga-abara onwe ya uru kama ime ihe Nna ya chọrọ ka o mee. Ọnwụnwa nke atọ mere ka o doo anya na e nwere okwu na-aganụ banyere onye kwesịrị ịchị. Mgbe Setan gosichara Jizọs “alaeze nile nke ụwa na ebube ha,” ọ sọghị anya gwa Jizọs, sị: “Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala kpọọ isi ala nye m.” Ebe Jizọs maara n’ezie na ọ bụ Ekwensu na-achị “alaeze nile nke ụwa,” o gosiri ebe ọ kwụ n’okwu banyere onye kwesịrị ịchị site n’ịgwa Setan, sị: “Pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’”—Matiu 4:8-10.

5. Olee ọrụ tara akpụ Jizọs ga-arụ?

5 Otú Jizọs si bie ndụ mere ka o doo nnọọ anya na ihe kasị mkpa nye ya bụ ịkwado ọchịchị Jehova. Jizọs maara nke ọma na iji gosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị, na ya ga-eruberịrị Jehova isi ruo mgbe Setan ga-egbu ya—bụ́ nke e kwuru n’ụzọ amụma na ọ bụ ichifịa “mkpụrụ” nwanyị ahụ n’ikiri ụkwụ. (Matiu 16:21; 17:12) Ọ ga-emekwa ka a mata eziokwu ahụ bụ́ na Alaeze Chineke ka Jehova ga-eji merie onye nnupụisi ahụ bụ́ Setan ma mee ka ihe nile o kere eke nweghachi udo, meekwa ka ihe na-aga nke ọma. (Matiu 6:9, 10) Olee ihe Jizọs mere iji rụzuo ọrụ a tara akpụ?

‘Alaeze Chineke Eruwo Nso’

6. Olee otú Jizọs si mee ka a mata na ọ bụ Alaeze ahụ ka Chineke ga-eji “tipịasịa ọrụ Ekwensu”?

6 Iji malite ozi ya, “Jizọs banyere n’ime Galili, na-ekwusa ozi ọma Chineke, na-asịkwa: ‘Oge ahụ a kara aka ezuwo, alaeze Chineke eruwokwa nso.’” (Mak 1:14, 15) O kwudịrị, sị: ‘Aghaghịkwa m ịkpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.’ (Luk 4:18-21, 43) Jizọs gazuru obodo ahụ nile, “na-ekwusa ma na-akpọsa oziọma banyere alaeze Chineke.” (Luk 8:1) Jizọs rụkwara ọtụtụ ọrụ dị ike—o nyere ìgwè mmadụ nri, kụjụọ ebili mmiri, gwọọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. Jizọs jiri ọrụ ebube ndị a ọ rụrụ gosi na Chineke nwere ikike ịkwụsị ihe nile nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden mebiri, ya na ahụhụ ndị ọ kpatara, ma si otú a “tipịasịa ọrụ Ekwensu.”—1 Jọn 3:8.

7. Olee ihe Jizọs gwara ụmụazụ ya ka ha mee, oleekwa ihe si na ya pụta?

7 Iji hụ na e kwusara ozi ọma nke Alaeze ahụ nke ọma, Jizọs nwetara ụmụazụ na-ekwesị ntụkwasị obi ma zụọ ha n’ọrụ ahụ. O buru ụzọ kenye ndị ozi iri na abụọ ya ọrụ ma “ziga ha ikwusa alaeze Chineke.” (Luk 9:1, 2) O zipụziri iri mmadụ asaa ndị ọzọ ịga kwusaa, sị: “Alaeze Chineke abịaruwo unu nso.” (Luk 10:1, 8, 9) Mgbe ndị a na-eso ụzọ Jizọs lọtara ma kọọrọ ya ihe ịga nke ọma ha nwere n’ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ, o kwuru, sị: “Amalitewo m ịhụ Setan ka ọ dawororị ada dị ka àmụ̀mà site n’eluigwe.”—Luk 10:17, 18.

8. Gịnị ka ụzọ Jizọs si bie ndụ mere nnọọ ka ọ pụta ìhè?

8 Jizọs jiri obi ya nile gbaa àmà maka Alaeze ahụ, o jikwa ohere ọ bụla dapụtaranụ mee nke a. Ọ rụrụ ọrụ mgbe nile ma n’ehihie ma n’abalị, ọ chọwaghịdị inweta ihe ndị ga-eme ka ndụ tọkwuo ya ụtọ. O kwuru, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọgbà, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla ịtọgbọ isi ya.” (Luk 9:58; Mak 6:31; Jọn 4:31-34) Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o kwuru hoo haa n’ihu Pọntiọs Paịlet, sị: “Ọ bụkwa n’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Ụzọ Jizọs si bie ndụ gosiri na ihe mere o ji bịa n’ụwa abụghị nanị iji ghọọ onye ozizi ukwu ma ọ bụ onye na-arụ ọrụ ebube ma ọ bụkwanụ Onye Nzọpụta na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị, kama ọ bụ iji mee uche Jehova na iji mee ka a mata na ọ bụ Alaeze ahụ ka Chineke ga-eji mezuo uche ya.—Jọn 14:6.

“E Mechawo Ya!”

9. Olee otú Setan si mechaa chifịa “mkpụrụ” nwanyị nke Chineke n’ikiri ụkwụ?

9 Ihe nile Jizọs mere banyere Alaeze ahụ adịghị Onye Mmegide ahụ bụ́ Setan bụ́ Ekwensu obi mma. Ọ nwara ike ya nile iji “mkpụrụ” ya nọ n’ụwa, bụ́ nke gụnyere ma ọchịchị ma okpukpe, gbuo “mkpụrụ” nke nwanyị Chineke. Malite mgbe a mụrụ Jizọs ruokwa mgbe ọ nwụrụ, Setan na ndị na-akwado ya chọrọ ohere ọ bụla ha ga-eji gbuo ya. N’ikpeazụ, n’oge opupu ihe ubi nke afọ 33 O.A., oge zuru ka e nyefee Nwa nke mmadụ n’aka Onye Mmegide ahụ ka o chifịa ya n’ikiri ụkwụ. (Matiu 20:18, 19; Luk 18:31-33) Ihe Matiu, Mak, Luk na Jọn kọrọ gosiri nnọọ otú Setan si kpalie ndị mmadụ—malite na Judas Iskarịọt ruo ná ndị isi nchụàjà, ndị odeakwụkwọ, ndị Farisii na ndị Rom—ịma Jizọs ikpe ọnwụ ma mee ka ọ nwụọ ọnwụ ụfụ n’elu osisi ịta ahụhụ.—Ọrụ 2:22, 23.

10. Olee ihe kacha mkpa Jizọs ji ọnwụ ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ rụzuo?

10 Gịnị na-agbata gị n’uche ma i cheta otú Jizọs si na-anụ ụfụ ọnwụ ya n’elu osisi ịta ahụhụ? Ikekwe ọ bụ àjà mgbapụta Jizọs, bụ́ nke o ji obi ya dum chụọ n’ihi ụmụ mmadụ na-emehie emehie. (Matiu 20:28; Jọn 15:13) Ịhụnanya a na-enweghị atụ Jehova gosiri nwere ike iri gị ọnụ. (Jọn 3:16) Ikekwe ọ dị gị otú ọ dị onyeisi agha ahụ bụ́ onye ihe ọ hụrụ mere ka o kwuo, sị: “N’ezie onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Matiu 27:54) N’ezie, ọ dịghị njọ ma mmadụ cheta ihe ndị a. Ma cheta na okwu ikpeazụ Jizọs kwuru n’elu osisi ịta ahụhụ bụ: “E mechawo ya!” (Jọn 19:30) Gịnị ka e mechara? Ọ bụ ezie na Jizọs jiri ndụ ya na ọnwụ ya rụzuo ọtụtụ ihe, ma ihe bụ́ isi mere o ji bịa n’ụwa ọ́ bụghị iji dozie esemokwu ahụ metụtara ma ọ̀ bụ Jehova kwesịrị ịchị? Ọ̀ bụ na é bughị n’amụma na ebe ọ bụ ya bụ “mkpụrụ” ahụ, ọ ga-ezute ule kpụ ọkụ n’ọnụ n’aka Setan iji wee nwee ike iwepụ aha Jehova n’ụta? (Aịsaịa 53:3-7) Ihe ndị a bụ ọrụ tara nnọọ akpụ, ma Jizọs rụzuchara ha. Ihe a ọ rụzuru dị mkpa n’ezie!

11. Gịnị ka Jizọs ga-eme iji mezuo amụma ahụ e buru n’Iden n’ụzọ zuru ezu?

11 N’ihi otú Jizọs si kwesị ntụkwasị obi ma kwadosie Alaeze Chineke ike, a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ bụghị dị ka mmadụ, kama dị ka “mmụọ na-enye ndụ.” (1 Ndị Kọrint 15:45; 1 Pita 3:18) Nkwa Jehova kwere Ọkpara ya a kpọlitere n’ọnwụ bụ́: “Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe M ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị dịrị ụkwụ gị abụọ.” (Abụ Ọma 110:1) “Ndị iro” Jizọs gụnyere onye nnupụisi mbụ ahụ bụ́ Setan, na ndị nile so ná “mkpụrụ” ya. Ebe Jizọs Kraịst bụ Eze nke Alaeze Mezaịa Jehova, ọ ga-ebute ụzọ n’ibibi ndị nile nupụrụ isi n’eluigwe na n’ụwa. (Mkpughe 12:7-9; 19:11-16; 20:1-3, 10) Ọ bụ mgbe ahụ ka amụma ahụ e buru na Jenesis 3:15 ga-emezu n’ụzọ zuru ezu, tinyekwara ekpere ahụ Jizọs kụziiri ụmụazụ ya, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:10; Ndị Filipaị 2:8-11.

Ihe Nlereanya Anyị Ga-agbaso

12, 13. (a) Olee otú ndị mmadụ si egosi na ha na-anabata ozi ọma nke Alaeze ahụ taa? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iso nzọụkwụ Kraịst?

12 Taa, a na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ọtụtụ mba, dị nnọọ ka Jizọs buru n’amụma na a ga-eme. (Matiu 24:14) Nke a emeela ka ọtụtụ nde mmadụ rara ndụ ha nye Chineke. Ngọzi ndị Alaeze ahụ ga-eweta na-eme ha nnọọ obi ụtọ. Ha na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa e mere ka ọ bụrụ paradaịs bụ́ ebe ha ga-ebi n’udo n’enweghị ihe ọ bụla ga-eyi ha egwu, ha ejirikwa obi ụtọ na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị a ha na-atụ anya ya. (Abụ ọma 37:11; 2 Pita 3:13) Ị̀ bụ otu n’ime ndị nkwusa Alaeze a? Ya bụrụ na ị bụ, jisie nnọọ ike. Ma ọ dị ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-echebarịrị echiche.

13 Pita onyeozi dere, sị: “Kraịst taara unu ahụhụ, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee gbasochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) Ghọtakwa na ihe Pita kwuru okwu ya n’ebe a abụghị otú Jizọs si jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ma ọ bụ otú o si jiri nká zie ihe, kama ọ bụ ahụhụ ọ tara. Ebe Pita ji anya ya hụ ihe nile merenụ, ọ maara nke ọma oké Jizọs dịruru njikere ịta ahụhụ ka o wee nwee ike ịkwado ọchịchị Jehova ma gosi na Setan bụ onye ụgha. Oleezi ụzọ ndị anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs? Anyị ga-ajụ onwe anyị, sị: ‘Olee oké m dịruru njikere ịta ahụhụ iji kwado ọchịchị Jehova ma doo ya nsọ? Otú m si ebi ndụ na otú m si eje ozi m ọ̀ na-egosi na ịkwado ọchịchị Jehova bụ ihe kasị mkpa ná ndụ m?’—Ndị Kọlọsi 3:17.

14, 15. (a) Gịnị ka Jizọs mere mgbe a tụụrụ ya aro na-ezighị ezi na mgbe a chọrọ ichi ya eze, gịnịkwa mere o ji mee otú ahụ? (b) Olee ihe iseokwu na-ekwesịghị ịpụ anyị apụ n’uche? (Gụnyekọta ihe e kwuru n’igbe bụ́ “Kwụrụ n’Akụkụ Jehova.”)

14 Kwa ụbọchị, anyị na-enweta ọtụtụ ọnwụnwa, na-enwekwa ọtụtụ mkpebi ndị anyị ga-eme. Olee ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ihe anyị ga-eme? Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị ga-eme ma a nwaa anyị ịkpa àgwà na-ekwesịghịrị Onye Kraịst? Mgbe Pita gwara Jizọs ka o meere onwe ya ebere, gịnị ka Jizọs mere? Jizọs gwara ya, sị: “Gaa n’azụ m, Setan! Ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.” (Matiu 16:21-23) Gịnịkwanụ ma anyị nwee ohere ịkpatakwu ego ma ọ bụ ịgụkwu akwụkwọ bụ́ nke nwere ike ime ka anyị gharazie ịdị na-enwe ohere ije ozi ọma ma ọ bụ mee ka anyị na Jehova gharazie ịdị ná mma, ànyị na-eme dị ka Jizọs? Mgbe Jizọs chọpụtara na ndị hụrụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ “na-achọ ịbịa jichie ya iji chie ya eze,” o siri n’etiti ha pụọ ozugbo.—Jọn 6:15.

15 Gịnị mere Jizọs ji jụwapụ isi ịnabata ihe ndị a nakwa ihe ndị ọzọ? Ọ bụ n’ihi na ọ ghọtara na ihe ka mkpa abụghị ichebe onwe ya ma ọ bụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya kama ọ bụ ime ihe na-atọ nna ya ụtọ. Ọ chọrọ ime uche Nna ya ma kwado ọchịchị Jehova n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara ya. (Matiu 26:50-54) Ya mere, ọ bụrụ na anyị adịghị eburu ihe iseokwu banyere onye kwesịrị ịchị n’uche mgbe nile dị ka Jizọs mere, anyị nwere ike kwụsị ịkwado ọchịchị Chineke ma ọ bụ kwụsị ịdị na-eme ihe ziri ezi. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ gaghịzi ara ahụ́ Setan anwụde anyị, onye bụ́ aka ochie n’ime ka ihe na-adịghị mma yie ihe dị mma, dị ka o mere mgbe ọ na-anwa Iv.—2 Ndị Kọrint 11:14; 1 Timoti 2:14.

16. Mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka, gịnị karịsịa ka anyị kwesịrị ime ka ha ghọta?

16 Mgbe anyị nọ n’ozi ọma, anyị na ndị mmadụ na-ekwurịta nsogbu ndị ha na-enwe, anyị na-agbalịsikwa ike gosi ha ihe Bible kwuru banyere nsogbu ndị ahụ. Nke a bụ ụzọ kasị mma isi mee ka ha nwee mmasị n’ịmụ Bible. Ma, ihe bụ́ isi anyị chọrọ ime abụghị nanị inyere ndị mmadụ aka ịma ihe Bible na-ekwu ma ọ bụ ngọzi ndị Alaeze Chineke ga-eweta. Anyị kwesịrị nnọọ inyere ha aka ịghọta esemokwu ahụ dịnụ banyere onye kwesịrị ịchị. Hà dị njikere ịghọ ezi Ndị Kraịst ma bulie “osisi ịta ahụhụ” ha ma taa ahụhụ n’ihi Alaeze ahụ? (Mak 8:34) Hà dị njikere isonyere ndị na-akwado ọchịchị Chineke ma si otú a gosi na Setan bụ onye ụgha na onye nkwutọ? (Ilu 27:11) Ọ bụụrụ anyị nnọọ ihe ùgwù inyere onwe anyị na ndị ọzọ aka ịkwado ọchịchị Jehova.—1 Timoti 4:16.

Mgbe Chineke Ghọrọ “Ihe Nile n’Ebe Onye Ọ Bụla Nọ”

17, 18. Olee oge magburu onwe ya anyị ga-atụ anya ya ma ọ bụrụ na anyị egosi na anyị na-akwado ọchịchị Jehova?

17 Ka anyị na-eme ike anyị nile ugbu a iji gosi na anyị na-akwado ọchịchị Jehova site n’àgwà anyị na otú anyị si ekwusa ozi ọma ahụ, anyị pụrụ ịtụ anya ịhụ mgbe Jizọs Kraịst “ga-enyefe alaeze ahụ n’aka Chineke na Nna ya.” Olee mgbe ọ ga-abụ? Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mgbe o meworo ka ọchịchị nile na ikike na ike nile ghara ịdị irè. N’ihi na ọ ghaghị ịchị dị ka eze ruo mgbe Chineke debeworo ndị iro nile n’okpuru ụkwụ ya. . . . Mgbe ahụ Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe nile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—1 Ndị Kọrint 15:24, 25, 28.

18 Ọ ga-amagbu nnọọ onwe ya mgbe Chineke ghọrọ “ihe nile n’ebe onye ọ bụla nọ”! Tupu nke a, Alaeze ahụ emezuchaalarị ihe mere e ji hiwe ya. E bibisịakwala ndị nile na-emegide ọchịchị Jehova. E meekwala ka udo na ịdị n’otu dị n’ụwa nile. Mgbe ahụ, ihe nile e kere eke ga-ekwu ihe a ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Nyenụ Jehova nsọpụrụ aha ya . . . Sịnụ n’etiti mba nile, Jehova bụ eze.”—Abụ Ọma 96:8, 10.

Ị̀ Ga-azali Ajụjụ Ndị A?

• Olee otú Jizọs si gosi na o weere ihe iseokwu ahụ e nwere banyere ọchịchị Chineke dị ka ihe dị oké mkpa ná ndụ ya?

• Olee ihe kasị mkpa Jizọs jiri ozi ya na ọnwụ ya rụzuo?

• Olee ụzọ ndị anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’igosi na anyị na-akwado ọchịchị Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 29]

KWỤRỤ N’AKỤKỤ JEHOVA

Dị nnọọ ka ọtụtụ ụmụnna nọ na Korea na n’ebe ndị ọzọ maara, ihe ga-enyere Ndị Kraịst aka idi ọnwụnwa mgbe ọ bụla ọ bịaara anyị bụ ịmara kpọmkwem ihe mere ọnwụnwa ndị dị otú ahụ ji abịara anyị.

Otu Onyeàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’oge ọchịchị ndị Soviet kwuru, sị: “Ihe nyeere anyị aka idi ya bụ na anyị maara nnọọ banyere esemokwu ahụ bilitere n’ogige Iden, ya bụ, okwu banyere onye kwesịrị ịchị. . . . Anyị maara na anyị kwesịrị ịkwado ọchịchị Jehova. . . . Nke a wusikwuru anyị ike ma mee ka anyị nọgide na-akwado ọchịchị Jehova.”

Onyeàmà ọzọ kọrọ ihe nyeere ya na Ndịàmà ibe ya aka n’ogige a na-amanye ndị mmadụ ịrụ ọrụ. O kwuru, sị: “Jehova nyeere anyị aka. N’agbanyeghị ọnọdụ ahụ tara akpụ anyị nọ na ya, anyị hụrụ na anyị na Jehova nọgidere na-adị ná mma. Anyị mere onwe anyị obi ụtọ site n’ịdị na-echetara onwe anyị na anyị kwụ n’akụkụ Jehova n’okwu metụtara onye kwesịrị ịchị eluigwe na ala.”

[Foto dị na peeji nke 26]

Olee otú Jizọs si gosi na ya dịnyeere ọchịchị Jehova mgbe Setan nwara ya?

[Foto dị na peeji nke 28]

Olee ihe ọnwụ Jizọs rụzuru?