Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Ga-ekwe Omume Mmadụ Nile Ịdị n’Otu?

Ọ̀ Ga-ekwe Omume Mmadụ Nile Ịdị n’Otu?

Ọ̀ Ga-ekwe Omume Mmadụ Nile Ịdị n’Otu?

À NA-AGA inwe udo n’ụwa nile ka ụwa anyị a ọ̀ na-aga itisasị? O yiri ka e nwere ọtụtụ ihe mere a ga-eji kweta na nke ọ bụla nwere ike ime.

Ụfọdụ ndị ọchịchị ụwa nọ n’otu akụkụ na-ekwusi ike na ọ ga-ekwe omume inwe udo n’ụwa nile—ikekwe ihe mere ha ji ekwu nke a bụ n’ihi na ha maara ụdị ebelebe ga-egbunụ ma e nwee agha ụwa ọzọ. N’aka nke ọzọ, ezigbo egwu na-ejide ọtụtụ ndị ma a jụọ ajụjụ ndị dị ka: Olee mba nke nwere ngwá agha ọ gwụrụ mba? Hà ga-anwa anwa tụpụ ha? Gịnị ga-eme ma ha tụọ ha?

Ihe ndị merela n’ụwa na-egosi na ọ dịla anya ịsọ mpi na ịkpọasị ji bụrụ isi ihe na-eme ka o sie ike ịdị n’otu, okpukpe sokwa nnọọ na-afụnye ọkụ ná nsogbu ahụ kama imenyụ ya emenyụ. Otu odeakụkọ bụ́ James A. Haught dere, sị: “Ihe ọ bụla na-akpata nkewa nwere ike ibute esemokwu, okpukpe sokwa n’otu n’ime ihe kasị akpata nkewa. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ mmadụ kwetara na okpukpe na-eme ka ndị mmadụ ‘na-eme ihe ọma,’ o doro anya na ọ na-eme ka ụfọdụ mmadụ kpawa arụ kasị arụ.” Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Steven Weinberg chekwara otú ahụ. O dere, sị: “Ọ bụ okpukpe na-eme ka ndị bụ́ ezigbo mmadụ malite ịkpa arụ.”

Olileanya ọ bụla ọ̀ dị na ụwa anyị a ga-emesị dị n’otu? Ee! Ma dị ka anyị ga-ahụ, ọ gaghị abụ ụmụ mmadụ ma ọ bụ okpukpe ndị mmadụ ji aka ha hiwe ka a ga-esi n’aka ha mee nke a.

[Ihe Odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

Ụwa a ọ̀ dị ka bọmbụ na-achọ ịgbawa agbawa?