Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbara Na-aga n’Ụwa Ọhụrụ

Ịgbara Na-aga n’Ụwa Ọhụrụ

Akụkọ Ndụ

Ịgbara Na-aga n’Ụwa Ọhụrụ

Dị Ka Jack Pramberg Si Kọọ

Ndịàmà Jehova nwere alaka ụlọ ọrụ ha nke ihe karịrị mmadụ iri asatọ na-arụ ọrụ na ya ná mpụga Arboga, bụ́ obere obodo mara nnọọ mma nke dị n’etiti mba Sweden. Ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ ka mụ na nwunye m, bụ́ Karin, bi na-arụ ọrụ. Olee otú anyị si bịa biri n’ebe a?

OTU nwa agbọghọ dị afọ iri na ise kwagara United States. Mgbe ọ nọ n’ebe ndị kwabatara ọhụrụ na New York City na-ebi, ọ hụrụ otu onye Sweden na-akwọ ụgbọ mmiri. Ha malitere ịhụ onwe ha n’anya ma mesịa lụọ onwe ha, mesịakwa mụta m. Nke ahụ mere na Bronx, New York, U.S.A., na 1916, mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ.

Obere oge ka a mụsịrị m, anyị kwafere na Brooklyn, nke dị nnọọ nso na Brooklyn Heights. Papa m mesịrị gwa m na o nwere mgbe mụ na ya ji ụgbọ mmiri garuo nso Brooklyn Bridge, bụ́ nke a na-anọ n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ahụ. N’oge ahụ, amaghị m na ihe a na-eme n’isi ụlọ ọrụ ahụ ga-emesị gbanwee nnọọ ndụ m.

Agha Ụwa nke Mbụ biri na 1918, a kwụsịtụkwara igbusị ndị mmadụ ka ọkụkọ na Europe. Ndị gara agha lọtara ma lọkwute ndị iro ọzọ—ụkọ ọrụ na ịda ogbenye. Papa m bịara chee na ọ kasị mma ma anyị laghachi Sweden, anyị mekwara otú ahụ na 1923. Anyị gara biri na Erikstad, bụ́ obere ime obodo dị nso n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị n’obodo Dalsland. Papa m mepere ụlọ ọrụ na-arụzi ụgbọ okporo ígwè na Erikstad, ọ bụkwa n’ebe a ka m nọ tolite ma gaa akwụkwọ.

A Kụọ Mkpụrụ

Ọrụ papa m agachaghị nke ọma. N’ihi ya, n’ihe dị ka n’afọ 1932, ọ maliteghachiri ịkwọ ụgbọ mmiri. Ọ hapụrụ nanị mụ na mama m—mama m nwere ọtụtụ ihe na-echegbu ya, ma ọ bụ m ka a hapụụrụ ụlọ ọrụ ahụ. Otu ụbọchị, mama m gara na nke nwanne papa m, bụ́ Deede m Johan. N’ihi ụjọ ji mama m maka ọnọdụ ọjọọ e nwere n’ụwa, ọ jụrụ, sị: “Johan, ụwa ọ̀ ga-anọgide na-ajọ njọ otú a?”

Deede m zara, sị: “Mba, Ruth.” Ọ gara n’ihu ịgwa ya nkwa ndị Chineke kwere ikpochapụ ihe ọjọọ nile ma weta ọchịchị ezi omume nke ga-achị ụwa site n’Alaeze nke Jizọs Kraịst ga-abụ Eze ya. (Aịsaịa 9:6, 7; Daniel 2:44) Ọ kọwaara ya na Alaeze ahụ Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere banyere ya bụ ọchịchị ezi omume nke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.—Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:3, 4.

Nkwa ndị ahụ dị na Bible ruru nnọọ mama m n’obi. Ọ lawara ma na-ekele Chineke ka ọ na-ala. Ma mụ na papa m enweghị mmasị na mama m na-achọ ịba chọọchị. N’ihe dị ka n’afọ 1935, akwafere m n’obodo Trollhättan, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Sweden, bụ́ ebe m nwetara ọrụ n’otu nnukwu ụlọ ọrụ. N’oge na-adịghị anya, mama m na papa m, bụ́ onye ka hapụrụ ọrụ ịkwọ ụgbọ mmiri mgbe ahụ, kwatara n’ebe a m nọ. Ezinụlọ anyị si otú a nọkọtakwa ọnụ ọzọ.

Mama m chọwakwara Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè ahụ n’ihi na ọ ka na-agụsi ya agụụ ike ịmatakwu Chineke. N’oge ahụ, ha na-ezukọ n’ụlọ ndị mmadụ, dị nnọọ ka Ndị Kraịst oge mbụ mere. (Faịlimọn 1, 2) Otu ụbọchị, o ruru mama m n’aka ka a nọrọ n’ụlọ ya nwee nzukọ. O ji ụjọ jụọ papa m ma ya nwere ike ịkpọta ndị enyi ya n’ụlọ anyị. Papa m zara ya, sị, “Ndị enyi gị bụ ndị enyi m.”

Ya mere, ha malitere ịbịa n’ụlọ anyị na-amụ ihe. Mgbe ọ bụla ha bịawara ọmụmụ ihe, m na-apụ. Ma ọ dịghị anya mụ esoro ha na-amụ ihe. Otú Ndịàmà ahụ si hụ onwe ha n’anya na nkụzi ha doro anya mere ka m kwụsị ịkpọ ha asị. E nwere mkpụrụ malitere itolite n’obi m mgbe ahụ—nke bụ́ olileanya maka ọdịnihu.

Ịmalite Ịkwọ Ụgbọ Mmiri

Ọ ga-abụ nnọọ na ọrụ ịkwọ ụgbọ mmiri dị anyị n’ọbara n’ihi na amalitekwara m ịkwọ ụgbọ mmiri dị ka papa m. Ọ bịakwara gụwa m agụụ ịmụta ihe banyere Chineke. N’ọdụ ụgbọ mmiri ọ bụla anyị kwụsịrị, m na-agbalị ịchọta Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ. N’Amsterdam, Holland (nke bụ́ Netherlands ugbu a), agara m n’otu post ọfịs iji jụta ebe m ga-achọta ha. Mgbe mụ na onye nọ n’ebe ahụ kparịtasịrị, anatara m ya adres m jiri chọrọ ha gawa ozugbo. Mgbe m ruru n’ụlọ m na-aga, otu nwa agbọghọ nta dị afọ iri nabatara m nnọọ. Abụ m onye ọbịa, ma ozugbo ahụ mụ na ndị ezinụlọ ahụ bịara dịrị nnọọ ná mma—nke gositụrụ m nnọọ ụdị ịdị n’otu dị n’etiti Ndịàmà Jehova n’ụwa nile!

Ọ bụ eziokwu na anyị adịghị asụ otu asụsụ, mgbe ha wetara otu kalenda, na otu akwụkwọ e dekọrọ oge ụgbọ okporo ìgwè ji apụ ma malite ise map, aghọtara m na ha na-aga inwe mgbakọ n’obodo Haarlem nke dị nso n’ebe ahụ. Agara m mgbakọ ahụ, ọ tọkwara m nnọọ ụtọ n’agbanyeghị na aghọtaghị m ihe ọ bụla e kwuru n’ebe ahụ. Mgbe m hụrụ ka Ndịàmà na-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù maka okwu ihu ọha a ga-ekwu na Sunday ya, ọ gụsiri m agụụ ike iso ha kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. N’ihi ya, atụtụụrụ m akwụkwọ ịkpọ òkù ndị mmadụ tụfuru atụfu ma were ha nye ndị ọzọ.

N’otu oge, anyị kwụsịrị n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Buenos Aires nke dị na Argentina, achọtakwara m ebe alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ. E nwere ọfịs na ebe a na-akwakọba ihe n’ebe ahụ. E nwere otu nwanyị nọdụ ala na-akpa ihe nakwa obere nwa, nke nwere ike ịbụ nwa ya, onye ji nwa bebi na-egwuri egwu. Chi ejiela nnọọ mgbe ahụ, e nwekwara otu nwoke nọ na-ewere akwụkwọ na shelf, gụnyere akwụkwọ Creation nke asụsụ Swedish. Mgbe m hụrụ nnọọ otú ha si nwee obi ụtọ ma jiri obi ụtọ nabata m, amaara m na ndị a ka m kwesịrị iso na-akpakọrịta.

Mgbe anyị ji ụgbọ mmiri anyị na-ala, anyị butere ndị nọ n’ụgbọelu ndị agha Canada, bụ́ nke kpọkasịrị n’ụsọ oké osimiri obodo Newfoundland. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, anyị rutewere Scotland, ndị agha ụgbọ mmiri England jichiri anyị n’ebe ahụ. Ha kpọọrọ anyị gaa Kirkwall nke dị n’Orkney Islands, iji mara ndị anyị bụ. N’oge ahụ, Agha Ụwa nke Abụọ ka malitere, ndị agha Nazi nke Hitler wakpokwara Poland na September 1939. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ha hapụrụ anyị, anyị rukwara Sweden n’enweghị nsogbu ọ bụla.

Ọ bụghị nanị na m lọrutere ụlọ, ejikwa m oge a mee ka mmekọrịta mụ na Chineke sikwuo ike. Ugbu a, achọsiri m ike isonyere ndị Chineke, achọghịkwa m ịhapụ iso ha na-ezukọta. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ na-enye m obi ụtọ icheta na m gbaara ndị ọkwọ ụgbọ mmiri ndị ọzọ àmà mgbe m na-akwọ ụgbọ mmiri, amakwa m na otu onye n’ime ha ghọrọ Onyeàmà.

Ụdị Ozi Pụrụ Iche

Ná mmalite afọ 1940, agara m n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Stockholm. Johan H. Eneroth, bụ́ onye na-elekọta ọrụ nkwusa na Sweden n’oge ahụ nabatara m. Mgbe m gwara ya na achọrọ m iso na-ekwusa ozi ọma oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ, o legidere m nnọọ anya n’ihu ma jụọ m sị, “Ì kweere na nzukọ a bụ nke Chineke?”

Azara m ya, sị: “Ee.” Nke a mere ka e mee m baptizim na June 22, 1940, amalitekwara m iso ọmarịcha ndị ọrụ ibe m ndị ọzọ na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ ahụ mara mma. Anyị na-agakarị ozi ọma ná ngwụsị izu. N’oge ọkọchị, anyị na-ejikarị ịnyịnya ígwè aga n’ókèala ndị dị anya ma jiri ngwụsị izu ahụ nile kwusaa ozi ọma. Anyị na-ehi n’ebe a na-adọsa ahịhịa ụmụ anụ na-ata.

Ma anyị na-ekwusakarị ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Stockholm na n’obere obodo ndị gbara ya gburugburu. E nwere otu oge m hụrụ otu nwoke ka ọ na-agbalị ịrụzi ihe o ji esi mmiri ọkụ. Apịara m aka uwe m ma nyere ya aka. Mgbe a rụzichara ihe ahụ, nwoke ahụ lere m anya ma kelee m, ma kwuo, sị: “Echere m na o nwere ihe ọzọ kpọtara gị n’ụlọ m. Ka anyị gaa kwọọ aka ma ṅụrụtụ kọfị.” Anyị mere otú ahụ, ezikwara m ya ozi ọma ka anyị na-aṅụ kọfị. Ka oge na-aga, ọ ghọrọ Onye Kraịst.

N’agbanyeghị na mba Sweden kwuru na aka ha adịghị n’agha, agha ahụ metụtara ndị Sweden. A kpọrọ ọtụtụ ụmụ nwoke ka ha bịa banye agha, a kpọkwara m. Mgbe m jụrụ ịba agha, a tụrụ m mkpọrọ ruo nwa oge ugboro ugboro. Mgbe e mesịrị, a mara m ikpe ịga n’ogige ebe a na-arụ ọrụ ahụhụ. A na-akpọtakarị Ndịàmà na-eto eto n’ihu ndị ọkàikpe, anyị na-ejikwa ohere ahụ agbara ha àmà banyere Alaeze Chineke. Nke a mezuru amụma ahụ Jizọs buru, sị: “A ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha na ndị mba ọzọ.”—Matiu 10:18.

Ndụ M Agbanwee

Na 1945, agha biri na Europe. Tupu afọ ahụ agwụ, Nathan H. Knorr, bụ́ onye na-eduzi ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ mgbe ahụ si Brooklyn bịa leta anyị, ya na odeakwụkwọ ya bụ́ Milton Henschel. Ọbịbịa ha bara uru dị ukwu n’ihi na o mere ka a hazigharịa otú anyị si ekwusa ozi ọma na Sweden, ọ bakwaara m uru n’onwe m. Mgbe m nụrụ na ọ ga-ekwe omume mụ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead, etinyere m akwụkwọ ozugbo.

N’afọ sochirinụ, agara m ụlọ akwụkwọ Gilead, bụ́ nke ebe a na-enwe ya nọdewere South Lansing, New York mgbe ahụ. Ọzụzụ ahụ were ọnwa ise mere ka m nwekwuo ekele maka Bible nakwa maka nzukọ Chineke. Achọpụtara m na ndị na-eduzi ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ bụ ndị ọ na-adị mfe ijekwuru na ndị na-echebara mmadụ echiche. Ha so anyị nile rụsie nnọọ ọrụ ike. (Matiu 24:14) Ọ bụ ezie na nke a ejughị m anya, obi dị m ụtọ iji anya m hụ ya.

Na February 9, 1947, klas nke asatọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead bịara ná ngwụsị. Nwanna Knorr kwuru mba ebe ndị a ga-eziga anyị. Mgbe o ruru na nke m, o kwuru, sị, “Nwanna Pramberg ga-alaghachi Sweden ịga jewere ụmụnna ya ndị nọ n’ebe ahụ ozi.” Ịgwa gị eziokwu, obi adịchaghị m mma na m na-alaghachi n’obodo m.

Ịnagide Otu Ihe Isi Ike Tara Akpụ

Mgbe m laghachiri Sweden, amatara m banyere otu ọrụ maliterela n’ụwa nile—nke bụ́ ọrụ distrikti. A họpụtara m ka m jewe ozi dị ka onye nlekọta distrikti mbụ e nwere na Sweden, ọ bụkwa mba ahụ dum ka m na-aga ilekọta. Ahaziri m ma hụ maka mgbakọ ndị a na-enwe n’oge ahụ, bụ́ nke a na-akpọzi mgbakọ sekit. E nwere ha n’obodo ukwu na obodo nta dị iche iche dị na Sweden. Ebe ọ bụ na ụdị mgbakọ a ka malitere ọhụrụ, anyị enwetaghị nkọwa zuru ezu banyere otú e si eme ya. Mụ na Nwanna Eneroth nọdụrụ ọdụ ma depụta usoro ihe omume ahụ otú anyị nwere ike. Obi akachaghị m na m ga-arụli ọrụ a, ekpegakwaara m Jehova ekpere ọtụtụ ugboro banyere ya. Enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye nlekọta distrikti ruo afọ iri na ise.

N’oge ndị ahụ, ọ na-esi ike inweta ebe anyị ga-anọ na-enwe mgbakọ. Anyị na-anọ n’ụlọ ebe a na-anọ agba egwu na ebe ndị ọzọ yiri ya enwe mgbakọ. Adịghị elebara ọtụtụ ebe ndị a anya nke ọma. Otu n’ime ebe ndị a bụ ebe a nọ nwee mgbakọ na Rökiö nke dị na Finland. Ebe ahụ bụ ụlọ ezumezu ochie nke e leghaara anya ruo ogologo oge. Nnukwu snow na-ada, oyi na-atụkwanụ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. N’ihi ya, anyị kwanyere ọkụ ná nnukwu ekwu ọkụ abụọ e ji drọnụ mmanụ rụọ. Anyị amaghị na ụmụ nnụnụ kpara akwụ ha n’ebe anwụrụ ọkụ si apụ. Anwụrụ ọkụ kwụjuru ebe ahụ anyị nọ! N’agbanyeghị na anya mmiri nọ na-agba onye ọ bụla, ọ dịghị onye n’ime anyị si n’oche ya bilie. Ihe a merenụ mere ka mgbakọ ahụ bụrụ nke a na-agaghị echefu echefu.

Otú a ga-esi nweta nri ndị bịara mgbakọ ga-eri so ná ntụziaka e nyere maka otú a ga-esi hazie mgbakọ sekit a ga-ewe ụbọchị atọ. Ná mmalite, anyị enweghị ngwa ọrụ a ga-eji eme nke a, anyị emetụbeghịkwa ya mbụ. Ma anyị nwere ọmarịcha ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị, bụ́ ndị ji obi ụtọ rụọ ọrụ ahụ tara akpụ. N’ụbọchị bọtara ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ, ị ga-ahụ ha ebe ha ji mma na-ebechasị peteto juru na bezin ma na-akọrịta ahụmahụ ndị na-enye obi ụtọ. Ọtụtụ ndị metere ezigbo ndị enyi n’oge ahụ ha rụkọrọ ọrụ.

Ọrụ ọzọ anyị rụrụ n’oge ahụ bụ iji obodobo akwụkwọ e dere ihe na-akpọsa banyere mgbakọ sekit ahụ. Anyị na-akwụ n’ahịrị ma gazuo obodo ahụ ebe anyị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa gere okwu ihu ọha a ga-ekwu. Ọtụtụ ndị nwere obiọma ma kwanyere anyị ùgwù. N’otu oge, n’obodo Finspång, imerime ndị ọrụ si n’otu ụlọ ọrụ na-apụta n’okporo ámá. Ọ tụrụ anyị n’anya mgbe otu onye n’ime ha kwuru n’oké olu, sị: “Unu lee ndị nyịrị Hitler!”

Otu Ihe Pụrụ Iche nke Mere ná Ndụ M

Ọrụ m dị ka onyeozi na-ejegharị ejegharị gbanwere mgbe m matara Karin, bụ́ otu ezigbo nwa agbọghọ nwere àgwà ọma. A kpọrọ anyị abụọ ka anyị bịa mgbakọ mba nile e nwere n’ámá egwuregwu Yankee Stadium dị na New York City, na July 1953. Mgbe e mechiri ihe omume nke ụtụtụ na Monday, nke bụ́ abalị iri abụọ nke ọnwa ahụ, Milton Henschel kwuru okwu agbamakwụkwọ anyị. Ọ bụ ihe omume pụrụ iche nke weere ọnọdụ n’ámá egwuregwu a a ma ama. Mgbe mụ na Karin rụsịrị ọrụ ilekọta ọgbakọ ruo afọ 1962, a kpọrọ anyị ka anyị bịa sonyere ezinụlọ Betel dị na Sweden. Ebe mbụ e zigara m bụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Magazin. Ma n’ihi na m mụrụ otú e si arụzi ígwè e ji arụ ọrụ, a gwara m ka m na-elekọta ígwè ndị e ji ebi akwụkwọ na ígwè ọrụ ndị ọzọ dị n’alaka ụlọ ọrụ Sweden. Karin rụrụ ọrụ ruo ọtụtụ afọ n’ebe a na-asa ákwà. Kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a, ọ nọwo na-arụ ọrụ ná Ngalaba Na-agụgharị Ihe Ndị E Dere Ede.

Anyị nwere nnọọ obi ụtọ n’ime ihe karịrị afọ iri ise na anọ anyị jirila jeere Jehova ozi dị ka di na nwunye! N’ezie, Jehova agọziwo ọgbakọ ya nke ihe mejupụtara ya bụ ndị ohu ya hụrụ ibe ha n’anya ma na-arụsi ọrụ ike. Na 1940, bụ́ mgbe m malitere ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Sweden, e nwere nanị Ndịàmà dị otu puku na narị ise na Sweden. Ma taa, e nwere ihe karịrị iri puku abụọ na puku abụọ. E nwedịrị ọnụ ọgụgụ karịrị nnọọ nke a n’ebe ndị ọzọ n’ụwa nke mere na taa, anyị dị ihe karịrị nde mmadụ isii na narị puku ise n’ụwa nile.

Ọ bụ mmụọ Jehova na-akwado ọrụ anyị, e nwere ike ikwu na ọ nọgidela na-eme ka ọtụtụ ndị na-abata n’ụgbọ mmiri anyị. Anyị ji okwukwe siri ike na-elegharị anya n’oké osimiri na-amali n’ike n’ike nke bụ́ ụmụ mmadụ, ma egwu ejighị anyị. N’ihu anyị, anyị na-ahụ nnọọ ụwa ọhụrụ Chineke. Mụ na Karin na-ekele Chineke maka ihe ọma nile o meere anyị ma na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ka o nye anyị ike iji nọgide na-eme ezi ihe ma ruo ihe mgbaru ọsọ anyị—nke bụ́ ịbụ ndị ha na Chineke dị ná mma na ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi!—Matiu 24:13.

[Foto dị na peeji nke 12]

Ebe mama m ku m

[Foto dị na peeji nke 13]

Ebe mụ na papa m ji ụgbọ mmiri gaa n’afọ ndị sochiri 1920

[Foto dị na peeji nke 15]

Mụ na Herman Henschel (papa Milton) oge m gara Gilead na 1946

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Anyị gbara akwụkwọ na Yankee Stadium na July 20, 1953