Ọbụbụeze Jehova na Alaeze Chineke
Ọbụbụeze Jehova na Alaeze Chineke
“Jehova, Gị nwe ịdị ukwuu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube . . . Jehova, Gị nwe alaeze.” —1 IHE E MERE 29:11.
1. Gịnị mere Jehova ji kwesị ịbụ Eze na-achị eluigwe na ala?
“JEHOVA emewo ka ocheeze Ya guzosie ike n’eluigwe; Alaeze Ya na-achịkwa ihe nile.” (Abụ Ọma 103:19) Ọbụ abụ ahụ jiri okwu ndị a gosi onye kwesịrị ịchị ụwa. Ebe ọ bụ na Jehova Chineke bụ Onye Okike, ọ bụ ya kwesịrị ịbụ Eze Na-achị eluigwe na ala.
2. Olee otú Daniel si kọwaa ihe na-aga n’eluigwe ebe Jehova bi?
2 Ma ka onye ọchịchị wee nwee ike ịchị achị, a ga-enwerịrị ndị ọ ga-achị. Ndị mbụ Jehova malitere ịchị bụ ndị mmụọ o kere eke—onye mbụ n’ime ha bụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, e mesịakwa ndị mmụọ ozi ndị ọzọ. (Ndị Kọlọsi 1:15-17) Ka ọtụtụ afọ gasịrị, e mere ka Daniel onye amụma hụperetụ otú ọchịchị Jehova si aga n’eluigwe. Ọ kọrọ, sị: “Anọ m na-ahụ ruo mgbe a tụdasịrị ocheeze dị iche iche, otu onye ochie wee nọdụ ala. . . . [Otu puku ụzọ otu puku ndị ozi] na-ejere Ya ozi, [puku iri ụzọ puku iri], na-eguzokwa ọtọ n’ihu Ya.” (Daniel 7:9, 10) Kemgbe ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, Jehova bụ́ “Onye ochie ahụ,” anọrọla na-achị nnukwu ezinụlọ ya a haziri nke ọma nke ụmụ ya ndị bụ́ mmụọ mejupụtara, bụ́ ndị na-arụ ọrụ dị ka ndị “na-ejere Ya ozi” na-eme ihe na-atọ ya ụtọ.—Abụ Ọma 103:20, 21.
3. Olee otú mbara ụwa si sonye n’ebe ndị Jehova na-achị?
3 Jehova mechara nwekwuo ebe ndị ọ na-achị site n’ike mbara igwe dị egwu na ụwa. (Job 38:4, 7) Ọ bụrụ na mmadụ anọrọ n’ụwa na-ekiri ihe ndị nọ ná mbara igwe, otú ha si na-arụ ọrụ n’usoro ga-eme ka o yie ka ọ dịghịkwa mkpa inwe onye ga na-eduzi ha. Ma, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “[Jehova] onwe ya nyere iwu, e wee kee ha. O wee mee ka ha guzo ruo mgbe nile ebighị ebi: ụkpụrụ ka O nyeworo nke na-agaghị agabiga.” (Abụ Ọma 148:5, 6) Kemgbe ụwa, Jehova anọgidela na-egosi na ọ bụ ya kwesịrị ịbụ eze site n’iduzi na ịchịkwa ihe ndị na-aga n’eluigwe nakwa n’ụwa.—Nehemaịa 9:6.
4. Olee otú Jehova si achị ụmụ mmadụ?
4 Chineke nwekwukwara ndị ọzọ ọ na-achị site n’ike nwoke mbụ na nwanyị mbụ. E wezụga inye ụmụ mmadụ ihe nile Jenesis 1:26-28; 2:8, 9) N’ihi ya, ọ bụghị nanị na Chineke ji obiọma na-achị, kamakwa ọ na-akwanyere ndị ọ na-achị ùgwù. Ọ bụrụhaala na Adam na Iv ekwere ka Jehova na-achị ha, ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke bụ́ paradaịs.—Jenesis 2:15-17.
dị ha mkpa iji bie ndụ nwere nzube na nke obi ụtọ, Jehova nyekwara ha ikike ka ha na-achịkwa ihe ndị ọzọ o kere eke nọ n’ụwa. (5. Olee otú i pụrụ isi kọwaa ụzọ Jehova si achị?
5 Gịnị ka ihe a nile na-agwa anyị? Nke mbụ, ọ dịla anya Jehova chịwara ihe nile o kere eke. Nke abụọ, Chineke ji obiọma na-achị, ọ na-akwanyekwara ndị ọ na-achị ùgwù. Nke ikpeazụ bụ na anyị ga-enweta ngọzi ndị na-adịghị agwụ agwụ ma ọ bụrụ na anyị erubere Chineke isi ma na-akwado ọchịchị ya. Ka a sịkwa ihe mere Eze Devid nke Izrel oge ochie ji kwuo, sị: “Jehova, Gị nwe ịdị ukwuu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube: n’ihi na ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa bụ nke Gị; Jehova, Gị nwe alaeze, Gị bụkwa Onye a na-eweli elu ịbụrụ ihe nile onyeisi.”—1 Ihe E Mere 29:11.
Gịnị Mere Alaeze Chineke Ji Dị Anyị Mkpa?
6. Olee ihe jikọrọ ọchịchị Chineke na Alaeze ya?
6 Ebe ọ bụ na kemgbe ụwa, Jehova bụ́ Eze Eluigwe na Ala, nọ na-achị ma na-egosipụta ike ya, oleezi ihe mere Alaeze Chineke ka ji dị anyị mkpa? Onye eze na-enwekarị ndị ọ na-esite n’aka ha na-agwa ndị ọ na-achị ihe ha ga-eme. N’ihi ya, Alaeze Chineke, bụ ụzọ Chineke ga-esi achị ndị o kere eke, nke bụ́ ụzọ o si egosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị.
7. Gịnị mere Jehova ji hiwe ọchịchị ọhụrụ?
7 Jehova achịala n’ụzọ dị iche iche na n’oge dịgasị iche. O hiwere ọchịchị ọhụrụ a iji mezie nsogbu biliterenụ. Nsogbu a malitere mgbe otu onye nnupụisi bụ́ Setan, onye bụ́ otu n’ime ụmụ Chineke ndị bụ́ mmụọ, mere ka Adam na Iv nupụrụ ọchịchị Jehova isi. Ihe a o mere bụ ịma otú Chineke si achị aka. N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe Setan gwara Iv na ‘ọ dịghị ọnwụ ọ ga-anwụ’ ma ọ bụrụ na ọ taa mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha atala, ihe ọ na-ekwu bụ na Jehova bụ onye ụgha, n’ihi ya e kwesịghị ịtụkwasị ya obi. Setan gwakwara Iv, sị: “N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” Ihe Setan na-ekwu bụ na Adam na Iv ga-aka eme nke ọma ma ọ bụrụ na ha enupụrụ Chineke isi ma mewe otú masịrị ha. (Jenesis 3:1-6) Nke ahụ bụ nnọọ ịkpachapụ anya mawa Chineke aka na ọ bụghị ya kwesịrị ịchị. Gịnị ka Jehova ga-eme?
8, 9. (a) Gịnị ka onye ọchịchị bụ́ mmadụ ga-eme ma e nwee ndị na-enupụrụ ọchịchị ya isi? (b) Gịnị ka Jehova mere n’ihi nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden?
8 Gịnị ka i chere onye ọchịchị ga-eme ma e nwee ndị na-enupụrụ ọchịchị ya isi? Ndị maara akụkọ ihe mere eme nke ọma nwere ike icheta mgbe ụdị ihe a mere. Kama ileghara okwu ahụ anya, onye ọchịchị—ọbụna onye ọchịchị nwere obi ọma—ga-ekpe ndị nnupụisi ahụ ikpe n’ihi na ha chọrọ ịgba ọchịchị ya mgba okpuru. Mgbe ahụzi onye ọchịchị ahụ nwere ike ịgwa otu onye ka ọ gaa kwụsị ihe a ha na-eme ma hụ na e mere ka udo dịghachi. N’otu aka ahụ, Jehova gosiri na ya kasị ihe nile elu mgbe o mere ihe ozugbo ma maa ndị nnupụisi ahụ ikpe. Ọ gwara Adam na Iv na ha erughị eru inweta onyinye nke ndụ ebighị ebi, ma chụpụ ha n’ogige Iden.—Jenesis 3:16-19, 22-24.
9 Mgbe Jehova na-ekwupụta ikpe ọ mara Jenesis 3:15) Jehova si otú a gosi na nzube ya bụ inye otu “mkpụrụ” ikike ichifịa Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ma gosi na ụzọ Chineke si achị ziri ezi.—Abụ Ọma 2:7-9; 110:1, 2.
Setan, o mere ka a mata ụzọ ọhụrụ ọ ga-esi achị bụ́kwanụ ụzọ ọ ga-esi mee ka udo dịghachi n’ebe nile ọ na-achị, meekwa ka ihe na-aga nke ọma. Chineke gwara Setan, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (10. (a) Ònye ghọrọ “mkpụrụ” ahụ? (b) Gịnị ka Pọl kwuru banyere otú a ga-esi emezu amụma mbụ ahụ e buru?
10 “Mkpụrụ” ahụ e kwuru okwu ya mechara bụrụ Jizọs Kraịst, tinyere ndị ga-eso ya chịa. Ọ bụ ha mejupụtara Alaeze Mezaịa Chineke. (Daniel 7:13, 14, 27; Matiu 19:28; Luk 12:32; 22:28-30) Ma e kpugheghị ihe a nile ozugbo. N’ezie, otú amụma mbụ ahụ e buru ga-esi mezuo nọgidere bụrụ ‘ihe nzuzo dị nsọ, bụ́ nke e debeworo na nzuzo eri ogologo oge.’ (Ndị Rom 16:25) Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị kweere na Chineke tụrụ nnọọ anya mgbe a ga-ekpughe “ihe nzuzo ahụ dị nsọ,” bụ́ mgbe a ga-emezu amụma mbụ ahụ iji bulie ọchịchị Jehova elu.—Ndị Rom 8:19-21.
E Ji Nke Nta Nke Nta Kpughee “Ihe Nzuzo ahụ Dị Nsọ”
11. Olee ihe Jehova gwara Ebreham?
11 Ka oge na-aga, Jehova jiri nke nta nke nta na-ekpughe akụkụ ụfọdụ nke “ihe nzuzo dị nsọ nke alaeze Chineke.” (Mak 4:11) Otu n’ime ndị Jehova kpugheere ya bụ nwoke ahụ bụ́ Ebreham, bụ́ onye a kpọrọ “enyi Jehova.” (Jems 2:23) Jehova kwere Ebreham nkwa na ya ga-eme ya ka ọ “ghọọ mba ukwu.” Ka e mechara, Chineke gwakwuru Ebreham, sị: “Ndị eze ga-esikwa n’ime gị pụta,” “ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.”—Jenesis 12:2, 3; 17:6; 22:17, 18.
12. Olee otú e si mata mkpụrụ Setan mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị?
12 Ka ọ na-erule n’oge Ebreham, e nweela ndị chọrọ ịchị ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Bible kwuru banyere nwa nwa Noa bụ́ Nimrọd, sị: “Onye ahụ malitere ịbụ dike n’ụwa. Ya onwe ya bụ dike n’ịchụ nta n’ihu Jehova.” (Jenesis 10:8, 9) O doro nnọọ anya na Nimrọd na ndị ọzọ jiri aka ha mee onwe ha eze bụ ngwá ọrụ Setan ji arụ ọrụ. Ha na ndị na-akwado ha so ná mkpụrụ Setan.—1 Jọn 5:19.
13. Gịnị ka Jehova kwuru na a gaje isite na Jekọb mee?
13 N’agbanyeghị ihe nile Setan mere iji hiwe ọchịchị ụmụ mmadụ, Jehova gara n’ihu n’imezu nzube ya. Jehova sitere na nwa nwa Ebreham bụ́ Jekọb mee ka a mata ihe gaje ime, o kwuru, sị: “Mkpanaka eze agaghị esi n’ebe Juda nọ wezụga onwe ya, mkpanaka onye na-enye ụkpụrụ agaghị esikwa n’etiti ụkwụ ya abụọ wezụga onwe Jenesis 49:10) Okwu bụ́ “Shaịlo” pụtara “Onye Ọ Bụ nke Ya; Onye Ọ Dịịrị.” N’ihi ya, okwu amụma ndị a gosiri na a ga-enwe onye kwesịrị ịnata “mkpanaka eze,” ma ọ bụ ocheeze na “mkpanaka onye na-enye ụkpụrụ,” ma ọ bụ ọchịchị, bụ́ onye ga-achị “ndị dị iche iche,” ma ọ bụ ụmụ mmadụ nile. Ònye ka ọ ga-abụ?
ya, ruo mgbe Shaịlo ga-abịa; ọ bụkwa ya ga-enwe ịṅa ntị ndị dị iche iche.” (“Ruo Mgbe Shaịlo Ga-abịa”
14. Olee ọgbụgba ndụ Jehova na Devid gbara?
14 Onye mbụ Jehova họọrọ n’ụmụ Juda nile ịchị ndị ya bụ nwa Jesi na-azụ atụrụ bụ́ Devid. * (1 Samuel 16:1-13) N’agbanyeghị mmehie ndị Devid mere na ebe ndị o mejọrọ, Jehova meere ya amara n’ihi otú o si kwadosie ọchịchị Jehova ike. Iji mee ka amụma mbụ ahụ o buru n’Iden dokwuo anya, Jehova na Devid gbara ndụ, ọ gwara ya sị: “M ga-emekwa ka o bilie, bụ́ mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị, nke ga-esi n’afọ gị pụta, M ga-emekwa ka alaeze ya guzosie ike.” Ọ bụghị nanị nwa Devid bụ́ Solomọn, bụ́ onye nọchiri ya, ka a na-ekwu okwu ya ebe a n’ihi na Jehova kwuru n’ọgbụgba ndụ ahụ, sị: “M ga-emekwa ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.” Ndụ ahụ Jehova na Devid gbara mere ka o doo anya na “mkpụrụ” nke Alaeze ahụ e kwere ná nkwa ga-emecha si n’agbụrụ Devid pụta.—2 Samuel 7:12, 13.
15. Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na alaeze Juda yiri Alaeze Chineke?
15 Ọ bụ site na Devid ka a malitere inwe usoro ndị eze, bụ́ ndị onyeisi nchụàjà na-ete mmanụ nsọ. N’ihi ya, a pụrụ ịkpọ ndị eze a ndị e tere mmanụ, ma ọ bụ ndị mezaịa. (1 Samuel 16:13; 2 Samuel 2:4; 5:3; 1 Ndị Eze 1:39) E kwuru na ha nọkwasịrị n’ocheeze Jehova ma na-achị dị ka ndị eze Jehova n’ime Jeruselem. (2 Ihe E Mere 9:8) N’ihi ya, alaeze Juda nọchiri anya Alaeze Chineke, bụ́ ihe nọchiri anya ọbụbụeze Jehova.
16. Olee ihe mechara mee ọchịchị ndị eze Juda?
16 Mgbe ọ bụla eze na ndị ọ na-achị rubeere ọchịchị Jehova isi, O chebere ha ma gọzie ha. Oge Solomọn chịrị bụ nnọọ oge udo nakwa oge e nwere ụdị ọganihu a na-enwetụbeghị n’Izrel, nke a na-eme ka anyị hụperetụ n’ụzọ amụma otú Alaeze Chineke ga-adị mgbe Setan na-agaghị na-akpakwa ike ọ bụla, bụ́kwa mgbe a ga-egosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịbụ eze. (1 Ndị Eze 4:20, 25) Ma ọ dị nnọọ mwute na ọtụtụ n’ime ndị eze si n’agbụrụ Devid edebeghị iwu Jehova, ụmụ Izrel malitekwara kpewere arụsị ma na-eme omume rụrụ arụ. N’ikpeazụ, Jehova kwere ka ndị Babịlọn bibie alaeze ahụ na 607 T.O.A. O yiziri ka Setan ò nweela ihe ịga nke ọma n’atụmatụ ọ na-eme iji kwatuo ọchịchị Jehova.
17. Gịnị na-egosi na Jehova ka nọ na-achị n’agbanyeghị na a kwaturu ọchịchị ndị eze si n’agbụrụ Devid?
17 Nkwatu a kwaturu ọchịchị ndị eze si n’agbụrụ Devid—na otú e sirila buru ụzọ kwatuo alaeze ebe ugwu Izrel—adịghị egosi na Jehova amachaghị achị, kama ọ na-eme ka anyị ghọta nsogbu Setan kpatarala ụmụ mmadụ, ya na nsogbu ndị sirila ná ụmụ mmadụ ịchị onwe ha pụta. (Ilu 16:25; Jeremaịa 10:23) Iji gosi na ya ka nọkwa na-achị, Jehova sitere n’ọnụ Ezikiel onye amụma kwuo, sị: “Wezuga ákwá nkuku isi ahụ, bupụ okpu eze ahụ. . . . Mkpu ihu, mkpu ihu, mkpu ihu ka M ga-ekpu ya: nke a kwa, ọ gaghị adị ruo mgbe ọ ga-abịa, bụ́ onye o ruru aka; M ga-ewerekwa ya nye ya.” (Ezikiel 21:26, 27) Ihe a e kwuru ebe a na-egosi na “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa, nke bụ́ “onye o ruru aka,” ga-abịa n’ọdịnihu.
18. Gịnị ka mmụọ ozi Gabriel gwara Meri?
18 Ọ dị mma, ka anyị chee echiche laa azụ n’ihe mere n’ihe dị ka n’afọ nke abụọ T.O.A. E zigara mmụọ ozi Gabriel na nke otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke aha ya bụ Meri. Ọ bụ onye Nazaret, bụ́ obodo nọ na Galili n’ebe ugwu Palestine. Mmụọ ozi a gwara Meri, sị: “Lee! ị ga-atụrụ ime n’akpa nwa gị ma mụọ nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jizọs. Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu; Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nke Devid bụ́ nna ya, ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.”—Luk 1:31-33.
19. Olee ihe omume ndị na-akpali akpali nke oge ya ruwerela?
19 Oge a ga-ekpughe “ihe nzuzo ahụ dị nsọ” eruwela. Onye bụ́ isi ná “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa gaje ịpụta n’oge na-adịghị anya. (Ndị Galeshia 4:4; 1 Timoti 3:16) Setan ga-echifịa ya n’ikiri ụkwụ. Ma “mkpụrụ” ahụ ga-echifịa Setan n’isi, kwụsịkwa ihe ọjọọ nile Setan na ndị òtù ya nile na-akpata. Ọ ga-emekwa ka a mata na ọ bụ Alaeze Chineke ka a ga-eji mezie ihe nile Setan mebiri ma gosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. (Ndị Hibru 2:14; 1 Jọn 3:8) Olee ụzọ Jizọs ga-esi mee nke a? Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ anyị? Anyị ga-amata azịza ha n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]
^ par. 14 Sọl, onye mbụ Chineke họọrọ ịchị mba Izrel, si n’ebo Benjamin.—1 Samuel 9:15, 16; 10:1.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• Gịnị mere Jehova ji bụrụ onye kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa?
• Gịnị mere Jehova ji chọọ ihiwe ọchịchị ọhụrụ?
• Olee otú Jehova sirila jiri nke nta nke nta mee ka a mata “ihe nzuzo ahụ dị nsọ”?
• Gịnị gosiri na Jehova ka na-achị achị n’agbanyeghị na a kwaturu ọchịchị ndị eze si n’agbụrụ Devid?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 23]
Olee ihe Jehova kwuru ọ gaje isite n’Ebreham mee?
[Foto dị na peeji nke 25]
Gịnị mere na nkwatu a kwaturu ọchịchị ndị eze si n’agbụrụ Devid apụtaghị na ọchịchị Jehova adaala?