Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa

N’AFỌ 520 T.O.A., ka afọ iri na isii gasịrị kemgbe ndị Juu ahụ si Babịlọn lọta tọrọ ntọala ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem, ha aka ewuchabeghị ya. A makwara iwu ka a kwụsị iwu ya. Jehova kpọrọ Hagaị ka ọ bụrụ onye amụma ga-agwa ndị mmadụ Okwu Ya, ka ọnwa abụọ gasịkwara, ọ kpọkwara Zekaraịa ịrụ otu ọrụ ahụ.

Hagaị na Zekaraịa bu otu ihe n’obi. Nzube ha bụ ịkpali ndị Izrel ka ha maliteghachi iwu ụlọ nsọ ahụ. Mgbalị ndị amụma a tinyere rụpụtara ihe dị mma, e wuchakwara ụlọ nsọ ahụ afọ ise ka e mesịrị. E dekọrọ ihe Hagaị na Zekaraịa kwuru na Bible n’akwụkwọ ndị ahụ bu aha ha. Hagaị dechara akwụkwọ ya n’afọ 520 T.O.A., ebe Zekaraịa dechara nke ya n’afọ 518 T.O.A. Anyị onwe anyị taa dịkwa ka ndị amụma ahụ n’ihi na anyị nwere ọrụ Chineke nyere anyị, bụ́ nke anyị ga-arụcharịrị tupu usoro ihe a abịa ná njedebe. Ọ bụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze na inyere ndị mmadụ aka ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ka anyị hụ agbamume ndị anyị pụrụ isi n’akwụkwọ Hagaị na Zekaraịa nweta.

“TỤKWASỊNỤ OBI UNU N’ỤZỌ NILE UNU”

(Hagaị 1:1–2:23)

N’ime otu narị ụbọchị na iri na abụọ, Hagaị kpọsara ozi anọ kpaliri ndị mmadụ ịrụ ọrụ. Nke mbụ bụ: “Tụkwasịnụ obi unu n’ụzọ nile unu. Rịgoonụ n’ugwu, bute osisi, wuo ụlọ a, ọ ga-atọkwa m ụtọ, a ga-asọpụkwara m, ka Jehova sịrị.” (Hagaị 1:7, 8) Ndị Izrel mere nnọọ ihe o kwuru. Ozi nke abụọ ọ kpọsara bụ nkwa Jehova kwere, sị: “M [Jehova] ga-emejukwa ụlọ a n’ebube.”—Hagaị 2:7.

Ozi nke atọ o ziri gosiri na ọ bụ n’ihi na ha leghaara ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ anya mere ka ‘ọrụ ọ bụla nke aka ha bụrụ ihe rụrụ arụ’ n’anya Jehova. Ma, site n’ụbọchị ha ga-amalite iwuzi ụlọ nsọ ahụ, Jehova “ga na-agọzi” ha. Dị ka e kwuru n’ozi nke anọ, Jehova ‘ga-akwatu ocheeze nke alaeze nile’ ma mee ka Gọvanọ Zerubabel dị ka “mgbaaka akara.”—Hagaị 2:14, 19, 22, 23.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:6—Gịnị ka okwu bụ́ “unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma ọ dịghị nṅụju afọ unu ṅụjuworo” pụtara? Ọ na-egosi na mmanya ga-adị ụkọ. N’ihi na Jehova kwụsịrị ịgọzi ha, mmanya ga-akọ ụkọ—mmanya a ga-enwe agaghị ezudị ezu ma ya fọdụzie igbuwe ndị mmadụ egbuwe.

2:6, 7, 21, 22—Ònye ma ọ bụ gịnị na-eme ka e nwee mkpatụ ahụ, oleekwa ihe mkpatụ ahụ ga-arụpụta? Ọ bụ Jehova na-eme ka “mba nile mee mkpatụ” site n’ozi ọma Alaeze nke a na-ekwusa n’ụwa nile. Ozi ọma ahụ na-emekwa ka “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” nubata n’ụlọ Jehova, si otú a na-eme ka ụlọ ya jupụta n’ebube. N’oge na-adịghị anya, “Jehova nke ụsụụ nile nke ndị agha” ga-eme ka “eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala kpọrọ nkụ” mee mkpatụ, nke ga-eme ka ajọ usoro ihe dị ugbu a gharazie ịdị.—Ndị Hibru 12:26, 27.

2:9—Olee otú ‘ebube ikpeazụ nke ụlọ nsọ ahụ ga-esi dị ukwuu karịa ebube ụlọ nke mbụ’? Ọ dịkarịa ala e nwere ụzọ atọ nke a si mee, ha bụ: afọ ole ụlọ nsọ ahụ nọrọ, onye nọ na ya zie ndị mmadụ ihe, na ndị nubatara na ya ịbịa fee Jehova. Ọ bụ eziokwu na nnukwu ụlọ nsọ ahụ Solomọn rụrụ nọrọ narị afọ anọ na iri afọ abụọ, malite na 1027 T.O.A. ruo 607 T.O.A., a nọrọ ihe karịrị narị afọ ise na iri afọ asatọ fee ofufe ‘n’ụlọ nke ikpeazụ ahụ,’ malite na mgbe a rụchara ya na 515 T.O.A. ruo mgbe e bibiri ya na 70 O.A. Ihe ọzọkwa bụ na Mezaịa ahụ bụ́ Jizọs Kraịst ziri ihe ‘n’ụlọ nke ikpeazụ’ ahụ, ọtụtụ mmadụ batakwara na ya ịbịa fee Chineke karịa ka ha mere n’ụlọ nke “mbụ.”—Ọrụ 2:1-11.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:2-4. Na ndị mmadụ na-emegide ọrụ ikwusa ozi ọma anyị ekwesịghị ime ka anyị bute ọdịmma nke onwe anyị ụzọ ma kwụsị ‘iburu ụzọ na-achọ alaeze.’—Matiu 6:33.

1:5, 7. Ọ dị mma ka anyị ‘tụkwasị obi anyị nile n’ụzọ nile anyị’ ma tụgharịa uche n’otú ndụ anyị na-ebi si emetụta mmekọrịta anyị na Chineke.

1:6, 9-11; 2:14-17. Ndị Juu nke oge Hagaị nọ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ iji mejuo akpa nke onwe ha ma ha adịghị enweta ihe ọ bụla ná ndọgbu nile ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ. Ha leghaara ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ anya, n’ihi ya kwa Chineke agọzighị ha. Anyị kwesịrị ibute ihe ndị metụtara ofufe Chineke ụzọ ná ndụ anyị ma jiri obi anyị nile na-ejere Chineke ozi, anyị kwesịkwara icheta na m̀a anyị nwere ọtụtụ ihe ma ọ bụ ihe ole na ole, ọ bụ ‘ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya.’—Ilu 10:22.

2:15, 18. Jehova gwara ndị Juu ka ha tinye uche site n’ụbọchị ahụ n’ịrụgharị ụlọ nsọ ahụ, ọ bụghị n’otú ha si leghara ya anya. Site taa gawa, anyị onwe anyị kwesịkwara ịgbalị ịdị na-etinye uche n’ofufe Chineke anyị.

‘Ọ BỤGHỊ SITE N’IKE, KAMA Ọ BỤ SITE NA MMỤỌ M’

(Zekaraịa 1:1–14:21)

Zekaraịa malitere ibu amụma ya site n’ịkpọ ndị Juu ka ha ‘laghachikwute Jehova.’ (Zekaraịa 1:3) Ọhụụ asatọ ndị ọzọ sochirinụ gwara ha na Chineke ga-akwado ha n’ọrụ iwugharị ụlọ nsọ ahụ. (Lee igbe bụ́ “Ọhụụ Asatọ Bụ́ Ihe Atụ Ndị Zekaraịa Hụrụ.”) A ga-ewucha ụlọ nsọ ahụ, “ọ bụghị site n’ụsụụ ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na Mmụọ [Jehova].” (Zekaraịa 4:6) Nwoke nke aha ya bụ Ihe Opupu “ga-ewukwa ụlọ ukwuu Jehova” bụrụkwa ‘onye nchụàjà ga-adị n’ocheeze ya.’—Zekaraịa 6:12, 13.

Ndị obodo Betel zigara ụfọdụ ndị ka ha gaa jụọ ndị nchụàjà banyere ememe ibu ọnụ e ji echeta mgbe e bibiri Jeruselem. Jehova gwara Zekaraịa na a ga-agbanwe újú ahụ a na-adị na-eru mgbe a na-eme ememe ibu ọnụ anọ ahụ e ji echeta ihe mere Jeruselem ka ọ bụrụzie oge “obi ụtọ na ọṅụ, na mgbe a kara aka dị mma.” (Zekaraịa 7:2; 8:19) Okwu ikpe abụọ ọzọ Zekaraịa kpọsara bụ nke Chineke mara mba dị iche iche na ndị amụma ụgha. E nwekwara amụma banyere Mezaịa ahụ na amụma banyere otú a ga-esi weghachi ndị Chineke n’ala ha.—Zekaraịa 9:1; 12:1.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:1—Gịnị mere otu nwoke ji were eriri ọ̀tụ̀tụ̀ na-atụ Jeruselem? Eleghị anya, ihe a nwoke a mere bụ iji gosi na a ga-eji mgbidi gbaa obodo ahụ gburugburu. Mmụọ ozi ahụ gwara nwoke ahụ na Jeruselem ga-agbasawanye nakwa na Jehova ga-echebe ya.—Zekaraịa 2:3-5.

6:11-13—Okpueze ahụ e kpuwere Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jọshụa ò mere ya ka ọ bụrụ eze nakwa onye nchụàjà? Ee e, Jọshụa esighị n’agbụrụ Devid bụ́ agbụrụ e si na ya enweta ndị eze. Ma okpueze e kpuwere ya bụ iji gosi ụdị ọrụ Mezaịa ahụ ga-arụ. (Ndị Hibru 6:20) Amụma banyere onye ahụ aha ya bụ “Ihe opupu” mezuru n’isi Jizọs Kraịst bụ́ Eze nakwa Onye Nchụàjà si n’eluigwe. (Jeremaịa 23:5) Dị nnọọ ka Jọshụa si jee ozi n’ụlọ nsọ ahụ a rụgharịrị arụgharị dị ka onyeisi nchụàjà nke ndị Juu ahụ si Babịlọn lọta, otú ahụkwa ka Jizọs si bụrụ Onyeisi Nchụàjà nke ndị na-efe Jehova ofufe n’ụlọ nsọ ime mmụọ ya.

8:1-23—Olee mgbe ihe iri ahụ Jehova kwuru n’amaokwu ndị a mezuru? Ihe sochiri nke ọ bụla n’ime ihe e kwuru n’amaokwu ndị a bụ “otú a ka Jehova nke ụsụụ nile nke ndị agha sịrị,” nke a bụkwa nkwa Chineke na-ekwe ndị ya na ha ga-enwe udo. Ụfọdụ n’ime ihe ndị a e kwuru mezuru na narị afọ nke isii T.O.A., ma ndị ọzọ emezuola kemgbe 1919 O.A., ụfọdụ ka na-emezukwa ugbu a. *

8:3—N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Jeruselem “obodo eziokwu”? Tupu e bibie Jeruselem n’afọ 607 T.O.A., ọ bụ “obodo ahụ nke na-eme ihe ike,” nke ndị bi na ya bụ ndị amụma na ndị nchụàjà na-ana aka azụ, ndị ọzọkwa abụrụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. (Zefanaịa 3:1; Jeremaịa 6:13; 7:29-34) Ma ugbu a a rụgharịchara ụlọ nsọ ahụ, ndị mmadụ ejirikwa ofufe Jehova kpọrọ ihe, a ga na-ekwuzi eziokwu nke ofufe dị ọcha ebe ahụ, a ga-akpọwazi Jeruselem “obodo eziokwu.”

11:7-14—Gịnị ka Zekaraịa igbuji mkpanaka ahụ a kpọrọ “Ịdị ụtọ” na nke ọzọ a kpọrọ “Ndị òtù udo” na-egosi? A kọwara Zekaraịa dị ka onye e zitere ịbụ onye ‘na-azụ ìgwè ewu na atụrụ a ga-egbu egbu’—nke bụ́ ndị mmadụ yiri atụrụ, bụ́ ndị ndị ndú ha na-erigbu. N’ebe a, Zekaraịa nọchiri anya Jizọs Kraịst, bụ́ onye e ziteere ndị ha na Chineke gbara ndụ ma ha ajụ ya. Mgbuji e gbujiri “Ịdị ụtọ” bụ ihe atụ na-egosi na Chineke ga-eme ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ya na ndị Juu gbara kwụsị nke ga-emekwa ka ha na ya kwụsị iso na-emekọ ihe n’ụzọ dị ụtọ. Igbuji “Ndị òtù udo” pụtara ịkwụsị mba Juda na mba Izrel ifekọ ofufe ọnụ.

12:11—Gịnị bụ “otiti aka n’obi nke Hedadrimọn n’ime ndagwurugwu Megido”? E gburu Eze Josaịa nke Juda mgbe ha na Fero Neko nke Ijipt na-alụ agha na “ndagwurugwu Megido,” ọtụtụ ndị jikwara ‘abụ ákwá’ ruo újú ọnwụ ya ruo ọtụtụ afọ. (2 Ihe E Mere 35:25) N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na “otiti aka n’obi nke Hedadrimọn” na-arụtụ aka n’iru újú ọnwụ Josaịa.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:2-6; 7:11-14. Obi na-adị Jehova ụtọ mgbe ndị chegharịrị ná mmehie ha nabatara ịdọ aka ná ntị ya ma laghachikwute ya site n’ịbịa jiri obi ha dum na-efe ya, ọ na-alaghachikwutekwa ndị dị otú ahụ. Ma ọ naghị aṅa ntị mgbe ndị ‘jụrụ ịṅa ya ntị, ndị na-ewezụga ubu ha, na ndị na-eme ka ntị ha dị arọ’ ige okwu ya na-akpọku ya ka o nyere ha aka.

4:6, 7. Ọ dịghị ihe mgbochi ọ bụla nke mmụọ Jehova na-emerilighị iji hụ na a rụgharịchara ụlọ nsọ ahụ. Anyị pụkwara imeri nsogbu ọ bụla anyị na-enweta mgbe anyị na-ejere Chineke ozi ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi.—Matiu 17:20.

4:10. Jehova nyeere Zerubabel na ndị ya aka ịrụcha ụlọ nsọ ahụ ka ọ dị ka Chineke n’onwe ya si chọọ. Ibi ndụ otú Jehova si chọọ abụghị ihe siri oké ike nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-agaghị emeli.

7:8-10; 8:16, 17. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova dị ná mma, anyị aghaghị ikpe ikpe eziokwu, na-enwe obiọma na obi ebere, ma na-agwa ibe anyị eziokwu.

8:9-13. Jehova na-agọzi anyị mgbe ‘aka anyị dị ike’ n’ọrụ ahụ o nyere anyị. Ngọzi ndị a gụnyere udo, nchebe, na anyị na Chineke ịdịkwu ná mma.

12:6. Ndị nlekọta nọ n’etiti ndị Jehova kwesịrị ịdị “ka ọwa na-enwu ọkụ”—nke pụtara na ha ga-abụ ndị ịnụ ọkụ n’obi ha pụtara nnọọ ìhè.

13:3. Otú anyị si erubere ezi Chineke ahụ na nzukọ ya isi kwesịrị ịkarị otú anyị si erubere mmadụ ọ bụla isi n’agbanyeghị otú anyị na onye ahụ dịruru ná mma.

13:8, 9. Ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị Jehova jụrụ, karịrị ndị ọzọ n’ọnụ ọgụgụ, ha bụ ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’ala ahụ. Ọ bụ nanị otu ụzọ nke ọzọ ka a nụchara dị ka e si anụcha ọla. N’oge anyị a, Jehova ajụla Krisendọm, bụ́ nke ndị mejupụtara ya bụ ọtụtụ ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole, nke bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ‘na-akpọku aha Jehova’ ma kwe ka a nụchaa ha dị ka ọla. Ha na ndị kwere ekwe ibe ha gosiri na ha abụghị Ndịàmà Jehova n’elu ọnụ.

Ndị A Kpaliri Ịdị Na-anụ Ọkụ n’Obi

Olee otú ihe ndị ahụ Hagaị na Zekaraịa kpọsara si emetụta anyị taa? Mgbe anyị na-atụgharịa uche n’otú ozi ha si kpalie ndị Juu itinye uche n’iwu ụlọ nsọ ahụ, ọ̀ dịghị akpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ma na-enyere ndị mmadụ aka ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs?

Zekaraịa buru amụma na Mezaịa ahụ ‘ga-anọkwasị n’ịnyịnya ibu, na a ga-arara ya nye n’ọnụ ego bụ́ ‘mkpụrụ ego ọla ọcha iri atọ,’ na a ga-etigbu ya, nakwa na “a ga-agbasakwa ìgwè ewu na atụrụ.” (Zekaraịa 9:9; 11:12; 13:7) Ịtụgharị uche n’otú amụma ndị Zekaraịa buru banyere Mezaịa ahụ si mezuo na-eme nnọọ ka okwukwe anyị sikwuo ike! (Matiu 21:1-9; 26:31, 56; 27:3-10) Obi na-esikwu anyị ike ịtụkwasị Okwu Jehova obi, anyị na-atụkwasịkwukwa ya obi na ọ ga-azọpụta anyị.—Ndị Hibru 4:12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 2 Lee Ụlọ Nche, January 1, 1996, peeji nke 9-22.

[Igbe dị na peeji nke 11]

ỌHỤỤ ASATỌ BỤ́ IHE ATỤ NDỊ ZEKARAỊA HỤRỤ

1:8-17: Ọhụụ a mere ka o doo anya na a ga-arụcharịrị ụlọ nsọ ahụ nakwa na a ga-agọzi Jeruselem na obodo ndị ọzọ dị na Juda.

1:18-21: Ọhụụ a kwere nkwa na a ga-ebibi ‘mpi anọ ahụ sọsara Juda,’ ya bụ, mba nile megidere ofufe Jehova.

2:1-13: Ọhụụ a gosiri na Jeruselem ga-agbasawanye nakwa na Jehova ga-abụrụ ya “mgbidi ọkụ gburugburu”—nke pụtara na ọ ga-echebe ha.

3:1-10: Ọhụụ a gosiri na Setan tinyere aka n’igbochi ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ nakwa na a napụtara Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jọshụa ma sachapụ mmehie ya.

4:1-14: Ọhụụ a mere ka obi sie ndị Izrel ike na a ga-akụtu ihe mgbochi nile yiri ugwu dị elu nakwa na Gọvanọ Zerubabel ga-ewuchapụ ụlọ nsọ ahụ.

5:1-4: Nke a bụ ọgbụgba iyi a gbara ndị mmebi iwu ndị na-anatabeghị ụgwọ ọrụ ha.

5:5-11: Ọhụụ a bụ amụma banyere otú mmebi iwu ga-esi bịa ná ngwụsị.

6:1-8: E kwere ndị Chineke nkwa n’ọhụụ nke a na ndị mmụọ ozi ga-echebe ma lekọta ha.

[Foto dị na peeji nke 8]

Olee isi ihe Hagaị na Zekaraịa ziri n’ozi ha?

[Foto dị na peeji nke 10]

Olee otú ndị nlekọta nọ n’ọgbakọ si dị “ka ọwa na-enwu ọkụ”?