Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kụziere Nwa Gị Otú E Si Eme Udo

Kụziere Nwa Gị Otú E Si Eme Udo

Kụziere Nwa Gị Otú E Si Eme Udo

N’ihi obi ụtọ Nicole dị afọ asatọ nwere na ha na-aga ịkwaga ebe ọzọ, ọ na-akọkarịrị enyi ya bụ́ Gabrielle otú ihe nile si na-aga. Otu ụbọchị, Gabrielle ji iwe gwa Nicole na ya achọghị ịma ma hà na-akwapụ ma hà na-anọ. N’ihi nke a, Nicole ji nnọọ mwute gwa mama ya sị, “Achọghị m iji anya ahụ Gabrielle ọzọ!”

Ọ DỊ mkpa ka ndị nne na nna nyere ụmụaka aka idozi ụdị nsogbu a Nicole na Gabrielle nwere—ọ bụghị nanị ka udo wee dị kamakwa iji kụziere ha otú e si edozi esemokwu. Ụmụaka ‘na-eme omume ka ụmụ ọhụrụ,’ ha adịchaghịkwa ama nsogbu okwu ha na omume ha nwere ike ịkpata. (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Ha chọrọ enyemaka iji mụta àgwà ndị ga-eme ka ha na ndị ọzọ na-adị n’udo ma n’ime ezinụlọ ha ma n’ebe ọ bụla ọzọ.

Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst chọsiri nnọọ ike ịzụ ụmụ ha ka ha bụrụ ndị ‘na-achọ udo ma na-achụso ya.’ (1 Pita 3:11) Obi ụtọ mmadụ na-enwe n’ihi ịbụ onye na-eme udo dị nnọọ ukwuu nke na o kwesịrị ime mgbalị nile o nwere ike ime iji ghara ịdị na-enyo ndị ọzọ enyo, zerekwa ịkpasu ndị ọzọ iwe ma ọ bụ ibu iwe n’obi. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú ị pụrụ isi kụziere ụmụ gị otú e si eme udo?

Mee Ka Ha Nwee Ọchịchọ Ime Ihe Na-atọ “Chineke nke Udo” Ụtọ

A kpọrọ Jehova “Chineke nke udo,” a makwaara ya dị ka onye “na-enye udo.” (Ndị Filipaị 4:9; Ndị Rom 15:33) N’ihi ya, ndị nne na nna maara ihe na-eji nkà eji Okwu Chineke bụ́ Bible akụziri ụmụ ha otú ha ga-esi nwee ọchịchọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ nakwa otú ha ga-esi na-eṅomi àgwà ya. Dị ka ihe atụ, nyere ụmụ gị aka iji anya nke uche hụ ihe Jọn onyeozi hụrụ n’otu ọhụụ dị ịrịba ama—nke bụ́ ọmarịcha eke na egwurugwu na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ nke gbara ocheeze Jehova gburugburu. * (Mkpughe 4:2, 3) Kọwaara ha na eke na egwurugwu a na-egosi na udo dị nnọọ n’ebe Jehova nọ nakwa na ebe ahụ dị nnọọ jụụ, na-egosikwa na ndị nile na-erubere Chineke isi ga-enwe udo na ọnọdụ dị jụụ.

Jehova na-eduzikwa ndị ya site n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs, onye a kpọrọ “Onyeisi Udo.” (Aịsaịa 9:6, 7) N’ihi ya, gị na ụmụ gị gụọ ma kwurịta akụkụ Bible ebe Jizọs kụziiri anyị ihe bara uru banyere otú e si ezere ọgụ na esemokwu. (Matiu 26:51-56; Mak 9:33-35) Kọwaara ha ihe mere Pọl, onye bụ́bu “onye na-akparị mmadụ,” ji gbanwee omume ya ma dee na “ọ dịghị mkpa ka ohu nke Onyenwe anyị na-alụ ọgụ, kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro, . . . na-achịkwa onwe ya n’ọnọdụ ọjọọ.” (1 Timoti 1:13; 2 Timoti 2:24) Ọ ga-atụ gị n’anya na nwa gị ga-eme ihe ị kụziiri ya.

Evan na-echeta mgbe nwa akwụkwọ ibe ya mere ya akaje mgbe ọ dị afọ asaa. Evan kwuru, sị: “Ihe ahụ o mere were m nnọọ iwe nke na achọrọ m imegwara! Ma echetara m ihe a kụziiri m n’ụlọ ka m mee mgbe mmadụ chọrọ m okwu. Ama m na Jehova achọghị ka m ‘jiri ihe ọjọọ kwụghachi n’ọnọdụ ihe ọjọọ’ kama ọ chọrọ ka ‘mụ na mmadụ nile na-adị n’udo.’” (Ndị Rom 12:17, 18) Evan gbalịrị nnọọ mee ka nsogbu ahụ jụọ oyi site n’iji obiọma mesoo nwata ahụ ihe. Ọ chọrọ ime ihe na-amasị Chineke nke udo.

Bụrụ Nne Ma Ọ Bụ Nna Na-eme Udo

Udo ọ̀ dị n’ezinụlọ gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ụmụ gị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere udo ọbụna mgbe ị na-ekwughị okwu ọ bụla. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị mụta ime udo ị ga-agbalịrịrị iṅomi otú Chineke na Kraịst si eme udo.—Ndị Rom 2:21.

Russ na Cindy na-agbalịsi ike ịzụlite ụmụ ha abụọ, ha na-agba ha nnọọ ume ka ha jiri obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe mgbe ndị ahụ kpasuru ha iwe. Cindy kwuru, sị: “Otú mụ na di m si emeso ụmụ anyị na ndị ọzọ ihe mgbe e nwere nsogbu nyere nnọọ aka n’ime ka ụmụ anyị mara ihe ha ga-eme mgbe nsogbu yiri nke ahụ dapụtara.”

Ọbụna mgbe i mehiere ihe—nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị nne na nna na-adịghị emehie ihe—ị ka nwere ike iji ohere ahụ kụziere ha ihe bara uru. Stephen kwuru, sị: “Ọ dị mgbe mụ na nwunye m, bụ́ Terry, mere ihe ọkụ ọkụ ma nye ụmụ anyị atọ ntaramahụhụ tupu anyị achọpụtachaa otú ihe nile si mee. Mgbe nke ahụ mere, anyị rịọrọ ha mgbaghara.” Terry kwukwara, sị: “Anyị na-eme ka ụmụ anyị mara na anyị onwe anyị ezughị okè, nakwa na anyị na-emehie ihe. Anyị na-eche na ọ bụghị nanị na nke a mere ka udo dịrị n’ezinụlọ anyị kamakwa o meela ka ụmụ anyị mụta ime udo.”

Ụmụ gị hà na-amụta ime udo site n’ikiri otú i si emeso ndị ọzọ? Jizọs dụrụ ọdụ, sị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) N’agbanyeghị na i nwere ike imehie ihe mgbe ụfọdụ, obi sie gị ike na ịhụnanya i nwere n’ebe ụmụ gị nọ ga-arụpụta ezigbo ihe. Ụmụ gị ga-anabata ihe ndị ị na-agwa ha ngwa ngwa ma ọ bụrụ na i jiri ịhụnanya na-eduzi ha.

Abụla Onye Na-ewe Iwe Ọsọ Ọsọ

Ilu 19:11 na-ekwu, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” Olee otú ị ga-esi nyere ụmụ gị aka inwe ezi uche? David kọwara otú ya na nwunye ya bụ́ Mariann si nwee ihe ịga nke ọma n’inyere nwa ha nwoke na nwa ha nwanyị aka. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe mmadụ kwuru okwu ma ọ bụ mee ihe kpasuru ha iwe, anyị na-enyere ha aka inwe ọmịiko. Anyị na-ajụ ha ajụjụ ndị dị ka: ‘Ọ̀ ga-abụ na o nwere ihe na-enye onye ahụ nsogbu n’obi? Ka ọ̀ ga-abụ na ọ na-ekwo ekworo? Ka ò nwere onye kpasuru ya iwe?’” Mariann na-agbakwụnye, sị: “Nke a na-eme ka obi ha jụrụ kama ime ka ha buru iwe n’obi ma ọ bụ rụwa ụka onye chọrọ okwu.”

Isi otú a na-azụ ụmụaka na-arụpụta nnọọ ezigbo ihe. Lee otú Michelle, bụ́ mama Nicole, onye anyị kpọtụrụ aha ná mmalite isiokwu a, si nyere Nicole aka ime ihe karịrị idozi esemokwu dị n’etiti ya na enyi ya bụ́ Gabrielle. Michelle na-ekwu, sị: “Mụ na Nicole gụrụ isi iri na anọ nke akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. * Mgbe anyị gụchara, akọwaara m ya ihe Jizọs bu n’uche mgbe ọ sịrị na anyị kwesịrị ịgbaghara mmadụ ‘ruo ugboro iri asaa na asaa.’ Mgbe m medachara obi gee Nicole ntị ka ọ na-ekwu ihe dị ya n’obi, enyeere m ya aka ịghọta na ihe mere Gabrielle ji na-ewe iwe bụ n’ihi na ezigbo enyi ya na-akwaga n’ebe dị anya.”—Matiu 18:21, 22.

Nghọta a Nicole mesịrị ghọta ihe ọ̀ ga-abụ ya mere Gabrielle ji wee iwe nyeere ya aka imetere Gabrielle ebere ma kpalie ya ịkpọ ya na fon ma rịọ ya mgbaghara. Michelle na-ekwu, sị: “Kemgbe ahụ, ọ na-atọzi Nicole ụtọ ichebara ndị ọzọ echiche na iji obiọma na-emeso ha ihe ka obi wee na-adị ha mma.”—Ndị Filipaị 2:3, 4.

Nyere ụmụ gị aka ịmụta otú ha ga-esi zere ịbụ ndị ezughị okè nke ndị ọzọ na nghọtahie na-akpasu iwe. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, eleghị anyị ị ga enwe obi ụtọ ka ị na-ahụ ka ụmụ gị na-enwe ọmịiko n’ahụ́ ndị ọzọ ma na-ahụ ha n’anya.—Ndị Rom 12:10; 1 Ndị Kọrịnt 12:25.

Mee Ka Ha Hụ Otú Ịgbaghara Ndị Ọzọ Si Maa Mma

Ilu 19:11 na-ekwu, sị: “Ọ bụkwa ịma mma [mmadụ] ịgabiga njehie.” N’oge Jizọs nọ nnọọ n’oké ihe mgbu, o ṅomiri Nna ya ma gbaghara ndị ọzọ ihe ha mere ya. (Luk 23:34) Ụmụ gị pụrụ ịmụta na ịgbaghara ndị ọzọ bụ ihe mara mma ma ọ bụrụ na gị onwe gị ana-agbaghara ha.

Dị ka ihe atụ, ọ na-amasịkarị Willy dị afọ ise ka ya na nne nne ya jiri kreyọn na-ese ihe. Otu ụbọchị, nne nne ya jụrụ iso ya ese ihe ma jiri iwe baara Willy mba ma pụwa. Nke a wutere Willy nke ukwuu. Papa ya, bụ́ Sam, kwuru, sị: “Nne nne Willy na-arịa ọrịa ụbụrụ a na-akpọ Alzheimer. N’ihi ya anyị kọwaara Willy ihe na-arịa nne nne ya otú ọ ga-aghọta ya.” Mgbe anyị chetaara Willy na a gbagharala ya ihe ndị o mere ọtụtụ ugboro gwakwa ya na o kwesịrị ime otu ihe ahụ, ihe Willy meziri tụrụ Sam n’anya. Sam na-ekwu, sị: “Obi tọgburu mụ na nwunye m atọgbu mgbe obere nwa anyị nwoke a gakwuuru nne nne ya dị afọ iri asatọ, rịọ ya mgbaghara, ma serezie ya n’aka bịaghachi na tebụl!”

Ọ mara mma n’ezie mgbe ụmụaka mụtara ‘ịnagide’ ezughị okè na mmehie nke ndị ọzọ ma na-agbaghara ha. (Ndị Kọlọsi 3:13) Mee ka ụmụ gị ghọta na iji obiọma emeso ndị ọzọ ihe, ọbụna mgbe ha kpasuru ha iwe, kasị mma n’ihi na “mgbe ụzọ nile nke onye ọ bụla na-atọ Jehova ụtọ, ọ na-eme ọbụna ndị iro ya ka ha na ya dị n’udo.”—Ilu 16:7.

Nọgide Na-enyere Ụmụ Gị Aka Ịghọ Ndị Na-eme Udo

Mgbe ndị nne na nna ji Okwu Chineke na-ezi ụmụ ha ihe “n’ọnọdụ udo,” bụrụkwa “ndị na-eme udo” n’onwe ha, ha na-enyere ụmụ ha aka nke ukwuu. (Jems 3:18) Ndị nne na nna dị otú a na-akwadebe ụmụ ha ịmụta otú e si edozi esemokwu na otú e si eme udo. Nke a na-eme nnọọ ka ha nwee obi ụtọ na afọ ojuju ná ndụ.

Dan na Kathy nwere ụmụ atọ dị afọ iri na ụma bụ́ ndị na-eme nnọọ nke ọma n’ọgbakọ. Dan kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na o siri nnọọ ike ịzụ ha mgbe ha na-eto eto, anyị nwere obi ụtọ na ụmụ anyị na-eme nnọọ nke ọma. Ha na ndị ọzọ na-adị nnọọ ná mma ugbu a, ha na-agbagharakwa ndị ọzọ mgbe ndị ahụ mejọrọ ha.” Kathy na-ekwu, sị: “Nke a na-eme anyị nnọọ obi ụtọ n’ihi na udo bụ otu akụkụ nke mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.

N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere unu ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-eji ghara “ịda mbà” ma ọ bụ kwe ka ‘ike gwụ’ unu ịkụziri ụmụ unu ịbụ ndị na-eme udo—ọ bụrụgodị na o yie ná mmalite ka o kweghị ụmụ unu mmụta. Ka unu na-eme nke a, obi sie unu ike na “Chineke nke ịhụnanya na nke udo ga-anọnyekwara unu.”—Ndị Galeshia 6:9; 2 Ndị Kọrịnt 13:11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 6 Lee foto dị na peeji nke 75 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 16 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

Ọ̀ NA-AKỤZIRI HA EZIGBO IHE?

Otu edemede nke isiokwu ya bụ “Ime Ihe Ike Ndị A Na-egosi na Televishọn,” bụ́ nke ụlọ ọrụ bụ́ Media Awareness Network bipụtara kwuru, sị: “N’ihe nkiri ndị e ji atụrụ ndụ, a na-egosikarị na ime ihe ike bụ ụzọ e si edozi nsogbu site n’igosi ọtụtụ ebe ndị ọjọọ na ndị bụ́ dike na-emekarị ihe ike.” Ọ bụ nanị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe nkiri TV, fim, na fim egwu ndị e nyochara na-egosi ihe ọjọọ ime ihe ike na-akpata. Dị ka edemede ahụ gosiri, “a na-egosi ime ihe ike dị ka ụzọ kwesịrị ekwesị ma karachaa mma a na-aghaghị isi dozie nsogbu.”

Ị̀ hụrụ ihe mere o ji dị mkpa ka i mee mgbanwe n’otú unu si ekiri televishọn n’ụlọ gị? Ekwela ka televishọn mebie mgbalị ị na-eme ịkụziri ụmụ gị ịbụ ndị na-eme udo.

[Foto dị na peeji nke 17]

Kụziere ụmụ gị inwe ọchịchọ ime ihe na-amasị “Chineke nke udo”

[Foto dị na peeji nke 18]

Wepụta oge gbazie onye kwuru okwu ma ọ bụ mee ihe kpasuru onye ọzọ iwe

[Foto dị na peeji nke 19]

Ụmụ gị kwesịrị ịmụta otú e si arịọ mgbaghara na otú e si agbaghara ndị ọzọ