Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Ike Ime Ememe Ndị Ọgọ Mmụọ Ka Ọ Bụrụ nke Ndị Kraịst?

È Nwere Ike Ime Ememe Ndị Ọgọ Mmụọ Ka Ọ Bụrụ nke Ndị Kraịst?

È Nwere Ike Ime Ememe Ndị Ọgọ Mmụọ Ka Ọ Bụrụ nke Ndị Kraịst?

N’OGE oyi nke afọ 2004, e nwere otu arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge Krismas n’Ịtali. Ụfọdụ ndị isi ụlọ akwụkwọ na ndị nkụzi kwuru na e kwesịrị ibelata ma ọ bụ kwụsịchaa ịkpọtụ ememe okpukpe ndị e jikọtara ha na Krismas aha. Ha tụrụ aro a iji kwado ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ụmụ akwụkwọ na-abụghị ndị Katọlik ma ọ bụ ndị Protestant. Otú ọ dị, ndị nkụzi ndị ọzọ na ndị ọzọ na-ekwu na e kwesịrị ịkwanyere omenala ndị ahụ ùgwù ma hapụ ha otú ha dị.

Ma, e wezụga arụmụka a, olee nnọọ ebe ọtụtụ omenala ndị a na-eme n’oge Krismas si? Ka arụmụka ahụ na-abịa ná njedebe, akwụkwọ akụkọ Vatican bụ́ L’Osservatore Romano kwuru ihe ụfọdụ na-akpali mmasị.

Akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik ahụ kwuru banyere ụbọchị e ji eme ememe Krismas, sị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị a mụrụ Jizọs, n’ihi na akụkọ ihe mere eme ndị Rom, ọnụ a gụrụ ndị mmadụ n’oge ahụ na nchọnchọ ndị e mere na narị afọ ndị sochirinụ adịghị nke gosiri kpọmkwem ụbọchị a mụrụ ya. . . . Onye ọ bụla maara na ọ bụ Chọọchị Rom họọrọ December 25 dị ka ụbọchị e ji eme ememe ahụ na narị afọ nke anọ. Ụbọchị a bụ ụbọchị ndị Rom na-ekpere arụsị raara nye chi Anyanwụ . . . Ọ bụ ezie na Iwu Constantine anabatala Iso Ụzọ Kraịst na Rom, ọtụtụ ndị, karịsịa ndị agha, ka na-agbaso ozizi . . . chi Anyanwụ. Ememe ndị ahụ e kwuru banyere ha n’elu, bụ́ ndị a na-eme na December 25, sitere nnọọ n’omenala a ma ama. Nke a mere ka Chọọchị Rom kwuo ka okpukpe Ndị Kraịst nabata ụbọchị a dị ka ihe ziri ezi site n’iji ezi Anyanwụ nke Ikpe Ziri Ezi, bụ́ Jizọs Kraịst, dochie anya chi Anyanwụ ma họrọ ụbọchị ahụ dị ka ụbọchị a ga-eji na-eme ememe ncheta ọmụmụ ya.”

Oleekwanụ banyere osisi Krismas, bụ́ nke so n’omenala ndị Katọlik ugbu a?

Edemede ahụ dị n’akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik kwuru na n’oge ochie, e weere ọtụtụ osisi ndị na-adịghị ama ọkọchị ndị dị ka “holly, butcher’s broom, na alaka fir dị ka ihe ndị nwere ikike pụrụ iche ma ọ bụ ndị pụrụ igbochi ọrịa.” Ọ gara n’ihu kwuo, sị: “N’abalị na-abọta Krismas, bụ́ December 24, a na-eji akụkọ ahụ a ma nke ọma banyere Osisi ahụ dị na Paradaịs elu ala echeta Adam na Iv . . . Osisi ahụ kwesịrị ịbụ osisi apụl, ma ebe ọ bụ na ọ gaghị adaba adaba iji osisi apụl eme ihe n’oge oyi, a na-egwunye osisi fir n’elu ebe ikpo okwu ma tinye mkpụrụ osisi apụl ụfọdụ n’alaka ya, ma ọ bụ iji cheta Mgbapụta na-abịa n’ọdịnihu, e jiri achịcha ndị e ji biskit a gbarisịrị agbarisị kpụọ n’ụzọ pụrụ iche mee ihe, bụ́ ihe e ji echeta ka Jizọs na-eme Yukarịsịa, tinyere ihe nracha na onyinye maka ụmụaka.” Oleekwanụ banyere mgbe oge ahụ gasịrị?

Mgbe akwụkwọ bụ́ L’Osservatore Romano na-ekwu banyere omenala nke iji osisi Krismas eme ihe, bụ́ nke malitere na Germany na narị afọ nke iri na isii, o kwuru, sị: “Ịtali so ná mba ndị ikpeazụ malitere iji osisi Krismas eme ihe, ihe sokwa kpata ya bụ kepu kepu a na-anụ n’ebe nile na ọ bụ ndị Protestant na-eji osisi Krismas eme ihe n’ihi ya kwa, na e kwesịrị iji ihe osise nke ebe a na-etinyere anụ ụlọ nri dochie anya ya [nke bụ́ ihe osise nke ọmụmụ Kraịst].” Popu Paul nke Isii “malitere omenala nke iguzobe nnukwu osisi Krismas” n’akụkụ ihe osise nke ọmụmụ Kraịst dị na St. Peter’s Square, Rom.

Ì chere na ọ dị mma onye ndú okpukpe ime ka ememe na ihe nnọchianya ndị sitere n’aka ndị ọgọ mmụọ oge ochie yie nke Ndị Kraịst? Akwụkwọ Nsọ gwara Ndị Kraịst ihe ha kwesịrị ime, sị: “Olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?”—2 Ndị Kọrint 6:14-17.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Osisi Krismas (na peeji chere nke a ihu) na ihe osise nke ọmụmụ Kraịst bụ́ nke dị na Vatican

[Ebe E Si Nweta Foto]

© 2003 BiblePlaces.com

[Foto dị na peeji nke 9]

Chi anyanwụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe Ndebe Ihe Ochie dị na Wiesbaden