Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ì nwere ike ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

• N’ihi gịnị ka “Agba Ochie” ji baa uru?

Onye chepụtara ya abụghị chi obi tara mmiri, kama ọ bụ Jehova Chineke, onye na-ahụ n’anya chepụtara ya. Jizọs na ụmụ azụ ya mbụ nọgidere na-ehota Akwụkwọ Nsọ Hibru. O nwere ndụmọdụ ndị bara uru maka ndụ anyị na-ebi kwa ụbọchị, na-emekwa ka e nwee olileanya magburu onwe ya maka ọdịnihu.—9/1, peeji nke 4-7.

• Olee ihe e mezurula n’ihi ikwere ka oge gafee kemgbe Adam na Iv mehiere?

Ihe dị ka puku afọ isii ugbu a, o doola anya na Setan bụ onye ụgha. Adam na Iv na ọtụtụ nde ụmụ ha anwụọla. Oge gaferelanụ egosila na ụmụ mmadụ enwebeghị ihe ịga nke ọma karị kemgbe ha jụrụ ka Chineke na-achị ha, nakwa na o rughịrị ha ịchị onwe ha ma ọ bụ inwe ikike iduzi onwe ha.—9/15, peeji nke 6-7.

• Gịnị mere na a katọghị Jekọb n’ime ka à ga-asị na ya bụ Ịsọ?

O ruuru Jekọb inweta ngọzi nna ya, ebe ọ bụ na ọ zụrụ ọnọdụ di ọkpara n’aka Ịsọ. Mgbe Aịzik chọpụtara na ya agọziela Jekọb, ọ chọghị ịgbanwe ya. O doro anya na Chineke chọrọ ka Jekọb nweta ngọzi ahụ, ma ọ́ bụghị ya, ọ gaara eme ihe ma à sị na ọ chọghị ka o nweta ya.—10/1, peeji nke 31.

• Olee otú akọnụche anyị si egosi na ozizi evolushọn ezighị ezi?

N’agbụrụ na n’omenala nile, ụmụ mmdụ na-enwe ọchịchọ inyere ndị ọzọ aka ọbụna mgbe ime otú ahụ nwere ike itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ. A gaghị atụ anya na ndị mmadụ ga-emere ibe ha obiọma dị otú ahụ na-achọghị ọdịmma onwe ha ma à sị na ha bụ ụmụ anụmanụ ndị na-ebi ndụ agwọ ike kwere loo ibe ya.—10/15, peeji nke 20.

• Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na Chineke dị umeala n’obi, oleekwa otú ọ na-esi egosi àgwà a?

Dị ka Onye Kasị Ihe Nile Elu na Onye Okike, ikike Chineke enweghị nsọtu dị ka ike mmadụ. N’ihi ya, n’ikwekọ n’ihe e dere na 2 Samuel 22:36, e nwere ike ikwu na Chineke dị umeala n’obi n’ihi na ihe banyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, bụ́ ndị na-agbalị ime ihe dị ya ụtọ, na-emetụ ya n’ahụ́, ọ na-emekwara ha ebere. E nwere ike ikwu na Chineke na-ewedata onwe ya ala iji gosi ndị na-atụ egwu ya obiọma.—11/1, peeji nke 4-5.

• Olee otú iberibe ite ájá si kwadoo ihe ndị e dere na Bible?

Ndị ọkà mmụta ihe ochie achọpụtala iberibe ite ájá na Sameria e dere aha ezinụlọ asaa na ha bụ́ ndị kwekọrọ n’aha ndị dị na Jọshua 17:1-6. Iberibe ite ájá a chọtara n’obodo Erad kwadoro ihe Bible kwuru banyere ezinụlọ ndị nchuàjà, o bukwa aha Chineke. Iberibe ite ájá a chọtara n’obodo Lekish mere ka a ghọtakwuo ọnọdụ ọchịchị na ọgba aghara jupụtara ebe nile n’obodo Juda tupu ndị Babilọn awakpo ya.—11/15, peeji nke 12-14.

• Olee ihe mere e ji kwuo na ọ bụ Luk dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi?

Ọ bụ Tiofilọs ka Luk degaara akwụkwọ Luk na akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, na-egosi na ọ bụ Luk dere ha abụọ. Ojiji Luk ji nnọchiaha bụ́ “anyị” mee ihe na-egosi na o so mee ihe ụfọdụ e kwuru n’Ọrụ Ndịozi. (Ọrụ 16:8-15)—11/15, peeji nke 18.

• Olee otú Onye Kraịst kwesịrị isi lee ịchụ nta na igbu azụ anya?

Malite n’oge Noa, Chineke nyere ụmụ mmadụ ikike igbu ụmụ anụmanụ na iri anụ ha. Ma iwu ahụ e nyere ka e gbupụ ha ọbara tupu eriwe ha mesiri ya ike na e kwesịrị ịkwanyere ndụ ụmụ anụmanụ ùgwù n’ihi na o sitere n’aka Chineke. Ndị Kraịst ekwesịghị igbu ụmụ anụmanụ maka egwuregwu ma ọ bụ iji ha mee ihe ọchị mgbe a na-achụgharị ha ma ọ bụkwanụ mgbe a na-achọ igbu ha. Ọ dị mkpa irube isi n’iwu gọọmenti ma na-echebara akọnuche ndị ọzọ echiche. (Ndị Rom 14:13)—12/1, peeji nke 31.