Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Onye Ndụmọdụ Na-enyere Gị Aka Ife Chineke?

Ì Nwere Onye Ndụmọdụ Na-enyere Gị Aka Ife Chineke?

Ì Nwere Onye Ndụmọdụ Na-enyere Gị Aka Ife Chineke?

MGBE Ụzaịa dị nanị afọ iri na isii, ọ ghọrọ eze nke alaeze ebe ndịda bụ́ Juda. Ọ chịrị ruo ihe karịrị iri afọ ise, site ná ngwụsị nke narị afọ nke itoolu ruo ná mmalite narị afọ nke asatọ T.O.A. Site na mgbe Ụzaịa bụ nwata, o ‘mere ihe ziri ezi n’anya Jehova.’ Olee ihe nyeere ya aka ibi ezi ndụ otú ahụ? Akụkọ ahụ kwuru, sị: “[Ụzaịa] nọ n’ịchọ Chineke n’ụbọchị Zekaraịa, onye nwere nghọta n’ihu Chineke: ma n’ụbọchị ọ na-achọ Jehova, Chineke mere ka ihe na-agara ya nke ọma.”—2 Ihe E Mere 26:1, 4, 5.

Anyị amaghị ọtụtụ ihe banyere Zekaraịa, bụ́ onye ndụmọdụ eze, ma e wezụga ihe a e kwuru banyere ya na Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka “onye nwere nghọta n’ihu Chineke,” Zekaraịa nyeere nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị aka ime ihe ziri ezi. Akwụkwọ bụ́ The Expositor’s Bible na-ekwu na o doro anya na Zekaraịa bụ “nwoke maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, onye nwerela ọtụtụ ahụmahụ n’ofufe Chineke, na onye nwere ike ịkụziri mmadụ ihe ọ maara.” Otu ọkà mmụta Bible kwuru banyere Zekaraịa, sị: “Ọ maara amụma nke ọma . . . ọ bụkwa nwoke na-akwụwa aka ọtọ, onye nwere ọgụgụ isi nke na-atụ egwu Chineke, na ezigbo mmadụ; o yikwara ka àgwà ya ò metụtara nnọọ nke Ụzaịa.”

Ndụ ikwesị ntụkwasị obi Ụzaịa biri wetaara ya ọtụtụ ngọzi, o ‘mekwara onwe ya ka ọ dị ike hie nne’ n’ihi na ‘Chineke nyeere ya aka.’ Ee, ihe ịga nke ọma o nwere n’ọchịchị dabeere n’ihe ịga nke ọma o nwere n’ịtụ egwu Chineke “n’ụbọchị Zekaraịa.” (2 Ihe E Mere 26:6-8) Mgbe Ụzaịa nwerela ihe ịga nke ọma, ọ hapụrụ ihe ndị Zekaraịa, bụ́ onye ndụmọdụ ya, kụziiri ya. ‘Obi Ụzaịa bịara dị elu ruo mbibi, nke na o mekpuru emekpu megide Jehova.’ N’ihi otu ajọ àgwà asọpụrụghị Chineke ọ kpara, e ji ọrịa akpụkpọ ahụ́ na-asọ oyi tie ya ihe otiti, bụ́ nke mere ka ọ gharakwa inwe ike ịrụ ọrụ, nke ahụ mekwara ka ọ ghara inwe ike ịrụzu ọrụ ya dị ka eze.—2 Ihe E Mere 26:16-21.

Ì nwere onye e nwere ike ịkpọ onye ndụmọdụ, bụ́ onye na-enyere gị aka “n’ịchọ Chineke”? I nwere ike inwe ụdị onye ahụ ma ị̀ ka na-eto eto ma ị̀ ghọọla dimkpa, ma ị̀ bụ nwoke ma ị̀ bụ nwanyị. Ejila onye ndụmọdụ dị otú ahụ egwuri egwu, n’ihi na ndụmọdụ ya nwere ike ime ka ị nọgide na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova. Gee Onye Kraịst a tozuru okè ntị, ma na-echebara nnọọ ndụmọdụ ndị ọ na-enye gị echiche. Ya adịla mgbe ị ga-eleghara okwu amamihe ndị “onye [dị otú ahụ] nwere nghọta n’ihu Chineke” na-agwa gị anya.—Ilu 1:5; 12:15; 19:20.