Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Dịghị Ihe Agha A Kpụrụ Megide Gị Ga-aga nke Ọma

Ọ Dịghị Ihe Agha A Kpụrụ Megide Gị Ga-aga nke Ọma

Ọ Dịghị Ihe Agha A Kpụrụ Megide Gị Ga-aga nke Ọma

“Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma.”—AỊSAỊA 54:17.

1, 2. Olee otú ihe mere Ndịàmà Jehova bi n’Albania si gosi na ihe e dere n’Aịsaịa 54:17 bụ eziokwu?

ỌTỤTỤ afọ gara aga, n’otu obere mba bụ́ ugwu ugwu nke dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Europe, e nwere otu ìgwè Ndị Kraịst na-anaghị atụ egwu. Otu ọchịchị ndị Kọmunist na-ekweghị na Chineke mere ike ya nile ikpochapụ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ịta ha ahụhụ, iziga ha n’ogige ọrụ mmanye, na imebi aha ha n’usoro mgbasa ozi adịghị nke kpochapụliri ha. Olee ndị ha bụ? Ha bụ Ndịàmà Jehova bi n’Albania. Ọ bụ ezie na o siiri ha nnọọ ike izukọ ọnụ na ikwusa ozi ọma, nnọgidesi ike ha ruo ọtụtụ iri afọ emewo ka a kwanyewere Iso Ụzọ Kraịst ùgwù ma wetara aha Jehova otuto. N’afọ gara aga, mgbe a na-arara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ ha nye, otu Onyeàmà kwesịrịla ntụkwasị obi ruo ogologo oge kwuru, sị: “N’agbanyeghị mbọ nile Setan na-agba, ọ nọgidere na-akụ afọ n’ala, Jehova anọgidekwa na-emeri!”

2 Ihe a nile bụ ihe àmà a hụrụ anya nke na-egosi na nkwa ahụ Chineke kwere ndị ya nke e dere n’Aịsaịa 54:17 bụ eziokwu, nke bụ́: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe.” Ihe ndị merela eme egosila na ọ dịghị ihe ụwa Setan ga-eme nke ga-enwe ike ịkwụsị ofufe ndị ohu Jehova Chineke raara onwe ha nye na-efe Ya.

Mbọ Na-akụ Afọ n’Ala Setan Na-agba

3, 4. (a) Olee ihe ndị so n’ihe agha Setan? (b) Olee otú ihe agha Ekwensu sirila kụọ afọ n’ala?

3 Ihe agha ndị e jirila busoo ndị na-efe ezi ofufe agha gụnyere mmachibido iwu, ime ihe ike, ịtụ mkpọrọ, na ‘iji ụkpụrụ akpụzi mmegbu.’ (Abụ Ọma 94:20) N’ezie, n’ala ụfọdụ, ọbụna ka Ndịàmà Jehova na-amụ isiokwu a, a ‘na-ele’ ikwesị ntụkwasị obi nke ezi Ndị Kraịst a nye Chineke “ule.”—Mkpughe 2:10.

4 Dị ka ihe atụ, otu alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova kọrọ na nanị n’otu afọ, e mesoro ndị ohu Chineke ihe ike ugboro iri atọ na abụọ ka ha nọ n’ozi. E wezụgakwa nke ahụ, ndị uwe ojii kpọchiri Ndịàmà ugboro iri ise na itoolu—ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị—ebe ha na-ekwusa ozi ọma n’ihu ọha. A gwara ụfọdụ ka ha bịanye aka n’akwụkwọ, e see ha foto, ma kpọchie ha dị ka ndị omekome. E yiela ndị ọzọ egwu na a ga-emeso ha ihe ike. N’ala ọzọ, e nweela ihe karịrị otu puku ugboro, na otu narị e deturu edetu bụ́ mgbe e jichiri Ndịàmà Jehova, rie ha nhá, ma ọ bụ tie ha ihe. N’ime ihe ndị ahụ e mere ha, ihe karịrị narị abụọ mere n’ụbọchị ha gbakọrọ icheta ọnwụ Jizọs! N’agbanyeghị nke ahụ, mmụọ Jehova enyeworo ndị ya aka imeri ihe isi ike ndị karịrị ha ike, ma n’ala ndị a ma ná mba ndị ọzọ. (Zekaraịa 4:6) Iwe ọkụ ndị iro na-eweso ndị na-eto Jehova agaghị emechili ha ọnụ. Ee, obi siri anyị ike na ọ dịghị ihe agha pụrụ igbochi nzube Chineke imezu.

Ịma Ire Okwu Ụgha Ọ Bụla Ikpe

5. Olee ire okwu ụgha nke biliri imegide ndị ohu Jehova na narị afọ mbụ?

5 Aịzaịa buru amụma na ndị Chineke ga-ama ire ọ bụla nke biliri imegide ha ikpe. Na narị afọ mbụ, e boro Ndị Kraịst ebubo ụgha ugboro ugboro ma kpọọ ha ndị ọjọọ. Ihe dị n’Ọrụ 16:20, 21 bụ otu n’ime ebubo ndị dị otú ahụ e boro ha: “Ndị a na-enye obodo anyị nsogbu nke ukwuu . . . ha na-ekwusakwa omenala ndị iwu na-akwadoghị ka anyị nakwere ma ọ bụ na-eme, ebe anyị bụ ndị Rom.” N’aka nke ọzọ, ndị okpukpe na-emegide Ndị Kraịst gbalịrị ịkpali ndị ọchịchị obodo imegide ndị na-eso ụzọ Kraịst, na-ebo ha ebubo, sị: “Ndị a nke kpuworo elu ụwa mmadụ bi ihu nọkwa n’ebe a, [ha] na-emekwa ihe megidere ụkpụrụ iwu Siza.” (Ọrụ 17:6, 7) A kpọrọ Pọl onyeozi “ajọ mmadụ” na onye ndú nke òtù na-akpali ndị mmadụ imegide ọchịchị “n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Ọrụ 24:2-5.

6, 7. Olee otu ụzọ ezi Ndị Kraịst si ama ebubo ụgha ndị a na-ebo ha ikpe?

6 N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na a kọjọwo nnọọ ezi Ndị Kraịst taa, kwutọọ ha ajọ nkwutọ ma gbasaa akụkọ ụgha banyere ha. Olee otú anyị si na-ama ebubo ụgha ndị dị otú ahụ ikpe?—Aịsaịa 54:17.

7 Àgwà ọma Ndịàmà Jehova na-agbakarị ebubo ụgha na okwu nduhie ndị dị otú ahụ n’anwụ. (1 Pita 2:12) Mgbe Ndị Kraịst gosipụtara na ha bụ ụmụ amala na-erubere iwu isi, ndị na-akpa ezi àgwà, na ndị na-echebara ọdịmma ụmụ mmadụ ibe ha echiche, ndị mmadụ na-achọpụta na ebubo ndị a na-ebo ha bụ ụgha. Àgwà ọma anyị na-agbara anyị akaebe. Ka ndị mmadụ na-ahụ ka anyị nọgidere na-arụ ọrụ ọma, ọ na-akpalikarị ha inye Nna anyị nke eluigwe otuto, ha na-ekwetakwa na ndị ohu ya na-ebi ndụ ka mma.—Aịsaịa 60:14; Matiu 5:14-16.

8. (a) Olee ihe ọ pụrụ ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka anyị mee iji gbachitere ihe ndị anyị mụtara n’Akwụkwọ Nsọ? (b) Dị ka Kraịst mere, olee otú anyị na-esi ama ire ndị na-ekwugide anyị ikpe?

8 Tụkwasị n’àgwà ndị na-enye Chineke otuto anyị na-akpa, ọ pụrụ ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka anyị jiri nkwuwa okwu gbachitere ihe ndị anyị mụtara n’Akwụkwọ Nsọ. Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịrịọ gọọmentị na ụlọikpe ka ha chebe anyị. (Esta 8:3; Ọrụ 22:25-29; 25:10-12) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ya na ndị na-akatọ ya rụrịtara ụka n’ihu ọha mgbe ụfọdụ, ya agbaakwa ebubo ụgha ha n’anwụ. (Matiu 12:34-37; 15:1-11) Anyị na-eṅomi Jizọs site n’ịnabata ohere ndị dapụtaara anyị iji kọwaara nnọọ ndị ọzọ ihe ndị anyị kwenyesiri ike na ha. (1 Pita 3:15) Ya adịkwala mgbe anyị ga-ekwe ka emo a na-akwa anyị n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ ma ọ bụ ndị ndị ikwu anyị na-ekweghị ekwe na-akwa anyị gbochie anyị ime ka a mara eziokwu nke Okwu Chineke.—2 Pita 3:3, 4.

Jeruselem—“Nkume Obubo”

9. Olee Jeruselem nke “nkume obubo” ahụ e kwuru banyere ya na Zekaraịa 12:3 nọchiri anya ya, oleekwa ndị nọchiri anya Jeruselem ahụ n’ụwa?

9 Amụma Zekaraịa kwuru ihe mere mba nile ji emegide ezi Ndị Kraịst. Hụwa ihe a Zekaraịa 12:3 kwuru ama: “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ, na M ga-eme Jeruselem ka ọ ghọọrọ ndị nile dị iche iche nkume obubo.” Oleedị Jeruselem nke amụma a na-ekwu banyere ya? Jeruselem nke amụma Zekaraịa na-ekwu banyere ya bụ “Jeruselem nke eluigwe,” bụ́ Alaeze eluigwe nke a kpọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ iso chịa. (Ndị Hibru 12:22) Ọnụ ọgụgụ dị nta nke ihe fọdụrụ n’ime ndị a ga-eso chịa n’Alaeze Mezaịa ahụ ka nọ n’ụwa. Ha na ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ” na-agba ndị mmadụ ume ịdụnyere Alaeze Chineke úkwù tupu oge agafee. (Jọn 10:16; Mkpughe 11:15) Mba dị iche iche hà azawo òkù a? Olee ụdị aka Jehova na-enyere ndị na-efe ya ezi ofufe taa? Ka anyị chọpụta nke ahụ ka anyị na-atụlekwu ihe Zekaraịa isi 12 pụtara. Ime otú ahụ ga-eme ka obi sie anyị ike na ọ dịghị ‘ihe agha ọ bụla ga-aga nke ọma’ megide ndị Chineke e tere mmanụ na ndị enyi ha raara onwe ha nye.

10. (a) Gịnị mere e ji na-akpagbu ndị Chineke? (b) Olee ihe merela ndị gbalịrị ibupụ “nkume obubo” ahụ n’ụzọ?

10 Zekaraịa 12:3 kwuru na mba nile ‘kọwapụtara onwe ha ọnyá nke ukwuu.’ Olee otú nke a si mee? Chineke enyela iwu na a ga-ekwusarịrị ozi ọma nke Alaeze. Ndịàmà Jehova ji ọrụ nkwusa ahụ kpọrọ ihe. Otú ọ dị, ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ dị ka nanị olileanya dịịrị ụmụ mmadụ aghọworo mba nile “nkume obubo.” Ha na-agbalị ibupụ ya n’ụzọ site n’imegide ndị nkwusa nke Alaeze ahụ. Mba ndị na-emegide ha ‘akọwapụtawo onwe ha ọnyá,’ ya bụ imepụ onwe ha ọtụtụ ọnyá n’ahụ́. Ọdịda na-emenye ihere ha dara imezu nzube ha emebiedịla aha ha. Ha agaghị emechili ọnụ ndị na-efe ezi ofufe, bụ́ ndị ji ihe ùgwù nke ikwusa “ozi ọma ebighị ebi” nke Alaeze Mezaịa nke Chineke tupu ọgwụgwụ nke ụwa a abịa kpọrọ ihe. (Mkpughe 14:6) Mgbe otu onye nche ụlọ mkpọrọ nọ n’otu mba dị n’Africa hụrụ otú e si na-eti ndị ohu Jehova ihe, o kwuru, sị: ‘Unu na-enye onwe unu nsogbu n’ịkpagbu ndị a. Ọ dịghị mgbe ha ga-ahapụ okpukpe ha. Nanị ihe ha ga-eme bụ ịmụba amụba.’

11. Olee otú Chineke si mezuo nkwa ya e dere na Zekaraịa 12:4?

11 Gụọ Zekaraịa 12:4. Jehova kwere nkwa na ya ga-eme ka ndị na-ebuso ndị ozi Alaeze ya nwere obi ike agha kpuo ìsì ma mee ka “ibobo” nwụọ ha n’ahụ́ n’ụzọ ihe atụ. O mezuwo okwu ya. Dị ka ihe atụ, n’otu mba ebe a machibidoro ezi ofufe iwu, ndị na-emegide ndị Chineke egbochilighị ha inweta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Otu akwụkwọ akụkọ kwudịrị na Ndịàmà Jehova na-eji otu ihe ikuku na-ebugharị nke yiri helikọpta ebubata akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ná mba ahụ! Chineke mezuru nkwa o kwere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, nke bụ́: ‘M ga-asaghe anya m abụọ, ọ bụ ịnyịnya nile ọ bụla nke ndị nile dị iche iche ka M ga-eji ikpu ìsì tigbuo.’ Iwe na ọnụma anaghị ekwe ndị iro nke Alaeze ahụ ịma ihe ha ga-eme eme. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kwenyesiri ike na Jehova ga-echebe ndị ya dị ka otu ìgwè ma chebara ọdịmma ha echiche.—2 Ndị Eze 6:15-19.

12. (a) Olee otú Jizọs si mụnye ọkụ n’ụwa mgbe ọ nọ n’ụwa? (b) Olee otú ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ si mụnye ọkụ n’ụwa n’ụzọ ihe atụ, gịnịkwa si na ya pụta?

12 Gụọ Zekaraịa 12:5, 6. ‘Ndị isi nke Juda’ e kwuru banyere ha na-anọchi anya ndị ndú nke ndị Chineke. Jehova na-eme ka ndị a nwee nnọọ ịnụ ọkụ n’obi maka ihe ndị metụtara Alaeze ya n’ụwa. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya n’otu oge, sị: “Abịara m ịmụnye ọkụ n’elu ụwa.” (Luk 12:49) N’ezie, ọ mụnyere ọkụ n’ụwa. Ịnụ ọkụ n’obi Jizọs maka ọrụ nkwusa ahụ mere ka Alaeze Chineke bụrụ okwu ndị mmadụ kpụ n’ọnụ. Nke a kpatara arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ n’ebe nile ná mba ndị Juu. (Matiu 4:17, 25; 10:5-7, 17-20) N’otu aka ahụ, “dị ka ihe ịgụ ọkụ n’etiti nkụ na dị ka ọwa na-enwu ọkụ n’etiti ùkwù ọka,” ndị na-eso ụzọ Kraịst nke oge anyị a na-amụnye ihe ọkụ n’ụzọ ihe atụ. Akwụkwọ bụ́ The Finished Mystery, * bụ́ nke e bipụtara n’afọ 1917, gbara nnọọ ihu abụọ nke Krisendọm n’anwụ. Nke ahụ kpasuru nnọọ ndị ụkọchukwu iwe. N’oge na-adịbeghị anya, Akụkọ Alaeze nke 37, bụ́ “A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!” emeela ka ọtụtụ gosi ebe ha kwụ site n’ịdụnyere Alaeze Chineke úkwù ma ọ bụ imegide ya.

A Zọpụtara “Ụlọikwuu Nile nke Juda”

13. Olee ihe okwu bụ́ “ụlọikwuu nile nke Juda” na-egosi, oleekwa ihe mere Jehova ga-eji zọpụta ndị o metụtara?

13 Gụọ Zekaraịa 12:7, 8. N’Izrel oge ochie, a na-ahụ ụlọikwuu ebe nile, ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ọrụ ugbo na-ebikwa na ya mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na mba ndị iro abịa ibuso Jeruselem agha, ọ bụ ndị dị otú ahụ ka a ga-ebu ụzọ nweta, ọ bụkwa ha ka nchebe dị mkpa. Okwu ahụ bụ́ “ụlọikwuu nile nke Juda” na-egosi na ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ yiri ndị na-enweghị nchebe n’ụzọ ihe atụ, ndị na-anọghị n’obodo ndị e wusiri ike. Ha na-anọ ebe ahụ agbachitere ihe ndị metụtara Alaeze Mezaịa ahụ. Jehova nke ụsụụ nile nke ndị agha “ga-ebu ụzọ zọpụta ụlọikwuu nile nke Juda” n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị bụ́ isi Setan na-ebuso agha.

14. Olee otú Jehova si azọpụta ndị bi ‘n’ụlọikwuu nile nke Juda’ ma mee ka ha ghara ịsụ ngọngọ?

14 N’ezie, ihe ndị mere eme na-egosi na Jehova na-azọpụta ndị nnọchianya e tere mmanụ nke Alaeze ahụ ka ha nọ ‘n’ụlọikwuu’ ha dị n’èzí. * Ọ na-eme ka ha ghara ‘ịsụ ngọngọ’ site n’ime ka ha dị ike ma nwee obi ike dị ka Devid, bụ́ eze bụ́ dike n’agha.

15. N’ihi gịnị ka Jehova ji ‘chọọ ikpochapụ mba nile,’ oleekwa mgbe ọ ga-eme nke a?

15 Gụọ Zekaraịa 12:9. Gịnị mere Jehova ji ‘chọọ ikpochapụ mba nile’? Ọ bụ n’ihi na ha nọgidere na-emegide Alaeze Mezaịa. Ikpe mara ha n’ihi na ha nọgidere na-akpagbu ma na-amaja ndị Chineke. N’oge na-adịghị anya, ndị ọrụ Setan nọ n’ụwa ga-awakpo ndị na-efe Chineke ezi ofufe mwakpo ikpeazụ, bụ́ nke ga-eduga n’ihe ga-eme n’ụwa nke Bible kpọrọ Ha–Magedọn. (Mkpughe 16:13-16) N’ihi mwakpo ahụ a ga-awakpo ndị Chineke, Onyeikpe Kasị Elu ga-azọpụta ndị ya ma doo aha ya nsọ n’etiti mba nile.—Ezikiel 38:14-18, 22, 23.

16, 17. (a) Gịnị bụ “ihe nketa nke ndị ohu Jehova”? (b) Olee ihe obi anyị na-atachi n’agbanyeghị mwakpo Setan na-egosi?

16 Setan enweghị ngwá agha ọ bụla pụrụ ime ka okwukwe nke ndị Chineke ma ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi ha n’ụwa nile nyụọ ọkụ. Udo anyị na-enwe n’ofufe anyị, bụ́ nke anyị na-enwe n’ihi ikike Jehova nwere ịzọpụta anyị, bụ “ihe nketa nke ndị ohu Jehova.” (Aịsaịa 54:17) Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịnapụ anyị udo anyị na ezi mmekọrịta nke anyị na Chineke n’ike. (Abụ Ọma 118:6) Setan ga-anọgide na-akpali ndị mmadụ ịkpagbu na imegide anyị. Anyị ịnọgide na-atachi obi n’agbanyeghị nkọcha a na-akọcha anyị na-egosi na anyị nwere mmụọ Chineke. (1 Pita 4:14) A na-ekwusa ozi ọma banyere Alaeze Jehova e guzobere eguzobe n’ụwa nile. Dị ka ihe ndị na-enwu ọkụ a na-eji emegharị ndị agha anya, a gbawo ndị Chineke ọtụtụ “nkume ebe” nke mmegide. N’agbanyeghị nke ahụ, site n’ike Jehova, ndị ohu ya na-emeri nkume ndị dị otú ahụ, nke mere ka ọ ghara imetụta ha. (Zekaraịa 9:15) Ọ dịghị onye ga-akwụsịli ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ na ndị enyi ha kwesịrị ntụkwasị obi ịrụ ọrụ ha!

17 Anyị na-atụ anya mgbe a ga-anapụta anyị kpamkpam ná mwakpo Ekwensu. Lee nnọọ otú nkwa ahụ e kwere anyị na ‘ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide anyị ga-aga nke ọma: ọzọ, na ire ọ bụla nke ga-ebili imegide anyị n’ikpe ka anyị ga-ama ikpe’ si akasi anyị obi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 12 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.

^ par. 14 Ọ bụrụ na ị chọrọ inwetakwu ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 675-676, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị na-egosi na ihe agha nile Setan akụọla afọ n’ala?

• Olee otú Jeruselem nke eluigwe si ghọọ “nkume obubo”?

• Olee otú Jehova si azọpụta “ụlọikwuu nile nke Juda”?

• Ka anyị na-eru Amagedọn nso, olee ihe i ji n’aka na ọ ga-eme?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ndị Jehova nọ n’Albania nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị mwakpo Setan

[Foto dị na peeji nke 23]

Jizọs gbara ebubo ụgha e boro ya n’anwụ

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụrụ megide ndị na-ekwusa ozi ọma ga-aga nke ọma